Ezikiel 20:1-49
20 N’abalị iri n’ọnwa ise n’afọ nke asaa,* ụfọdụ n’ime ndị okenye Izrel bịara nọdụ ala n’ihu m ka ha jụọ Jehova ase.
2 Jehova wee gwa m, sị:
3 “Nwa nke mmadụ, gwa ndị okenye Izrel, sị, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Ùnu bịara ka unu jụọ m ase? ‘Ebe ọ bụ na m na-adị ndụ, agaghị m aza unu ihe ọ bụla.’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.”’
4 “Nwa nke mmadụ, ị̀ ga-ekpe ha ikpe?* Ì jikerela ikpe ha ikpe? Mee ka ha mara arụ dị iche iche ndị nna nna ha kpara.+
5 Sịkwa ha, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: “N’ụbọchị m họọrọ ndị Izrel,+ bụ́ ụmụ* si n’ezinụlọ Jekọb, m ṅụụrụ ha iyi,* meekwa ka ha mara m n’Ijipt.+ N’eziokwu, m ṅụụrụ ha iyi, sị, ‘Abụ m Jehova Chineke unu.’
6 N’ụbọchị ahụ, m ṅụụrụ ha iyi na m ga-akpọpụta ha n’Ijipt kpọga ha n’ala m họtaara ha,* ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.*+ Ọ bụ ala kacha* ala niile mma.
7 M gwaziri ha, sị, ‘Onye ọ bụla n’ime unu tụfuo ihe ndị rụrụ arụ ọ na-efe. Unu ejikwala arụsị dị iche iche na-asọ oyi* ndị Ijipt na-efe emerụ onwe unu.+ Abụ m Jehova Chineke unu.’+
8 “‘“Ma, ha nupụụrụ m isi. Ha ekweghịkwa ege m ntị. Ha atụfughị ihe ndị rụrụ arụ ha na-efe, ha ahapụghịkwa arụsị dị iche iche na-asọ oyi ndị Ijipt na-efe.+ N’ihi ya, m kpebiri na m ga-eji ezigbo iwe na ọnụma mee ha ihe n’Ijipt.
9 Ma, ihe mere m ji mee ihe m mere bụ ka a ghara imebi aha m ná mba dị iche iche ha bi.+ N’ihi na m nọ n’ihu mba ndị a mee ka ha* mara m mgbe m si n’Ijipt kpọpụta ha.*+
10 M kpọpụtara ha n’Ijipt duru ha gaa n’ala ịkpa.+
11 “‘“M nyere ha iwu m, meekwa ka ha mara ihe ndị m kpebiri,+ ka onye na-eme ha wee dịrị ndụ na-aga.+
12 M gwakwara ha ka ha na-edebe ụbọchị izu ike m,+ ka ọ bụrụ ihe ga-egosi na mụ na ha gbara ndụ,+ ka ha wee mara na ọ bụ mụnwa, bụ́ Jehova, mere ka ha dịrị nsọ.
13 “‘“Ma, ndị Izrel nupụụrụ m isi n’ala ịkpa.+ Ha edebeghị iwu m. Ha anabataghịkwa ihe ndị m kpebiri. Ma, ihe ndị a bụ ihe ndị ga-eme ka mmadụ dịrị ndụ ma ọ na-eme ha. Ha mebiri ụbọchị izu ike m. N’ihi ya, m kpebiri iji ezigbo iwe kpochapụ ha n’ala ịkpa.+
14 Ma, m hapụrụ ime ha ihe m chọrọ ime ha, ka a ghara imebi aha m ná mba dị iche iche, ndị hụrụ mgbe m si n’Ijipt kpọpụta ha.*+
15 M ṅụkwaara ha iyi n’ala ịkpa na agaghị m akpọba ha n’ala ahụ m nyere ha,+ nke bụ́ ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya*+ nakwa ala kacha* ala niile mma.
16 M ṅụrụ iyi ahụ maka na ha anabataghị ihe ndị m kpebiri, ha edebeghị iwu m, ha mebikwara ụbọchị izu ike m, n’ihi na obi ha dị n’arụsị ha dị iche iche na-asọ oyi.+
17 “‘“Ma, m meteere ha ebere.* Alaghị m ha n’iyi, ekpochapụghịkwa m ha n’ala ịkpa.
18 M gwara ụmụ ha n’ala ịkpa,+ sị, ‘Unu esokwala ntụziaka nna nna unu hà.+ Unu emekwala ihe ndị ha kpebiri ime. Unu ejikwala arụsị ha dị iche iche na-asọ oyi emerụ onwe unu.
19 Abụ m Jehova Chineke unu. Debenụ iwu m. Nabatanụ ihe ndị m kpebiri, meekwanụ ha.+
20 Dowenụ ụbọchị izu ike m nsọ.+ Ọ ga-abụkwa ihe ga-egosi na mụ na unu gbara ndụ, ka unu wee mara na m bụ Jehova Chineke unu.’+
21 “‘“Ma, ụmụ ha malitere inupụrụ m isi.+ Ha edebeghị iwu m, ha anabataghị ihe ndị m kpebiri, ha emeghịkwa ha. Ma, ihe ndị a bụ ihe ndị ga-eme ka mmadụ dịrị ndụ ma ọ na-eme ha. Ha mebikwara ụbọchị izu ike m. N’ihi ya, m kpebiri na m ga-eji ezigbo iwe na ọnụma mee ha ihe n’ala ịkpa.+
22 Ma, emechaghị m mee ha ihe,+ ka a ghara imebi aha m+ n’anya mba dị iche iche, ndị hụrụ mgbe m si n’Ijipt kpọpụta ha.*
23 M ṅụkwaara ha iyi n’ala ịkpa na m ga-achụsasị ha ná mba dị iche iche, meekwa ka ha gbasasịa n’ala dị iche iche,+
24 n’ihi na ha emeghị ihe ndị m kpebiri, ha anabataghịkwa iwu m.+ Ha mebiri ụbọchị izu ike m, fewekwa arụsị* dị iche iche na-asọ oyi ndị nna nna ha fere.+
25 M hapụrụ ha ka ha soro ntụziaka na-adịghị mma, hapụkwa ha ka ha na-edebe iwu ndị na-agaghị eme ka ha dị ndụ.+
26 M hapụrụ ha ka ha jiri àjà ha na-achụ merụọ onwe ha. Àjà ahụ bụ ịkpọ nwa mbụ ọ bụla ha mụtara ọkụ.+ Ihe mere m ji hapụ ha bụ ka m laa ha n’iyi, ka ha wee mara na m bụ Jehova.”’
27 “N’ihi ya, nwa nke mmadụ, gwa ndị Izrel, sị, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Nna nna unu hà kparịrị m mgbe ha mebiri iwu m.
28 M kpọbara ha n’ala m ṅụrụ iyi na m ga-enye ha.+ Mgbe ha hụrụ ugwu niile dị elu na osisi ndị nwere akwụkwọ,+ ha malitere ịnọ ebe ahụ achụ àjà dị iche iche na-akpasu iwe. Ha na-anọ ebe ahụ achụ àjà na-esi ísì ọma na àjà mmanya.
29 M jụkwara ha, sị, ‘Gịnị mere unu ji aga n’ebe ahụ dị elu? (A ka na-akpọ ya Ebe Dị Elu ruo taa.)’”’+
30 “Ugbu a, gwa ndị Izrel, sị, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: “Ọ̀ kwa unu na-emerụ onwe unu otú nna nna unu hà mere, na-akpa àgwà ka ndị akwụna, hapụ m na-efe arụsị dị iche iche na-asọ oyi?+
31 Ọ̀ kwa unu ka na-emerụ onwe unu ruo taa, ebe ọ bụ na unu na-achụrụ arụsị niile na-asọ oyi unu na-efe àjà, na-akpọ ụmụ unu ọkụ iji chụọ àjà?+ Ndị Izrel, ọ̀ bụ unu mechaa ihe a, mụ atụpụrụ unu ọnụ ma unu chọọ ịjụta m ihe?”’+
“Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị, ‘Ebe ọ bụ na m na-adị ndụ, agaghị m atụpụrụ unu ọnụ ma unu chọọ ịjụta m ihe.+
32 Ihe uche* unu na-agwa unu emekataghị mee. Unu na-asị: “Ka anyị dịrị ka ndị mba ọzọ, mba ndị dị ebe dị iche iche, ndị na-efe osisi na nkume.”’”*+
33 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị, ‘Ebe ọ bụ na m na-adị ndụ, m ga-eji aka m siri ike na ike m, jirikwa iwe na ọnụma na-achị unu.+
34 M ga-esi n’obodo dị iche iche unu nọ kpọpụta unu, sikwa n’ala niile a chụsasịrị unu jiri aka m siri ike na ike m nakwa iwe na ọnụma kpọkọta unu.+
35 M ga-akpọbatakwa unu n’ala ịkpa mba dị iche iche ma kpee unu ikpe.+
36 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị, ‘Otú ahụ m kpere nna nna unu hà ikpe n’ala ịkpa dị n’Ijipt, ka m ga-ekpe unu ikpe.
37 M ga-eme ka unu si n’okpuru mkpara gafee otú atụrụ si agafe.+ M ga-emekwa ka unu ghara imebi ndụ mụ na unu gbara.
38 M ga-ebibi onye ọ bụla n’ime unu na-enupụrụ m isi na onye na-emebi iwu m.+ M ga-esi ebe ha bi ka ndị mbịarambịa kpọpụta ha, ma ha agaghị abata n’ala Izrel.+ Unu ga-amarakwa na m bụ Jehova.’
39 “Ndị Izrel, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘Onye ọ bụla n’ime unu gaa fewe arụsị ya na-asọ oyi.+ Ọ bụrụgodị na unu egeghị m ntị, unu agaghịzi eji àjà ndị unu na-achụ na arụsị unu dị iche iche na-asọ oyi emerụ aha nsọ m.’+
40 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘Ndị Izrel niile ga-efe m n’obodo a+ n’ugwu nsọ m, ya bụ, n’ugwu dị elu dị n’Izrel.+ Ihe unu na-eme ebe ahụ ga-atọ m ụtọ. M ga-atụkwa anya ka unu nye m onyinye, jirikwa mkpụrụ mbụ ndị mịịrị unu, ya bụ, ihe niile dị nsọ unu nwere, chụọrọ m àjà ebe ahụ.+
41 M ga-eji maka ihe na-esi ísì ọma kpọpụta unu ná mba dị iche iche unu nọ, sikwa n’ala dị iche iche a chụsasịrị unu kpọkọta unu.+ A ga-esikwa n’aka unu doo m nsọ n’anya mba niile.’+
42 “‘Unu ga-amarakwa na m bụ Jehova+ mgbe m kpọbatara unu n’Izrel,+ n’ala m ṅụrụ iyi na m ga-enye nna nna unu hà.
43 Unu ga-anọkwa ebe ahụ cheta àgwà unu niile na ihe niile unu mere, ndị unu ji merụọ onwe unu.+ Ihere onwe unu ga na-emekwa unu* n’ihi ihe ọjọọ niile unu mere.+
44 Ndị Izrel, unu ga-amarakwa na m bụ Jehova mgbe m mere unu ihe maka aha m,+ ma ghara imeso unu otú àgwà unu jọruru ná njọ ma ọ bụ otú unu kparuru arụ.’ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.”
45 Jehova gwakwara m okwu ọzọ, sị:
46 “Nwa nke mmadụ, chee ihu ná mpaghara ndịda, gwa ebe ndịda okwu, buokwa amụma ihe a ga-eme oké ọhịa dị n’ebe ndịda.
47 Gwa oké ọhịa dị n’ebe ndịda, sị: ‘Nụrụ ihe Jehova kwuru. Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: “M ga-esunye gị ọkụ.+ Ọ ga-erepịakwa osisi ọ bụla dị ndụ na osisi ọ bụla kpọrọ nkụ dị n’ime gị. A gaghị emenyụ ọkụ ahụ.+ Ọ ga-achakpọkwa ihu niile malite n’ebe ndịda ruo n’ebe ugwu.
48 Mmadụ* niile ga-amakwa na ọ bụ mụnwa, bụ́ Jehova, sunyere ya ọkụ nakwa na a gaghị emenyụ ya emenyụ.”’”+
49 M wee sị: “Ewoo, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova! Ha na-ekwu banyere m, sị, ‘Naanị ilu ka ọ na-atụ.’”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọ ga-abụ afọ nke asaa a dọọrọ Eze Jehoyakim, Ezikiel, na ndị Juu ndị ọzọ n’agha.
^ Ma ọ bụ “ị̀ ga-agwa ha ihe e kpebiri ime ha?”
^ Na Hibru, “mkpụrụ.”
^ Na Hibru, “m weliri aka elu.”
^ Ma ọ bụ “m nyopụtaara ha otú ọ dị.”
^ Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.
^ Ma ọ bụ “Ọ bụ ihe e ji chọọ.”
^ Ọ ga-abụ na ihe a kpọrọ arụsị ndị ahụ n’asụsụ Hibru bụ nwanne okwu Hibru ọzọ nke pụtara “nsị.” E ji ya egosi na ihe na-asọ oyi.
^ Ya bụ, ndị Izrel.
^ Ya bụ, ndị Izrel.
^ Ya bụ, ndị Izrel.
^ Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.
^ Ma ọ bụ “ala e ji chọọ.”
^ Na Hibru, “anya m meteere ha ebere.”
^ Ya bụ, ndị Izrel.
^ Na Hibru, “anya ha dịkwa n’arụsị.”
^ Na Hibru, “mmụọ.”
^ Ma ọ bụ “ndị na-ejere osisi na nkume ozi.”
^ Na Hibru, “Ihu unu ga-egosikwa na ihere onwe unu na-eme unu.”
^ Na Hibru, “Anụ ahụ́.”