Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Obere Àjà Ndị Anyị Chụrụ Wetaara Anyị Ngọzi Dị Ukwuu

Obere Àjà Ndị Anyị Chụrụ Wetaara Anyị Ngọzi Dị Ukwuu

Akụkọ Ndụ

Obere Àjà Ndị Anyị Chụrụ Wetaara Anyị Ngọzi Dị Ukwuu

DỊ KA GEORGE NA ANN ALJIAN SI KỌỌ

Ọ dịtụghị mgbe mụ na nwunye m rọtara ná nrọ na otu ụbọchị anyị agaghị aghọta ọdịiche dị n’etiti okwu ndị bụ́ “onye nkụzi” na “òké.” Ọ dịtụghị mgbe anyị chere na mgbe anyị dị afọ 60 na ụma na anyị ga-anọ na-eche ihe mkpụrụ akwụkwọ e dere ede ndị dị mgbagwoju anya pụtara ná mgbalị iso ndị si n’Ebe Ime Ime Ọwụwa Anyanwụ Ụwa nwee nkwurịta okwu. Ma, nke a bụ ihe mụ na Ann mere ná ngwụsị afọ ndị 1980. Ka anyị kọọrọ gị otú obere àjà ndị anyị chụworo kemgbe ọtụtụ afọ siworo duga n’ọtụtụ ngọzi.

ESI m n’ezinụlọ sitere n’agbụrụ ndị Armenia, abụkwa m onye Chọọchị Armenia. Ann bụ onye Roman Katọlik. Anyị abụọ mere ihe megidere nkwenkwe okpukpe anyị mgbe anyị lụrụ na 1950. Adị m afọ 27, Ann dịkwa afọ 24. Anyị jere biri n’ụlọ nwere ọtụtụ ọnụ ụlọ nke dị n’elu ụlọ ọrụ ịsa ákwà m dị na Jersey City, New Jersey, U.S.A. Ka ọ na-erule mgbe ahụ, arụwo m ọrụ achụmnta ego a ruo ihe dị ka afọ anọ.

Na 1955, anyị zụtara otu ọmarịcha ụlọ nwere ọnụ ụlọ ihi ụra atọ na Middletown, New Jersey. Ụlọ ahụ dị ihe dị ka kilomita 60 site n’ebe achụmnta ego m, bụ́ ebe m na-arụ ọrụ ụbọchị isii n’izu. Ana m alọrute ụlọ n’ime abalị kwa ụbọchị. Nanị mgbe mụ na Ndịàmà Jehova na-ahụ bụ mgbe ha na-abịa n’ụlọ ọrụ m site n’oge ruo n’oge enye m akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. Ana m eji mmasị dị ukwuu agụ akwụkwọ ndị ahụ. Ọ bụ ezie na achụmnta ego m na-ewekọrọ oge m na ohere m, abịara m zụlite nkwanye ùgwù miri emi maka Bible.

N’oge na-adịghị anya, achọpụtara m na ụlọ ọrụ redio Watchtower, bụ́ WBBR, na-akpọsa okwu ihu ọha ndị dabeere na Bible n’oge m na-anya ụgbọala m aga ọrụ na mgbe m na-alọta. Ana m ege ntị nke ọma n’okwu ihu ọha ndị a, mmasị m tolitekwara ruo n’ókè nke na m gwara Ndịàmà ka ha bịa leta m. Na November 1957, George Blanton bịara n’ụlọ m ma malite ịmụrụ m Bible.

E Jikọọ Ezinụlọ Anyị n’Ofufe Dị Ọcha

Olee otú ihe a nile dị Ann? Ka ọ kọọrọ gị.

“Ná mmalite, emegidere m ya n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. M na-enyekarị nsogbu mgbe George na-enwe ọmụmụ Bible ya nke na o kpebiri ịdị na-enwe ya n’ebe ọzọ, o mere nke a ruo ọnwa asatọ. N’ime oge ahụ, George malitere ịga nzukọ n’ụbọchị Sunday n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Mgbe ahụ ka m maara na o ji ọmụmụ Bible ya kpọrọ ihe, n’ihi na ọ bụ nanị ụbọchị ọ na-ejighị aga ọrụ. Ma, ọ nọgidere na-abụ ezigbo di na nna—ọbụna ka mma—omume m malitekwara ịgbanwe. N’ezie, mgbe ụfọdụ ka m na-ehicha tebụl kọfị mgbe ọ na-adịghị onye na-ele anya, ana m ewelite magazin Teta! George na-ahapụkarị n’elu ya, m na-agụkwa ya. N’oge ndị ọzọ, George na-agụrụ m isiokwu ndị dị na Teta! bụ́ ndị na-emetụtachaghị nkwenkwe ma bụrụ ndị na-ekwu mgbe nile banyere Onye Okike.

“Otu mgbede mgbe George gara ka ya na Nwanna Blanton nwee ọmụmụ Bible ya, ewelitere m otu akwụkwọ nwa anyị nwoke dị afọ abụọ, bụ́ George, tọgbọrọ n’elu tebụl dị n’akụkụ àkwà m. Ọ na-ekwu banyere olileanya maka ndị nwụrụ anwụ. Ọ bụ ezie na ike gwụrụ m, amalitere m ịgụ ya n’ihi na nne m ochie ka nwụsịrị, enwekwara m nnọọ nkụda mmụọ. Ozugbo ahụ, ahụrụ m ma ghọta eziokwu Bible bụ́ na ndị nwụrụ anwụ enweghị ebe ha nọ na-ata ahụhụ, nakwa na ha ga-adị ndụ ọzọ site ná mbilite n’ọnwụ n’ọdịnihu. N’oge na-adịghị anya, anọdụrụ m ala n’elu àkwà, jiri ịnụ ọkụ n’obi na-agụ ya ma na-akanye ihe n’okpuru ihe ndị m chọrọ igosi George mgbe o si ọmụmụ Bible ya lọta.

“O siiri di m ike ikweta na m ka bụ otu onye ahụ. Mgbe ọ hapụrụ ụlọ, ana m emegide ya, ma ugbu a, ọṅụ jupụtara m obi n’ihi eziokwu Bible ndị dị ebube m mụtaworo! Anyị mụ anya gafee etiti abalị ebe anyị na-ekwurịta banyere Bible. George kọwara ihe bụ́ nzube Chineke maka ụwa. Ajụrụ m ya n’abalị ahụ ma ọ̀ pụrụ ịdị na-enwe ọmụmụ ihe ya n’ụlọ ka m nwee ike isonye na ya.

“Nwanna Blanton tụrụ aro ka ụmụ anyị na-esonye n’ọmụmụ ihe anyị. Anyị chere na ha ka dị nnọọ obere, ebe ọ bụ na ha dị nanị afọ abụọ na afọ anọ. Otú ọ dị, Nwanna Blanton gosiri anyị Deuterọnọmi 31:12, bụ́ ebe sịrị: ‘Kpọkọta ndị Izrel, bụ́ ndị ikom, na ndị inyom, na ụmụntakịrị, ka ha wee nụ, ka ha wee mụtakwa.’ Anyị nwere ekele maka ntụziaka ahụ ọbụnakwa mee ndokwa ka ụmụ anyị na-aza ajụjụ mgbe anyị na-enwe ọmụmụ Bible. Anyị na-akwadokọ ihe anyị ga-aza ọnụ, ma ọ dịghị mgbe anyị gwara ha ihe ha ga-ekwu. Anyị na-eche na nke a nyere aka duzie ụmụ anyị ime eziokwu ahụ ka ọ bụrụ nke ha. Anyị ga-anọgide na-enwe ekele maka nduzi Nwanna Blanton nyere anyị iji nyere ezinụlọ anyị aka ito eto n’ụzọ ime mmụọ.”

Ihe Ịma Aka Ndị Chọrọ Ịchụ Ihe n’Àjà

Ugbu a anyị dịrịla n’otu n’ịmụ Bible, anyị nwetara ihe ịma aka ndị ọhụrụ anyị ga-emeri. Ebe ọ bụ na ụlọ ọrụ m dị nnọọ anya, anaghị m alọtakarị ọrụ ruo elekere anya itoolu nke abalị. N’ihi nke a, anaghị m enwe ike ịga nzukọ ndị a na-enwe n’ime izu, ọ bụ ezie na m na-enwe ike ịga nke Sunday. Ka ọ na-erule oge ahụ, Ann na-aga nzukọ nile, na-enwekwa ọganihu ngwa ngwa. Mụ onwe m chọkwara ịdị na-aga nzukọ nile, tinyere iduzi ọmụmụ ihe ezinụlọ dị mma. Amaara m na aghaghị m ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà. Ya mere, ekpebiri m igbubilata oge m ji arụ ọrụ, ọ bụ ezie na ọ ga-eme ka ndị ahịa m ụfọdụ gbafuo.

Ndokwa ahụ gara nnọọ nke ọma. Anyị na-ele ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị anya dị ka ihe dị mkpa ka nzukọ ise ndị ọzọ a na-enwe kwa izu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Anyị na-akpọ ya nzukọ anyị nke isii. Nke ahụ pụtara anyị iwepụta kpọmkwem otu ụbọchị na oge maka ya—ụbọchị Wednesday izu ọ bụla n’elekere anya asatọ nke abalị. Mgbe ụfọdụ, mgbe anyị richara nri abalị, ka anyị na-asacha efere ndị anyị ji rie nri na kichin, otu onye n’ime anyị ga-ekwu, sị, “Ọ fọrọ nke nta ka oge ‘nzukọ’ ruo!” Ann na-amalite ọmụmụ ihe ahụ ma ọ bụrụ na mụ alọtaghị n’oge, m na-agakwa n’ihu n’iduzi ya ozugbo m lọtara.

Ihe ọzọ nyeere anyị aka ịnọgide na-akwụsi ike ma na-adị n’otu dị ka ezinụlọ bụ ịgụkọ ihe mmụta dịịrị ụbọchị ọnụ n’ụtụtụ. Otú ọ dị, anyị nwere nsogbu n’ịhazi nke a. Anyị nile adịghị eteta ụra n’otu oge. Anyị kwurịtara nke a ma kpebie na anyị nile ga na-eteta n’otu oge, rie nri ụtụtụ anyị mgbe o ji ọkara gafee elekere anya isii nke ụtụtụ ma tụlekọọ ihe mmụta dịịrị ụbọchị ọnụ. Nke a baara anyị uru. Mgbe ụmụ anyị tolitere, ha họọrọ ịbanye ozi Betel. Anyị chere na nkwurịta okwu ndị a nyere aka kwalite ọnọdụ ime mmụọ ha.

Ihe Ùgwù Ndị Anyị Nwere Mgbe Anyị Mesịrị Baptizim Achọọ Ịchụ Àjà Ka Ukwuu

E mere m baptizim na 1962, ka m rụwokwara ọrụ m ruo afọ 21, erere m ya ma nweta ọrụ n’ógbè anyị iji nọrọ ezinụlọ m nso karị ka anyị wee nwee ike ijekọrọ Jehova ozi ọnụ. Nke a meghere ụzọ maka ọtụtụ ngọzi. Anyị setịpụrụ ihe mgbaru ọsọ bụ́ na anyị nile ga-abanye ozi oge nile. Nke ahụ malitere ná mbido 1970 mgbe ọkpara anyị bụ́ Edward ghọrọ onye ozi oge nile, ma ọ bụ ọsụ ụzọ oge nile, ozugbo o si n’ụlọ akwụkwọ dị elu pụta. N’oge na-adịghị anya, nwa anyị nwoke bụ́ George malitere ịsụ ụzọ, ebe Ann sochiri n’oge na-adịghị anya. Ha atọ gbara m ume nke ukwuu, n’ihi na ha na-akọrọ m ahụmahụ ndị ha nwere n’ozi ubi. Dị ka ezinụlọ, anyị kwurịtara otú anyị pụrụ isi mee ka ndụ anyị dị mfe ka anyị nile wee nwee ike ịnọ n’ozi oge nile. Anyị kpebiri ire ụlọ anyị. Anyị ebiela n’ụlọ ahụ afọ 18, nọrọkwa ebe ahụ zụlite ụmụ anyị. Anyị nwere nnọọ mmasị n’ụlọ anyị ma Jehova gọziri mkpebi anyị ire ya.

A kpọrọ Edward ije ozi na Betel na 1972, George kwa na 1974. Ọ bụ ezie na agụụ ha na-agụsi mụ na Ann ike, anyị adịghị eche otú ọ gaara esi dị mma ma a sị na ha bi n’ógbè anyị, lụọ nwanyị ma mụta ụmụ. Kama nke ahụ, anyị nwere obi ụtọ na ụmụ anyị na-ejere Jehova ozi na Betel. * Anyị kwenyeere Ilu 23:15, bụ́ nke na-ekwu, sị: “Nwa m, ọ bụrụ na obi gị maara ihe, obi m ga-aṅụrị, ọbụna nke m.”

Anyị Abanye Ozi Ọsụ Ụzọ Pụrụ Iche

Ugbu a ụmụ anyị abụọ nọ na Betel, anyị nọgidere n’ọrụ ịsụ ụzọ. Mgbe ahụ, otu ụbọchị na 1975, anyị natara otu akwụkwọ ozi e ji na-akpọ anyị òkù ịbanye ọrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche n’ókèala a na-eketaghị ọrụ dị na Clinton County, Illinois. Lee ihe ịtụnanya nke ahụ bụ! Nke a pụtara na anyị ga-ahapụ New Jersey, bụ́ ebe mere ka anyị nọrọ ụmụ anyị nọ na New York nso, bụ́kwa ebe anyị nwere ndị enyi na ndị ikwu. Otú ọ dị, anyị weere ya dị ka ọrụ si n’aka Jehova ma chụọ àjà ahụ, bụ́ nke wetara ngọzi ndị ọhụrụ.

Ka anyị rụsịrị ọrụ ọtụtụ ọnwa n’ókèala a a na-eketaghị ọrụ, anyị malitere inwe nzukọ n’otu ụlọ ezumezu dị na Carlyle, Illinois. Ma anyị chọrọ ebe ga-adịgide adịgide anyị ga-anọ na-enwe nzukọ. Otu nwanna nwoke n’ógbè ahụ na nwunye ya chọtara ala nwere obere ụlọ onye na-akpa anụmanụ bụ́ nke anyị nataliri ná ngo. Anyị sachasịrị ya—ụlọ mposi na ebe nile—ma jiri ya mere obere ebe nzukọ. Anyị na-eji obi ụtọ echeta otu ịnyịnya na-achọ ịmata ihe anyị na-eme. Ọ na-esikarị na windo ewebata isi ya iji hụ ihe na-eme ná nzukọ!

Ka oge na-aga, e guzobere Ọgbakọ Carlyle, anyị nwekwara obi ụtọ na anyị keere òkè na nke a. Ndị nyeere anyị aka bụ di na nwunye na-akatabeghị ahụ́ bụ́ ndị ọsụ ụzọ, Steve na Karil Thompson, bụ́ ndị bịakwara ịrụ ọrụ n’ókèala ahụ a na-eketaghị ọrụ. Nwanna Nwoke na Nwanna Nwanyị Thompson nọrọ ebe ahụ ọtụtụ afọ ma mesịa gaa Watchtower Bible School of Gilead ma gafee n’ọrụ ozi ala ọzọ ha n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa, bụ́ ebe ha na-eje ozi n’ọrụ njegharị.

N’oge na-adịghị anya, ndị mmadụ na-ejupụtazi n’obere ebe nzukọ anyị ahụ, anyị nwekwara mkpa nke inweta ebe bukwuru ibu. Otu nwanna nwoke ahụ bi n’ógbè ahụ na nwunye ya gbataara anyị ọsọ enyemaka ọzọ ma zụta ala ka kwesị ekwesị maka Ụlọ Nzukọ Alaeze. Lee ọṅụ anyị nwere mgbe ka afọ ole na ole gasịrị, a kpọrọ anyị òkù maka nraranye nke Ụlọ Nzukọ Alaeze a ka rụsịrị ọhụrụ na Carlyle! Enwekwara m ihe ùgwù nke ikwu okwu nraranye ya. Ọrụ anyị n’ebe ahụ bụụrụ anyị nnọọ ahụmahụ magburu onwe ya, ngọzi si n’aka Jehova.

Ohere Ije Ozi Ọhụrụ Emegheere Anyị

Na 1979, anyị natara ọrụ ọhụrụ, ịga Harrison, New Jersey. Anyị jere ozi n’ebe ahụ ruo ihe dị ka afọ 12. N’ime oge ahụ, anyị na otu nwanyị onye China malitere ịmụ Bible, nke a dujekwara n’ịmụrụ ọtụtụ ndị China ndị ọzọ ihe. Ka ọ dịgodị, anyị chọpụtara na ọtụtụ puku ụmụ akwụkwọ na ọtụtụ ezinụlọ ndị China bi n’ógbè anyị. N’ihi nke a, a gbara anyị ume ịmụ asụsụ Chinese. Ọ bụ ezie na nke a pụtara anyị iwepụta oge kwa ụbọchị ịmụ asụsụ ahụ, ihe ọ rụpụtara bụ ọtụtụ ọmụmụ Bible na-enye obi ụtọ anyị na ndị China bi n’ógbè anyị na-enwe.

N’ime afọ ndị ahụ, anyị nwere ọtụtụ ahụmahụ ndị na-atọ ọchị, karịsịa ka anyị na-agbalị ịsụ Chinese. Otu ụbọchị, Ann kọwara onwe ya dị ka “òké” Bible kama ịbụ dị ka “onye nkụzi” Bible. Okwu abụọ ahụ yiri nnọọ onwe ha. Onye nwe ụlọ mụmụrụ ọnụ ọchị ma sị: “Biko batawa. Mụ na òké Bible ekwuritatụbeghị okwu.” Anyị na asụsụ ahụ ka na-alụkwa.

Mgbe ahụ, e zigara anyị n’ebe ọzọ na New Jersey bụ́ ebe anyị nwere ike ịnọgide na-eje ozi n’ógbè ndị na-asụ Chinese. Mgbe e mesịrị, a kpọrọ anyị ịgafe Boston, Massachusetts, ebe otu ìgwè na-asụ Chinese nọworo na-eto ruo ihe dị ka afọ atọ. Ọ bụworo anyị ihe ùgwù inye ìgwè a nkwado n’ime afọ asaa gara aga, na inwe ọṅụ nke ịhụ ya ka ọ ghọrọ ọgbakọ na January 1, 2003.

Ngọzi Ndị Sitere ná Ndụ Ịchụ Onwe Onye n’Àjà

Na Malakaị 3:10, anyị na-agụ banyere ọkpụkpọ òkù Jehova ka ndị ya webata onyinye ha na àjà ha ka o wee wụsa ha ngọzi ruo mgbe ọnọdụ na-agaghị ezu ịnagide ya. Anyị hapụrụ achụmnta ego m nwere mmasị na ya nke ukwuu. Anyị rere ụlọ anyị, bụ́ nke anyị nwere nnọọ mmasị na ya. Anyị hapụkwara ihe ndị ọzọ. Ma, e jiri ha tụnyere ngọzi ndị anyị nwetaworo, àjà ndị ahụ dị nta.

N’ezie, lee nnukwu ngọzi ndị Jehova wụsaworo anyị! Anyị enwewo afọ ojuju nke ịhụ ụmụ anyị ka ha ji eziokwu ahụ kpọrọ ihe, anyị enwewo ọṅụ nke ikere òkè oge nile n’ozi na-azọpụta ndụ, anyị ahụwokwa ka Jehova na-egbo mkpa anyị. N’ezie, obere àjà ndị anyị chụrụ ewetaworo anyị ngọzi ndị dị ukwuu!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 20 Ha ka ji ikwesị ntụkwasị obi na-eje ozi na Betel—Edward na nwunye ya bụ́ Connie nọ na Patterson, ebe George na nwunye ya, bụ́ Grace, nọ na Brooklyn.

[Foto dị na peeji nke 25]

Louise na George Blanton na Ann, na 1991

[Foto dị na peeji nke 26]

Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na Carlyle, bụ́ nke a raara nye na June 4, 1983

[Foto dị na peeji nke 27]

Anyị na ọgbakọ na-asụ Chinese e hiwere ọhụrụ na Boston

[Foto dị na peeji nke 28]

Anyị na Edward, Connie, George, na Grace