Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Ga-ekwe Omume Ịkwanyere Mmadụ Nile Ùgwù

Ọ Ga-ekwe Omume Ịkwanyere Mmadụ Nile Ùgwù

Ọ Ga-ekwe Omume Ịkwanyere Mmadụ Nile Ùgwù

“Anyị kwesịrị ihiwe ụwa ọhụrụ—nke ga-aka nnọọ nke dị ugbu a mma—bụ́ ebe a ga na-akwanyere onye ọ bụla ùgwù ruuru ya.”—OKWU PRESIDENT MBA UNITED STATES BỤ́ HARRY TRUMAN KWURU NA SAN FRANCISCO, CALIFORNIA, U.S.A., APRIL 25, 1945.

DỊKWA ka ọtụtụ ndị mere n’ime afọ ndị sochiri Agha Ụwa nke Abụọ, President Truman kweere na ụmụ mmadụ pụrụ ịmụta ihe site n’ihe ndị gara aga ma hiwe “ụwa ọhụrụ” bụ́ ebe a ga na-akwanyere onye ọ bụla ùgwù ruuru ya. Ọ dị mwute ikwu na ihe na-eme ugbu a gosiri na nke ahụ ekwebeghị omume. O kwebeghị omume inwe ọha mmadụ ebe a na-akwanyere onye ọ bụla ùgwù ruuru ya. Ọ bụghị ụmụ mmadụ bụ isi sekpụ ntị mere ka nke a ghara ikwe omume kama ọ bụ onye iro kasịnụ nke ụmụ mmadụ nwere.

Isi Ihe Na-akpata Nsogbu Ahụ

Bible kwuru na onye iro a bụ Setan bụ́ Ekwensu, bụ́ ajọ mmụọ nke nọworo kemgbe ụwa na-ama oruru o ruuru Chineke ịchị dị eze aka. Kemgbe Setan gwasịrị Iv okwu n’ogige Iden, nzube ya anọgidewo bụrụ ime ka ụmụ mmadụ gbakụta Onye kere ha azụ. (Jenesis 3:1-5) Cheedị banyere ọdachi dakwasịrị Adam na Iv mgbe ha mere ihe Ekwensu gwara ha mee! Ihe isi ha nupụụrụ Chineke ma gaa rie mkpụrụ ahụ a sịrị ha erila kpataara ha ozugbo bụ na ha abụọ ‘zopụrụ onwe ha n’ihu Jehova, bụ́ Chineke.’ N’ihi gịnị? Adam zara, sị: ‘Atụrụ m egwu, n’ihi na onye gba ọtọ ka m bụ; m wee zoo onwe m.’ (Jenesis 3:8-10) Mmekọrịta Adam na Nna ya nke eluigwe agbanweela. Otú o sizi ele onwe ya anya ugbu a dị iche n’otú o si elebu onwe ya anya. Ihere onwe ya meweziri ya, ahụ́ erughịzi ya ala n’ihu Jehova.

N’ihi gịnị ka Ekwensu ga-eji chọọ ka Adam gharazie inwe ùgwù onwe onye? Ọ bụ n’ihi na e kere mmadụ n’oyiyi Chineke, obi na-atọgbukwa Setan ịhụ ka mmadụ na-eme omume nke na-eme ka ha ghara ịdị na-egosipụta ebube Chineke. (Jenesis 1:27; Ndị Rom 3:23) Nke a kpatara ọtụtụ ndị jiworo na-akparị ndị ọzọ kemgbe ụwa. Dị ka “chi nke usoro ihe a,” Setan na-eme ka ndị mmadụ na-akparị ibe ha n’oge a “mgbe otu mmadụ nwere ike n’ahụ́ mmadụ ibe ya imejọ ya.” (2 Ndị Kọrịnt 4:4; Eklisiastis 8:9; 1 Jọn 5:19) Nke a ọ̀ pụtara na ọ dịtụghị mgbe a ga-akwanyere mmadụ nile ùgwù ruuru ha?

Jehova Na-akwanyere Ndị O Kere Eke Ùgwù

Chee echiche laghachi azụ n’ọnọdụ e nwere n’ogige Iden tupu Adam na Iv emehie. Ha nwere ọtụtụ ihe oriri ha ga-eri, nwee ọrụ na-eju afọ ịrụ, nweekwa olileanya na ha na ụmụ ha ga-anọgide na-enwe ezi ahụ́ ike ma dịrị ndụ agwụghị agwụ. (Jenesis 1:28) Ụdị ndụ e kere ha ka ha na-ebi gosiri nnọọ na Chineke nwere nzube dị ùgwù maka ụmụ mmadụ n’ihi ịhụnanya o nwere n’ebe ha nọ.

Otú Jehova si ele ùgwù ụmụ mmadụ anya ọ̀ gbanwere mgbe Adam na Iv mehiere? Ee e. O chebaara ha echiche mgbe ọ hụrụ na ihere na-eme ha n’ihi na ha gba ọtọ. Chineke jiri ‘akpụkpọ anụ meere ha uwe ime’ iji dochie anya akwụkwọ fig ha dụkọtara iji kpuchie ọtọ ha n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya. (Jenesis 3:7, 21) Kama ịhapụ ha ka ihere onwe ha mewe ha, Chineke kwanyeere ha ùgwù.

N’ikpeazụ, mgbe ya na ndị Izrel na-emekọ ihe, Jehova gosiri na ya nwere ọmịiko n’ahụ́ ụmụ mgbei, ụmụ nwanyị di ha nwụrụ, na ndị ọbịa—bụ́ ndị a na-emegbukarị emegbu. (Abụ Ọma 72:13) Dị ka ihe atụ, a gwara ụmụ Izrel ka ha ghara ịlaghachi azụ ịga were ihe ndị ha chefuru n’ubi mgbe ha na-ewe ihe ubi ndị dị ka ọka, mkpụrụ oliv, na mkpụrụ vaịn. Kama nke ahụ, Chineke nyere ha iwu na ihe ndị ahụ ga-adịrị “ọbịa, nwa mgbei, na nwanyị di ya nwụrụ.” (Deuterọnọmi 24:19-21) Mgbe e rubere isi n’iwu a, o mere ka a ghara inwe ndị arịrịọ, meekwa ka ndị mmadụ, ọbụna ndị ogbenye ọnụ ntụ, nwee ihe dị ùgwù ha ga na-arụ.

Jizọs Kwanyeere Ndị Ọzọ Ùgwù

Mgbe Ọkpara Chineke bụ́ Jizọs Kraịst nọ n’ụwa, ọ masịrị ya ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ nọ na Galili, otu nwoke nọworo na-arịa ọrịa ekpenta eri ogologo oge bịakwutere ya. Dị ka iwu Mozis si kwuo, iji ghara ibunye ndị ọzọ ọrịa ya, a chọrọ ka onye ekpenta ahụ na-eti mkpu, sị: “Onye rụrụ arụ, onye rụrụ arụ.” (Levitikọs 13:45) Otú ọ dị, mgbe nwoke ahụ na-abịakwute Jizọs, o tighị mkpu iji dọọ ndị mmadụ aka ná ntị. Kama ime otú ahụ, ọ kpọrọ isi ala ma rịọ Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ nnọọ na ị chọọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” (Luk 5:12) Gịnị ka Jizọs mere? Jizọs abaghịrị ya mba n’ihi imebi Iwu Mozis, o legharaghịkwa nwoke ahụ anya ma ọ bụ sọọ ya oyi. Kama nke ahụ, ọ kwanyeere nwoke ahụ ùgwù site n’imetụ ya aka na-asị: “Achọrọ m. Ka e mee ka ị dị ọcha.”—Luk 5:13.

N’oge ndị ọzọ, Jizọs gosiri ikike o nwere ịgwọ ndị ọrịa n’emetụghị ha aka—o mere nke a mgbe ụfọdụ site n’ebe dị anya. Ma na nke nwoke a, ọ họọrọ imetụ ya aka. (Matiu 15:21-28; Mak 10:51, 52; Luk 7:1-10) Ebe ọ bụ na ‘ekpenta zuru nwoke ahụ ahụ́ nile,’ ihe ịrụ ụka adịghị ya na o ruola ọtụtụ afọ ọ na-adịbeghị onye metụrụ ya aka. Cheedị ụdị nkasi obi nwoke ahụ ga-enwe ịhụ ka mmadụ metụrụ ya aka ọzọ! Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nanị ihe nwoke ahụ chọrọ bụ ka a gwọọ ya ekpenta ya. Ma obi abụọ adịghị ya na otú Jizọs si gwọọ ya mere ka nwoke ahụ nweghachi otu ihe dị mkpa—ùgwù ya. Ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwere na e nwere ndị pụrụ ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù otú ahụ n’ụwa taa? Ọ bụrụ na e nwere, olee otú a ga-esi na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù?

Iwu nke Na-akwanyere Ndị Mmadụ Ùgwù

Jizọs kwuru ihe ọtụtụ ndị weere dị ka ntụziaka a kasị mara amara e nyetụworo n’ihe banyere mmekọrịta mmadụ n’ibe ya. Ọ sịrị: “Ya mere, ihe nile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” (Matiu 7:12) Ụkpụrụ a a na-akpọkarị Ụkpụrụ Ọma na-akpali mmadụ ịkwanyere mmadụ ibe ya ùgwù, na-atụ anya ka onye ahụ kwanyekwara ya ùgwù.

Dị ka akụkọ ihe mere eme na-egosi, ọ naghị adị mfe itinye ụkpụrụ a n’ọrụ—ọ na-adịkarị mfe ime ihe megidere ya. Otu nwoke anyị ga-akpọ Harold kwuru, sị: “Ọ na-amasịbu m ime ndị ọzọ akaje. M na-agwa ha nnọọ okwu mkparị ga-emenye ha ihere, nke pụrụ ịkpasu ha iwe ma mee ka ha bewe àkwà mgbe ụfọdụ.” Ma ọ dị ihe merenụ bụ́ nke mere ka Harold gbanwee otú o si emeso ndị ọzọ ihe. “Ọtụtụ Ndịàmà Jehova malitere ịbịa na nke m. Ugbu a, m cheta ụfọdụ n’ime ihe ndị m gwara ha na otú m si mesoo ha ihe, ihere onwe m emewe m. Ma ọ dịghị mgbe ha kwụsịrị ịbịa na nke m, nke nta nke nta, eziokwu Bible metụrụ m n’obi ma kpalie m ime mgbanwe.” Taa, Harold na-eje ozi dị ka okenye n’ọgbakọ Ndị Kraịst.

Ahụmahụ Harold na-enye ihe àmà doro anya na “okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ihu abụọ ọ bụla, na-amapukwa amapu ọbụna ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ, nakwa nkwonkwo na ụmị ha, o nwekwara ike ịchọpụta echiche na ebumnuche nke obi.” (Ndị Hibru 4:12) Okwu Chineke nwere ikike iru mmadụ n’obi ma gbanwee otú onye ahụ si eche echiche na àgwà ya. Isi ihe nke ga-enyere mmadụ aka ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù bụ ọchịchọ sitere n’obi inyere ndị ọzọ aka kama ime ihe ga-agbawa ha obi, nakwa inwe ọchịchọ ịsọpụrụ ha kama imenye ha ihere.—Ọrụ 20:35; Ndị Rom 12:10.

Mgbe A Ga-akwanyere Mmadụ Nile Ùgwù Ruuru Ha

Ọ bụ otu ọchịchọ a nke ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù na-akpali Ndịàmà Jehova ịgwa ndị ọzọ banyere olileanya dị ebube nke dị na Bible. (Ọrụ 5:42) Ọ dịghị ụzọ ka mma mmadụ pụrụ isi kwanyere mmadụ ibe ya ùgwù karịa izi ya “ozi ọma nke ezi ihe.” (Aịsaịa 52:7) “Ezi ihe” a gụnyere iyikwasị “ụdị mmadụ ọhụrụ,” bụ́ nke ga-eme ka “ọchịchọ na-emerụ ahụ́,” nke bụ́ imenye ndị ọzọ ihere nwụọ. (Ndị Kọlọsi 3:5-10) Ọ gụnyekwara nzube Jehova nke bụ́ iwepụ ọnọdụ na àgwà ndị na-eme ka ụmụ mmadụ ghara inwe ùgwù onwe onye, tinyere iwepụ isi sekpụ ntị na-akpata nke a, ya bụ, Setan bụ́ Ekwensu. (Daniel 2:44; Matiu 6:9, 10; Mkpughe 20:1, 2, 10) Ọ bụ nanị mgbe ahụ, bụ́ mgbe “ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa,” ka a ga na-akwanyere mmadụ nile ùgwù ruuru ha.—Aịsaịa 11:9.

Anyị na-akpọ gị oku ka ị bịa mụta banyere olileanya a dị ebube. Site n’iso Ndịàmà Jehova na-akpakọrịta, ị ga-eji anya gị hụ na itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ na-eme ka a kwanyere ndị ọzọ ùgwù. Ị ga-enwekwa ike ịmụta otú Alaeze Chineke ga-esi weta ‘ụwa ọhụrụ nke ka nnọọ ụwa e nwere ugbu a mma,’ bụ́ ebe a ga na-akwanyere ndị mmadụ ùgwù ruuru ha, ọ dịghịkwa onye ga na-akparị mmadụ ibe ya.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]

A Kwanyeere Ha Ùgwù n’Ihi na Ha Nọgidesiri Ike Na-eme Ezi Ihe

N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, e zigara ihe karịrị puku Ndịàmà Jehova abụọ n’ogige ịta ahụhụ nke ndị Nazi n’ihi nkwenkwe ha. Mgbe ọ hụrụ ụzọ dị ịrịba ama ha si nọgidesie ike na-eme ezi ihe, otu onye a tụburu mkpọrọ na Ravensbrück onye aha ya bụ́ Gemma La Guardia Gluck kọrọ n’akwụkwọ ya bụ́ My Story, sị: “N’otu oge, ndị Gestapo kwuru na Onye Mmụta Bible ọ bụla nke kwere ịjụ okwukwe ya ma bịanye aka n’akwụkwọ gosiri na ọ jụla okwukwe ya ga-enwere onwe ya, a gaghịkwa akpagbu ya ọzọ.” O dere banyere ndị nke na-ekweghị abịanye aka n’akwụkwọ ahụ, sị: “Ha họọrọ ịnọgide na-ata ahụhụ ma jiri ndidi chere maka ụbọchị a ga-eme ka onye ọ bụla nwere onwe ya.” Gịnị mere ha ekweghị ajụ okwukwe ha? Magdalena, bụ́ onye dị afọ iri asatọ n’ụma ugbu a, onye anyị kpọtụrụ aha ná mmalite isiokwu a, na-akọwa, sị: “Ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova ka mkpa karịa ime ihe ọ bụla iji ghara ịnwụ. Ịnọgide na-enwe ùgwù onwe anyị chọrọ ka anyị nọgidesie ike na-eme ezi ihe.” *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 23 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgụ akụkọ banyere ezinụlọ Kusserow n’ụzọ zuru ezu, lee Ụlọ Nche nke March 1, 1986, peeji nke 10-15.

[Foto dị na peeji nke 5]

Jizọs kwanyeere ndị ọ gwọrọ ọrịa ùgwù

[Foto dị na peeji nke 7]

Ndịàmà Jehova na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù site n’izi ha “ozi ọma nke ezi ihe”