Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịmata Anụ Ọhịa ahụ na Akara Ya

Ịmata Anụ Ọhịa ahụ na Akara Ya

 Ịmata Anụ Ọhịa ahụ na Akara Ya

Ọ̀ NA-ATỌ gị ụtọ ịkọwa ihe omimi? Iji mee otú ahụ, ị ga-achọ ihe ndị ga-enyere gị aka inweta nkọwa ya. N’Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ, Chineke na-enye ihe ndị ga-enye aka ịghọta nọmba ahụ bụ́ 666, aha, ma ọ bụ akara anụ ọhịa ahụ dị ná Mkpughe isi 13.

N’isiokwu a, anyị ga-atụle ụzọ iche echiche anọ bụ́ isi—ihe enyemaka ndị dị mkpa—ndị ga-ekpughe ihe akara anụ ahụ pụtara. Anyị ga-atụle (1) otú e si ahọrọ aha Bible mgbe ụfọdụ, (2) ihe ndị e ji mara anụ ọhịa ahụ, (3) ihe 666 ịbụ “nọmba nke mmadụ” pụtara, nakwa (4) ihe nọmba ahụ bụ́ 6 pụtara na ihe mere e ji dee ya ugboro atọ, nke bụ́, 600 a gbakwụnyere 60, gbakwụnyekwa ya 6, ma ọ bụ 666.—Mkpughe 13:18.

Aha Bible—Ha Abụghị Nanị Njimara

Aha Bible na-enwekarị ihe pụrụ iche ha pụtara, karịsịa ma ọ bụrụ na ọ bụ Chineke nyere ha. Dị ka ihe atụ, n’ihi na Ebram ga-aghọ nna nke ọtụtụ mba, Chineke gbanwere aha nna ochie ahụ ịbụ Ebreham, nke pụtara “nna nke ìgwè mba.” (Jenesis 17:5) Chineke gwara Josef na Meri ka ha kpọọ nwa Meri gaje ịmụ n’ọdịnihu Jizọs, nke pụtara “Jehova Bụ Nzọpụta.” (Matiu 1:21, ihe odide ala ala peeji nke NW; Luk 1:31) N’ikwekọ n’aha ahụ nwere ihe pụrụ iche ọ pụtara, site n’ozi na ọnwụ ịchụàjà Jizọs, Jehova mere ka nzọpụta anyị kwe omume.—Jọn 3:16.

N’ihi ya, nọmba ahụ bụ́ aha nke Chineke nyere bụ́ 666 aghaghị ịnọchi anya ihe Chineke weere dị ka ihe ndị e ji mara anụ ọhịa ahụ. Dị ka o kwesịrị ịdị, iji ghọta ihe ndị ahụ, ọ dị anyị mkpa ịmata anụ ọhịa ahụ n’onwe ya na ọrụ ya.

E Kpughee Anụ Ọhịa Ahụ

Akwụkwọ Bible bụ́ Daniel mere ka a matakwuo ihe anụ ọhịa ihe atụ dị iche iche pụtara. Isi 7 nwere nkọwa doro anya nke “anụ ọhịa anọ nke dị ukwuu”—ọdụm, bea, agụ, nakwa anụ ọhịa dị egwu nke nwere nnukwu ezé ígwè. (Daniel 7:2-7) Daniel na-agwa anyị na anụ ọhịa ndị a na-anọchi anya “ndị eze,” ma ọ bụ alaeze ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche, bụ́ ndị na-anọchi ibe ha n’ịchị alaeze ukwu dị iche iche.—Daniel 7:17, 23.

Banyere anụ ọhịa nke Mkpughe 13:1, 2, akwụkwọ bụ́ The Interpreter’s Dictionary of the Bible mere ka ọ pụta ìhè na ọ “na-ejikọta n’onwe ya ihe nile e ji mara anụ ọhịa anọ ahụ dị n’ọhụụ Daniel . . . N’ihi ya, anụ ọhịa mbụ a [nke Mkpughe] na-anọchi anya ikike e jikọtara ọnụ nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị nile na-emegide Chineke n’ụwa.” Mkpughe 13:7 kwadoro ihe ahụ e kwuru n’elu mgbe ọ na-ekwu banyere anụ ọhịa ahụ, sị: “E nyekwara ya ikike n’ebe ebo na ndị na asụsụ na mba ọ bụla dị.” *

N’ihi gịnị ka Bible ji eji anụ ọhịa eme ihe atụ nke ọchịchị ụmụ mmadụ? Ọ dịkarịa ala, n’ihi ihe abụọ. Nke mbụ, ọ bụ n’ihi ihe ndekọ nke ịwụfu ọbara dị ka anụ ọhịa nke ọchịchị nweworo kemgbe ọtụtụ narị afọ. “Agha bụ otu n’ime ihe ndị na-adịgide adịgide n’akụkọ ihe mere eme,” ka ndị na-akọ akụkọ ihe mere bụ́  Will na Ariel Durant dere, “mmepeanya ma ọ bụ ọchịchị onye kwuo uche ya emebeghị ka o belata.” Lee ka o si bụrụ eziokwu na “mmadụ nwere ike n’ahụ́ mmadụ ibe ya imejọ ya”! (Eklisiastis 8:9) Nke abụọ bụ na “dragọn ahụ [Setan] nyekwara anụ ọhịa ahụ ike ya na ocheeze ya na ikike dị ukwuu.” (Mkpughe 12:9; 13:2) N’ihi ya, ọchịchị ụmụ mmadụ sitere n’aka Ekwensu, si otú a na-egosipụta àgwà anụ ọhịa ya yiri nke dragọn.—Jọn 8:44; Ndị Efesọs 6:12.

Otú ọ dị, nke a apụtaghị na onye ọchịchị ọ bụla bụ́ mmadụ bụ nanị ngwá ọrụ Setan. N’ezie, n’otu echiche, ọchịchị ụmụ mmadụ bụ “onye na-ejere Chineke ozi,” na-eme ka ọha mmadụ dị n’usoro, nke ọ ga-abụ e wezụga ya, ọgba aghara ejupụta ebe nile. Ụfọdụ ndị isi echebewo ihe ndị bụ́ isi ruuru mmadụ, ndị na-agụnye ikike nke ife ezi ofufe—bụ́ ihe Setan na-achọghị. (Ndị Rom 13:3, 4; Ezra 7:11-27; Ọrụ 13:7) N’agbanyeghị nke ahụ, n’ihi mmetụta Ekwensu, ọ dịbeghị mmadụ ma ọ bụ òtù ụmụ mmadụ nwetụrụla ike iwetara ndị mmadụ udo na nchebe na-adịgide adịgide. *Jọn 12:31.

“Nọmba Ụmụ Mmadụ”

Ihe nke atọ ga-enyere anyị aka ịmata ihe 666 pụtara dabeere n’ihe mere e ji kpọọ ya “nọmba nke mmadụ,” ma ọ bụ dị ka The Amplified Bible si sụgharịa ya, “nọmba ụmụ mmadụ.” Okwu a apụghị izo aka n’ebe otu mmadụ nọ, n’ihi na ọ bụ Setan—ọ bụghị mmadụ ọ bụla—nwere ikike n’ebe anụ ọhịa ahụ dị. (Luk 4:5, 6; 1 Jọn 5:19; Mkpughe 13:2, 18) Kama nke ahụ, anụ ọhịa ahụ inwe ‘nọmba, ma ọ bụ akara ụmụ mmadụ,’ na-enye echiche na o nwere ọdịdị nke mmadụ, ọ bụghị nke mmụọ ma ọ bụ mmụọ ọjọọ, nakwa na ọ na-egosipụta àgwà ụfọdụ nke mmadụ. Gịnị ka àgwà ndị ahụ pụrụ ịbụ? Bible na-aza, sị: “Mmadụ nile emehiewo, gharakwa iru ebube Chineke.” (Ndị Rom 3:23) N’ihi ya, anụ ọhịa ahụ inwe “nọmba ụmụ mmadụ” na-egosi na ọchịchị dị iche iche na-egosipụta ọnọdụ nke ụmụ mmadụ dara ada, nke e ji mmehie na ezughị okè mara.

Akụkọ ihe mere eme na-egosi na nke a bụ eziokwu. “Mmepeanya ọ bụla nke dịworo mgbe ọ bụla mesịrị daa,” ka onye bụbu Odeakwụkwọ nke Mba United States bụ́ Henry Kissinger kwuru. “Akụkọ ihe mere eme bụ akụkọ banyere mgbalị ndị daworo ada, banyere ọchịchọ ndị a na-enwetaghị. . . . Ya mere, dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme, mmadụ aghaghị ịnakwere na a pụghị izere ọdachi.” Nnyocha a Kissinger ji ezi obi mee na-agba akaebe nye  eziokwu a bụ́ isi nke Bible: “Ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.”—Jeremaịa 10:23.

Ugbu a anyị mataworo anụ ọhịa ahụ ma ghọta otú Chineke si ele ya anya, anyị nweziri ike inyocha akụkụ ikpeazụ nke ihe omimi anyị—nọmba ahụ bụ́ isii na ihe mere e ji dee ya ugboro atọ—ya bụ, 666, ma ọ bụ 600 a gbakwụnyere 60, gbakwụnyekwa ya 6.

Isii E Dere Ugboro Atọ —N’ihi Gịnị?

N’ime Akwụkwọ Nsọ, nọmba ụfọdụ nwere ihe ha nọchiri anya ha. Dị ka ihe atụ, a na-ejikarị nọmba ahụ bụ́ asaa eme ihe iji nọchie anya ihe zuru ezu, ma ọ bụ zuo okè, n’anya Chineke. Dị ka ihe atụ, ihe mejupụtara izu okike ihe Chineke bụ “ụbọchị” ma ọ bụ ogologo oge asaa, bụ́ nke Chineke ji rụzuo ọrụ ike ihe ya n’ụwa kpam kpam. (Jenesis 1:3-2:3) “Okwu ọnụ” Chineke dị ka ọlaọcha nke “e sichaworo ugboro asaa,” si otú ahụ bụrụ nke a nụchara n’ụzọ zuru okè. (Abụ Ọma 12:6; Ilu 30:5, 6) A gwara Neeman onye ekpenta ka ọ saa ahụ́ ugboro asaa n’Osimiri Jọdan, mgbe o mesịkwara nke ahụ, a gwọrọ ya kpam kpam.2 Ndị Eze 5:10, 14.

Isii bụ asaa e wepụrụ otu. Ọ́ gaghị abụ ihe nnọchianya dabara adaba nke ihe na-ezughị okè, ma ọ bụ ihe gbara ọrụ, n’anya Chineke? Ee, ọ bụ! (1 Ihe E Mere 20:6, 7) Ọzọkwa, ide isii ugboro atọ, dị ka 666, na-emesi nnọọ ezughị okè ahụ ike. Eziokwu ahụ bụ́ na 666 bụ “nọmba ụmụ mmadụ,” dị ka anyị tụleworo, na-egosikwu na nke a bụ echiche ziri ezi. N’ihi ya, ihe ndekọ nke anụ ọhịa ahụ, “nọmba ụmụ mmadụ” ya, na nọmba 666 ahụ n’onwe ya na-arụtụ aka n’otu nkwubi okwu na-enweghị mgbagha—erutụghị eru na ọdịda kpam kpam n’anya Jehova.

Nkọwa nke erughị eru nke anụ ọhịa ahụ na-echetara anyị ihe e kwuru banyere Eze Belshaza nke Babilọn oge ochie. Site n’ọnụ Daniel, Jehova gwara onye ọchịchị ahụ, sị: “A tụwo gị n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, hụ na ihe kọrọ n’ime gị.” Kpọmkwem n’abalị ahụ, e gburu Belshaza, Alaeze Ukwu Babilọn dị ike adaakwa. (Daniel 5:27, 30) N’otu aka ahụ, ikpe Chineke megide anụ ọhịa ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ na ndị nile nwere akara ya ga-apụtara anụ ọhịa ahụ na ndị na-akwado ya mbibi. Otú ọ dị, n’ime nke a, Chineke ga-ekpochapụ ọ bụghị nanị otu usoro ọchịchị kama ọchịchị nile nke ụmụ mmadụ. (Daniel 2:44; Mkpughe 19:19, 20) Ya mere, lee ka o si dị mkpa ka anyi zere inweta akara ahụ na-egbu egbu nke anụ ọhịa ahụ!

A Kọwaa Akara Ahụ

Ozugbo o mesịrị ka a ghọta nọmba 666 ahụ, Mkpughe kpọtụrụ ụmụazụ dị 144,000 nke Nwa Atụrụ ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst aha, bụ́ ndị e dere aha ya na aha Nna ya, bụ́ Jehova, n’egedege ihu ha. Aha ndị a na-eme ka a mata ndị bu ha dị ka ndị Jehova na Ọkpara ya nwe, bụ́ ndị  ha ji obi ụtọ na-agba àmà banyere. N’otu aka ahụ, ndị nwere akara anụ ọhịa ahụ na-egosipụta na ha na-ejere anụ ọhịa ahụ ozi. Ya mere, akara ahụ, ma è dere ya n’aka nri ma ọ bụ n’egedege ihu, n’ụzọ ihe atụ, bụ ihe na-eme ka a mata onye bu ya dị ka onye na-enye usoro ọchịchị ụwa nke yiri anụ ọhịa nkwado n’ụdị ofufe. Ndị nwere akara ahụ na-enye “Siza” ihe ruuru Chineke. (Luk 20:25; Mkpughe 13:4, 8; 14:1) N’ụzọ dị aṅaa? Site n’inye ọchịchị, ihe nnọchianya ya, na ike agha ya, bụ́ nke ha na-elegara anya maka nzọpụta, nsọpụrụ n’ụdị ofufe. Ofufe ọ bụla ha na-enye ezi Chineke ahụ bụ́ nanị n’elu ọnụ.

N’ụzọ megidere nke ahụ, Bible na-agba anyị ume, sị: “Unu atụkwasịla obi n’ahụ́ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ́ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere. Mmụọ ya na-apụ apụ, o wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.” (Abụ Ọma 146:3, 4) Ndị na-aṅa ntị na ndụmọdụ a amamihe dị na ya adịghị enwe nkụda mmụọ mgbe ndị ọchịchị na-emezughị nkwa ndị ha kwere ma ọ bụ mgbe ndị ndú na-adọrọ adọrọ tụfuru ọnọdụ ha.—Ilu 1:33.

Nke a apụtaghị na ezi Ndị Kraịst adịghị eme ihe ọ bụla banyere ọnọdụ ọjọọ nke ihe a kpọrọ mmadụ nọ na ya. Kama nke ahụ, ha ji ịrụsi ọrụ ike na-akpọsa otu ọchịchị nke ga-edozi nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ—Alaeze Chineke, bụ́ nke ha na-anọchite anya ya.—Matiu 24:14.

Alaeze Chineke—Nanị Olileanya Dịịrị Ihe A Kpọrọ Mmadụ

Mgbe ọ nọ n’ụwa, Jizọs mere Alaeze Chineke isiokwu nke nkwusa ya. (Luk 4:43) N’ekpere ihe atụ ya, bụ́ nke a na-akpọkarị Ekpere Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe, Jizọs kụziiri ụmụazụ ya ka ha na-ekpe ekpere ka Alaeze ahụ bịa nakwa ka e mee uche Chineke n’ụwa ebe a. (Matiu 6:9, 10) Alaeze ahụ bụ ọchịchị nke ga-achị ụwa dum, ọ bụghị site n’isi obodo dị n’ụwa, kama site n’eluigwe. N’ihi ya, Jizọs kpọrọ ya “alaeze nke eluigwe.”—Matiu 11:12.

Olee onye ruru eru ịbụ Eze nke Alaeze ahụ karịa Jizọs Kraịst, bụ́ onye nwụrụ n’ihi ndị ọ ga-achị n’ọdịnihu? (Aịsaịa 9:6, 7; Jọn 3:16) N’oge na-adịghị anya, Onye Ọchịchị a zuru okè, onye bụ́ ugbu a mmụọ dị ike, ga-atụba anụ ọhịa ahụ, ndị eze ya, na usuu ndị agha ya n’ime “ọdọ ọkụ ahụ nke ji sọlfọ na–enwu ọkụ,” bụ́ ihe nnọchianya nke mbibi zuru ezu. Ma ọ bụghị ebe ahụ ka okwu biri. Jizọs ga-ebibikwa Setan, bụ́ ihe ọ na-adịghị mmadụ ọ bụla ga-emeli ya.—Mkpughe 11:15; 19:16, 19-21; 20:2, 10.

Alaeze Chineke ga-ewetara ndị nile na-erube isi ọ na-achị udo. (Abụ Ọma 37:11, 29; 46:8, 9) Ọbụna iru újú, ihe mgbu, na ọnwụ agaghịzi adị. Lee atụmanya dị ebube nke a bụụrụ ndị na-anataghị akara nke anụ ọhịa ahụ!—Mkpughe 21:3, 4.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Maka ntụle zuru ezu nke amaokwu ndị a, lee isiakwụkwọ nke 28 nke akwụkwọ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 11 Ọ bụ ezie na ha maara na ọchịchị ụmụ mmadụ na-emekarị ka anụ ọhịa, ezi Ndị Kraịst na-edo onwe ha n’okpuru “ikike ndị ka elu” nke ọchịchị, dị ka Bible kwuru ka e mee. (Ndị Rom 13:1) Otú ọ dị, mgbe ndị ọchịchị dị otú ahụ nyere iwu ka ha mee ihe megidere iwu Chineke, ha ‘na-erubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.’—Ọrụ 5:29.

[Igbe dị na peeji nke 5]

Ihe Ndị Na-enye Aka Ịghọta Ihe 666 Pụtara

1. Aha Bible na-egosikarị ihe ụfọdụ banyere àgwà ma ọ bụ ndụ ndị na-aza ha, dị ka ọ dị n’ihe banyere Ebreham, Jizọs, na ọtụtụ ndị ọzọ. N’otu aka ahụ, nọmba aha nke anụ ọhịa ahụ na-anọchi anya ihe ndị e ji mara ya.

2. N’akwụkwọ Bible bụ́ Daniel, anụ ọhịa ndị ahụ dịgasị iche iche na-anọchi anya alaeze ma ọ bụ alaeze ukwu dị iche iche nke ụmụ mmadụ bụ́ ndị na-anọchi onwe ha. Anụ ọhịa ọtụtụ ihe mejupụtara nke Mkpughe 13:1, 2 na-anọchi anya usoro ọchịchị zuru ụwa ọnụ, nke Setan na-enye ike ma na-achịkwa.

3. Anụ ọhịa ahụ inwe “nọmba nke mmadụ,” ma ọ bụ “nọmba ụmụ mmadụ,” na-egosi na o nwere ọdịdị nke mmadụ, ọ bụghị nke mmụọ ọjọọ. N’ihi ya, ọ na-egosi erughị eru nke ụmụ mmadụ nke mmehie na ezughị okè na-akpata.

4. N’anya Chineke, nọmba ahụ bụ́ isii, bụ́ nke na-erughị nọmba izu ezu ma ọ bụ izu okè nke Bible, bụ́ asaa, na-ezo aka n’ezughị okè. Akara ahụ bụ́ 666 na-emesi erughị eru ahụ ike site n’inwe nọmba ahụ ugboro atọ.

[Foto ndị dị na peeji nke 6]

Ọchịchị ụmụ mmadụ adawo, nọmba ahụ bụ́ 666 gosiri nnọọ nke ahụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Nwata agụụ na-agụgbu: MBA NDỊ DỊ N’OTU/Foto F. GRIFFING sere

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Jizọs Kraịst ga-eweta ọchịchị zuru okè n’ụwa