Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 36:1-23

  • Jehoahaz malitere ịchị Juda (1-3)

  • Jehoyakim malitere ịchị Juda (4-8)

  • Jehoyakin malitere ịchị Juda (9, 10)

  • Zedekaya malitere ịchị Juda  (11-14)

  • E bibiri Jeruselem (15-21)

  • Saịrọs nyere iwu ka a rụghachi ụlọ nsọ Chineke (22, 23)

36  Ndị Juda wee kpọrọ Jehoahaz nwa Josaya+ chie ya eze na Jeruselem, ya anọchie nna ya.+  Jehoahaz dị afọ iri abụọ na atọ mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị ọnwa atọ na Jeruselem.  Ma, eze Ijipt chụturu ya n’ọchịchị na Jeruselem ma rie obodo ahụ iwu otu narị (100) talent* ọlaọcha na otu talent ọlaedo.+  Eze Ijipt chikwara Elayakim nwanne Jehoahaz eze Juda na Jeruselem. Ọ gbanwere aha ya, a kpọwazie ya Jehoyakim. Ma, eze a bụ́ Niko+ kpọọrọ Jehoahaz nwanne Elayakim kpọta Ijipt.+  Jehoyakim+ dị afọ iri abụọ na ise mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri na otu na Jeruselem. Ọ nọkwa na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova bụ́ Chineke ya.+  Nebukadneza+ eze Babịlọn wee bịa lụso ya agha, tụọ ya ịga abụọ e ji ọla kọpa mee ma kpụrụ ya laa Babịlọn.+  Nebukadneza bukwaara ụfọdụ n’ime arịa ndị dị n’ụlọ Jehova buga Babịlọn ma busa ha n’obí ya dị na Babịlọn.+  E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Jehoyakim na ihe ọjọọ niile o mere nakwa arụ ndị ọ kpara n’akwụkwọ gbasara ndị eze Izrel na Juda. Jehoyakin nwa ya nọchiri ya, malite ịchị.+  Jehoyakin+ dị afọ iri na asatọ mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị ọnwa atọ na ụbọchị iri na Jeruselem. Ọ nọ na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova.+ 10  Ná mmalite afọ, Eze Nebukadneza dunyere ndị mmadụ ka ha gaa kpụta ya Babịlọn,+ butekwa arịa ndị bara ezigbo uru dị n’ụlọ Jehova.+ O chikwara Zedekaya nwanne nna Jehoyakin eze Juda na Jeruselem.+ 11  Zedekaya+ dị afọ iri abụọ na otu mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri na otu na Jeruselem.+ 12  Ọ nọ na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova bụ́ Chineke ya. O wedaghị onwe ya ala mgbe Jeremaya onye amụma+ dọrọ ya aka ná ntị otú Jehova gwara ya mee. 13  O nupụkwaara Eze Nebukadneza+ isi n’agbanyeghị na Nebukadneza mere ka o jiri Chineke ṅụọ iyi na ọ ga na-erubere yanwa isi. Ọ kpọrọ ekwo nkụ, kpọchie obi ya, jụkwa ịlọghachikwute Jehova bụ́ Chineke Izrel. 14  Ndị niile bụ́ ndị isi ndị nchụàjà nakwa ndị ọzọ niile nọ na-enupụrụ Chineke isi, na-akpakwa arụ mba ndị ọzọ na-akpa. Ha merụkwara ụlọ Jehova,+ nke o doro nsọ na Jeruselem. 15  Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha nọkwa na-ezigara ha ndị ozi ya ka ha dọọ ha aka ná ntị. Ọ dọrọ ha aka ná ntị ugboro ugboro, n’ihi na ihe gbasara ha na ụlọ nsọ ya* na-emetụ ya n’obi. 16  Ma, ha ji ndị ozi ezi Chineke+ na-eme ihe ọchị. O nweghịkwa ihe ha ji okwu ya kpọrọ.+ Ha nọ na-akwa ndị amụma ya emo+ ruo mgbe hanwa na-akwa emo na-enweghịzi mmekwata. Mgbe ahụzi ka Jehova wesara ha ezigbo iwe.+ 17  O mere ka eze ndị Kaldia gaa lụso ha agha,+ jiri mma agha gbuo ụmụ okorobịa ha+ n’ụlọ nsọ ha.+ O mereghị ma nwa okorobịa ma nwa agbọghọ, ma agadi ma onye na-adịkwaghị ike, ebere.+ Chineke nyefere ihe niile n’aka ya.+ 18  O buuru arịa niile dị n’ụlọ ezi Chineke, ma ndị nnukwu ma ndị obere, burukwa akụ̀ ndị dị n’ụlọ Jehova na akụ̀ eze nakwa nke ndị o mere ndị isi. O buuru ha niile laa Babịlọn.+ 19  Ọ gbara ụlọ ezi Chineke+ ọkụ, kwatuokwa mgbidi Jeruselem.+ Ọ gbara ụlọ elu niile a rụsiri ike na Jeruselem ọkụ, bibiekwa ihe niile bara uru dị na ya.+ 20  Ọ kpụụrụ ndị a na-ejighị mma agha gbuo laa Babịlọn,+ ha aghọọrọ ya na ụmụ ya ndị ohu+ ruo mgbe ndị* Peshia malitere ịchị.+ 21  Ihe a mere iji mezuo ihe Jehova si n’ọnụ Jeremaya kwuo.+ Obodo a tọgbọọrọ chakoo ruo mgbe ọ kwụchara ụgwọ ụbọchị izu ike o ji.+ N’oge niile obodo a tọgbọ chakoo, ọ nọ na-ezu ike ruo mgbe afọ iri asaa gachara.+ 22  N’afọ nke mbụ n’ọchịchị Saịrọs+ eze Peshia, ka ihe Jehova si n’ọnụ Jeremaya kwuo wee mezuo,+ Jehova mere ka Saịrọs eze Peshia nye iwu* ka a maa ọkwa n’alaeze ya niile, deekwa ya n’akwụkwọ,+ sị: 23  “Ihe a bụ ihe Saịrọs eze Peshia kwuru, ‘Jehova bụ́ Chineke nke eluigwe enyela m alaeze niile dị n’ụwa.+ Ọ họpụtakwala m ka m rụọrọ ya ụlọ na Jeruselem, nke dị na Juda.+ Onye ọ bụla n’ime unu niile nke so ná ndị ya, ka Jehova bụ́ Chineke ya nọnyere ya. Ya lawa.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Otu talent bụ kilogram 34.2. Gụọ B14.
Na Hibru, “ebe o bi.”
Ma ọ bụ “alaeze.”
Na Hibru, “kpaliri mmụọ Saịrọs eze Peshia.”