Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Anyaụfụ Nwere Ike Imebi Uche Anyị

Anyaụfụ Nwere Ike Imebi Uche Anyị

Anyaụfụ Nwere Ike Imebi Uche Anyị

Napoleon Bonaparte nwere ya. Julius Caesar nwere ya. Alexander Onye Ukwu nwere ya. N’agbanyeghị na ndị a niile dị ike, aha ha edeekwa ude, e nwere ihe dị ha n’obi nke nwere ike imebi uche ha. Onye nke ọ bụla n’ime ha atọ nwere onye o nweere anyaụfụ.

Otu ọkà ihe ọmụma, bụ́ onye Ingland, kwuru na “Napoleon nweere Caesar anyaụfụ, Caesar enweere Alexander [Onye Ukwu] anyaụfụ, ikekwe, Alexander nweere Hercules, bụ́ onye na-enweghịdị mgbe ọ dịrị ndụ, anyaụfụ.” E nweghị onye na-enweghị ike inwe anyaụfụ, ma ọgaranya, ma onye ma ihe, ma onye ihe gaziiri.

Onye nwere anyaụfụ bụ onye ihe ndị ọzọ nwere na-afụ ụfụ n’obi. Otu akwụkwọ nke na-akọwa ihe e dere na Baịbụl kọwara ihe dị iche n’anyaụfụ na ekworo. Ọ sịrị: “‘Ekworo’ . . . pụtara mmadụ ịchọ ka ihe na-agaziri ya otú o si agaziri onye ọzọ, ebe ‘anyaụfụ’ pụtara mmadụ ịchọ ịnapụ onye ọzọ ihe o nwere.” Ọ bụghị naanị na ihe ndị ọzọ nwere anaghị adị onye anyaụfụ mma n’obi, kama ọ na-achọkwa ịnapụ ha ihe ahụ.

Ọ ga-adị mma ma anyị tụlee ihe nwere ike ime ka anyị nwee anyaụfụ na ihe inwe anyaụfụ nwere ike ịkpatara anyị. Ihe dịkwa ezigbo mkpa anyị kwesịrị ịma bụ ihe ndị anyị nwere ike ime ka anyị ghara ịna-enwe anyaụfụ.

IHE NWERE IKE IME KA MMADỤ NA-ENWE ANYAỤFỤ

Ọ bụ eziokwu na ụmụ mmadụ na-ezughị okè nwere “mmụọ nke anyaụfụ,” e nwere ọtụtụ ihe ndị nwere ike ime ka anyaụfụ gbanyesie mgbọrọgwụ ike n’obi mmadụ. (Jems 4:5) Pọl onyeozi kwuru otu n’ime ihe ndị ahụ. O dere, sị: “Ka anyị ghara ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, na-akpali ịsọ mpi n’etiti onwe anyị, na-enwere ibe anyị anyaụfụ.” (Gal. 5:26) Ọ bụrụ na anyị na-asọrịta mpi, o nwere ike ime ka anyị nwewe anyaụfụ. Ndị Kraịst abụọ aha ha bụ́ Cristina na José * chọpụtara na nke a bụ eziokwu.

Cristina, bụ́ onye ọsụ ụzọ oge niile, sịrị: “M na-enwekarịrị ndị ọzọ anyaụfụ. Ọ na-adị m ka ya bụrụ m nwe ihe ndị ha nwere.” E nwere mgbe Cristina na otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na nwunye ya nọ na-eri nri. Mgbe ọ chọpụtara na ya na di ya na onye nlekọta ahụ na nwunye ya bụ ọgbọ, jeekwa otu ụdị ozi n’oge gara aga, ọ sịrị: “Di m bụkwa okenye! Oleezi ihe mere e ji họpụta unu ka unu na-aga eleta ọgbakọ dị iche iche ma a họpụtaghị anyịnwa?” Anyaụfụ o nwere n’ihi na o ji ya na di ya na-atụnyere ndị ọzọ mere ka ọ ghara ịchọpụta na ya na di ya na-arụkwa ọrụ dị mma. Nke a mekwara ka ọ dị ya ka o nweghị uru ha bara.

José chọrọ ịbụ ohu na-eje ozi. Mgbe a họpụtara ndị ọzọ ma a họpụtaghị ya, ọ malitere inwere ha anyaụfụ, malitekwa iburu onye na-ahaziri òtù ndị okenye ọrụ iwe n’obi. José kwuru, sị: “Anyaụfụ mere ka m kpọọ nwanna nwoke a asị, meekwa ka m na-enyo ya enyo. Onye anyaụfụ na-amalite ịchọ naanị ọdịmma onwe ya, nke a na-emekwa ka ọ ghara ịna-eche echiche otú kwesịrị ekwesị.”

IHE AKỤKỌ NDỊ DỊ NA BAỊBỤL NA-AKỤZIRI ANYỊ

E nwere ọtụtụ akụkọ ndị dị na Baịbụl bụ́ ndị na-akụziri anyị ihe. (1 Kọr. 10:11) Ụfọdụ n’ime akụkọ ndị a na-egosi anyị otú mmadụ si amalite inwe anyaụfụ nakwa otú anyaụfụ si laa ndụ ndị nwere ya n’iyi.

Dị ka ihe atụ, nwa mbụ Adam na Iv mụrụ, bụ́ Ken, were iwe mgbe Jehova nabatara àjà Ebel nwanne ya chụrụ ma ọ nabataghị nke ya. Ken gaara ejide onwe ya, ma anyaụfụ mere ka o gbuo nwanne ya. (Jen. 4:4-8) Ka a sịkwa ihe mere Baịbụl ji kwuo na Ken “sitere n’ajọ onye ahụ,” bụ́ Setan!—1 Jọn 3:12.

Ụmụnne iri n’ime ụmụnne Josef nweere ya anyaụfụ n’ihi na Josef na nna ha dị n’ezigbo mma. Ha kpọkwuru Josef asị mgbe ọ kọọrọ ha nrọ ọ rọrọ. Ha chọdịrị igbu ya. Ha mechara ree ya ka ọ gaa gbawa ohu, jirikwa aghụghọ mee ka nna ha chee na Josef anwụọla. (Jen. 37:4-11, 23-28, 31-33) Ha mechara kwuo mgbe ọtụtụ afọ gachara, sị: “O doro anya na anyị bụ ndị ikpe mara n’ihe metụtara nwanne anyị nwoke, n’ihi na anyị hụrụ otú mkpụrụ obi ya si nọrọ ná mwute mgbe ọ nọ na-arịọ anyị ka anyị nweere ya ọmịiko, ma anyị egeghị ntị.”—Jen. 42:21; 50:15-19.

Kora, Detan, na Abaịram malitere iji ihe ùgwù ha nwere tụnyere nke Mozis na Erọn. Nke a mere ka ha nwewere Mozis na Erọn anyaụfụ. Ha boro Mozis ebubo na ọ ‘na-eme onwe ya onyeisi’ nakwa na ọ na-eme ka ọ̀ ka ndị ọzọ. (Ọnụ Ọgụ. 16:13) Ebubo a abụghị eziokwu. (Ọnụ Ọgụ. 11:14, 15) Ọ bụ Jehova họpụtara Mozis. Ma, ndị nnupụisi a na-enwere Mozis anyaụfụ n’ihi ihe ùgwù e nyere ya. Jehova mechara laa ha n’iyi n’ihi anyaụfụ ha nwere.—Ọma 106:16, 17.

Eze Sọlọmọn hụkwara ihe anyaụfụ nwere ike ime. Otu nwaanyị nwa ọ mụrụ ọhụrụ nwụrụ gbalịrị ịmanye nwaanyị ọzọ ya na ya bi ka o kweta na ọ bụ nwa nke ya nwụrụ. Mgbe Eze na-eleba anya n’okwu ahụ, nwaanyị aghụghọ ahụ kwetara ka e gbuo nwa ahụ dị ndụ. Ma, Sọlọmọn hụrụ na e kunyere nne mụrụ nwa ahụ nwa ya.—1 Eze 3:16-27.

Anyaụfụ nwere ike imebi ihe. Akụkọ ndị a anyị tụlere, bụ́ ndị si na Baịbụl, gosiri na anyaụfụ nwere ike ime ka mmadụ kpọọ mmadụ ibe ya asị, mee ka mmadụ kpee ikpe na-ezighị ezi, ma ọ bụkwanụ gbuo mmadụ ibe ya. Na nke ọ bụla n’ime akụkọ ndị ahụ anyị tụlere, onye e nweere anyaụfụ enweghị ihe o mere onye nweere ya anyaụfụ. Olee ihe ndị anyị nwere ike ime ka anyị wee ghara ịna-enwe anyaụfụ?

IHE NDỊ NWERE IKE IME KA ANYỊ GHARA ỊNA-ENWE ANYAỤFỤ

Hụ ụmụnna gị n’anya. Pita onyeozi dụrụ Ndị Kraịst ọdụ, sị: “Ebe unu meworo ka mkpụrụ obi unu dị ọcha site n’isi unu na-erubere eziokwu ahụ nke mere ka unu nwee ịhụnanya ụmụnna nke na-abụghị nke ihu abụọ, nweenụ ịhụnanya siri ike n’ebe ibe unu nọ site n’obi unu.” (1 Pita 1:22) Gịnị bụ ịhụnanya? Pọl onyeozi dere, sị: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma. Ịhụnanya adịghị ekwo ekworo, ọ dịghị etu ọnụ, ọ dịghị afụli onwe ya elu, ọ dịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị, ọ dịghị achọ ọdịmma nke ya.” (1 Kọr. 13:4, 5) Ọ bụrụ na anyị esi n’obi anyị hụ ndị ọzọ n’anya otú e kwuru ebe a, ọ ga-eme ka anyị ghara ịna-enwe anyaụfụ. (1 Pita 2:1) Kama Jọnatan ga-enwewere Devid anyaụfụ, ọ ‘hụrụ ya n’anya dị ka mkpụrụ obi nke ya.’—1 Sam. 18:1.

Gị na ndị Chineke na-akpakọrịta. Onye rọrọ Abụ Ọma nke 73 nweere ndị ajọ omume anyaụfụ n’ihi na ha anaghị enwe nsogbu ndị ọzọ na-enwe. Ma, ihe nyeere ya aka ịkwụsị inwe anyaụfụ bụ ọgịga ọ gara “ná nnukwu ebe nsọ Chineke.” (Ọma 73:3-5, 17) Mkpakọrịta ọbụ abụ ahụ na ndị ha na ya na-efe Chineke nyeere ya aka ịghọta uru “ịbịaru Chineke nso” baara ya. (Ọma 73:28) Ọ bụrụkwa na anyị na ụmụnna anyị ana-akpakọrịta n’ọmụmụ ihe, anyị ga-aghọtakwa na ịbịaru Chineke nso na-abara anyị ezigbo uru.

Na-eme ihe dị mma. Mgbe Chineke chọpụtara na Ken na-enwere nwanne ya anyaụfụ nakwa na ọ kpọrọ ya asị, Chineke gwara ya, sị: “Gbanwee mewe ezi ihe.” (Jen. 4:7) Olee ihe ọ ga-abụ Ndị Kraịst na-eme, ya abụrụ na ha ‘na-eme ezi ihe’? Jizọs kwuru na anyị ‘kwesịrị iji obi anyị dum na mkpụrụ obi anyị dum na uche anyị dum hụ Jehova bụ́ Chineke anyị n’anya nakwa na anyị kwesịrị ịhụ onye agbata obi anyị n’anya dị ka onwe anyị.’ (Mat. 22:37-39) Obi ụtọ anyị na-enwe n’ihi na anyị ji ndụ anyị na-ejere Jehova ozi ma na-enyere ndị ọzọ aka ka ha mụta ime uche ya na-eme ka anyị ghara ịna-enwere ndị ọzọ anyaụfụ. Ụzọ dị mma anyị si ejere Chineke na ndị agbata obi anyị ozi bụ ikwusa ozi ọma na ime ka ndị ọzọ ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Nke a na-emekwa ka anyị nweta “ngọzi Jehova.”—Ilu 10:22.

‘Soro ndị na-aṅụrị ọṅụ ṅụrịa ọṅụ.’ (Rom 12:15) Jizọs ṅụrịrị ọṅụ mgbe ihe gaara ndị na-eso ụzọ ya nke ọma. O kwudịrị na ha ga-ekwusa ozi ọma karịa yanwa. (Luk 10:17, 21; Jọn 14:12) Ndị ohu Jehova dị n’otu. Obi na-atọ anyị niile ụtọ ma ihe ọma meere onye ọ bụla n’ime anyị. (1 Kọr. 12:25, 26) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-aṅụrị ọṅụ mgbe ndị ọzọ nwetara ihe ùgwù, kama inwewere ha anyaụfụ.

Ọ DỊGHỊ MFE ỊKWỤSỊ INWE ANYAỤFỤ

Onye chọrọ ịkwụsị inwe anyaụfụ ga-agbasiriri mbọ ike tupu ya akwụsị ya. Cristina kwuru, sị: “Ọ ka na-esiri m ike ịkwụsị inwe anyaụfụ. M ka na-enwe anyaụfụ n’agbanyeghị na obi adịghị m mma na m na-enwe ya. M na-agbasikwa mbọ ike ịkwụsị ya.” José na-agbasikwa mbọ ike ịkwụsị nke ya. Ọ sịrị: “Jehova nyeere m aka ilekwasị anya n’ebe ndị onye na-ahaziri òtù ndị okenye anyị ọrụ na-eme nke ọma. Adịm ná mma mụ na Chineke enyekwarala m ezigbo aka.”

Anyaụfụ so ‘n’ọrụ nke anụ ahụ́’ ndị Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka ọ ghara inwe. (Gal. 5:19-21) Ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike ghara ịna-enwe anyaụfụ, anyị ga-enwe ike ime ihe dị Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova mma.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Aha a a kpọrọ ha abụghị ezigbo aha ha.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 17]

‘Soro ndị na-aṅụrị ọṅụ ṅụrịa ọṅụ’