Ò Nwere Otu Onye Dị Adị Bụ́ Chineke?
Ò Nwere Otu Onye Dị Adị Bụ́ Chineke?
Ihe ndị mmadụ na-azakarị:
▪ “Ọ nọ ebe niile. Ọ nọ n’ihe niile. Ọ dị ka ifufe.”
▪ “Ọ bụ ihe nwere ọgụgụ isi anyị na-enweghị ike ịkọwa akọwa, ike nkịtị a na-adịghị ahụ anya.”
Olee ihe Jizọs kwuru?
▪ “N’ụlọ Nna m, ọtụtụ ebe obibi dị.” (Jọn 14:2) Jizọs kwuru na Chineke nwere ebe e nwere ike ịkpọ ụlọ, ma ọ bụ ebe obibi.
▪ “Esi m n’ebe Nna m nọ bịa, abịawokwa m n’ụwa. Ana m ahapụkwa ụwa, ana m alakwuru Nna m.” (Jọn 16:28) Jizọs kweere na Chineke bụ Onye dị adị nke nwere otu ebe o bi.
O NWEGHỊ mgbe Jizọs kwuru na Chineke bụ ike nkịtị a na-anaghị ahụ anya. Kama nke ahụ, ọ gwara Chineke okwu, kpekuokwa ya ekpere. Ọtụtụ mgbe, ọ kpọrọ Jehova Nna ya nke bi n’eluigwe, bụ́ nke na-egosi na ya na Chineke dị n’ezigbo mma.—Jọn 8:19, 38, 54.
N’eziokwu, “ọ dịghị mmadụ hụtụrụla Chineke mgbe ọ bụla,” ‘Chineke bụkwa Mmụọ.’ (Jọn 1:18; 4:24) Ma, nke a apụtaghị na o nweghị ahụ́ ma ọ bụ ọdịdị. Baịbụl gwara anyị, sị: “Ọ bụrụ na e nwere anụ ahụ́, e nwekwara ahụ́ nke mmụọ.” (1 Ndị Kọrịnt 15:44) Jehova ò nwerenụ ahụ́ mmụọ?
Ee. Mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, “ọ banyere n’ime eluigwe, ka o wee pụta ugbu a n’ihu Chineke n’onwe ya maka anyị.” (Ndị Hibru 9:24) Nke a na-akụziri anyị ihe abụọ dị mkpa banyere Chineke. Nke mbụ bụ na o nwere ebe o bi. Nke abụọ abụrụ na ọ bụ Onye dị adị, ọ bụghị ike nkịtị a na-enweghị ike ịkọwa akọwa nke dị n’ebe niile.
Oleezi otú ike Chineke si eru ebe niile? Chineke nwere ike ime ka mmụọ nsọ ya, ma ọ bụ ike ya nọ n’ọrụ, gaa n’ebe ọ bụla n’eluigwe na n’ụwa. Chineke na-eji mmụọ nsọ ya emezu nzube ya otú nna na-amatị aka ya kasie ụmụ ya obi ma ọ bụ nyere ha aka.—Abụ Ọma 104:30; 139:7.
Ebe Chineke bụ Onye dị adị, o nwekwara ihe ndị na-amasị ya na ihe ndị na-anaghị amasị ya, ihe na-emetụkwa ya n’ahụ́. Baịbụl gwara anyị na ọ hụrụ ndị ya n’anya, ọrụ ndị ọ rụrụ na-eme ya obi ụtọ, ọ kpọrọ ikpere arụsị asị, omume ọjọọ na-ewutekwa ya. (Jenesis 6:6; Diuterọnọmi 16:22; 1 Ndị Eze 10:9; Abụ Ọma 104:31) Na 1 Timoti 1:11, a kpọrọ ya “Chineke bụ́ onye obi ụtọ.” Ka a sịkwa ihe mere Jizọs ji kwuo na anyị nwere ike iji obi anyị dum hụ Chineke anyị a n’anya!—Mak 12:30. *
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 12 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ya, gụọ isi 1 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke di na peeji nke 5]
Chineke na-eji mmụọ nsọ ya emezu nzube ya otú nna na-amatị aka ya kasie ụmụ ya obi ma ọ bụ nyere ha aka