Chineke Ọ̀ Na-anabata Otú Ọ Bụla Ndị Mmadụ Si Efe Ya?

Chineke Ọ̀ Na-anabata Otú Ọ Bụla Ndị Mmadụ Si Efe Ya?

Chineke Ọ̀ Na-anabata Otú Ọ Bụla Ndị Mmadụ Si Efe Ya?

Ihe ndị mmadụ na-azakarị:

▪ “Okpukpe niile dị Chineke mma.”

▪ “Ọ bụrụhaala na ihe i kweere si gị n’obi, o nweghị ihe o mere.”

Olee ihe Jizọs kwuru?

▪ “Sinụ n’ọnụ ụzọ ámá dị warara banye; n’ihi na okporo ụzọ nke na-eduba ná mbibi sara mbara ma dị obosara, ndị na-esikwa na ya abanye dị ọtụtụ; ma ọnụ ụzọ ámá nke na-eduba ná ndụ dị warara, okporo ụzọ ya dịkwa mkpagide, ndị na-achọta ya dịkwa ole na ole.” (Matiu 7:13, 14) Jizọs ekwetaghị na okpukpe niile dị Chineke mma.

▪ “Ọtụtụ mmadụ ga-asị m n’ụbọchị ahụ, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ọ̀ bụ na anyị ebughị amụma n’aha gị, chụpụkwa ndị mmụọ ọjọọ n’aha gị, rụọkwa ọtụtụ ọrụ dị ike n’aha gị?’ Ma mgbe ahụ, m ga-ekwupụtara ha, sị: Ọ dịghị mgbe m maara unu! Sinụ n’ebe m nọ pụọ, unu ndị ọrụ mmebi iwu.” (Matiu 7:22, 23) Jizọs anaghị anabata ndị niile sị na ha na-eso ụzọ ya.

ỌTỤTỤ ndị na-aga chọọchị ejighị ihe ha kweere na omenala chọọchị ha egwuri egwu. Ya bụrụkwanụ na ihe ndị ahụ chọọchị ha na-akụzi dị iche n’ihe Baịbụl bụ́ Okwu Chineke na-akụzi? Jizọs kwuru ihe mere o ji dị njọ mmadụ iso omenala ụmụ mmadụ mgbe ọ gwara ndị isi okpukpe nọ n’oge ya, sị: “Unu emewo ka okwu Chineke ghara ịdị irè n’ihi ọdịnala unu.” O kwughachiziri ihe ndị a Chineke kwuru: “Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị nnọọ anya n’ebe m nọ. Ọ bụ n’efu ka ha na-efe m ofufe, n’ihi na ozizi ha na-ezi bụ ihe mmadụ nyere n’iwu.”—Matiu 15:1-9; Aịzaya 29:13.

Ọ bụghị naanị ihe mmadụ kweere dị mkpa, kama, àgwà onye ahụ dịkwa mkpa. Baịbụl kwuru banyere ụfọdụ ndị sị na ha na-efe Chineke, sị: “Ha na-ekwupụta n’ihu ọha na ha maara Chineke, ma ha na-agọnahụ ya site n’ọrụ ha.” (Taịtọs 1:16) N’eziokwu, Baịbụl kwuru na ọtụtụ ndị bi n’oge anyị bụ “ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya, ndị na-eme ka hà nwere nsọpụrụ Chineke ma na-agọnahụ ike ya,” kwuokwa, sị: “Zere ndị dị otú a.”—2 Timoti 3:4, 5.

Ọ dị mma ka mmadụ jiri obi ya dum na-eme ihe ọ bụla ọ na-eme. Ma, ọ bụghị naanị ya bụ ihe a chọrọ. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na mmadụ nwere ike iji obi ya dum kwere ihe na-abụghị eziokwu. N’ihi ya, ọ dị oké mkpa ka mmadụ nwee ezi ihe ọmụma banyere Chineke. (Ndị Rom 10:2, 3) Ọ bụrụ na anyị enwee ezi ihe ọmụma banyere Chineke, na-emekwa ihe Baịbụl kwuru, ọ ga-eme ka anyị mee ihe dị Chineke mma. (Matiu 7:21) Ọ pụtaziri na onye na-ekpe ezi okpukpe ga-ebu ezi ihe n’obi, kwere ihe bụ́ eziokwu, na-akpakwa ezi àgwà. Ịkpa ezi àgwà pụtara ime uche Chineke kwa ụbọchị!—1 Jọn 2:17.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe Baịbụl gwara anyị banyere Chineke, gwa Ndịàmà Jehova ka ha bịa n’ụlọ gị kụziwere gị Baịbụl n’efu.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 9]

Onye na-ekpe ezi okpukpe ga-ebu ezi ihe n’obi, kwere ihe bụ́ eziokwu, na-akpakwa ezi àgwà