Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Lee! Ìhè Ahụ Dị Ebube!

Lee! Ìhè Ahụ Dị Ebube!

Lee! Ìhè Ahụ Dị Ebube!

YA BỤRỤ na ị sọtụla ìsì n’ọchịchịrị, ị ga-ama na ọ naghị adị mfe. Lee otú ị ga-esi nwee obi ụtọ ma ọ bụrụ na ị hụ ìhè! Ọ pụkwara ịbụ na ị nọwo n’ọnọdụ a pụrụ iji tụnyere ọchịchịrị. Ikekwe nke a mere mgbe ị na-enweghị ike isi n’otu nsogbu pụta. Ị bịara jiri nwayọọ nwayọọ hụwa ụzọ ị ga-esi merie nsogbu ahụ. Ọ na-enye nnọọ obi ụtọ isi n’ụdị ọchịchịrị ahụ pụta n’ìhè.

Na narị afọ mbụ, ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ amaghị Chineke. Pita onyeozi degaara ndị hapụrụ nkwenkwe ha ma bata n’Iso Ụzọ Kraịst akwụkwọ, sị: “[Chineke] kpọpụtara unu n’ọchịchịrị gaa n’ìhè ya dị ebube.” (1 Pita 2:9) Nye ha, mgbanwe a ha mere yiri mmadụ isi n’oké ọchịchịrị baa n’ezi ìhè. A pụkwara iji ya tụnyere mmadụ ịnọ nanị ya n’enweghị olileanya ma otu ụbọchị ya ahụzie onwe ya n’ezinụlọ bara ọgaranya.—Ndị Efesọs 2:1, 12.

“Ị Hapụwo Ịhụnanya ahụ I Nwere na Mbụ”

Ndị Kraịst mbụ chọtara “eziokwu ahụ”—ya bụ ezi okpukpe Ndị Kraịst. (Jọn 18:37) Ha hụrụ ìhè magburu onwe ya nke eziokwu ahụ ma si n’ọchịchịrị bata n’ezi ìhè. Ma ka oge na-aga, ịnụ ọkụ n’obi ụfọdụ Ndị Kraịst nwere na mbụ bịara jụọ nnọọ oyi. Dị ka ihe atụ, ka ọ na-erule n’ọgwụgwụ nke narị afọ mbụ, nsogbu kpụ ọkụ n’ọnụ malitere n’ọgbakọ Efesọs. Jizọs Kraịst ahụ a kpọlitere n’ọnwụ chọpụtara nsogbu ahụ ma kwuo, sị: “Enwere m ihe a megide gị, na ị hapụwo ịhụnanya ahụ i nwere na mbụ. Ya mere, cheta ihe i siworo na ya daa, chegharịakwa ma mee ihe ndị ị na-eme na mbụ.” (Mkpughe 2:4, 5) Ọ dị Ndị Kraịst nọ n’Efesọs mkpa inweghachi ịhụnanya mbụ ahụ ha nwere n’ebe Chineke nọ na n’ebe eziokwu ahụ dị.

Oleekwanụ banyere anyị? Anyị onwe anyị kwa enwewo ọṅụ n’ihi ịhụ ìhè ahụ, ịmata eziokwu magburu onwe ya nke dị n’Okwu Chineke. Anyị ahụwo eziokwu n’anya. Ma ihe isi ike ụmụ mmadụ na-enwekarị pụrụ ime ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe eziokwu ahụ dị belata. Ihe ọzọ pụrụ ime ka ịhụnanya ahụ belata bụ nsogbu ndị e ji mara ‘ụbọchị ikpeazụ.’ Anyị bi n’ụwa nke e ji “oge pụrụ iche nke siri ike obibi” mara—ụwa nke ndị bi na ya bụ “ndị hụrụ onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe.” (2 Timoti 3:1, 2) Ha nwere ike ime ka ịnụ ọkụ n’obi anyị nwere belata ma mee ka ịhụnanya anyị hụrụ Jehova jụọ oyi.

Ọ bụrụ na anyị enwekwaghị ịhụnanya ahụ anyị nwere na mbụ, ọ dị anyị mkpa ‘icheta ihe anyị siworo na ya daa ma chegharịa.’ Ọ dịkwa anyị mkpa inweghachi ịhụnanya mbụ ahụ anyị nwere n’ebe Chineke nọ. Ọzọkwa, anyị aghaghị ilezi anya ka anyị ghara ikwe ka ịhụnanya ahụ anyị nwere n’ebe eziokwu ahụ dị jiri nwayọọ nwayọọ jụọ oyi. Ọ dị anyị nnọọ mkpa ịnọgide na-enwe olileanya na ọṅụ ma nọgide na-ahụ Chineke na eziokwu ya n’anya!

‘Eziokwu ahụ nke Na-eme Ka Anyị Nwere Onwe Anyị’

Ìhè nke eziokwu Akwụkwọ Nsọ dị nnọọ ebube n’ihi na Bible na-aza ajụjụ ndị dị mkpa gbagwojuworo ụmụ mmadụ anya ruo ọtụtụ puku afọ. Ụfọdụ n’ime ha bụ: Gịnị mere anyị ji nọrọ n’ebe a? Gịnị bụ nzube nke ndụ? N’ihi gịnị ka ihe ọjọọ ji dịrị? Mmadụ ọ̀ na-adị ndụ mgbe ọ nwụsịrị? Jehova eziwo anyị eziokwu ndị magburu onwe ha metụtara ozizi Bible. Nke ahụ ó kwesịghị ime ka anyị si n’ala ala obi anyị kelee Chineke? Ya adịkwala mgbe anyị ga-eji ihe ndị ahụ anyị mụtara gwuo egwú!

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.” (Jọn 8:32) Àjà mgbapụta Jizọs emewo ka anyị nwere onwe anyị pụọ ná mmehie na ọnwụ. Ma eziokwu ndị a magburu onwe ha emewokwa ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’amaghị nke a na-akọ na enweghị olileanya jupụtara n’ụwa a nke nọ n’oké ọchịchịrị. Iji ekele na-atụgharị uche n’ihe ndị anyị mụtara ga-enyere anyị aka ime ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ na n’ebe Okwu ya dị sikwuo ike.

Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka akwụkwọ, sị: “Mgbe unu natara okwu Chineke, bụ́ nke unu nụrụ n’ọnụ anyị, unu nakweere ya, ọ bụghị dị ka okwu ụmụ mmadụ, kama, dị nnọọ ka ọ bụ n’eziokwu, dị ka okwu Chineke, bụ́ nke na-arụkwa ọrụ n’ime unu ndị kwere ekwe.” (1 Ndị Tesalonaịka 2:13) Ndị Tesalonaịka nụrụ ma ‘jiri ọṅụ nakwere okwu [Chineke].’ Ha anọkwaghị “n’ọchịchịrị.” Kama, ha ghọrọ “ụmụ nke ìhè.” (1 Ndị Tesalonaịka 1:4-7; 5:4, 5) Ndị Kraịst ahụ mụtara na Jehova bụ Onye Okike, onye pụrụ ime ihe nile, onye maara ihe, onye nwere ịhụnanya na onye obi ebere. Ha mụtakwara na Jehova emewo ndokwa ịgbaghara ha mmehie ha site n’àjà mgbapụta nke Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst, dịkwa ka ndị na-eso ụzọ Kraịst ndị ọzọ mụtara.—Ọrụ 3:19-21.

Ọ bụ ezie na ndị Tesalonaịka amaghị ihe nile banyere eziokwu ahụ, ha maara ebe ha ga-aga iji nweta ihe ọmụma. Akwụkwọ Nsọ e dere n’ike mmụọ nsọ pụrụ ime ka onye nke Chineke “ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu maka ezi ọrụ ọ bụla.” (2 Timoti 3:16, 17) Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka pụrụ ịnọgide na-amụ ihe, na-aghọta mgbe nile na ìhè nke si n’aka Chineke magburu nnọọ onwe ya. Ha nwere ihe kpatara ha ga-eji na-aṅụrị ọṅụ mgbe nile. (1 Ndị Tesalonaịka 5:16) Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị.

Ìhè nke Dịịrị Okporo Ụzọ Anyị

Ọbụ abụ kwuru ihe mere ìhè ji magbuo onwe ya mgbe ọ bụrụ, sị: “Okwu Gị bụ oriọna dịịrị ụkwụ m, ọ bụkwa ìhè dịịrị okporo ụzọ m.” (Abụ Ọma 119:105) Nduzi Chineke na-enye anyị site n’Okwu Ya pụrụ inyere anyị aka ịgbaso ezi ụzọ ma mee ka anyị bie ndụ obi ụtọ. Anyị agaghị adị ka ụgbọ nke mmiri na-ebugharị. Ịmara eziokwu ahụ na itinye ya n’ọrụ na-echebe anyị pụọ n’ịbụ “ndị ebili mmiri na-enugharị na ndị ifufe ozizi ọ bụla na-ebugharị.”—Ndị Efesọs 4:14.

Bible kwuru, sị: “Unu atụkwasịla obi n’ahụ́ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ́ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere.” O kwukwara, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka onye ahụ bụ nke Chineke nke Jekọb bụ Onye na-enyere ya aka, nke olileanya ya dịkwasị Jehova, bụ́ Chineke ya.” (Abụ Ọma 146:3, 5) Ọzọkwa, ịtụkwasị Jehova obi na-enyere anyị aka ịghara ịtụ egwu na inwe nchekasị. Pọl onyeozi dere, sị: “Unu enwela nchegbu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe nile site n’ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike ya na inye ekele, meenụ ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche nile ga-echekwa obi unu na ike iche echiche unu nche site na Kraịst Jizọs.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ìhè nke Okwu Chineke idu anyị na-abara anyị ezigbo uru.

Na-enwunụ Dị Ka Ihe Ndị Na-enye Ìhè n’Ụwa

Ihe ọzọkwa mere ìhè nke Okwu Chineke ji magbuo onwe ya bụ na ọ na-eme ka anyị nwee ike ịrụ ọrụ kasị ùgwù ụmụ mmadụ nwere ike ịrụ. Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu, sị: “Gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ, na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu. Ma, lee! m nọnyeere unu ụbọchị nile ruo ọgwụgwụ nke usoro ihe.” Ọ malitere iwu ahụ o nyere ha site n’ikwu, sị: “E nyewo m ikike nile n’eluigwe na n’elu ụwa.”—Matiu 28:18-20.

Chee echiche banyere onye na-enyere ezi Ndị Kraịst aka n’ọrụ ikwusa ozi ọma na nke ịkụziri ndị nke mba nile eziokwu Bible. Jizọs kwere ndị na-eso ụzọ ya nkwa na ya ga-anọnyere ha. Ọ na-enyere ha aka ma na-akwado ha n’ozi ha ka ha ‘na-ekwe ka ìhè ha na-enwu’ n’ụzọ dị otú ahụ nakwa n’ọrụ ọma’ ndị ọzọ ha na-arụ. (Matiu 5:14-16) Ndị mmụọ ozi so n’ọrụ ikwusa ozi ọma a. (Mkpughe 14:6) Gịnị banyekwaranụ Jehova Chineke? Pọl onyeozi dere, sị: “Akụrụ m mkpụrụ, Apọlọs kwọsara ya mmiri, ma Chineke nọgidere na-eme ka ọ na-eto.” Lee nnọọ ihe ùgwù ọ bụ iso ná “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ”!—1 Ndị Kọrint 3:6, 9.

Cheekwa echiche banyere otú e si na-agọzi mgbalị anyị n’ọrụ a Chineke nyere anyị. Ọ dịghị ihe a ga-eji tụnyere ihe ùgwù Chineke nyere anyị nke bụ́ ịbụ ‘ndị na-enwu dị ka ihe ndị na-enye ìhè n’ụwa.’ Site n’igosipụta ìhè nke si n’Okwu Chineke site n’okwu na n’omume anyị, anyị pụrụ inyere nnọọ ndị nwere obi eziokwu aka. (Ndị Filipaị 2:15) Anyị pụkwara ịṅụrị ọṅụ ka anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ma na-ezi ihe, ‘n’ihi na Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ anyị na ịhụnanya anyị gosiri maka aha ya.’—Ndị Hibru 6:10.

‘Zụrụ Ọgwụ Anya Ị Ga-ete n’Anya Gị’

N’ozi o zigaara ọgbakọ Leodisia nke narị afọ mbụ, Jizọs kwuru, sị: “Zụta n’aka m . . . ọgwụ anya ị ga-ete n’anya gị ka i wee na-ahụ ụzọ. Ndị nile m nwere mmetụta na-ekpo ọkụ n’ebe ha nọ ka m na-adọ aka ná ntị ma na-enye ahụhụ.” (Mkpughe 3:18, 19) Ihe ga-eme nnọọ ka onye kpuru ìsì n’ihe metụtara amamihe Chineke hụwa ụzọ bụ “ọgwụ anya”—ya bụ ozizi na ịdọ aka ná ntị Jizọs. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọgide na-ele ihe anya otú Chineke si ele ya, anyị aghaghị ịnabata ndụmọdụ Ya, rube isi na ya nakwa ná nduzi ndị Bible na-enye anyị. Anyị kwesịkwara ịmụta iche echiche ka Kraịst ma ṅomie ihe nlereanya ya. (Ndị Filipaị 2:5; 1 Pita 2:21) Ọgwụ anya ahụ abụghị n’efu. Jizọs kwuru, sị: “Zụta [ya] n’aka m.” Ihe ọ ga-efu anyị bụ oge na mgbalị.

Mgbe anyị si n’ebe gbara ọchịchịrị banye n’ụlọ ìhè dị na ya, ọ pụrụ iwe oge tupu anyị ahụwa ụzọ. N’otu aka ahụ, ịmụ Okwu Chineke na ịhụ ìhè nke eziokwu ahụ na-ewe oge. Ọ na-ewe oge ịtụgharị uche n’ihe ndị anyị mụtara na iche echiche miri emi banyere otú eziokwu ahụ si dịrị oké ọnụ ahịa. Ma, ihe ọ ga-ewe anyị akarịghị akarị. N’ihi gịnị? N’ihi na ìhè ahụ dị ebube!

[Foto dị na peeji nke 14]

“Zụta n’aka m . . . ọgwụ anya ị ga-ete n’anya gị ka i wee na-ahụ ụzọ”