Samuel nke Mbụ 30:1-31

  • Ndị Amalek lụsoro ndị bi na Ziklag agha, gbaakwa ya ọkụ (1-6)

    • Obi siri Devid ike maka na ọ tụkwasịrị Chineke obi (6)

  • Devid meriri ndị Amalek (7-31)

    • Devid napụtara ndị Amalek ndị niile ha kpụụrụ (18, 19)

    • Otú Devid kwuru ka e si kee ihe ndị ha lụtara n’agha (23, 24)

30  Mgbe Devid na ndị so ya na-alọrutela Ziklag+ n’ụbọchị nke atọ, ndị Amalek+ agaala lụso ebe ndịda* nakwa Ziklag agha ma gbaa Ziklag ọkụ.  Ha dọọrọ ụmụ nwaanyị+ na ndị niile bi na ya n’agha, ma onye ukwu ma onye nta. O nweghị onye ha gburu, kama ha kpụụrụ ha lawa.  Mgbe Devid na ndị so ya lọrutere n’obodo ahụ, ha hụrụ na a gbaala ya ọkụ, dọrọkwa ndị nwunye ha na ụmụ ha ndị nwoke na ụmụ ha ndị nwaanyị n’agha.  Devid na ndị ya na ha so wee malite ibe ákwá, na-ebesikwa ya ike ruo mgbe ike ibe ákwá na-adịghịzi ha.  A dọkwaara ndị nwunye Devid abụọ n’agha. Otu bụ Ahịnoam nwaanyị Jezril, nke ọzọ abụrụ Abigel, onye Kamel,+ onye bụ́bu nwunye Nebal.  Ihe a gbawara Devid obi, n’ihi na mmadụ* niile nọ na-asị ka a tụọ ya nkume, maka na ezigbo iwe ji ha niile n’ihi ụmụ ha ndị nwoke na ụmụ ha ndị nwaanyị a kpụụrụ. Ma, Devid tụkwasịrị Jehova bụ́ Chineke ya obi, ya emesie ya obi ike.+  Devid wee sị Abayata+ onye nchụàjà, nwa Ahimelek: “Biko, chịtara m efọd ebe a.”+ Abayata wee chịtara Devid efọd ahụ.  Devid wee jụọ Jehova ase,+ sị: “Ọ̀ bụ m chụwa ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga a? M̀ ga-achụkwute ha?” Ya asị: “Chụwa ha, n’ihi na ị ga-achụkwute ha. Ị ga-anapụtakwa ha ihe niile ha weere.”+  Ozugbo ahụ, Devid na narị ụmụ nwoke isii (600)+ ya na ha so chụụrụ ha gawa ruo na Ndagwurugwu* Bisọ, ebe ụfọdụ n’ime ha kwụsịrị. 10  Devid na narị ụmụ nwoke anọ (400) chụụrụ ha na-aga. Ma narị ụmụ nwoke abụọ (200) kwụsịrị na Ndagwurugwu Bisọ n’ihi na ezigbo ike gwụrụ ha nke na ha enweghị ike ịgafe ebe ahụ.+ 11  Ka ha chụ ndị ahụ na-aga, ha hụrụ otu nwoke onye Ijipt n’ọhịa ma kpọgara ya Devid. Ha nyere ya nri ya erie, nyekwa ya mmiri, ya aṅụọ. 12  Ha nyekwara ya otu keeki e ji naanị mkpụrụ fig mee na keeki abụọ e ji mkpụrụ vaịn kpọrọ nkụ mee. O nwetakwara ume mgbe o richara ihe. Kemgbe ụbọchị atọ, o ribeghị nri ma ọ bụ ṅụọ mmiri, ehihie na abalị. 13  Devid wee jụọ ya, sị: “Ị̀ bụ ohu onye? Oleekwa ebe i si?” Ya asị: “Abụ m onye Ijipt, ohu otu nwoke onye Amalek. Ma nna m ukwu hapụrụ m maka na m rịawara ọrịa ụbọchị atọ gara aga. 14  Anyị gara agha n’ebe ndịda obodo ndị Keretaịt,+ nakwa n’ala ndị Juda nakwa n’ebe ndịda Keleb.+ Anyị gbakwara Ziklag ọkụ.” 15  Devid asị ya: “Ị̀ ga-eduga m ebe ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga ahụ nọ?” Ya asị: “Ọ bụrụ na i jiri Chineke ṅụọrọ m iyi na ị gaghị egbu m, nakwa na ị gaghị enyefe m n’aka nna m ukwu, m ga-eduga gị ebe ha nọ.” 16  O wee duru ya gaa ebe ha gbasara onwe ha n’ala ahụ niile, na-eri, na-aṅụ, na-ekporikwa ndụ n’ihi ọtụtụ ihe ha kwatara n’ala ndị Filistia nakwa n’ala Juda. 17  Devid wee gbuwe ha malite n’isi ụtụtụ ruo ná mgbede. O nweghịkwa nwoke ọ bụla n’ime ha gbapụrụ+ ma e wezụga narị ụmụ nwoke anọ (400) ndị ji kamel gbaa ọsọ. 18  Devid napụtakwara ndị Amalek ihe niile ha buuru,+ napụtakwa ha ndị nwunye ya abụọ. 19  Ọ dịghịkwa ihe ha ọ bụla ha na-ewetaghị, ma ihe ukwu ma ihe nta. Ha napụtakwara ha ụmụ ha ndị nwoke na ụmụ ha ndị nwaanyị ha kpụụrụ, nakwa ihe ndị ha weere.+ Devid napụtara ha ihe ndị ahụ niile. 20  Devid wee kpụrụ ewu na atụrụ na ehi niile, ndị agha ya achịrị ha na-aga n’ihu anụ ụlọ ndị nke ha. Ha wee sị: “Ihe a bụ ihe Devid lụtara n’agha.” 21  Devid mechara gakwuru narị ụmụ nwoke abụọ (200) ahụ kwụsịrị iso ya maka na ezigbo ike gwụrụ ha, nke mere ka ha nọdụ n’akụkụ Ndagwurugwu Bisọ.+ Ha pụtara izute Devid na ndị ya na ha so. Mgbe Devid ruru ebe ha nọ, ọ jụrụ ha otú ha mere. 22  Ma, ndị ọjọọ niile, ndị na-abaghị uru ọ bụla n’ime ndị ha na Devid so, sịrị: “Ebe ọ bụ na ha kwụsịrị iso anyị, anyị agaghị enye ha ihe ọ bụla n’ihe anyị napụtara ndị ahụ, ma e wezụga ịkpọnye onye nke ọ bụla nwunye ya na ụmụ ya, ka ha kpọrọ lawa.” 23  Ma Devid sịrị ha: “Ụmụnne m, unu esila otú a eme ihe Jehova nyere anyị. O chebere anyị, nyekwara anyị aka anyị emerie ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga nke lụsoro anyị agha.+ 24  Ònye ga-ekweta ihe a unu na-ekwu? Ihe onye gara agha ga-eketa ga-aha ka ihe onye nọ na-elekọta ibu anyị ga-eketa.+ Mmadụ niile ga-eketa ihe.”+ 25  Malite n’ụbọchị ahụ gawa, ihe a o kwuru ghọrọ iwu, bụrụkwa ihe a na-eme n’Izrel ruo taa. 26  Mgbe Devid laruru Ziklag, o zigaara ndị okenye Juda, bụ́ ndị enyi ya, ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ ha kwatara, sị: “Naranụ onyinye a.* Ọ bụ ihe a kwatara n’aka ndị iro Jehova.” 27  Ndị ọzọ o zigaara onyinye bụ ndị nọ na Betel,+ ndị nọ na Remọt dị na Negeb,* ndị nọ na Jatia,+ 28  ndị nọ n’Aroa, ndị nọ na Sifmọt, ndị nọ n’Eshtemoa,+ 29  ndị nọ na Rekal, ndị nọ n’obodo niile nke ndị Jeramiel,+ ndị nọ n’obodo niile nke ndị Kenaịt,+ 30  ndị nọ na Họma,+ ndị nọ na Bọrashan, ndị nọ n’Etak, 31  ndị nọ na Hebrọn,+ nakwa ndị nọ ebe niile Devid na ndị na-eso ya na-agakarị.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, ebe ndịda Juda.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Hibru, “ngọzi a.”
Ma ọ bụ “n’ebe ndịda.”