Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ò Nwere Ihe Otú Anyị Si Efe Chineke Mere?

Ò Nwere Ihe Otú Anyị Si Efe Chineke Mere?

Ò Nwere Ihe Otú Anyị Si Efe Chineke Mere?

“IKPE okpukpe dị ụmụ mmadụ n’ọbara.” Ọ bụ ọkachamara bụ́ Alister Hardy kwuru nke a n’akwụkwọ ya bụ́ The Spiritual Nature of Man. Nnyocha e mere n’oge na-adịbeghị anya yiri ka ọ̀ kwadoro ihe ahụ o kwuru. Nnyocha ahụ kwuru na ihe karịrị mmadụ asatọ n’ime mmadụ iri ọ bụla kwuru na ha nwere okpukpe ha na-ekpe.

Nnyocha ahụ kwukwara na e nwere ụzọ okpukpe iri na itoolu bụ́ isi ndị mmadụ na-ekpe, kwuokwa na ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst nwere puku chọọchị iri atọ na puku asaa dị iche iche ha nọ na ha. Ọ̀ bụ na nke a anaghị eme ka i chewe ma Chineke ọ̀ na-anabata ụzọ a dị iche iche ndị mmadụ si efe ofufe? Ò nwere ihe otú anyị si efe Chineke mere?

N’okwu a dị mkpa, ọ bụghị otú anyị si ele ihe anya ma ọ bụ echiche anyị ga-ekpebi ma okpukpe anyị ò ziri ezi. Ya mere, anyị kwesịrị ịchọpụta ihe bụ́ echiche Chineke n’okwu a. Anyị kwesịrị ịgụ Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, ka anyị wee chọpụta ihe bụ́ echiche ya. N’ihi gịnị? N’ihi na Jizọs Kraịst kwuru mgbe ọ na-ekpeku Chineke ekpere, sị: “Okwu gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) Pọl, bụ́ onyeozi kwesịrị ntụkwasị obi, kwuru, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru iji ya zie ihe, iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị, iji ya mee ka ihe guzozie.”—2 Timoti 3:16.

Baịbụl gosiri na Chineke anaghị anabata ofufe niile. Ihe ndị mere eme na-egosi na e nwere ụdị ofufe Chineke na-anabata na ụdị ọ na-anaghị anabata. Ọ bụrụ na anyị ejiri nlezianya leruo ha anya, anyị nwere ike ịmata ihe anyị ga-eme na ihe anyị na-agaghị eme ka ofufe anyị wee dị Chineke mma.

Ihe Mere n’Oge Ochie

Jehova bụ́ Chineke si n’aka Mozis onye amụma nye ụmụ Izrel iwu dị iche iche ndị kụziere ha otú ha ga-esi na-efe Chineke n’ụzọ ọ na-anara. Mgbe ha mere ihe iwu ndị ahụ, bụ́ nke a na-akpọkarị Iwu Mozis, kwuru, Chineke nabatara ha ịbụ ndị ya, gọziekwa ha. (Ọpụpụ 19:5, 6) N’agbanyeghị ngọzi ndị ahụ Chineke nọ na-enye mba Izrel, ha anọgideghị na-efe ya ofufe n’ụzọ ọ na-anara. Ha gbakụtara Jehova azụ ugboro ugboro ma gbasoo okpukpe nke ndị bi n’ala ndị gbara ha gburugburu.

N’oge Ezikiel onye amụma na Jeremaya onye amụma, n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ isii gara aga, ọtụtụ ụmụ Izrel leghaara Iwu Chineke anya wee soro ndị mba ndị gbara ha gburugburu na-akpakọrịta. Mgbe ụmụ Izrel malitere ime omenala ha na ememme ha dị iche iche, ha tinyere aka n’okpukpe ọzọ. Ọtụtụ n’ime ụmụ Izrel nọ na-asị: “Ka anyị dịrị ka ndị mba ọzọ, dị ka ezinụlọ niile nke ala dị iche iche, site n’ijere osisi na nkume ozi.” (Ezikiel 20:32; Jeremaya 2:28) Ha kwuru na ha na-efe Jehova bụ́ Chineke, ma n’otu mgbe ahụ, ha na-efe ‘arụsị ndị na-asọ oyi ka nsị,’ ọbụna na-esurere arụsị ndị ahụ ụmụ ha n’ọkụ.—Ezikiel 23:37-39; Jeremaya 19:3-5.

Ndị ọkà mmụta ihe ochie kpọrọ ụdị ofufe a ife ọtụtụ chi. Ihe ọzọ a na-akpọ ya bụ okpukpe ọdịnala. Taa, ọtụtụ ndị chere na ebe ọ bụ na anyị bi n’ụwa nke e nwere ọtụtụ nkwenkwe, na anyị kwesịrị ịnabata ihe niile, tinyere ụdị okpukpe ọ bụla. N’ihi ya, ha chere na o nweghị ihe dị njọ mmadụ ife Chineke otú ọ bụla ọ chọrọ. Ma, nke a ọ̀ bụ eziokwu? È kwesịrị iwere na nke a bụ naanị mmadụ ịnabata ofufe ndị ọzọ? Tụlegodị ihe ụfọdụ a na-eme n’okpukpe ọtụtụ ndị kpere nke ụmụ Izrel na-ekwesịghị ntụkwasị obi tinyere aka, ị ga-ahụ ihe o dugara ha ime.

Okpukpe Ọzọ Ụmụ Izrel Tinyere Aka

Ebe ụmụ Izrel nọ tinye aka n’ife chi dị iche iche bụ “n’ebe ndị dị elu,” ma ọ bụ n’ihu arụsị dị iche iche ndị nwere ebe ịchụàjà, nkume dị nsọ, na ogwe osisi dị nsọ, ndị nwere ike ịbụ osisi a tụrụ atụ bụ́ Ashera, ya bụ, chi nwaanyị na-enye nwa nke ndị Kenan na-efe. E nwere ọtụtụ ebe dị otú ahụ na Juda. Ndị Eze nke Abụọ 23:5, 8 kwuru banyere ‘ebe ndị dị elu n’obodo ndị dị na Juda nakwa n’ebe ndị gbara Jeruselem gburugburu, . . . malite na Giba [ebe ala ha jedebere n’ebe ugwu] ruo Bia-shiba [ebe ala ha jedebere n’ebe ndịda].’

Ọ bụ n’ebe ndị ahụ dị elu ka ụmụ Izrel sureere “Bel, anyanwụ na ọnwa na ìgwè kpakpando nke zodịak na ìgwè ihe niile dị n’eluigwe, ihe nsure ọkụ.” Ha nwere ụlọ “ndị ikom bụ́ ndị akwụna ụlọ arụsị . . . n’ụlọ Jehova,” ha surekwaara Molek ụmụ ha “n’ọkụ.”—2 Ndị Eze 23:4-10.

Ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie ahụwo ọtụtụ narị arụsị a kpụrụ akpụ na Jeruselem na Juda, karịchaa n’ọkpụ ụlọ ndị mmadụ. Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị inyom gba ọtọ nwere ara ukwu. Ndị ọkà mmụta kwuru na ihe ndị ahụ a kpụrụ akpụ bụ chi nwaanyị aha ha bụ Ashtọret na Ashera, ndị na-enye nwa. Ndị na-efe arụsị ndị ahụ kweere na ihe ndị ahụ a kpụrụ akpụ “na-eme ka a tụrụ ime mụọ nwa.”

Olee otú ụmụ Izrel si lee ebe ndị ahụ ha na-anọ efe chi dị iche iche ofufe anya? Prọfesọ Ephraim Stern nke Mahadum Hibru kwuru na ọ ga-abụ “Yahweh [ya bụ, Jehova] ka e nyefere” ọtụtụ n’ime ebe ndị ahụ dị elu. Ihe ndị e dere n’ihe ndị mgbe ochie e gwutere n’ala na-akwado echiche a. Dị ka ihe atụ, otu n’ime ha sịrị, “Ana m agọzi gị n’aha Yahweh nke Sameria nakwa n’aha ashera ya,” nke ọzọ sịrị, “Ana m agọzi gị n’aha Yahweh nke Timan nakwa n’aha ashera ya!”

Ihe atụ ndị a na-egosi otú ụmụ Izrel si mebie iwu Chineke site n’ịgwakọta ofufe dị ọcha a na-efe Jehova bụ́ Chineke na omume rụrụ arụ nke ndị na-ekpere arụsị. Nke a mere ka omume ha na ofufe ha bụrụ nke rụrụ arụ. Olee otú Chineke si lee ụdị ofufe a anya?

Ihe Chineke Mere Mgbe Ha Tinyere Aka n’Ife Chi Ọzọ

Chineke si n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Ezikiel kwupụta iwe na-ewe ya na ụmụ Izrel tinyere aka n’ofufe rụrụ arụ, ọ katọkwara ha, sị: “Obodo niile, ndị bụ́ ebe unu bi, ga-abụ ndị a lara n’iyi, ebe ndị dị elu ga-atọgbọrọkwa n’efu, ka ha wee bụrụ ebe a lara n’iyi, ebe ịchụàjà unu abụrụkwa ebe tọgbọrọ n’efu na ebe a kụrisịrị akụrisị. A ga-ebibi arụsị unu ndị na-asọ oyi ka nsị, gbajisịakwa ihe unu ji adọba ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, kpochapụkwa ọrụ unu.” (Ezikiel 6:6) O doro anya na o nweghị otú ụdị ofufe ahụ si masị Jehova, ọ jụkwara ya kpamkpam.

Jehova bụ́ Chineke kwuru otú a ga-esi bibie ha. Ọ sịrị, ‘Lee, m ga-ezi Nebukadreza eze Babịlọn, bụ́ ohu m, ozi, m ga-emekwa ka ha bịa buso ala a na ndị bi n’ime ya na mba ndị a niile gbara ya gburugburu agha; m ga-ebibi ha. . . . Ala a dum ga-aghọ ebe a lara n’iyi.’ (Jeremaya 25:9-11) Okwu a mezuru n’afọ 607 T.O.A., mgbe ndị Babịlọn busoro Jeruselem agha ma bibie obodo ahụ na ụlọ nsọ ya kpamkpam.

Mgbe Prọfesọ Stern, bụ́ onye e kwuru okwu ya na mbụ, na-ekwu banyere mbibi e bibiri Jeruselem, o kwuru na ihe ndị mgbe ochie a hụrụ n’ebe ahụ “na-akwado ihe ndị Baịbụl kwuru (2 Ndị Eze 25:8; 2 Ihe E Mere 36:18-19) banyere otú e si bibie obodo ahụ, gbaa ya ọkụ, na otú e si kụtusịa ụlọ ndị dị na ya na mgbidi ya.” O kwukwara, sị: “A pụrụ ikwu na Jeruselem so n’obodo ndị akụkọ Baịbụl kọrọ banyere ha kacha doo anya . . . n’ihi ihe ndị mgbe ochie a hụrụ bụ́ ndị na-egosi mbibi e biri ya.”

Gịnị Ka Anyị Na-amụta na Ya?

Ihe kacha mkpa anyị na-amụta na ya bụ na Chineke anaghị anabata ofufe nke a na-agwakọta ozizi Baịbụl na nkwenkwe, omenala, ma ọ bụ ọdịnala okpukpe ọ bụla ọzọ. Pọl onyeozi ghọtara nke a nke ọma. A zụrụ ya n’iwu ndị Farisii nke ndị Juu, ọ gụkwara akwụkwọ wee ghọọ onye òtù ha. Mgbe o mechara mata na Jizọs bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa, nabatakwa ya, gịnị ka o mere? Ọ sịrị: “Ihe ndị bụụrụ m uru, m weere ha dị ka ihe na-abaghị uru n’ihi Kraịst.” Ọ hapụrụ ụzọ ndụ ochie ya wee jiri obi ya dum sowe ụzọ Kraịst.—Ndị Filipaị 3:5-7.

Ebe Pọl jere mba dị iche iche na-ekwusa ozi ọma, otú ndị dị iche iche si ekpe okpukpe ha na nkà ihe ọmụma dị iche iche a na-akụziri ha doro ya anya. Ọ bụ ya mere o ji degara Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt akwụkwọ, sị: “Olee òkè ìhè na ọchịchịrị nwere? Oleekwa nkwekọ dị n’etiti Kraịst na Bilial? Ma ọ bụ, olee òkè onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe nwere? Oleekwa nkwekọrịta ụlọ nsọ Chineke na arụsị nwere? . . . ‘Ya mere, sinụ n’etiti ha pụọ, kewapụnụ onwe unu,’ ka Jehova sịrị, ‘kwụsịkwanụ imetụ ihe na-adịghị ọcha aka’; ‘m ga-akpọbatakwa unu.’”—2 Ndị Kọrịnt 6:14-17.

Ebe ọ bụ na anyị aghọtala na otú anyị si efe Chineke nwere ihe o mere, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị sị: ‘Olee ụdị ofufe Chineke na-anabata? Olee otú m nwere ike isi bịaruo Chineke nso? Olee ihe m kwesịrị ime iji na-efe Chineke n’ụzọ ọ na-anara?’

Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka ịmata azịza ajụjụ ndị a na ajụjụ ndị ọzọ Baịbụl zara. Anyị na-agwa gị ka ị gakwuru Ndịàmà n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha ma ọ bụ detara ndị bipụtara magazin a akwụkwọ gwa ha na ị chọrọ ka a bịa na-akụziri gị Baịbụl n’efu n’ebe ọ bụla dị gị mma nakwa n’oge ọ bụla ị chọrọ ya.

[Foto dị na peeji nke 10]

Ihu arụsị a na-anọ efe arụsị n’oge ochie, na Tel Arad, Israel

[Ebe E Si Nweta Foto]

Garo Nalbandian

[Foto dị na peeji nke 10]

Arụsị Ashtọret ndị e si n’ụlọ ndị dị na Judia n’oge ochie wepụta

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto © Israel Museum, Jerusalem; A natara Israel Antiquities Authority ikike see ya