Ezikiel 23:1-49
23 Jehova gwara m okwu ọzọ, sị:
2 “Nwa nke mmadụ, e nwere ụmụ nwaanyị abụọ otu nne ji.+
3 Ha malitere ịgba akwụna n’Ijipt.+ Ha bidoro ịgba akwụna mgbe ha bụ ụmụ agbọghọ. N’ebe ahụ ka a nọ pịa ha aka n’ara. A pịrị ha aka n’ara n’oge ha na-amabeghị nwoke.
4 Aha nke okenye bụ Ohola,* aha nke ntakịrị abụrụ Oholiba.* Ha ghọrọ ndị nke m, mụọkwara m ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. Ohola bụ Sameria,+ Oholiba abụrụ Jeruselem.
5 “Ohola malitekwara ịgba akwụna+ mgbe ọ bụ nke m. Ọ na-agụsi ya ike ka ya na ndị Asiria, bụ́ ndị agbata obi ya,+ ha na ya na-eme enyi, dinaa.+
6 Ha bụ ndị gọvanọ ndị yi uwe na-acha anụnụ anụnụ na ndị osote onye na-achị achị. Ha niile bụcha ụmụ okorobịa mara mma, ndị ịgba ịnyịnya doro anya.
7 Ọ nọ na-agba akwụna, ya na ndị niile kacha mma n’ụmụ nwoke ndị Asiria ana-edina. O jikwa arụsị ha dị iche iche na-asọ oyi* merụọ onwe ya,+ ya bụ, arụsị nke ndị ahụ ọ na-agụsi ya ike ka ya na ha dinaa.
8 Ọ hapụghị akwụna ọ malitere ịgba n’Ijipt, n’ihi na ha na ya dinara mgbe ọ bụ nwa agbọghọ. Ha pịkwara ya aka n’ara mgbe ọ na-amabeghị nwoke. Ha nọkwa na-achụ ya ka ha na ya dinaa.*+
9 Ọ bụ ya mere m ji nyefee ya n’aka ndị ya na ha na-eme enyi, ya bụ, ndị Asiria,+ ndị ọ na-achọsi ike ka ya na ha dinaa.
10 Ha gbara ya ọtọ,+ kpụrụ ụmụ ya ndị nwoke na ụmụ ya ndị nwaanyị,+ jirikwa mma agha gbuo ya. Ụmụ nwaanyị makwa ya ka onye ọjọọ. Ndị Asiria takwara ya ahụhụ.
11 “Mgbe nwanne ya nwaanyị bụ́ Oholiba hụrụ ihe ọ na-eme, ịkwa iko gụsiwere ya ike, akwụna nke ya akarịzie nke nwanne ya nwaanyị.+
12 Ọ nọ na-achọsi ike ka ya na ndị Asiria, bụ́ ndị agbata obi ya, dinaa,+ ya bụ, ndị gọvanọ na ndị osote onye na-achị achị. Ha na-eyi uwe mara ezigbo mma, na-agbakwa ịnyịnya. Ha niile bụcha ụmụ okorobịa mara mma.
13 Mgbe o merụrụ onwe ya, m hụrụ na ha abụọ na-akpa otu àgwà.+
14 Ma ọ nọ na-agbakwu akwụna. Ọ hụrụ ụmụ nwoke ndị Kaldia a tụrụ n’ahụ́ ụlọ. E ji ihe na-acha uhie uhie* tụọ ha.
15 Ha kere ájị̀ n’úkwù, keekwa ogologo ákwà n’isi. Ha yiri ndị dike n’agha. Ha niile yiri ndị Babịlọn, ndị a mụrụ n’ala ndị Kaldia.
16 Ozugbo ọ hụrụ ha, ọ malitere ịchọ ka ya na ha kwaa iko. O zikwara ndị mmadụ ka ha gaa Kaldia zie ha ozi.+
17 Ndị Babịlọn nọkwa na-abịa, ha na ya ana-akwa iko n’àkwà* ya. Mgbe ha merụchara ya, ọ* jụrụ ha maka na ha na-asọzi ya oyi.
18 “Ebe ọ nọ na-agba akwụna n’asọghị anya, na-agbakwa onwe ya ọtọ,+ ihe ya sọwara m oyi, mụ ajụ ya otú m* jụrụ nwanne ya nwaanyị.+
19 Ọ nọ na-agba akwụna n’ike n’ike,+ nke na o chetara mgbe ọ bụ nwa agbọghọ nọrọ n’Ijipt na-agba akwụna.+
20 Ọ na-agụ ya agụụ ka ya na ndị ha na ya na-eme enyi dinaa. Ọ na-akpa àgwà ka ndị iko ụmụ nwoke ihe ha ji bụrụ nwoke yiri nke jakị na nke ịnyịnya.
21 Oholiba, ị na-achọsi ike ịna-eme omume rụrụ arụ i mere mgbe ị bụ nwa agbọghọ, n’oge ị nọ n’Ijipt+ ha ana-apị gị aka n’ara.+
22 “N’ihi ya, Oholiba, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru gbasara gị, sị, ‘M ga-eme ka ndị gị na ha na-eme enyi mee gị ihe,+ ya bụ, ndị ihe ha sọwara gị* oyi gị ajụ ha. M ga-esi ná mpaghara niile kpọta ha ka ha mee gị ihe.+
23 Ndị m ga-akpọta bụ ndị Babịlọn+ na ndị Kaldia niile,+ ndị Pikọd+ na Shoa na Koa, ha na ndị Asiria niile. Ha niile bụ ụmụ okorobịa mara mma. Ha bụ ndị gọvanọ na ndị osote onye na-achị achị, ndị dike n’agha na ndị a na-akwanyere ùgwù.* Ha niile na-agba ịnyịnya.
24 Ha na ìgwè ndị agha ga-eji ụgbọ ịnyịnya agha ndị ụkwụ ha na-eme mkpọtụ bata lụso gị agha. Ha ga-ejikwa ọta ukwu na ọta nta na okpu agha. Ha ga-agba gị gburugburu lụso gị agha. M ga-enyekwa ha ikike ka ha kpee gị ikpe. Ha ga-ekpekwa gị ikpe otú masịrị ha.+
25 M ga-ewesa gị iwe. Ha ga-ejikwa ezigbo iwe mee gị ihe. Ha ga-ebepụ ma imi gị ma ntị gị. A ga-ejikwa mma agha gbuo ndị gị fọrọ afọ. Ha ga-akpọrọ ụmụ gị ndị nwoke na ụmụ gị ndị nwaanyị. Ọkụ ga-erepịakwa ndị gị fọrọ afọ.+
26 Ha ga-eyipụ gị uwe gị,+ jichiekwa ọmarịcha ihe ndị i ji achọ mma.+
27 M ga-eme ka ị kwụsị omume rụrụ arụ ị na-eme nakwa akwụna+ ị malitere ịgba n’Ijipt.+ Ị ga-akwụsị ile ha anya. Ị gaghịkwa echeta Ijipt ọzọ.’
28 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘Obere oge ugbu a, m ga-enyefe gị n’aka ndị ị kpọrọ asị, ndị ị* jụrụ maka na ha na-asọ gị oyi.+
29 Ha ga-eji obi ọjọọ napụ gị ihe niile ị tara ahụhụ nweta,+ gbaakwa gị ọtọ, gị aghara iyi uwe ọ bụla. A ga-eme ka a mara iko ị na-akwa na omume rụrụ arụ ị na-eme nakwa akwụna ị na-agba.+
30 A ga-eme gị ihe ndị a n’ihi na ị na-achụ mba dị iche iche dị ka nwaanyị akwụna.+ I jirikwala arụsị ha dị iche iche na-asọ oyi merụọ onwe gị.+
31 Ị na-akpa àgwà ka nwanne gị nwaanyị.+ M ga-ewerekwa iko ya nye gị.’+
32 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị:
‘Ị ga-aṅụ ihe nwanne gị nwaanyị ṅụrụ, ya bụ, ihe dị n’iko dị ogologo ma saa mbara.+
A ga na-achị gị ọchị, na-akwakwa gị emo, n’ihi na ihe dị n’iko ahụ hiri nne.+
33 Ị ga-aṅụ ihe dị n’iko nwanne gị nwaanyị bụ́ Sameria, ṅụjuo afọ.
Ị ga-aṅụrọ anya, rujuokwa uju afọ.
Ihe a ga-eme gị ga-eju ndị mmadụ anya. Ị ga-atọgbọrọkwa nkịtị.
34 Ị ga-aṅụ ihe dị n’iko ahụ, ṅụkpọọ ya.+ Iko ahụ ga-akụri, gị ataa mpekere ya.
Ị ga-adọpụkwa ara gị abụọ.
“Ọ bụ mụnwa kwuru ya.” Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.’
35 “N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘Ebe ọ bụ na i chefuola m, o nweghịkwa ihe i ji m kpọrọ,*+ ị ga-ata ahụhụ maka omume rụrụ arụ ị na-eme nakwa maka akwụna ị na-agba.’”
36 Jehova gwaziri m, sị: “Nwa nke mmadụ, m chọrọ ka ị gwa Ohola na Oholiba+ na ikpe mara ha, gwakwa ha arụ niile ha na-akpa.
37 Ha na-akwa iko,*+ ọbara dịkwa ha n’aka. Ọ bụghị naanị na ha na arụsị ha dị iche iche na-asọ oyi na-akwa iko, kamakwa, ha na-akpọ ụmụ ha mụụrụ m ọkụ iji chụọrọ arụsị dị iche iche àjà, arụsị ndị a ejirikwa ha mere nri.+
38 Ihe ọzọ ha mere m bụ na ha merụrụ ụlọ nsọ m n’otu ụbọchị ahụ ha ji ụmụ ha chụọ àjà. Ha mebikwara ụbọchị izu ike m.
39 Mgbe ha ji ụmụ ha chụchaara arụsị ha dị iche iche na-asọ oyi àjà,+ ha bịara n’ụlọ nsọ m n’otu ụbọchị ahụ ma merụọ ya.+ Ihe a ka ha mere n’ime ụlọ nsọ m.
40 Ha ziri mmadụ ozi ka ọ gaa ebe dị anya kpọọ ndị mmadụ ka ha bịa.+ Mgbe ndị ahụ ọ kpọrọ nọ na-abịa, gịnwa bụ́ Oholiba sara ahụ́, tee uri anya, jirikwa ihe dị iche iche e ji achọ mma chọọ onwe gị mma.+
41 Ị nọdụkwara ọdụ n’otu ọmarịcha oche,+ nke a dọsara tebụl n’ihu ya.+ I dosakwara insens m+ na mmanụ m+ n’elu tebụl ahụ.
42 A nụkwara mkpọtụ ìgwè mmadụ na-ejighị ihe akpọrọ ihe nọ n’ụlọ nsọ m na-eme. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị aṅụrụma e si n’ala ịkpa kpọrọ bịa. Ha gbanyekwara ụmụnne abụọ ahụ ọla n’aka, kpuwekwa ha okpueze mara mma.
43 “M kwuziri banyere nwaanyị ahụ ahụ́ gwụrụla n’ihi ịkwa iko, sị: ‘Ọ ka ga na-agba akwụna.’
44 Ndị mmadụ nọ na-abịakwute ya otú e si abịakwute nwaanyị na-agba akwụna. Ọ bụ otú ahụ ka ha si na-abịakwute Ohola na Oholiba, bụ́ ụmụ nwaanyị na-eme omume rụrụ arụ.
45 Ma, ọ bụ ndị ezi omume ga-ekpe ya* ikpe e kwesịrị ikpe ndị na-akwa iko+ na ndị na-egbu mmadụ.*+ A ga-ekpe ha ikpe maka na ha bụ ụmụ nwaanyị na-akwa iko, ọbara dịkwa n’aka ha.+
46 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘A ga-akpọkọta ndị agha ka ha bịa lụso ha agha. Ha ga-emekwa ha ihe ga-eju ndị mmadụ anya, bukọrọkwa ihe ha.+
47 Ndị agha ahụ ga-atụ ha nkume,+ jirikwa mma agha ha gbuo ha. Ha ga-egbu ụmụ ha ndị nwoke na ụmụ ha ndị nwaanyị,+ gbaakwa ụlọ ha ọkụ.+
48 M ga-emekwa ka a kwụsị ime omume rụrụ arụ n’obodo a. Ụmụ nwaanyị niile ga-amụta ihe n’ihe mere unu. Ha agaghịkwa eme omume rụrụ arụ unu na-eme.+
49 Ndị agha ahụ ga-ata unu ahụhụ maka omume rụrụ arụ unu na-eme nakwa maka ofufe unu na-efe arụsị unu dị iche iche na-asọ oyi. Unu ga-amarakwa na m bụ Ọkaakaa Onyenwe unu bụ́ Jehova.’”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Oholiba pụtara “Ụlọikwuu M Dị n’Ime Ya.”
^ Ohola pụtara “Ụlọikwuu Ya.”
^ Ọ ga-abụ na ihe a kpọrọ arụsị ndị ahụ n’asụsụ Hibru bụ nwanne okwu Hibru ọzọ nke pụtara “nsị.” E ji ya egosi na ihe na-asọ oyi.
^ Ma ọ bụ “kwaa iko.”
^ Ma ọ bụ “ọbara ọbara.”
^ Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”
^ Na Hibru, “ndị a na-akpọ òkù.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”
^ Na Hibru, “ị gbakụtala m azụ.”
^ Ya bụ, ha hapụrụ Chineke, gaa fewe arụsị.
^ Ma ọ bụ “na-awụfu ọbara.”
^ Ọ ga-abụ Oholiba ka a na-ekwu gbasara ya.