Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Niile Na-asị na Ha Bụ Ndị Kraịst Hà Bụ Ndị Kraịst n’Eziokwu?

Ndị Niile Na-asị na Ha Bụ Ndị Kraịst Hà Bụ Ndị Kraịst n’Eziokwu?

Ndị Niile Na-asị na Ha Bụ Ndị Kraịst Hà Bụ Ndị Kraịst n’Eziokwu?

NDỊ KRAỊST e nwere n’ụwa hà dị ole? N’afọ 2010, akwụkwọ bụ́ Atlas of Global Christianity kwuru na ọ fọrọ obere ka ha ruo ijeri mmadụ abụọ na nde atọ n’ụwa niile. Otu akwụkwọ ahụ kwukwara na ndị na-asị na ha bụ Ndị Kraịst nọ n’ihe karịrị puku chọọchị iri anọ na otu. Chọọchị nke ọ bụla nwere iwu nke ya, nke ọ bụla n’ime ha na-akụzikwa ihe dị iche n’ihe chọọchị ndị ọzọ na-akụzi. Ụfọdụ ndị amaghịzi chọọchị nke ha ga-eso eso n’ihi imirikiti chọọchị e nwere n’ụwa niile. Nke a emeekwala ka ike ịga chọọchị gwụ ụfọdụ ndị. Ha nwere ike ịna-ajụ, sị, ‘Ndị niile na-asị na ha bụ Ndị Kraịst hà bụ Ndị Kraịst n’eziokwu?’

Ka anyị leba anya n’ihe atụ ga-enyere anyị aka ịghọta okwu a nke ọma. Ọ bụrụ na mmadụ na-aga mba ọzọ, ya ruo ebe e si abanye ná mba ọ na-aga, ọ na-agwa ndị na-arụ ọrụ ebe ahụ onye ọ bụ na mba o si. Ma, ọ ga-egosikwa ha akwụkwọ ga-egosi na ihe ahụ o kwuru bụ eziokwu. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị ezigbo Ndị Kraịst. Ha ekwesịghị ịna-ekwu naanị n’ọnụ na ha bụ Ndị Kraịst. Ha kwesịrị inwe ihe ndị ọzọ ga-egosi na ha bụ ezigbo Ndị Kraịst. Gịnị bụ ihe ndị ahụ?

Ọ bụ n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ itoolu na iri asaa gara aga ka a malitere ịkpọ ndị na-efe Chineke “Ndị Kraịst.” Luk, bụ́ onye so dee Baịbụl, kwuru, sị: “Ọ bụkwa n’Antiọk ka e bu ụzọ site ná nduzi Chineke gụọ ndị na-eso ụzọ Jizọs aha bụ́ Ndị Kraịst.” (Ọrụ 11:26) Ị̀ hụrụ na ọ bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst ka a kpọrọ Ndị Kraịst? Gịnị ka e ji ama onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst? Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru, sị: “Mmadụ ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs pụtara na onye ahụ ji obi ya niile na-eso Jizọs . . . ná ndụ ya niile.” N’ihi ya, ezigbo Onye Kraịst bụ onye ji obi ya niile na-eme ihe niile Jizọs kụziri.

N’ime ndị niile na-asị na ha bụ Ndị Kraịst taa, è nwere ndị ji obi ha niile na-eme ihe niile Jizọs kụziri? Gịnị ka Jizọs kwuru e ji amata ndị bụ́ ezigbo ndị na-eso ụzọ ya? Anyị ga-achọ ka i leba anya n’otú Baịbụl si zaa ajụjụ ndị a. N’isiokwu ndị na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’ihe ise Jizọs kwuru e ji amata ndị bụ́ ezigbo ndị na-eso ụzọ ya. Anyị ga-achọpụta ma Ndị Kraịst oge mbụ hà mere ihe ndị ahụ Jizọs kwuru e ji amata ezigbo Ndị Kraịst. Anyị ga-achọpụtakwa ndị na-eme ihe ahụ Jizọs kwuru n’agbanyeghị na e nwere ọtụtụ ndị na-ekwu na ha bụ Ndị Kraịst taa.