Ọnụ Ọgụgụ 16:1-50
16 Kora+ nwa Izha,+ nwa Kohat,+ nwa Livaị,+ ya na Detan na Abaịram bụ́ ụmụ Elayab,+ nakwa Ọn nwa Pilet, bụ́ ụmụ Ruben,+ wee zukọta.
2 Ha malitere ịma Mosis aka, ha na narị ụmụ nwoke abụọ na iri ise (250) ndị Izrel, bụ́ ndị isi nzukọ ahụ, ndị e si n’ọgbakọ ahụ họrọ, ụmụ nwoke a ma ama.
3 Ha zukọtara na-akatọ+ Mosis na Erọn. Ha sịrị ha: “O zuolara unu! Nzukọ a niile dị nsọ,+ Jehova nọnyekwaara ha.+ Gịnịzi mere unu ga-eji na-ebuli onwe unu elu n’ọgbakọ Jehova?”
4 Mgbe Mosis nụrụ ihe a, o gburu ikpere n’ala ozugbo, kpudo ihu n’ala.
5 O wee gwa Kora na ndị niile na-akwado ya, sị: “N’ụtụtụ, Jehova ga-eme ka a mara onye bụ́ onye nke ya+ na onye dị nsọ na onye ga na-abịa ya nso.+ Ọ bụ onye ọ bụla ọ họọrọ+ ga na-abịa ya nso.
6 Kora, gị na ndị niile na-akwado gị,+ meenụ ihe a: Werenụ ihe ndị e ji amụ insens,+
7 gụnyenụ ọkụ na ha echi ma tụkwasị insens* na ha n’ihu Jehova. Ọ bụ onye Jehova ga-ahọrọ+ bụ onye dị nsọ. Ụmụ Livaị,+ nsogbu unu akarịala!”
8 Mosis wee gwa Kora, sị: “Biko, geenụ ntị, unu ụmụ Livaị.
9 Ọ̀ bụụrụ unu obere ihe na Chineke Izrel si ná nzukọ Izrel wepụta unu iche+ ma kwe ka unu na-abịa ya nso ka unu wee na-arụ ọrụ gbasara ụlọikwuu Jehova nakwa ka unu na-eguzo n’ihu nzukọ a na-ejere ha ozi?+
10 Ọ̀ bụkwaara unu obere ihe na ọ kpọtara gị na ụmụnne gị niile, bụ́ ụmụ Livaị, ka unu nọrọ ya nso? Ùnu chọkwuru ka unu bụrụ ndị nchụàjà?+
11 N’ihi ya, ọ bụ Jehova ka gị na ndị niile na-akwado gị na-ama aka. Ma ònye ka Erọn bụ mere unu ga-eji na-akatọ ya?”*+
12 Mosis mechara zie ozi ka Detan na Abaịram,+ ụmụ Elayab, bịa. Ma ha sịrị: “Anyị agaghị abịa!
13 Ọ̀ bụ obere ihe na i si n’ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya* kpọpụta anyị ka i gbuo anyị n’ala ịkpa a?+ Ugbu a, ị̀ chọkwuru ime onwe gị onyeisi anyị?*
14 Ka ọ dị ugbu a, ị kpọbabeghị anyị n’ala ọ bụla mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.*+ I nyebeghịkwa anyị ala na ubi vaịn. Ị̀ ga-aghụpụta ụmụ nwoke ndị ahụ anya?* Anyị agaghị abịa!”
15 N’ihi ya, ezigbo iwe were Mosis, ya asị Jehova: “Elela àjà ọka ha anya. E nweghị jakị ọ bụla m naara ha, emejọghịkwa m otu onye n’ime ha.”+
16 Mosis wee gwa Kora, sị: “Gị na ndị niile na-akwado gị, bịanụ n’ihu Jehova echi, gị na ha na Erọn.
17 Onye ọ bụla were ihe ọ ga-eji amụ insens ma tụkwasị insens* na ya. Onye ọ bụla n’ime unu ga-eweta ihe ọ ga-eji amụ insens n’ihu Jehova, ya bụ, narị ihe e ji amụ insens abụọ na iri ise (250), ma gịnwa ma Erọn. Onye ọ bụla n’ime unu ga-eji ihe ọ ga-eji amụ insens bịa.”
18 Onye ọ bụla n’ime ha wee were ihe ọ ga-eji mụọ insens, tinye ọkụ na ya, tụkwasịkwa insens* na ya ma guzoro n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute, ha na Mosis na Erọn.
19 Mgbe Kora kpọkọtara ndị na-akwado ya+ ka ha maa ha aka n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute, ebube Jehova pụtara n’ihu nzukọ ahụ niile.+
20 Jehova gwaziri Mosis na Erọn, sị:
21 “Sinụ n’ebe ìgwè mmadụ a nọ pụọ ka m wee bibie ha n’otu ntabi anya.”+
22 Ha wee gbuo ikpere n’ala ma kpudo ihu n’ala, sị: “Biko, Chineke, gị onye na-enye mmadụ niile ndụ,*+ mmehie otu onye mere ọ̀ ga-eme ka i wesa nzukọ a niile iwe?”+
23 Jehova wee sị Mosis:
24 “Gwa nzukọ a okwu, sị ha, ‘Sinụ na gburugburu ebe ụlọikwuu Kora, Detan, na Abaịram dị pụọ!’”+
25 Mosis biliri gakwuru Detan na Abaịram, ndị okenye+ Izrel sokwa ya gaa.
26 Ọ gwara nzukọ ahụ, sị: “Biko, sinụ n’ebe ụlọikwuu ndị ajọ omume a dị pụọ. Unu emetụkwala ihe ọ bụla bụ́ nke ha aka, ka e wee ghara ibibi unu n’ihi mmehie niile ha mere.”
27 Ha si na gburugburu ebe ụlọikwuu Kora, Detan, na Abaịram dị pụọ ozugbo. Detan na Abaịram pụtara guzoro n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ha, ha na ndị nwunye ha, ụmụ ha ndị torola eto, na ụmụntakịrị ha.
28 Mosis wee sị: “Unu ga-eji ihe a mara na ọ bụ Jehova zitere m ka m mee ihe a niile, na ọ bụghị m chepụtara ha:
29 Ọ bụrụ na ndị a anwụọ otú mmadụ niile si anwụ, ọ bụrụkwa na a taa ha ahụhụ otú e si ata mmadụ niile ahụhụ, maranụ na ọ bụghị Jehova zitere m.+
30 Ma ọ bụrụ na Jehova ga-eme ha ihe pụrụ iche, mee ka ala meghee* loo ha na ihe niile bụ́ nke ha, ha abanye n’ili* ná ndụ, unu ga-amara n’eziokwu na ụmụ nwoke ndị a akparịala Jehova.”
31 Ozugbo o kwuchara ihe a niile, ala ebe ha zọkwasịrị ụkwụ gbawara.+
32 Ala wee meghee* loo ha na ezinụlọ ha na ndị niile na-akwado Kora+ nakwa ngwongwo ha niile.
33 Ha na ndị niile na-akwado ha banyere n’ili* ná ndụ, ala ekpuchie ha. Ha wee laa n’iyi.*+
34 Ndị Izrel niile nọ ha gburugburu wee gbaa ọsọ mgbe ha nụrụ mkpu ha, n’ihi na ha sịrị: “Anyị na-atụ egwu na ala nwere ike ilo anyị!”
35 Jehova wee zite ọkụ,+ ya eregbuo narị ụmụ nwoke abụọ na iri ise (250) ahụ, ndị nọ na-achụ insens* n’àjà.+
36 Jehova gwaziri Mosis, sị:
37 “Gwa Elieza nwa Erọn onye nchụàjà ka o si n’ọkụ ahụ wepụtasịa ihe ndị ahụ e ji amụ insens+ n’ihi na ihe ndị ahụ dị nsọ. Gwakwa ya ka ọ wụsasịa ọkụ ahụ n’ebe dịtụ anya.
38 A ga-eji ihe ndị ahụ e ji amụ insens, bụ́ ndị ụmụ nwoke ahụ mere mmehie ma kpatara onwe ha ọnwụ ji mụọ insens, rụọ mbadamba ọla ndị dị fere fere a ga-eji machie ebe ịchụàjà,+ n’ihi na ha wetara ihe ndị ahụ n’ihu Jehova, ihe ndị ahụ ewee dị nsọ. Ha ga-abụrụ ndị Izrel ihe àmà.’”+
39 Elieza onye nchụàjà weere ihe ndị ahụ e ji amụ insens, bụ́ ndị e ji ọla kọpa mee, ya bụ, ihe ndị ahụ ọkụ regburu wetara, ma kụọ ha ka ha dị mbadamba ka e jiri ha machie ebe ịchụàjà,
40 otú Jehova si n’ọnụ Mosis gwa ya. Ọ bụ ihe na-echetara ndị Izrel na onye na-abụghị onye nchụàjà,* onye na-abụghịkwa nwa Erọn, agaghị abịa nso ka ọ mụọ insens n’ihu Jehova+ nakwa na onye ọ bụla ekwesịghị ịdị ka Kora na ndị kwadoro ya.+
41 N’echi ya, nzukọ Izrel niile malitere ịkatọ* Mosis na Erọn,+ sị: “Unu abụọ egbusịala ndị Jehova.”
42 Mgbe nzukọ ahụ zukọtara na-akatọ Mosis na Erọn, ha tụgharịrị chee ihu n’ụlọikwuu nzute, ígwé ojii wee kpuchie ụlọikwuu ahụ, ebube Jehova malitekwara ịpụta.+
43 Mosis na Erọn gara n’ihu ụlọikwuu nzute ahụ,+
44 Jehova wee gwa Mosis, sị:
45 “Sinụ n’etiti nzukọ a pụọ ka m bibie ha n’otu ntabi anya.”+ Ha wee gbuo ikpere n’ala ma kpudo ihu n’ala.+
46 Mosis gwaziri Erọn, sị: “Were ihe e ji amụ insens, gụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà gụnye na ya,+ tụkwasịkwa insens* na ya ma gakwuru nzukọ ahụ ọsọ ọsọ kpuchiere ha mmehie ha,+ n’ihi na iwe eweela Jehova. Ọrịa ọjọọ arịawala ha!”
47 Erọn weere ya ozugbo otú Mosis kwuru, gbara ọsọ gbaba n’etiti ọgbakọ ahụ, ya abụrụ na ọrịa ọjọọ ahụ arịawala ndị Izrel. O wee tụkwasị insens n’ihe ahụ e ji amụ insens malite ikpuchiri ha mmehie ha.
48 Ọ kwụụrụ n’agbata ndị nwụrụ anwụ na ndị dị ndụ. Ọrịa ọjọọ ahụ wee mechaa kwụsị.
49 Ndị ọrịa ọjọọ ahụ gburu dị puku iri na anọ na narị asaa (14,700), ma e wepụ ndị nwụrụ n’ihi Kora.
50 Mgbe Erọn mechara gakwuru Mosis n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute, ọrịa ọjọọ ahụ akwụsịla.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
^ Ma ọ bụ “na-atamu ntamu n’ihi ya.”
^ Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.
^ Ma ọ bụ “ime ka ọ̀ bụ gị nwe anyị?”
^ Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.
^ O nwere ike ịbụ na ihe ha na-ekwu bụ na Mosis chọrọ ka ha sowe ya ka ndị ìsì.”
^ Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
^ Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
^ Na Hibru, “Chineke nke mmụọ anụ ahụ́ niile.”
^ Na Hibru, “meghee ọnụ ya.”
^ Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Na Hibru, “meghee ọnụ ya.”
^ Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Na Hibru, “E wee si n’ọgbakọ ahụ bibie ha.”
^ Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
^ Na Hibru, “onye mbịarambịa.”
^ Ma ọ bụ “ịtamu ntamu n’ihi.”
^ Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”