Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Dị Njọ n’Ime Mgbaasị?

Gịnị Dị Njọ n’Ime Mgbaasị?

Gịnị Dị Njọ n’Ime Mgbaasị?

Barbara * malitere mgbe ọ bụ nwata na-ahụ ọhụụ ma na-anụ olu dị iche iche. Nke ahụ mere ka o chewe na ọ bụ ndị ikwu ya nwụrụ anwụ ka ọ na-anụ olu ha. Ya na di ya, bụ́ Joachim, gụrụ akwụkwọ ndị na-akọ banyere mgbaasị, ha amụtazie otú e si eji kaadị mgbaasị amata ihe ga-eme n’ọdịnihu. Kaadị ndị ahụ gwara ha na ha ga-akpata ezigbo ego. Ha mechara kpata ego ahụ n’ahịa ha na-azụ. Otu ụbọchị, kaadị ahụ gwara ha na ndị ọjọọ ga-abịa n’ụlọ ha, gwakwa ha ihe ha ga-eme ka ihe ọ bụla ghara ime ha.

Ọ BỤ eziokwu na ime mgbaasị nwere ike iyi ihe mgbe ochie, ọtụtụ ndị n’ebe dị iche iche ka na-eme ya. Ndị mmadụ n’ebe dị iche iche n’ụwa na-eyi ọtụmọkpọ, na-eji bọọdụ e ji agba afa eme mgbaasị, ma na-agakwuru ndị na-ajụ ndị mmụọ ase ka ha mata ihe ga-eme n’ọdịnihu ma ọ bụ ka ha chebe onwe ha ka ihe ọjọọ ghara ime ha. Otu isiokwu gbara n’otu magazin ndị Jamanị kwuru, sị: “Ịntanet emeela ka ime mgbaasị na-ewu ewu.”

Ị̀ ma na Baịbụl kwuru banyere ime mgbaasị? Ihe o kwuru nwekwara ike iju gị anya.

Ihe Baịbụl Kwuru Banyere Ime Mgbaasị

Iwu Chineke nyere ndị ya, bụ́ mba Izrel oge ochie, kwuru, sị: “A gaghị ahụ n’etiti unu. . . onye ọ bụla nke na-agba afa, onye na-eme anwansi ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-achọ ihe mgbaàmà ọdịnihu ma ọ bụ dibịa anwansi, ma ọ bụ onye na-akọ ndị ọzọ ọgwụ ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ onye na-agba afa ase ma ọ bụ onye ọrụ ya bụ ịkọ ọdịnihu ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ase. N’ihi na onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ ihe arụ n’anya Jehova.” (Diuterọnọmi 18:10-12) Gịnị mere Chineke ji kwusie ike na ime mgbaasị adịghị mma?

Ihe anyị kọrọ ná mmalite isiokwu a gosiri na ọtụtụ ndị kweere na ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ nwere ike ịkparịta ụka nakwa na ọ bụ ndị nwụrụ anwụ na-esi n’aka ndị na-eme mgbaasị ezitere ndị mmadụ ozi. Ihe mere ọtụtụ ndị ji kwere ihe ndị a bụ n’ihi ihe a na-akụzi n’ọtụtụ okpukpe. Ọtụtụ okpukpe na-akụzi na o nwere ebe ndị mmadụ na-aga biri ma ha nwụọ. Ma ihe Baịbụl kwuru dị iche n’ihe ahụ ha na-akụzi. Baịbụl kwuru hoo haa, sị: “Ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” (Ekliziastis 9:5) Baịbụl ji ndị nwụrụ anwụ tụnyere ndị nọ n’oké ụra, bụ́ ndị na-amaghị ihe na-emenụ. * (Matiu 9:18, 24; Jọn 11:11-14) Ebe Baịbụl kwuru otú ahụ, mmadụ nwere ike ịjụ, sị, Gịnịzi mere ndị mmadụ ji asị na ha na ndị nwụrụ anwụ na-ekwurịta okwu? Ole ndị ka ha na ha na-ekwurịta okwu ahụ?

Ịgwa Ndị Bụ́ Mmụọ Okwu

Ihe e dere n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk na Jọn gosiri na mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ya na ndị bụ́ mmụọ kwurịtara okwu. Mak 1:23, 24 kọrọ na “mmụọ na-adịghị ọcha” gwara Jizọs, sị: “Amaara m kpọmkwem onye ị bụ.” O doro anya na ndị bụ́ mmụọ makwaara gịnwa nke ọma. Ma, ị̀ maara ndị ha bụ?

Tupu Chineke ekee ndị mmadụ, o kere ọtụtụ ndị bụ́ mmụọ, ya bụ, ndị mmụọ ozi. (Job 38:4-7) Ndị mmụọ ozi na ụmụ mmadụ ahaghị, ha ka ụmụ mmadụ. (Ndị Hibru 2:6, 7) Ha dị ike, marakwa ihe nke ukwuu, e kekwara ha ka ha na-eme uche Chineke. Otu ọbụ abụ bụrụ abụ, sị: “Gọzienụ Jehova, unu ndị mmụọ ozi ya, ndị dị ike nke ukwuu, ndị na-eme ihe o kwuru.”—Abụ Ọma 103:20.

Baịbụl gosiri anyị na ụfọdụ ndị mmụọ ozi nọkatara gakwuru ndị mmadụ mgbe Chineke na-agwaghị ha mee otú ahụ. Gịnị mere ha ji gakwuru ha? Mmụọ ozi mbụ mere otú ahụ ji aghụghọ mee ka nwoke na nwaanyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, nupụrụ Chineke bụ́ Onye kere ha isi. Ihe a mmụọ ozi ahụ mere mere ka ọ ghọọ Setan bụ́ Ekwensu, ya bụ, onye na-ekwutọ Chineke na onye na-emegide Chineke.—Jenesis 3:1-6.

Ndị mmụọ ozi ndị ọzọ mechara ‘hapụ ebe obibi ha kwesịrị ekwesị’ n’eluigwe ma ghọọ ụmụ mmadụ. Ha kpọkwaara ụmụ nwaanyị mara mma ka ha na ha biri n’ụwa. (Jud 6; Jenesis 6:1, 2) Ndị mmụọ ozi ahụ, bụ́ ndị nupụụrụ Chineke isi, na ụmụ ha ndị a kpọrọ ndị Nefilim mekpọrọ ndị mmadụ ọnụ nke ukwuu nke na ụwa ‘jupụtara n’ime ihe ike.’ O nwere ike ịbụ na ị maara ihe Baịbụl kwuru banyere otú Chineke si jiri Iju Mmiri e nwere n’oge Noa bibie ndị ajọ omume ahụ na-eme ihe ike.—Jenesis 6:3, 4, 11-13.

Mgbe Iju Mmiri ahụ bịara, ndị mmụọ ozi ahụ ghọghachiri mmụọ ma laghachi n’eluigwe. Ma, Chineke ekweghị ka ha laghachi ‘n’ebe obibi ha.’ Kama nke ahụ, Chineke wedara ha ala, ya bụ, mee ka ha ghara ịnọ n’ọnọdụ ọma ha nọbu. E ji ọnọdụ a Chineke debere ha tụnyere “olulu nke oké ọchịchịrị.” (2 Pita 2:4, 5) Baịbụl kpọrọ ndị mmụọ ozi ahụ nupụụrụ Chineke isi “ndị mmụọ ọjọọ.” (Jems 2:19) Ọ bụ ha na-eme ka ndị mmadụ na-eme mgbaasị.

Ihe Ndị Mmụọ Ọjọọ Chọrọ

Ihe mbụ mere ndị mmụọ ọjọọ ji agwa ndị mmadụ okwu bụ ka ha mee ka ndị mmadụ ghara ife ezi Chineke, bụ́ Jehova. Ndị na-eme mgbaasị na-eji ike ha sịrị na ha nwere emegharị ndị mmadụ anya ka ha ghara ịmụta eziokwu banyere Chineke nakwa ka ha na Chineke ghara ịdị ná mma.

Ihe Setan, bụ́ onye ndú ndị mmụọ ọjọọ, kwuru mgbe ọ na-anwa Jizọs ọnwụnwa nwere ike ime ka anyị ghọta ihe nke abụọ mere ndị mmụọ ọjọọ ji agwa ndị mmadụ okwu. Setan gwara Jizọs na ya ga-enye ya “alaeze niile nke ụwa na ebube ha.” Olee ihe Setan chọrọ ka Jizọs mee ka o wee nye ya ihe ndị ahụ? Setan chọrọ ka Jizọs “daa n’ala fee ya ofufe.” N’eziokwu, ihe Setan na ndị mmụọ ọjọọ chọrọ bụ ka e fewe ha ofufe. Ma, Jizọs jụrụ ife Setan ofufe, ọ chọghịkwa ịhapụ Chineke nakwa ofufe ya.—Matiu 4:8-10.

N’oge anyị a, ndị mmụọ ọjọọ anachaghị agwa ndị mmadụ ka ha fee ha ofufe otú ahụ Ekwensu gwara Jizọs ihu na ihu ka o fee ya. Kama, ihe ha na-eme bụ iji ihe ndị e chere na ha adịchaghị njọ na-emegharị ndị na-amaghị nke a na-akọ anya. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ bụ ugegbe e ji ama ihe ga-eme n’ọdịnihu, ịgụ kpakpando, na ịgụ akara aka. Ekwela ka ha jiri ihe ndị ahụ megharịa gị anya! Ihe ndị ahụ abụghị otú mmadụ kwesịrị isi mata ihe ọ na-agaghị amatali n’onwe ya. Ndị mmụọ ọjọọ na-eme ka ime mgbaasị na-atọ ndị mmadụ ụtọ. Ha na-eji ya arata ndị mmadụ ma mee ka ha ghara ife Jehova. Ọ bụrụ na ha emelighị ka ndị ahụ ghara ife Jehova, ihe ha na-emekarị bụ imenyewe ndị ahụ ụjọ ma mesiwe ha ike ka ha ghara ịhapụ ime mgbaasị. Ọ bụrụ na ụdị ihe a na-eme gị, olee ihe i nwere ike ime ka ha hapụ gị aka?

Otú Ị Ga-esi Kwụsị Ime Mgbaasị

N’eziokwu, ndị mmụọ ọjọọ, bụ́ ndị na-agwa ụmụ mmadụ okwu, bụ ndị iro Chineke. Chineke ga-ebibi ha n’oge na-adịghị anya. (Jud 6) Ha bụ ndị aghụghọ, bụrụkwa ndị ụgha. Ọ bụ ha na-eme ka hà bụ ndị nwụrụ anwụ. Olee otú obi ga-adị gị ma ị chọpụta na onye sịrị na ya bụ enyi gị bụ onye aghụghọ nke chọrọ imebiri gị ihe? Oleekwa otú obi ga-adị gị ma ị chọpụta na onye gị na ya na-akpa n’Ịntanet bụ onye na-edina mmadụ n’ike? Mmadụ na ndị mmụọ ọjọọ imekọ ihe kadị ihe ndị a njọ. I kwesịrị ime ihe niile i nwere ike ime ka gị na ha kwụsị imekọ ihe. Gịnị ka i nwere ike ime?

Mgbe ụfọdụ ndị n’Efesọs oge ochie mụtara ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ime mgbaasị, ha gbara akwụkwọ ndị ha ji eme mgbaasị ọkụ, n’agbanyeghị na akwụkwọ ndị ahụ dị oké ọnụ. Baịbụl kwuru na ha ‘kpọrọ ha ọkụ n’ihu mmadụ niile.’ (Ọrụ 19:19, 20) Taa, ọ bụghị naanị akwụkwọ, ọtụmọkpọ, bọọdụ e ji agba afa, na ihe ndị yiri ya ka e ji eme mgbaasị. Ihe ndị mmadụ nwere ike ile na fim, tiivi, Ịntanet ma ọ bụkwanụ n’ekwe ntị sokwa na ha. Gbaara ihe ọ bụla nwere ike ime ka i mee mgbaasị ọsọ.

Ì chetara Joachim na Barbara bụ́ di na nwunye ahụ anyị kwuru okwu ha ná mmalite isiokwu a? Mgbe ha lechara kaadị mgbaasị ha, ha sịrị na e nwere ndị ọjọọ ga-abịa n’ụlọ ha, nakwa na ha ekwesịghị ige ha ntị ma ọ bụkwanụ nata ha ihe ọ bụla. Ma, mgbe Ndịàmà Jehova abụọ, bụ́ Connie na Gudrun, gara n’ụlọ di na nwunye ahụ ma gwa ha na ha bịara izi ha ozi ọma, di na nwunye ahụ kpebiri ige ha ntị. Ka ha na-akparịta ụka, ha kwutere okwu mgbaasị, Connie na Gudrun ejiri Akwụkwọ Nsọ gwa ha nke bụ́ eziokwu banyere ime mgbaasị. Ha sizi otú ahụ bido ịmụchi Baịbụl anya.

Mgbe obere oge gafere, Joachim na Barbara kpebiri na ha achọghịzi ka e nwee ihe ọ bụla ga-ejikọ ha na ndị mmụọ ọjọọ. Ndịàmà Jehova ahụ gwara ha na obi agaghị adị ndị mmụọ ọjọọ ahụ mma. N’eziokwu, ndị mmụọ ọjọọ ahụ mesiri Joachim na Barbara ike, menyekwa ha ụjọ. Ndị mmụọ ọjọọ ahụ menyegidere ha ụjọ kwa abalị ruo mgbe ha gara biri n’ụlọ ọzọ. N’oge niile ndị mmụọ ọjọọ mesiri di na nwunye ahụ ike, ihe e dere ná Ndị Filipaị 4:13 mere ka obi sie ha ike. Ebe ahụ sịrị: “N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ nke na-enye m ike.” Jehova gọziri mgbalị ha, ndị mmụọ ọjọọ ahụ mechakwara kwụsị inye ha nsogbu. Taa, Joachim na Barbara ji obi ụtọ na-efe ezi Chineke, bụ́ Jehova.

Akwụkwọ Nsọ gwara ndị niile chọrọ ka Jehova gọzie ha, sị: “Doonụ onwe unu n’okpuru Chineke; ma na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ. Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:7, 8) Ọ bụrụ na ị chọrọ, Jehova Chineke ga-enyeliri gị aka ka ndị mmụọ ọjọọ kwụsị inye gị nsogbu. Mgbe Joachim na Barbara chetara otú Chineke si nyere ha aka ka ha kwụsị ime mgbaasị, ha ji obi ha niile kweta ihe Baịbụl kwuru n’Abụ Ọma 121:2. Ebe ahụ sịrị: “Enyemaka m ga-esi n’aka Jehova bịa.”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 7 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ ebe a kọwakwuru ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ, gụọ isiokwu bụ́ “Ebee Ka Ndị Nwụrụ Anwụ Gara?” n’isi nke 6 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 21]

Ime mgbaasị na-eme ka ndị mmadụ na Chineke ghara ịdị ná mma

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 22]

“Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”—JEMS 4:8