Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Eji Ihe Oyiyi Efe Ofufe?

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Eji Ihe Oyiyi Efe Ofufe?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Eji Ihe Oyiyi Efe Ofufe?

N’ụwa niile, ndị Hindu, ndị Buddha, ndị Katọlik, na ndị na-ekpe Chọọchị Ọtọdọks weere ihe oyiyi dị iche iche dị ka ihe dị mkpa n’ofufe ha. N’ebe ụfọdụ n’Africa, ndị mmadụ na-eji ihe e ji osisi pịa ma ọ bụ ihe e ji nkume tụọ efe ofufe n’ihi na ha kweere na e nwere chi ma ọ bụ mmụọ nọ n’ime ha.

Ma, Ndịàmà Jehova anaghị eji ụdị ihe oyiyi ọ bụla efe ofufe. Ọ bụrụ na ị gaa n’ebe ha na-amụ ihe, nke a na-akpọ Ụlọ Nzukọ Alaeze, ị gaghị ahụ ihe oyiyi nke ndị a sị na ha bụ ndị nsọ, ihe oyiyi Jizọs ma ọ bụkwanụ nke Meri. * Ọ̀ bụ maka gịnị? Legodị ihe Baịbụl kwuru banyere ya.

Gịnị Ka Chineke Gwara Ụmụ Izrel Ka Ha Mee?

Mgbe Jehova Chineke mechara ka ụmụ Izrel pụọ n’Ijipt, ọ gwara ha hoo haa otú ọ chọrọ ka ha si na-efe ya. Iwu nke abụọ n’ime iwu ahụ a na-akpọkarị Iwu Iri, sịrị: “Emerela onwe gị ihe oyiyi a pịrị apị ma ọ bụ ọdịdị nke yiri ihe ọ bụla dị n’eluigwe ma ọ bụ nke dị n’elu ụwa ma ọ bụ nke dị na mmiri n’okpuru ụwa. Akpọrọla ha isiala, ekwekwala ka a rata gị ife ha ofufe, n’ihi na mụ onwe m bụ́ Jehova Chineke gị bụ Chineke nke chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa.”—Ọpụpụ 20:4, 5.

N’oge Chineke nọ na-enye Mozis iwu ndị ahụ, ụmụ Izrel ji ọlaedo na-akpụ nwa ehi. Ọ ga-abụ ndị Ijipt, ndị na-efe ụmụ anụmanụ, ka ha nọ na-eṅomi. Ha akpọghị ihe oyiyi ahụ aha chi ndị Ijipt. Kama nke ahụ, ha weere ya na ọ bụ ihe ha ji efe Jehova ofufe. (Ọpụpụ 32:5, 6) Ma, gịnị ka Chineke mere? O wesoro ndị sọpụụrụ ihe oyiyi ahụ iwe dị ọkụ, Mozis kụrikwara ihe oyiyi ahụ.—Ọpụpụ 32:9, 10, 19, 20.

Mgbe e mechara, Jehova bụ́ Chineke tinyekwuru ihe n’iwu nke abụọ ahụ. O si n’ọnụ Mozis chetara ụmụ Izrel ka ha ghara imere onwe ha “ihe oyiyi a pịrị apị, ọdịdị nke ihe oyiyi ọ bụla, ihe yiri nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ihe yiri anụ ọhịa ọ bụla nke nọ n’ụwa, ihe yiri anụ ufe ọ bụla nke nwere nku nke na-efe n’eluigwe, ihe yiri ihe ọ bụla na-agagharị n’ala, ihe yiri azụ̀ ọ bụla nke nọ na mmiri n’okpuru ụwa.” (Diuterọnọmi 4:15-18) O doro anya na ụmụ Izrel ekwesịghị iji ụdị ihe oyiyi ọ bụla na-efe Chineke ofufe.

Ma, mba Izrel mechara kpewere arụsị. Iji gbazie ha, Jehova dunyere ndị amụma ya ka ha dọọ ha aka ná ntị na Ọ ga-ata ha ahụhụ maka arụsị ha na-ekpere. (Jeremaya 19:3-5; Emọs 2:8) Mba Izrel leghaara ịdọ aka ná ntị Chineke anya. N’ihi ya, n’afọ 607 tupu a mụọ Kraịst, Jehova kwere ka ndị Babịlọn bibie Jeruselem ma dọrọ mba ahụ n’agha.—2 Ihe E Mere 36:20, 21; Jeremaya 25:11, 12.

Olee Ihe Ndị Kraịst Oge Gboo Kweere?

Mgbe ndị na-abụghị ndị Juu ghọrọ Ndị Kraịst n’oge gboo, ha kwụsịrị iji ihe oyiyi na-efe Chineke. Legodị ihe Dimitriọs, onye na-eji ọlaọcha akpụ ihe oyiyi n’Efesọs, kwuru banyere ozi ọma Pọl onyeozi nọ na-ekwusa: “Unu maara nke ọma na ọ bụ ọrụ a na-eme ka anyị na-enwe ọganihu. Unu hụkwara ma nụ otú Pọl a si mee ka ìgwè mmadụ dị ukwuu kweta, meekwa ka ha nwee echiche dị iche, ọ bụghị naanị n’Efesọs kama n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ógbè Eshia dum, na-asị na chi ndị e ji aka mee abụghị chi.”—Ọrụ 19:25, 26.

Okwu Pọl gosiri na ihe Dimitriọs kwuru na Pọl mere bụ eziokwu. Mgbe Pọl na-agwa ndị Gris nọ n’Atens okwu, ọ sịrị: “Anyị ekwesịghị iche na Chineke yiri ọlaedo ma ọ bụ ọlaọcha ma ọ bụ nkume, dị ka ihe a kpụrụ akpụ site na nkà na nchepụta nke mmadụ. N’eziokwu, Chineke elefuruwo oge amaghị ihe dị otú ahụ anya, ma ugbu a ọ na-agwa ihe a kpọrọ mmadụ na ha niile kwesịrị ichegharị n’ebe niile.” (Ọrụ 17:29, 30) N’otu oge, Pọl kwukwara ihe yiri nke ahụ n’akwụkwọ ozi o degaara ndị bi na Tesalonaịka ma jaa ha mma, sị: ‘Unu hapụrụ arụsị unu wee bịakwute Chineke.’—1 Ndị Tesalonaịka 1:9.

Ọ bụghị naanị Pọl bụ onye dọrọ Ndị Kraịst aka ná ntị ka ha ghara iji ihe oyiyi na-efe ofufe, Jọn onyeozi mekwara otú ahụ. N’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ itoolu gara aga, Jọn gwasiri Ndị Kraịst ike, sị: “Kpacharanụ anya ka unu ghara ikpere arụsị.”—1 Jọn 5:21.

Ndịàmà Jehova na-erubere iwu doro anya Chineke nyere isi nke bụ́ ka a ghara iji ụdị ihe oyiyi ọ bụla na-efe ya ofufe. Ha kweere ihe Jehova Chineke kwuru, bụ́ onye sịrị: “Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m; agaghị m enye onye ọzọ nsọpụrụ m, agaghịkwa m enye ihe oyiyi a pịrị apị otuto m.”—Aịzaya 42:8.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 N’Ụlọ Nzukọ Alaeze ụfọdụ, e sere ụfọdụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. Ma, ihe mere e ji see ha abụghị na ha bụ ihe oyiyi a na-akwanyere ùgwù, kama e ji ha chọọ Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ahụ mma. Ndịàmà Jehova anaghị ekpeku ihe osise ndị ahụ ekpere, ha anakwaghị akpọrọ ha isiala.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 31]

“Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m; agaghị m enye onye ọzọ nsọpụrụ m, agaghịkwa m enye ihe oyiyi a pịrị apị otuto m.”—Aịzaya 42:8