Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere O Ji Dị Mkpa Ka I Nwee Mmasị n’Ọrụ Ebube?

Gịnị Mere O Ji Dị Mkpa Ka I Nwee Mmasị n’Ọrụ Ebube?

Gịnị Mere O Ji Dị Mkpa Ka I Nwee Mmasị n’Ọrụ Ebube?

“Ọrụ ebube adabaghị n’ihe ndị sayensị na-akụzi.” —RICHARD DAWKINS, ỌKACHAMARA NKE NA-AHỤBU MAKA ỊKỌWARA ỌHANEZE IHE NDỊ SAYENSỊ CHỌPỤTARA.

“Mmadụ ikwere n’ọrụ ebube abụghị ihe ọjọọ. Kama ikwu na ọ bụ ọrụ ebube mere ndị mmadụ ji ekwere na Chineke, anyị kwesịrị ịghọta na ọ bụ ihe Chineke ji egosi anyị na ọ hụrụ ihe ndị o kere eke n’anya, nakwa na aka ya ka dị n’ihe ndị o kere eke.” —ROBERT A. LARMER, ỌKACHAMARA NKE NA-AKỤZI NKÀ IHE ỌMỤMA.

“Ì KWEERE n’ọrụ ebube?” Ihe ndị a ndị ọkachamara kwuru gosiri na e nwere ndị kweere n’ọrụ ebube, nweekwa ndị na-ekweghị. Oleekwanụ maka gịnwa? Ì kweere n’ọrụ ebube?

O nwere ike isitụrụ gị ike ikwu na i kweere n’ọrụ ebube. I nwere ike ichewe na ọ bụrụ na ị sị na i kweere n’ọrụ ebube na a ga-elewe gị anya ka onye na-agụghị akwụkwọ. E nwekwara ọtụtụ ndị ọ dị otú ahụ.

Ma, o nwere ike ịbụ na i kwenyesiri ike na ọrụ ebube na-eme eme n’eziokwu. O nwere ike ịbụ na i kweere na ọrụ ebube ndị a kọrọ na Baịbụl mere eme, dị ka mgbe Mozis mere ka Oké Osimiri Uhie kewaa abụọ. Ọ ga-abụkwa na i kweere na ọrụ ebube na-eme n’oge a. Otu nchọpụta e mere n’oge na-adịbeghị anya gosiri na “ọtụtụ ndị bi ná mba ndị dị ka Amerịka, Briten, Jamanị, na Frans ka kweere n’ọrụ ebube. Dị ka ihe atụ, ihe dị ka mmadụ atọ n’ime mmadụ anọ ọ bụla n’Amerịka kweere n’ọrụ ebube, ebe ihe dị ka mmadụ abụọ n’ime mmadụ ise ọ bụla na Briten kwekwaara otu ihe ahụ.” (Akwụkwọ bụ́ The Cambridge Companion to Miracles, nke Graham H. Twelftree dezigharịrị) Ma, ọ bụghị naanị Ndị Kraịst kweere n’ọrụ ebube. Akwụkwọ bụ́ Britannica Encyclopedia of World Religions kwuru na “ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na e nweghị ndị okpukpe” na-ekweghị n’ọrụ ebube.

O nwekwara ike ịbụ na i so ná ndị ọ na-abụ a jụọ ha ma hà kweere n’ọrụ ebube, ha asị: “Amaghị m, achọkwanụghị ịma! Ọrụ ebube anaghị eme ná ndụ m!” Ma, gịnị mere o ji dị mkpa ka i nwee mmasị n’okwu gbasara ọrụ ebube?

Chebagodịrị ihe atụ a echiche: Weregodị ya na ị na-arịa ọrịa na-enweghị ngwọta. Otu ụbọchị, gị agụta n’akwụkwọ na e nwere ọgwụ ọhụrụ e mepụtara nke nwere ike ịgwọ gị. Ọ̀ bụ na ị gaghị ewepụta oge chọpụta ma ihe ahụ ị gụtara ọ̀ bụ eziokwu? Baịbụl kwuru na ọrụ ebube ndị ga-atụ ndị mmadụ n’anya ga-eme n’oge na-adịghị anya. Ọrụ ebube ndị ahụ ga-abara ọtụtụ ndị nọ n’ụwa a uru. Ọ̀ bụ na ọ gaghị adị mma ka i wepụta oge chọpụta ma ihe ahụ Baịbụl kwuru ò nwere ike ime eme?

Ma, tupu anyị eleba anya n’ọrụ ebube ndị ahụ ga-eme n’ụwa, ka anyị burugodị ụzọ hụ ihe atọ ndị mmadụ na-ekwukarị banyere ọrụ ebube.

[Igbe dị na peeji nke 3]

GỊNỊ BỤ ỌRỤ EBUBE?

Ọ bụ ihe ọ bụla nke na-anaghị anọkata mee n’onwe ya, nke karịkwara ike mmadụ.