Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Na-agbachitere Eziokwu

Ndị Na-agbachitere Eziokwu

Ememme Ngụcha Akwụkwọ nke Klas nke Otu Narị na Iri Atọ na Abụọ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied

Ndị Na-agbachitere Eziokwu

ABALỊ iri n’ọnwa Mach nke afọ 2012 bụ ụbọchị pụrụ iche n’ụlọ akwụkwọ Ndịàmà Jehova dị na Patasịn, Niu Yọk. Ọ bụ n’ụbọchị ahụ ka e mere ememme ngụcha akwụkwọ nke klas nke otu narị na iri atọ na abụọ nke ụlọ akwụkwọ Gilied. Ọtụtụ puku mmadụ si mba dị iche iche bịa ememme a, ejiji ha makwara mma. Ọtụtụ n’ime ha zukọtara n’otu ụlọ nzukọ dị na Patasịn. Ma ndị ọzọ zukọtara n’ụlọ nzukọ ndị ọzọ bụ́ ebe ha ga-anọ na-ahụ ihe a na-eme n’ememme ahụ na tiivi. Ndị niile bịara ememme ahụ dị puku mmadụ itoolu na iri mmadụ anọ na abụọ.

Ndị niile bịara ememme ahụ chọrọ ịmata otú ememme ahụ ga-esi aga. Ihe kpatara ya bụ na klas a dị iche na klas niile bu ya ụzọ. Ụfọdụ n’ime ndị nọ na klas a na-eje ozi na Betel, ndị ọzọ bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, na ndị na-ekwusa ozi ọma ná mba ọzọ tupu ha abịa ụlọ akwụkwọ a. Ma, o nweghị onye n’ime ha gatụrụla ụlọ akwụkwọ Gilied. Gịnị ka a ga-agwa ụmụ akwụkwọ a jeerela Jehova ozi ọtụtụ afọ?

Ka ndị bịara ememme a nọ na-eche ihe a n’obi ha, Nwanna Gerrit Lösch, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, kwuru okwu mbụ n’ememme a. Ọ bụ Nwanna Lösch bụ onyeisi oche nke ememme a. Ọ jụrụ ụmụ akwụkwọ ahụ otu ajụjụ e kwesịrị ichebara echiche. Ihe ọ jụrụ ha bụ: “Ùnu Na-agbachitere Eziokwu?” O kwuru na ezigbo Ndị Kraịst na-agbachitere eziokwu, ya bụ, ihe niile Ndị Kraịst na-akụzi. Mmadụ ịgbachitere eziokwu abụghị naanị ịkụziri ndị mmadụ eziokwu, kama onye ahụ ga-enyere ndị mmadụ aka ka ha jiri eziokwu kpọrọ ihe.

Nwanna Lösch jụrụ ha, sị: “Olee otú anyị si mata na ọ bụ anyị na-akụzi eziokwu?” O kwuru na ihe na-egosi na anyị na-akụzi eziokwu abụghị mmadụ ole na-anabata ihe anyị na-akụzi. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ nde mmadụ abatala ná nzukọ Jehova ma na-efe Jehova ugbu a, ma ndị na-efe Jehova dị mmadụ ole na ole na Pentikọst nke afọ 33 Oge Ndị Kraịst. Nwanna Lösch kwuru ụzọ ihe ise na-egosi na ọ bụ anyị na-akụzi eziokwu. Nke mbụ bụ na ọ bụ ihe Jizọs kụziri ka anyị na-akụzi. Nke abụọ abụrụ na anyị hụrụ ibe anyị n’anya. Nke atọ abụrụ na anyị na-ebi ndụ otú Chineke chọrọ ka anyị na-ebi. Nke anọ abụrụ na anyị anaghị etinye aka n’agha ma ọ bụ n’esemokwu e nwere n’ụwa. Ebe nke ise bụ na Chineke kpọkwasịrị anyị aha ya.

“Na-emenụ Ihe Jehova Gwara Unu”

Mgbe Nwanna Lösch kwuchara okwu ya, Nwanna Geoffrey Jackson, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, bu nnukwu igbe bata n’ebe a na-anọ ekwu okwu. Ihe ahụ juru ndị na-ege ntị anya. Nwanna Jackson kwuru okwu n’isiokwu bụ́, “Na-emenụ Ihe Jehova Gwara Unu.” Isiokwu a si n’akwụkwọ Aịzaya 50:5. Amaokwu ahụ kwuru banyere Jizọs Kraịst, sị: “Mụ onwe m enupụghịkwa isi. Atụgharịghị m gawa n’ebe ọzọ.”

Nwanna Jackson gwara ụmụ akwụkwọ ahụ na mgbe ọ bụla Jehova ji mmụọ nsọ ya, ma ọ bụ Baịbụl, ma ọ bụkwanụ nzukọ ya gwa ha ihe ha ga-eme, ha kwesịrị ime ya ozugbo. Ọ kọọrọ ha otu ilu Jizọs tụrụ nke dị na Matiu 25:14-30. N’ilu ahụ, Jizọs kọrọ otú otu nwoke si nye ndị ohu ya talent ka ha were zụọ ahịa. O nyere onye nke ọ bụla n’ime ha talent otú ike ya hà. Ọ chọrọ ka ha jiri ya gbaa mbọ otú ha nwere ike. Mgbe e mechara, nwoke ahụ jara ndị ohu ya abụọ mma ma kpọọ ha ‘ezi ndị ohu kwesịrị ntụkwasị obi.’ Nwanna Jackson kwuru na ihe e ji ama ma mmadụ ò kwesịrị ntụkwasị obi abụghị naanị ihe onye ahụ rụpụtara, kama ọ bụ otú onye ahụ si nọgide na-eme ihe a gwara ya.

Nwanna Jackson kwuziri na nwoke ahụ kpọrọ ohu nke atọ “ajọ ohu dị umengwụ,” kpọọkwa ya ‘ohu na-abaghị uru ọ bụla.’ Gịnị bụ ihe ọjọọ ohu a mere? O liri talent e nyere ya n’ala. Otu talent abụghị otu mkpụrụ ego. E jiri ihe e ji atụ ihe tụọ ya, ya na puku mkpụrụ ego dinarịọs isii ga-aha n’ịdị arọ. Nke a pụtara na otu talent dị kilogram iri abụọ n’ịdị arọ. O kwuru na otu talent nwere ike ịha ka nnukwu igbe nke e nwere ike ikwe ka mmadụ buru banye n’ụgbọelu ma ọ gawa mba ọzọ. Igwu ala lie ihe hà ka nnukwu igbe abụghị obere ọrụ. N’ihi ya, e nwere ike ikwu na o nwere ọrụ ohu ahụ rụrụ. O gwuru ala lie talent ahụ, ma ọ bụghị ihe ahụ ka a gwara ya rụọ. Onye na-ekwusa ozi ọma ná mba ọzọ nwekwara ike ime ụdị ihe ahụ ohu ahụ mere. O nwere ike iji oge ya niile na-edegara ndị ọzọ akwụkwọ ozi, na-achọ ihe n’Ịntanet, na-aga na nke ndị enyi ya, ma ọ bụkwanụ na-azụ ahịa. Mgbe o mechara ihe ndị a n’ụbọchị, ike nwere ike ịgwụcha ya, ma ihe ndị ahụ o mere abụghị ihe e dunyere ya. Nwanna Jackson gwaziri ụmụ akwụkwọ ahụ, sị: “Na-emenụ ihe a gwara unu mee!”

“Enwela Obi Abụọ”

Nwanna Anthony Morris, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, bụ onye ọzọ kwuru okwu n’ememme ahụ. Isiokwu ya bụ “Unu Enwela Obi Abụọ.” Ọ gwara ụmụ akwụkwọ ahụ, sị, “Na Baịbụl, o nweghị ihe gbasara inwe okwukwe na inwe obi abụọ. Onye nwere okwukwe anaghị enwe obi abụọ.” O kwuru na ebe ọ bụ na Setan mere ka Iv, bụ́ nwaanyị zuru okè, nwee obi abụọ, o nwekwara ike ime ka anyị nwewe obi abụọ. Ọ gwaziri ụmụ akwụkwọ ahụ, sị, “Meenụ ka okwukwe unu na-esikwu ike, nke a ga-eme ka unu ghara ịna-enwe obi abụọ.” Nwanna Morris kọọrọ ha ihe mere Pita. O kwuru na Pita “jere ije n’elu mmiri,” ma “mgbe ọ hụrụ oké ifufe,” egwu tụrụ ya, ya amalite imikpu. Mgbe Jizọs sepụtachara Pita na mmiri ahụ, Jizọs jụrụ ya, sị: “Gịnị mere i ji nwewe obi abụọ?” (Matiu 14:29-31) Nwanna Morris gwaziri ụmụ akwụkwọ ahụ, sị, “Ebe ọ bụ na unu nwere ọtụtụ ihe unu ga na-arụ n’ebe e zigara unu, ndị ọzọ ga na-ekiri unu ka à ga-asị na unu na-eje ije n’elu mmiri. Ma mgbe nsogbu ndị yiri oké ifufe bịaara unu, gbalịanụ ka unu ghara inwe obi abụọ.”

Nwanna Morris gwakwara ha na ihe agaghị adịrị ha mfe n’oge ahụ nsogbu ndị ahụ yiri oké ifufe bịaara ha, ma e mechaa, nsogbu ndị ahụ ga-akwụsị. Ọ gwaziri ha na mgbe ọ bụla nsogbu bịara, ka ha cheta ihe Pọl na Saịlas mere mgbe a tụrụ ha mkpọrọ na Filipaị. Ọrụ Ndịozi 16:25 kwuru, sị: “N’ihe dị ka n’etiti abalị, Pọl na Saịlas nọ na-ekpe ekpere ma jiri abụ na-eto Chineke; ee, ndị mkpọrọ nọ na-anụ olu ha.” Ọ gwara ha na amaokwu a gosiri na ihe Pọl na Saịlas mere abụghị naanị ikpe ekpere, kama ha bụkwara abụ. Ha bụrụ abụ n’olu dara ụda nke na ndị mkpọrọ ndị ọzọ nọ na-anụ olu ha. Nwanna Morris gwara ha na n’agbanyeghị na ọtụtụ n’ime anyị enweghị olu abụ, anyị kwesịrị ịna-abụ abụ, karịchaa, mgbe nsogbu bịaara anyị. Ọ gụpụtaara ụmụ akwụkwọ ahụ ihe e dere n’Abụ nke 135. Isiokwu abụ ahụ bụ “Ịtachi Obi Ruo Ọgwụgwụ.” O si n’akwụkwọ abụ anyị bụ́ Bụkuo Jehova Abụ. Ọ bụ abụ a ọ gụpụtaara ha ka o ji mechie okwu ya.

Okwu Ndị Ọzọ Na-agba Ume E Kwuru

“Ọ̀ Na-agụ Gị Agụụ Ịhụ Ọtụtụ Ụbọchị?” Nke a bụ isiokwu ọzọ e kwuru n’ememme ahụ. Ọ bụ Nwanna Robert Luccioni, bụ́ onye na-arụ ọrụ ná Ngalaba Ịzụta Ihe, kwuru ya. Ebe o si nweta isiokwu a bụ n’ihe Eze Devid kwuru n’Abụ Ọma 34:12. N’okwu ahụ, Nwanna Luccioni gwara ụmụ akwụkwọ ahụ ihe ndị ha ga-eme mgbe nsogbu bịaara ha ka ha na Jehova nwee ike ịnọgide na-adị ná mma. Ọ gwara ha na ha nwere ike isi n’akwụkwọ Samuel nke Mbụ, isi nke iri atọ, mụta ihe ndị ha ga-eme. Ebe ahụ kwuru na mgbe Eze Sọl chọrọ igbu Devid, Devid na ndị ikom ya nakwa ndị ezinụlọ ha gara biri n’obodo Ziklag. Otu ụbọchị, mgbe Devid na ndị ikom ya na-anọghị n’ụlọ, ndị Amalek gara buso Ziklag agha ma kpụrụ ndị ezinụlọ Devid nakwa ndị ezinụlọ nke ndị ikom ahụ ha na Devid so. Ndị ahụ ha na Devid so kwuru na ọ bụ Devid kpataara ha nsogbu ahụ, kwuokwa na ha ga-atụ Devid nkume. Gịnị ka Devid mere? Devid ekweghị ka ihe ahụ merenụ mee ka obi daa ya mbà. Baịbụl kwuru, sị: “Devid wee jiri Jehova bụ́ Chineke ya na-eme onwe ya ka ọ dị ike.” (1 Samuel 30:6) Ọ jụziri Jehova ihe ya ga-eme, o mekwara ihe Jehova gwara ya. Nke a mere ka o nwee ike ịnapụta ndị ahụ a kpụụrụ. Nwanna Luccioni gwara ụmụ akwụkwọ ahụ na ọ bụrụhaala na ha atụkwasị Jehova obi ma mee ihe o kwuru otú ahụ Devid mere, ha ga-enwe obi ụtọ n’ozi ha.

“Mụrụnụ Anya.” Nke a bụ isiokwu nke okwu Nwanna Michael Burnett kwuru. Nwanna Burnett bụ otu n’ime ndị nkụzi n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. O kwuru na ndị Izrel kewara abalị ha ụzọ atọ. Nke atọ na-amalite n’elekere abụọ nke ime abalị ruo n’elekere isii nke ụtụtụ. Ọ bụ mgbe ahụ ka oyi kacha atụ, ọ bụkwa mgbe ahụ ka ebe niile na-agba itiri karịchaa. N’ihi ya, ọ na-esiri ndị mmadụ ezigbo ike ịmụ anya n’oge ahụ. Ọ gwara ha na e nwere otu ọbụ abụ nke na-echebara okwu Jehova echiche n’oge ahụ ọ na-esi ezigbo ike ịmụ anya. Ihe mere o ji eme ya bụ ka ụra ghara iburu ya. (Abụ Ọma 119:148) Nwanna Burnett gwaziri ụmụ akwụkwọ ahụ, sị, “Unu kwesịrị ịmụrụ anya. Mgbe ụfọdụ, nsogbu nwere ike ịbịara unu, ya eyie ka ọchịchịrị ò kpuchiele unu. Unu kwesịrị ịkwadebe akwadebe tupu nsogbu abịa.” Ọ gwara ha ka ha na-agụsi Baịbụl ike ma na-agbalị ịmụ isiokwu Baịbụl ndị yiri ka hà siri ike. Nke a ga-eme ka ha mụrụ anya. Nwanna Burnett mere ka ihe ọ na-ekwu dokwuo anya. Ọ gwara ụmụ akwụkwọ ahụ, sị: “Kwa ụbọchị, unu na-ekpegara Jehova ekpere maka na unu chọrọ ka ọ bụrụ enyi unu. Unu kwesịkwara ikwe ka enyi unu, bụ́ Jehova, si na Baịbụl na-agwa unu okwu kwa ụbọchị. Chi ejimiwo, n’ihi ya, hazienụ ihe ndị unu ga-eji ụbọchị ndị dị n’ihu mee. Ọ bụrụ na unu emee otú ahụ, unu ga-amụrụ anya n’oge unu kwesịrị ịmụrụ anya.”

“A Zụrụ Unu Maka Ọrụ Dị n’Ihu.” Nke a bụ isiokwu ọzọ e kwuru n’ememme ahụ. O si na 1 Pita 5:10. Ọ bụ Nwanna Mark Noumair kwuru ya. Nwanna Noumair bụ otu n’ime ndị nkụzi n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Mgbe o bidoro okwu ya, ọ jụrụ ụmụ akwụkwọ ahụ, sị: “Gịnị mere unu ji bịa Ụlọ Akwụkwọ Gilied n’agbanyeghị na unu ejeerela Jehova ozi ọtụtụ afọ?” O ji aka ya zaa ajụjụ ahụ. Ọ sịrị: “Ọ bụ maka na unu bụ aka ochie n’ozi unu. N’ụlọ ọrụ ndị e nwere n’ụwa, ọtụtụ ndị ma nke a na-akọ n’ọrụ ha na-ewepụta oge gaa mụtakwuo ọrụ ka ha nwee ike ịna-emekwu nke ọma n’ọrụ ha. Kemgbe ọnwa ise unu bịara ụlọ akwụkwọ a, unu amụọla Okwu Jehova nke ọma, mụọkwa banyere nzukọ ya. Jehova si otú a mee ka okwukwe unu ‘sikwuo ike’ ka unu nwee ike ịrụ nnukwu ọrụ ndị a ga-enye unu. Nnukwu osisi ndị ji ụlọ kwesịrị ịkwụ chịm, siekwa ezigbo ike ka ụlọ ghara ịda. Ọ bụ mgbe unu na ụmụnna unu rụkọwara ọrụ ka a ga-achọpụta uru ihe ndị a kụziiri unu bara. Ajụjụ bụzi, mgbe nsogbu ga-abịara unu, ùnu ga-akwụsị ime ihe Chineke chọrọ, ka ùnu ga-akwụsi ike ma na-eme ihe unu mụtara n’Okwu Chineke? Osisi na-esighị ike enweghị ike ijide ụlọ. Ọ bụ otú osisi dị n’ime ka e ji amata ma ò siri ike ma ọ bụ na o sighị ike. Otú ahụ ka ọ dịkwa unu. Ihe ga-eme ka unu sie ike n’okwukwe bụ ihe dị unu n’ime. Jehova kpọtara unu ebe a ka o mee ka unu gbasie ike, meekwa ka unu nwee ike ịrụ ọrụ ndị a ga-enye unu ma rụọ ha nke ọma. Chineke emeela òkè nke ya. Anyị na-arịọzi Chineke ka o nyere unu aka ka unu mee òkè nke unu ma kwe ka ‘Onye Ozizi Ukwu’ unu nyezie unu ọzụzụ fọdụrụ.”

Ajụjụ Ọnụ na Ihe Ndị Mere n’Ozi Ọma

Mgbe ọ bụla a na-eme ememme ngụcha akwụkwọ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied, ọ na-atọ ndị mmadụ ụtọ ịnụ ihe ụmụ akwụkwọ ga-ekwu mgbe a na-agba ha ajụjụ ọnụ nakwa ịnụ ihe ndị mere mgbe ụmụ akwụkwọ na-ekwusa ozi ọma. N’ememme ngụcha akwụkwọ a, ụmụ akwụkwọ a gosiri otú ihe ụfọdụ ndị mere n’oge ha gara ikwusa ozi ọma si mee. Dị ka ihe atụ, otu di na nwunye bụ́ ndị Frans kọrọ ihe mere mgbe ha nọ n’ọdụ ụgbọelu na-eche ụgbọelu ga-ebuga ha Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ha nọrọ awa isii n’ọdụ ụgbọelu ahụ. Ka ha nọ n’ebe a na-eri nri n’ọdụ ụgbọelu ahụ, ha gwawara ụmụ nwoke abụọ ndị nọkwa na-eche ụgbọelu okwu. Mgbe otu n’ime ụmụ nwoke ahụ kwuru na ya bụ onye Malawi, di na nwunye ahụ malitere ịgwa ya okwu n’asụsụ Chichewa. O juru nwoke ahụ anya, ya ajụọ ha otú ha si mụta asụsụ ya. Ha gwara ya na ha na-ekwusa ozi ọma na Malawi. Mgbe nwoke nke ọzọ ahụ kwuru na ya bụ onye Kameruun, di na nwunye ahụ gwawaziri ya okwu n’asụsụ French. O jukwara nwoke ahụ anya. Ụmụ nwoke abụọ ahụ kwuziri na ha na-ekpupụrụ Ndịàmà Jehova okpu, di na nwunye ahụ zikwara ha ozi ọma.

Nwanna Nicholas Ahladis, bụ́ onye na-arụ ọrụ ná Ngalaba Na-enyere Ndị Nsụgharị Aka, gbara di na nwunye abụọ ajụjụ ọnụ. Otu di na nwunye si Ọstrelia gaa ikwusa ozi ọma ná mba a na-akpọ Ist Timọ. Di na nwunye nke ọzọ si Korea gawa ije ozi na Họng Kọng. Ọ na-agụsi di na nwunye abụọ ahụ agụụ ike ịlaghachi n’ebe ha na-eje ozi ka ha gaa mee ihe ndị a kụziiri ha n’ụlọ akwụkwọ a.

Ihe ikpeazụ e mere n’ememme ngụcha akwụkwọ a bụ inye ụmụ akwụkwọ ahụ diplọma. Mgbe e nyechara ha diplọma, otu n’ime ụmụ akwụkwọ ahụ gụrụ akwụkwọ ozi ha ji gosi na obi dị ha ụtọ maka ihe a kụziiri ha. Mgbe a gụchara akwụkwọ ozi ahụ, Nwanna Lösch kwuru okwu ụfọdụ magburu onwe ha o ji mechie ememme ahụ. O kwuru na eziokwu mara ezigbo mma ka eke na egwurugwu, na ọ dị ka mmiri nke dị n’ọzara, dịrịkwa ka ígwè nke na-ejide ụgbọ mmiri mgbe oké ifufe na-efe n’oké osimiri. Nwanna Lösch gwaziri ụmụ akwụkwọ ahụ, sị: “Anyị kwesịrị ikele Chineke maka na o mere ka anyị mụta eziokwu. N’ihi ya, na-agbachiterenụ eziokwu, na-enyekwaranụ ndị ọzọ aka ka ha na-agbachitere eziokwu.”

[Chaatị/Map dị na peeji nke 31]

IHE BANYERE KLAS AHỤ

Mba ole ha si 12

Nkezi afọ ndụ ha 36

Nkezi afọ ole ha nọrọla kemgbe e mere ha baptizim 20

Nkezi afọ ole ha kwusarala ozi ọma oge niile 15

[Map]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

E zigara ha mba ndị e depụtara n’okpuru ebe a:

EBE NDỊ E ZIGARA HA

BELIIZ

BENIN

KAMBODIA

KAMERUUN

KEP VAD

KOT DEVỤA

DỌMINIKAN RIPỌBLIK

IST TIMỌ

EKWEDỌỌ

GABỌN

JỌJIA

GINI

HỌNG KỌNG

LAỊBERỊA

MADAGASKA

MALAWI

PERUU

SAMOA

SAO TOMEE NA PRỊNSIPE

AMERỊKA

ZIMBABWE

[Foto dị na peeji nke 31]

Ndị Gụchara Akwụkwọ na Klas nke Otu Narị na Iri Atọ na Abụọ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied

N’aha ndị e dere n’okpuru ebe a, ahịrị nke ọ bụla nwere nọmba malite n’ihu gaa n’azụ. N’ahịrị nke ọ bụla, aha ha si n’aka ekpe gaa n’aka nri.

(1) Iap, R.; Iap, J.; Ng, T.; Ng, P.; Laurino, F.; Laurino, B.; Won, S.; Won, S.

(2) Morales, N.; Morales, M.; Zanutto, J.; Zanutto, M.; Rumph, I.; Rumph, J.; Germain, D.; Germain, N.

(3) Atchadé, Y.; Atchadé, Y.; Thomas, C.; Thomas, E.; Estigène, C.; Estigène, P.

(4) Ehrman, D.; Ehrman, A.; Bray, J.; Bray, A.; Amorim, M.; Amorim, D.; Seo, Y.; Seo, Y.

(5) Simon, J.; Simon, C.; Seale, C.; Seale, D.; Erickson, J.; Erickson, R.

(6) McCluskey, D.; McCluskey, T.; Brown, A.; Brown, V.; Mariano, D.; Mariano, C.; Loyola, Y.; Loyola, C.

(7) Rutgers, P.; Rutgers, N.; Foucault, P.; Foucault, C.; Wunjah, J.; Wunjah, E.