Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ugbu A Bụ Oge Ịhọrọ Otú Ọdịnihu Gị Ga-adị

Ugbu A Bụ Oge Ịhọrọ Otú Ọdịnihu Gị Ga-adị

Ugbu A Bụ Oge Ịhọrọ Otú Ọdịnihu Gị Ga-adị

“Chineke wee kee mmadụ n’onyinyo ya, ọ bụ n’onyinyo Chineke ka o kere ya; nwoke na nwaanyị ka o kere ha.”—Jenesis 1:27.

OKWU ndị ahụ a ma ama ndị dị ná mbido Baịbụl gosiri otu n’ime ihe ndị kacha ebube Chineke ‘mere ka ọ maa mma n’oge ya,’ ya bụ, di na nwunye mbụ zuru okè O kere, bụ́ Adam na Iv. (Ekliziastis 3:11) Jehova Chineke, bụ́ Onye kere ha, gwara ha, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba ma jupụta ụwa, meekwanụ ka ọ dịrị n’okpuru unu, ka azụ̀ ndị dị n’oké osimiri na anụ ufe nke eluigwe na ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ nke na-agagharị n’elu ala nọrọkwa n’okpuru unu.”—Jenesis 1:28.

Chineke ji okwu ahụ ọ gwara nwoke mbụ na nwaanyị mbụ ahụ mee ka ha mara ihe o zubeere ha. Ha ga-amụ ọmụmụ ma lekọta ụwa, mee ka ọ ghọọ paradaịs ebe ha na ụmụ ha ga-ebi. E nweghị oge Chineke kara aka ha ga-adịru ndụ, o nweghịkwa mgbe ọ kara aka ha ga-anwụ. Kama nke ahụ, Chineke kwere ha nkwa otu ihe magburu onwe ya. Ọ bụrụ na ha ekpebie ime ihe dị mma, na-erubekwara Chineke isi, ha ga-ebi nnọọ n’udo ma nwee obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.

Ha họọrọ ime ihe na-adịghị mma, ọ bụ ya mere ụmụ mmadụ ji aka nká, na-anwụkwa anwụ. N’eziokwu, nna ochie bụ́ Job kwuru, sị: “Mmadụ nke nwaanyị mụrụ, ndụ ya na-adị mkpụmkpụ, jupụtakwa ná nsogbu.” (Job 14:1) Olee ebe mmiri si baa n’opi ụgbọgụrụ?

Baịbụl kọwara, sị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.” (Ndị Rom 5:12) “Otu mmadụ” ahụ bụ Adam, bụ́ onye kpachaara anya nupụrụ iwu doro anya Chineke nyere ya isi. (Jenesis 2:17) N’ihi ihe ahụ Adam ma ụma mee, ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs n’elu ụwa kwara ya. O mekwara ka ụmụ ya ghara inweta onyinye ahụ dị oké ọnụ ahịa, kama nke ahụ, o bufere ha mmehie na ọnwụ. O yiri ka ihe niile ò mebiela. Ma, ihe niile ò mebirinụ?

Oge A Ga-eme Ka Ihe Niile Dị Ọhụrụ

Mgbe ọtụtụ puku afọ gachara, ọbụ abụ, bụ́ Devid, si n’ike mmụọ nsọ dee, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) Iji mesie anyị obi ike na nkwa ahụ Chineke kwere n’Iden ga-emezu, Okwu Chineke gwara anyị ihe ọma ndị Chineke ga-eme n’oge na-adịghị anya, sị: “Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.” Chineke n’onwe ya ekwuzie, sị: “Lee! Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.”—Mkpughe 21:4, 5.

Ebe ọ bụ na e nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla, ajụjụ e kwesịziri ịjụ bụ, Olee mgbe Chineke ga-eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ, ka nkwa ọma ndị ahụ o kwere nwee ike imezu? Ndị na-ebipụta akwụkwọ a, bụ́ Ndịàmà Jehova, na-agbalị kemgbe ime ka ndị mmadụ mata na anyị bi n’oge Baịbụl kpọrọ ‘oge ikpeazụ’ nakwa na oge Chineke ‘ga-eme ka ihe niile dị ọhụrụ’ eruola nso. (2 Timoti 3:1) Anyị na-agba gị ume ka ị mụọ Baịbụl ma chọpụta ihe ndị dị ebube nwere ike iru gị aka n’ọdịnihu. Anyị na-agbakwa gị ume ka i mee ihe a Baịbụl kwuru, nke bụ́: “Chọọnụ Jehova ugbu a a pụrụ ịchọta ya. Kpọkuonụ ya ugbu a ọ nọ nso.” (Aịzaya 55:6) Ọ bụghị akara aka na-ekpebi ihe na-eme ná ndụ gị, kama nke ahụ, ọ dị n’aka gị ikpebi ma ị̀ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi!

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 8]

“Lee! Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ”