Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Jikọtara Ndị Odeakwụkwọ Oge Ochie na Okwu Chineke

Ihe Jikọtara Ndị Odeakwụkwọ Oge Ochie na Okwu Chineke

Ihe Jikọtara Ndị Odeakwụkwọ Oge Ochie na Okwu Chineke

E DECHARA Akwụkwọ Nsọ Hibru n’ọgwụgwụ narị afọ nke ise T.O.A. Na narị afọ ndị sochirinụ, ndị ọkà mmụta ndị Juu, karịsịa ndị Sopherim na mgbe e mesịrị ndị Masorete, ji nnọọ nlezianya chekwaa ihe odide Hibru. Ma, e dere akwụkwọ Bible ndị kasị mee ochie n’oge Mozis na Jọshụa, nke bụ́ otu puku afọ tupu oge ndị Sopherim. Ihe ndị e ji dee akwụkwọ ndị ahụ na-emebi emebi; n’ihi ya, ọ ghaghị ịbụ na e depụtaghachiri akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ ọtụtụ ugboro. Olee ihe a maara banyere ọrụ ndị odeakwụkwọ n’oge mbụ ahụ? È nwere ndị odeakwụkwọ nwere nkà n’Izrel?

Ihe odide Bible ndị kasị ochie e nwere taa sitere n’Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ, bụ́ ndị e depụtaghachiri ụfọdụ n’ime ha na narị afọ nke atọ na nke abụọ T.O.A. Prọfesọ Alan R. Millard, bụ́ ọkà mmụta nke asụsụ nke mba ndị dị nso n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa na ọkà mmụta ihe mgbe ochie kọwara, sị: “Anyị enweghị ihe odide ochie ọ bụla nke Bible.” O kwukwara, sị: “Omenala nke mba ndị gbara Izrel gburugburu nwere ike ime ka anyị ghọta otú ndị odeakwụkwọ si rụọ ọrụ ha, anyị ịmatakwa nke ahụ nwere ike inyere anyị aka ịghọta ihe odide Hibru na otú o si malite.”

Ọrụ Ndị Odeakwụkwọ n’Oge Ochie

Puku afọ anọ gara aga, e dewela ihe ndị metụtara akụkọ ihe mere eme, okpukpe, iwu, nkà mmụta, na akwụkwọ nkịtị na Mesopotemia. Ụlọ akwụkwọ na-azụ ndị odeakwụkwọ jupụtara ebe nile, otu n’ime ihe ndị ha na-akụzikwa bụ otú e si edepụtaghachi ihe n’edehieghị ihe. Ọ bụ nanị ọdịiche ole na ole ka ndị ọkà mmụta nke oge a hụrụla n’otu ihe odide Babilọn e depụtaghachiri ugboro ugboro ruo otu puku afọ ma ọ bụ karịa.

Ọ bụghị nanị na Mesopotemia ka e nwere ndị odeakwụkwọ. Akwụkwọ nkà ihe ọmụma bụ́ The Oxford Encyclopedia of Archaeology in the Near East kwuru, sị: “Ọ gaghị ara odeakwụkwọ bụ́ onye Babilọn nke dịrị ndụ n’etiti puku afọ nke abụọ T.O.A. ahụ́ ịghọta otú ndị odeakwụkwọ e nwere n’ebe dị iche iche na Mesopotemia, Siria, Kenan, na ọbụna n’Ijipt si arụ ọrụ ha.” *

Ndị odeakwụkwọ nọ n’ọkwá dị elu n’Ijipt n’oge Mozis. Ha nọgidere na-edepụtaghachi akwụkwọ ndị e dere ede. A na-ahụ ihe ndị dị otú ahụ n’ihe ndị e ji chọọ ili ndị Ijipt nọferela puku afọ anọ mma. Akwụkwọ nkà ihe ọmụma ahụ e hotara ihe na ya n’elu kwuru banyere ndị odeakwụkwọ oge ochie e nwere mgbe ahụ, sị: “Ka ọ na-erule na narị afọ iri nke abụọ T.O.A., ha edepụtala aha akwụkwọ ndị kọwara nnukwu mmepeanya nke Mesopotemia na Ijipt ma depụta ụkpụrụ iwu ndị odeakwụkwọ ga na-agbaso.”

“Ụkpụrụ iwu” a gụnyere nkọwa ndị a na-agbakwụnye n’ihe odide. Nkọwa ndị ahụ na-ebu aha ndị odeakwụkwọ na onye nwe ihe odide ahụ, mgbe e dere ya, ebe e si nweta nke e si na ya depụtaghachi ya, ahịrịokwu ole o nwere na ihe ndị ọzọ. Mgbe mgbe, onye odeakwụkwọ ahụ na-agbakwunye, sị: “Mgbe e dechara ya, e nyochara ya nke ọma iji hụ na ya na nke mbụ ya kwekọrọ.” Ihe ndị ahụ na-egosi na ihe bụ́ mkpa ndị odeakwụkwọ bụ idepụtaghachi ihe odide ndị ahụ ka ha na ndị mbụ kwekọọ.

Prọfesọ Millard, bụ́ onye e hotara okwu ya na mbụ, kwuru, sị: “A chọpụtara site n’ihe odide ndị ahụ na ndị odeakwụkwọ na-enyocha ihe ndị ha dere ma dezie ebe ndị ha dehiere ihe, bụ́ nke na-eme ka a hụ na e dehieghị ihe. Ndị Massorete, bụ́ ndị dịrị ndụ Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya, maliteghachiri ụfọdụ n’ime ihe ndị a ha na-eme, karịsịa ịgụ ahịrịokwu ma ọ bụ okwu ọnụ.” N’ihi ya, n’oge Mozis na Jọshụa, iji nlezianya edepụtaghachi akwụkwọ iji ghara idehie ihe adịworị adị n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa.

Ndị Izrel hà nwekwara ndị odeakwụkwọ ruru eru? Gịnị ka ihe ndị e dere na Bible na-egosi?

Ndị Odeakwụkwọ n’Izrel Oge Ochie

A zụlitere Mozis dị ka onye òtù ezinụlọ Fero. (Ọpụpụ 2:10; Ọrụ 7:21, 22) Ndị na-amụ ihe banyere Ijipt oge ochie kwuru na ọzụzụ e nyere Mozis ga-agụnyewo ịmụ otú e si agụ na otú e si ede ihe n’Ijipt, nakwa ma ọ dịghị ihe ọzọ nkà ụfọdụ nke ndị odeakwụkwọ. N’akwụkwọ ya bụ́ Israel in Egypt, Prọfesọ James K. Hoffmeier kwuru, sị: “Anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji kwere ihe ahụ Bible kwuru nke bụ́ na Mozis dekọrọ ihe ndị mere eme na ebe ndị obodo ya gara, ma mee ihe ndị ọzọ ndị odeakwụkwọ na-eme.” *

Bible kwuru na e nwere ndị odeakwụkwọ ndị ọzọ n’Izrel oge ochie. Dị ka akwụkwọ bụ́ The Cambridge History of the Bible si kwuo, Mozis “họpụtara ndị odozi okwu a zụrụ nke ọma . . . idekọ ihe ndị e kpebiri n’ikpe na ihe ndị ọzọ.” Nkwubi okwu a dabeere na Deuterọnọmi 1:15, bụ́ nke na-ekwu, sị: “M [Mozis] wee chịrị ndị isi ebo nile unu . . . m wee doo ha ndị isi unu, ndị isi [otu puku otu puku], na ndị isi [otu narị otu narị], na ndị isi [iri ise iri ise], na ndị isi mmadụ iri mmadụ iri na ndị odozi okwu, dị ka ebo nile unu si dị.” Olee ndị bụ́ ndị odozi okwu a?

Okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “odozi okwu” bụ́ nke pụtara ọtụtụ ugboro n’akụkụ Bible dị iche iche na-ezo aka n’oge Mozis na Jọshụa. Ndị ọkà mmụta dị iche iche na-akọwa na okwu a pụtara “odeakwụkwọ na-edetu ihe ndị e mere,” “onye ‘na-ede’ ma ọ bụ ‘na-edekọ’ ihe,” na “onye ọrụ nke na-enyere onyeikpe aka n’idekọ ihe.” Ugboro ole okwu Hibru a pụtara n’Akwụkwọ Nsọ na-egosi na e nwere ọtụtụ ndị odeakwụkwọ dị otú ahụ n’Izrel nakwa na ha rụrụ ọtụtụ ọrụ ná mmalite nke ọchịchị mba ahụ.

Ihe atụ nke atọ bụ banyere ndị nchụàjà nke Izrel. Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Judaica na-ekwu na “ọrụ ha na-arụ n’okpukpe na nke ha na-arụrụ ọhaneze mere ka ọ dị mkpa na ha ga-ama akwụkwọ.” Dị ka ihe atụ, Mozis nyere ndị Livaị iwu, sị: “N’ọgwụgwụ afọ asaa, . . . ị ga-agụ iwu a n’ihu Izrel nile.” Ndị nchụàjà ghọrọ ndị na-echekwa akwụkwọ Iwu ahụ. Ha nyere ikike ka e depụtaghachi akwụkwọ iwu ahụ ma hụ na ndị depụtaghachiri ha depụtara ha nke ọma.—Deuterọnọmi 17:18, 19; 31:10, 11.

Tụlee otú e si depụta Iwu ahụ nke mbụ ya. N’ọnwa ikpeazụ nke ndụ Mozis, ọ gwara ndị Izrel, sị: “Mgbe unu ga-agabiga Jọdan ruo ala ahụ nke Jehova, bụ́ Chineke gị, na-enye gị, . . . ị ga-eguzoro onwe gị nkume ukwu ọtọ, were ihe ntechi techie ha: ị ga-edekwasịkwa ha okwu nile nke iwu a.” (Deuterọnọmi 27:1-4) Mgbe e bibisịrị Jeriko na Aị, ndị Izrel zukọrọ n’Ugwu Ibal, bụ́ nke dị n’etiti Ala Nkwa ahụ. N’ebe ahụ ka Jọshụa nọ dee n’elu nkume nke ebe ịchụàjà ahụ “ndepụta iwu Mozis.” (Joshua 8:30-32) A gaghị enwe ihe odide dị otú ahụ ma a sị na ha amaghị otú e si agụ na otú e si ede. Nke a na-egosi na ndị Izrel oge ochie nwere amamihe na nkà a chọrọ iji chekwaa ihe odide ha dị nsọ nke ọma.

Izi Ezi nke Akwụkwọ Nsọ

Mgbe oge Mozis na Jọshụa gasịrị, e dere akwụkwọ mpịakọta Hibru ndị ọzọ, ma jiri aka depụtaghachi ha. Ka ihe odide ndị a na-emebi n’ihi ịnọ n’ebe jụrụ oyi ma ọ bụ ịma ebu, ọ na-adị mkpa ka e depụtaghachi ihe ndị dị na ha. A nọgidere na-edepụtaghachi ha ruo ọtụtụ narị afọ.

N’agbanyeghị nlezianya ndị depụtaghachiri Bible ji mee ihe, ha dehiere ihe ụfọdụ. Ma ihe ndị odeakwụkwọ dehiere hà gbanwere nnọọ isi ihe Bible na-ekwu? Ee e. Ihe ndị ha dehiere dị ole na ole, ha agbanwekwaghị isi ihe Bible na-ekwu, dị ka a chọpụtaworo site n’iji nlezianya jiri ihe odide oge ochie dị iche iche tụnyere ibe ha.

N’ebe Ndị Kraịst nọ, otú Jizọs Kraịst si were akwụkwọ Bible ndị mbụ ahụ gosiri na isi ihe ndị Akwụkwọ Nsọ na-ekwu agbanweghị agbanwe. Okwu ndị dị ka “Únu agụghị n’akwụkwọ Mozis?” na “Mozis nyere unu Iwu ahụ, ka ó nyeghị ya unu?” na-egosi na Jizọs weere akwụkwọ Bible ndị ahụ e ji aka depụtaghachi e nwere mgbe ahụ ọ nọ n’ụwa dị ka eziokwu. (Mak 12:26; Jọn 7:19) Ọzọkwa, Jizọs gosiri na a gbanweghị isi ihe ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru mgbe o kwuru, sị: “Ihe nile e dere n’iwu Mozis na n’akwụkwọ ndị amụma na Abụ Ọma banyere m aghaghị imezu.”—Luk 24:44.

N’ihi ya, e nwere ezi ihe mere obi ga-eji sie anyị ike na Akwụkwọ Nsọ anyị nwere ugbu a adịghị iche n’otú ọ dị n’oge ochie. Ọ dị nnọọ otú ahụ Aịzaịa onye amụma e nyere ike mmụọ nsọ kwuru ya, sị: “Ahịhịa akpọnwụwo, okooko ọhịa ajanwụwo; ma okwu Chineke anyị ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Aịsaịa 40:8.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Jọshụa, bụ́ onye dịrị ndụ n’etiti puku afọ abụọ T.O.A., kpọtụrụ otu obodo Kenan a kpọrọ Kiriat-sefer aha, bụ́ nke pụtara “Obodo Akwụkwọ” ma ọ bụ “Obodo Ndị Odeakwụkwọ.”—Joshua 15:15, 16.

^ par. 12 A pụrụ ịhụ ebe ndị e kwuru na Mozis dekọrọ okwu ụfọdụ ndị metụtara iwu n’Ọpụpụ 24:4, 7; 34:27, 28; na Deuterọnọmi 31:24-26. E kwuru na o dere abụ na Deuterọnọmi 31:22, kwuokwa na o dere banyere njem ndị Izrel ji ụkwụ mee n’ọzara n’Ọnụ Ọgụgụ 33:2.

[Foto dị na peeji nke 18]

Ebe odeakwụkwọ bụ́ onye Ijipt nọ n’ọrụ

[Foto dị na peeji nke 19]

E dere akwụkwọ Bible ndị kasị ochie n’oge Mozis