Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Bụ “Aha A Na-ekwesịghị Ịkpọ Akpọ”?

Ọ̀ Bụ “Aha A Na-ekwesịghị Ịkpọ Akpọ”?

Ọ̀ Bụ “Aha A Na-ekwesịghị Ịkpọ Akpọ”?

Ọ BỤ n’akụkụ osimiri nke dị na St. Louis, Missouri, ka a rụrụ Gateway Arch, bụ́ ihe ncheta kacha ogologo e nwere na United States, nke dị otu narị mita na iri itoolu na abụọ. N’otu akụkụ ihe ncheta ahụ, e nwere otu chọọchị na-adịchaghị ogologo nke a na-akpọkarị Katidral Ochie.

Akwụkwọ bụ́ The Story of the Old Cathedral, nke chọọchị ahụ bipụtara, kwuru banyere otú ihu ụlọ chọọchị ahụ dị, sị: “E nwere ihe e wuru n’elu ọnụ ụzọ e si abanye na ya nke a chọrọ mma. N’etiti ya, e ji mkpụrụ akwụkwọ Hibru dee aha Chineke nke a na-ekwesịghị ịkpọ akpọ.” Dị ka foto dị na peeji a na-egosi, a na-ahụ mkpụrụ akwụkwọ anọ nke asụsụ Hibru יהוה (YHWH), ma ọ bụ Tetragramatọn ahụ, anya nke ọma, bụ́ nke na-anọchi anya aha Chineke.

Mgbe e wuru katidral a na 1834, ọ ga-abụrịrị na ndị na-aga chọọchị a na St. Louis maara na e kwesịrị iji aha ahụ e dere ná mkpụrụ akwụkwọ anọ nke Hibru kpọrọ ihe. Gịnịzi mere e ji were aha ahụ dị ka aha “a na-ekwesịghị ịkpọ akpọ”?

Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia kwuru ihe mere mgbe ndị Juu si na Babịlọn lọta n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ ise gara aga. Ọ sịrị: “A malitere ịtụ aha ahụ bụ́ Yahweh [ya bụ, Tetragramatọn e tinyere ụdaume] ụjọ pụrụ iche, a malitekwara iji okwu bụ́ ADONAI [Onyenwe anyị] ma ọ bụ ELOHIM [Chineke] na-edochi anya ya. . . . Nke a mere ka e chefuo otú kwesịrị ekwesị e si akpọ aha ahụ bụ́ Yahweh ka oge na-aga.” Ya mere, ndị mmadụ kwụsịrị ịkpọ aha Chineke. Ka oge na-aga, a maghịzi kpọmkwem otú ndị mgbe ochie si akpọ aha Chineke, o wee ghọọ aha a na-anaghị akpọ akpọ.

Ọ bụ ezie na anyị ejighị n’aka kpọmkwem otú e si akpọ aha Chineke, ihe dị mkpa bụ na ịkpọ aha ya na-eme ka anyị bịarukwuo ya nso. Ọ̀ ga-adị gị mma ka ndị enyi gị na-akpọ gị “maazị” ma ọ bụ “nwaada,” ka ị̀ ga-achọ ka ha na-akpọ gị aha gị? Ọ bụrụgodị na ha anaghị akpọtacha aha gị maka na ha anaghị asụ asụsụ ị na-asụ, ọ́ bụghị aha gị ka ị ga-achọ ka ha na-akpọ gị? Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị Chineke. Ọ chọrọ ka anyị na-akpọ ya aha ya, bụ́ Jehova.

N’asụsụ Igbo, otú ọtụtụ ndị si akpọ aha ahụ bụ “Jehova.” Ọ̀ bụ na o kwesịghị ekwesị ka ndị niile hụrụ Chineke n’anya na-akpọ ya aha ya, wee si otú a na-abịaru ya nso? Baịbụl kwuru, sị, “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”—Jems 4:8.