Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Dabere Na Mmụọ Chineke N’ime Ihe Banyere Mgbanwe Ndị A Na-enwe Ná Ndụ

Dabere Na Mmụọ Chineke N’ime Ihe Banyere Mgbanwe Ndị A Na-enwe Ná Ndụ

 Dabere Na Mmụọ Chineke N’ime Ihe Banyere Mgbanwe Ndị A Na-enwe Ná Ndụ

“Mee ike gị nile iche onwe gị n’ihu Chineke dị ka onye a nwapụtara anwapụta.”—2 TIMOTI 2:15.

1. Mgbanwe ndị dị aṅaa na-ewetara ọdịmma ime mmụọ anyị ihe ịma aka?

ỤWA gbara anyị gburugburu nọgidere na-agbanwe. Anyị na-ahụ ezigbo ọganihu ndị a na-enwe na nkà mmụta sayensị na nkà na ụzụ nakwa ndalata dị egwu nke ụkpụrụ omume. Dị ka anyị tụlere n’isiokwu bu ụzọ, Ndị Kraịst aghaghị iguzogide mmụọ nke ụwa nke na-emegide Chineke. Otú ọ dị, ka ụwa na-agbanwe, anyị na-agbanwekwa n’ọtụtụ ụzọ. Anyị na-esi na nwata ruo okenye. Anyị pụrụ inweta akụ̀ na ụba, ezi ahụ́ ike, nakwa ndị a hụrụ n’anya, ma ọ bụ bụrụ ndị ihe ndị a funahụrụ. Ọtụtụ n’ime mgbanwe ndị dị otú ahụ bụ ndị anyị na-apụghị ịchịkwa, ha pụkwara iwetara ọdịmma ime mmụọ anyị ihe ịma aka ndị ọhụrụ na ndị tara akpụ.

2. Olee otú Devid si nwee mgbanwe ná ndụ ya?

 2 Ọ bụ mmadụ ole na ole na-enwe oké mgbanwe ná ndụ ha dị ka Devid, nwa Jesi, nwere. Devid gbanwere ngwa ngwa site n’onye a na-amaghị ama dị ka nwa okoro bụ́ onye ọzụzụ atụrụ gaa n’onye a ma ama dị ka dike nke mba ya. O mesịrị ghọọ onye na-agba ọsọ ndụ, onye eze na-ekwo ekworo chụgharịrị dị ka anụmanụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, Devid ghọrọ eze na onye mmeri. O diri ihe ndị na-agbawa obi mmehie dị oké njọ na-akpata. Ọdachi dakwasịrị ya, ezinụlọ ya kewakwara. O nwetara akụ̀ na ụba, mee agadi, nagide adịghị ike ndị ha na ime agadi so aga. Otú ọ dị, n’agbanyeghị mgbanwe ndị o nwere ná ndụ ya, Devid gosipụtara obi ike na ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ nakwa na mmụọ Ya ná ndụ ya nile. O mere ike ya nile iche onwe ya n’ihu “Chineke dị ka onye a nwapụtara anwapụta,” Chineke gọzikwara ya. (2 Timoti 2:15) Ọ bụ ezie na ọnọdụ anyị dị iche na nke Devid, anyị pụrụ ịmụta ihe site n’ụzọ o si mee ihe banyere ihe ndị mere ná ndụ ya. Ihe nlereanya ya pụrụ inyere anyị aka ịghọta otú anyị pụrụ isi nọgide na-enweta enyemaka nke mmụọ Chineke ka anyị na-eche mgbanwe ihu ná ndụ anyị.

Ịdị Umeala n’Obi Devid —Ezi Ihe Nlereanya

3, 4. Olee otú Devid si si n’ịbụ onye a na-amaghị ama dị ka nwa okoro bụ́ onye ọzụzụ atụrụ gaa n’ịbụ dike nke mba ya?

3 Dị ka nwa okoro, a maghị Devid ama ọbụna n’ezinụlọ ya. Mgbe Samuel onye amụma bịara Betlehem, nna Devid kpọpụtara asaa n’ime ụmụ nwoke asatọ ya. A hapụrụ Devid, bụ́ ọdụdụ nwa, ilekọta atụrụ. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova họọrọ Devid ịbụ eze Izrel n’ọdịnihu. E si n’ubi kpọta Devid. Mgbe nke ahụ gasịrị, ihe ndekọ Bible na-asị: “Samuel wee were mpi mmanụ ahụ, tee ya n’etiti ụmụnne ya: Mmụọ nke Jehova wee na-adakwasị Devid n’ike site n’ụbọchị ahụ gaa n’ihu.” (1 Samuel 16:12, 13) Devid dabeere na mmụọ ahụ ná ndụ ya nile.

4 N’oge na-adịghị anya, nwa okoro a bụ́ onye ọzụzụ atụrụ ga-aghọ dike nke mba ya. A kpọrọ ya ijere eze ozi na ịkpọrọ ya egwú. O gburu dike ahụ bụ́ Golaịat, bụ́ onye gbara agba na-eme nnọọ ihe ike nke na ọbụna ndị agha Izrel nwere ahụmahụ tụrụ egwu izute ya. N’ịbụ onye e mere onyeisi agha, Devid meriri ndị Filistia n’agha. Ndị obodo ya hụrụ ya n’anya. Ha rọrọ abụ iji too ya. Tupu mgbe ahụ, otu onye ndụmọdụ nke Eze Sọl kọwara nwa okoro a bụ́ Devid, ọ bụghị nanị dị ka “onye maara akpọ ụbọ nke ọma” kamakwa, dị ka “dike nke bụ́ dimkpa, bụrụkwa nwoke agha, o nwekwara uche n’okwu, bụrụkwa nwoke mara mma n’ahụ́.”—1 Samuel 16:18; 17:23, 24, 45-51; 18:5-7.

5. Gịnị gaara emewo ka Devid dị mpako, oleekwa otú anyị si mara na ọ dịghị otú ahụ?

5 Ịbụ onye a ma ama, ịma mma, ike okorobịa, nkà ikwu okwu, nkà egwú, nkà ibu agha, ihu ọma Chineke—o yiri ka ọ dịghị ihe kọrọ Devid. Nke ọ bụla n’ime ihe ndị a gaara emewo ka ọ dị mpako, ma ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha buru ya isi. Rịba ama ihe Devid zaghachiri Eze Sọl, bụ́ onye nyere Devid nwa ya nwanyị ka ọ lụwa. Devid ji ezi obi umeala kwuo, sị: “Ònye ka m bụ, gịnị bụkwa ndụ m ma ọ bụ agbụrụ nna m n’Izrel, na m ga-abụrụ eze di nwa ya?” (1 Samuel 18:18) N’ikwu okwu n’amaokwu a, otu ọkà mmụta dere, sị: “Ihe Devid bu n’uche bụ na, ọ bụghị n’ihi iru eru ya, ma ọ bụ n’ihi ọnọdụ ya ná ndụ, ma ọ bụ n’ihi agbụrụ ya, ka ya ga-eji zọrọ na ya ruru eru ịbụ di nwa eze.”

6. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịzụlite ịdị umeala n’obi?

 6 Ịdị umeala n’obi Devid dabeere ná nghọta ọ ghọtara na Jehova karịrị nnọọ ụmụ mmadụ na-ezughị okè n’ụzọ nile. Ọ tụrụ Devid n’anya na Chineke na-amata ma ọ bụ na-eji mmadụ akpọrọ ihe. (Abụ Ọma 144:3) Devid makwaara na otú ọ bụla ya dịruru ukwuu bụ nanị n’ihi na Jehova gosipụtara ịdị umeala n’obi, na-eweda onwe ya ala iji gboo mkpa ya, chebe ma lekọta ya. (Abụ Ọma 18:35) Lee ihe mmụta dị mma nke ahụ bụụrụ anyị! Nkà anyị, ihe ndị anyị rụzuru, na ihe ùgwù anyị ekwesịghị ma ọlị ime ka anyị dị mpako. “N’ezie, olee ihe i nwere nke ị na-anataghị anata?” ka Pọl onyeozi dere. “Ma, ọ bụrụ na ị natara ya anata n’ezie, n’ihi gịnị ka i ji na-anya isi dị ka à ga-asị na ị nataghị ya anata?” (1 Ndị Kọrint 4:7) Iji nweta mmụọ nsọ Chineke na ihu ọma ya, anyị aghaghị ịzụlite na ịnọgide na-egosipụta ịdị umeala n’obi.—Jems 4:6.

“Unu Abọrọla Onwe Unu Ọbọ”

7. Ohere dị aṅaa dapụtaara Devid igbu Eze Sọl?

7 Ọ bụ ezie na Devid ịbụ onye a ma ama emeghị ka ọ dị mpako, nke ahụ kpaliri Eze Sọl, bụ́ onye mmụọ Chineke hapụworo, inwe ekworo igbu ọchụ. Ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe Devid mere, ọ gbalagara maka ndụ ya ma biri n’ịkpa. N’otu oge, mgbe ọ na-achụ Devid ọnwụ ọnwụ, Eze Sọl banyere n’otu ọgba, n’amaghị na Devid na ndị ha na ya so zoro n’ebe ahụ. Ndị ikom Devid gbara ya ume ka o jiri ohere ahụ yiri ihe sitere n’aka Chineke gbuo Sọl. Anyị pụrụ iji anya nke uche hụ ha n’ọchịchịrị ahụ ka ha na-agbanyere Devid izu, sị: “Lee ụbọchị nke Jehova sịrị gị, Lee, Mụ onwe m na-enye onye iro gị n’aka gị, ị ga-emekwa ya dị ka o si dị mma n’anya gị.”—1 Samuel 24:2-6.

8. N’ihi gịnị ka Devid ji ghara ịbọrọ onwe ya ọbọ?

8 Devid jụrụ imerụ Sọl ahụ́. N’igosipụta okwukwe na ndidi, o nwere afọ ojuju ịhapụrụ Jehova okwu. Mgbe eze ahụ hapụrụ ọgba ahụ, Devid kpọrọ ya òkù, sị: “Jehova kpee ikpe n’etiti mụ na gị, Jehova bọkwaara m ọbọ n’ahụ́ gị: ma aka m agaghị adị n’ahụ́ gị.” (1 Samuel 24:12) Ọ bụ ezie na ọ maara na Sọl mejọrọ ya, Devid abọrọghị onwe ya ọbọ; ọ kparịghịkwa Sọl ma ọ bụ kwuo okwu ọjọọ banyere ya. N’ọtụtụ oge ndị ọzọ, Devid zeere ịbọrọ onwe ya ọbọ. Kama nke ahụ, ọ dabeere n’ebe Jehova nọ idozi okwu.—1 Samuel 25:32-34; 26:10, 11.

9. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji bọọrọ onwe anyị ọbọ ma ọ bụrụ na a na-emegide ma ọ bụ na-akpagbu anyị?

9 Dị ka Devid, ị pụrụ ịchọta onwe gị n’ọnọdụ ndị tara akpụ. Eleghị anya, ụmụ akwụkwọ ibe gị, ndị ọrụ ibe gị, ndị ezinụlọ gị, ma ọ bụ ndị  ọzọ na-anọghị n’okpukpe gị na-emegide ma ọ bụ na-akpagbu gị. Abọrọla onwe gị ọbọ. Chere Jehova, na-arịọ maka mmụọ nsọ ya iji nyere gị aka. Ikekwe ndị ahụ na-ekweghị ekwe ga-enwe mmasị n’àgwà ọma gị ma ghọọ ndị kwere ekwe. (1 Pita 3:1) Otú o sina dị, jide n’aka na Jehova na-ahụ ọnọdụ gị, ọ ga-emekwa ihe banyere ya n’oge nke ya. Pọl onyeozi dere, sị: “Unu abọrọla onwe unu ọbọ, kama nyenụ ọnụma ahụ ohere; n’ihi na e dere, sị: ‘Ịbọ ọbọ bụ nke m; m ga-akwụghachi, ka Jehova na-asị.’”—Ndị Rom 12:19.

‘Nụrụ Ịdọ Aka ná Ntị’

10. Olee otú Devid si daba ná mmehie, oleekwa otú o si gbalịa ikpuchi ya?

10 Ọtụtụ afọ gafere. Devid ghọrọ eze a hụrụ n’anya na onye aha ya na-ede nnọọ ude. Ụzọ ndụ ikwesị ntụkwasị obi ya nke dị ịrịba ama, tinyere ọmarịcha abụ ndị o dere iji too Jehova, pụrụ ime ka mmadụ chee na ọ dịghị mgbe nwoke a ga-adaba ná mmehie dị oké njọ. Otú ọ dị, ọ dabara. Otu ụbọchị, eze ahụ nọ n’elu ụlọ ya hụ ọmarịcha nwanyị na-asa ahụ́. Ọ jụrụ ase onye ọ bụ. N’ịmata na nwanyị ahụ bụ Bat-sheba nakwa na di ya, bụ́ Yuraịa, agaala agha, Devid ziri ozi ka a kpọọ ya ma soro ya nwee mmekọahụ. Mgbe e mesịrị, ọ chọpụtara na ọ dị ime. Lee ihe ihere nke ahụ ga-abụ ma ọ bụrụ na ọ pụta ìhè! N’Iwu Mozis, ịkwa iko bụ mmehie nke nwere ntaramahụhụ ọnwụ. Ikekwe eze ahụ chere na a pụrụ ikpuchi mmehie ahụ. N’ihi ya, o zigara ozi n’ihu agha, na-enye iwu ka Yuraịa lọghachi Jeruselem. Devid chere na Yuraịa ga-eso Bat-sheba rahụ n’abalị ahụ, ma nke ahụ emeghị. Ugbu a, n’amazighị ihe ọ ga-eme, Devid zighachiri Yuraịa n’ọgbọ agha na-enye ya akwụkwọ ozi ọ ga-enye Joab, bụ́ onyeisi agha. Akwụkwọ ozi ahụ kwuru ka e debe Yuraịa n’ihu agha ebe a ga-egbu ya. Joab rubere isi, e gbukwara Yuraịa. Mgbe Bat-sheba rusịrị újú di ya dị ka omenala si dị, Devid kpọọrọ ya ka ọ bụrụ nwunye ya.—2 Samuel 11:1-27.

11. Akụkọ dị aṅaa ka Netan kọọrọ Devid, oleekwa otú o si meghachi omume?

11 O yiri ka atụmatụ ahụ ọ gaala nke ọma, ọ bụ ezie na Devid kwesịrị ịmawo na ihe ahụ nile gbara ka ọnwa n’ihu Jehova. (Ndị Hibru 4:13) Ọtụtụ ọnwa gabigara, a mụọkwa nwa ahụ. Mgbe ahụ, ná ntụziaka Chineke, Netan onye amụma gakwuuru Devid. Onye amụma ahụ kọọrọ eze otu akụkọ bụ́ ebe otu ọgaranya nke nwere ọtụtụ atụrụ weere ma gbuo nanị otu atụrụ nke otu nwoke dara ogbenye hụrụ n’anya nke ukwuu. Akụkọ ahụ kpaliri echiche ikpe ziri ezi nke Devid, ma ọ ghọtaghị ihe ọ pụtara n’ezie. Devid mara ọgaranya ahụ ikpe ozugbo. N’oké iwe, ọ gwara Netan, sị: “Onye kwesịrị ọnwụ ka nwoke ahụ bụ nke na-eme ihe a.”—2 Samuel 12:1-6.

12. Ikpe dị aṅaa ka Jehova mara Devid?

12 “Gị onwe gị ka nwoke ahụ bụ,” ka onye amụma ahụ zaghachiri. Devid amala onwe ya ikpe. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na iwe Devid ghọrọ ihere na mwute dị ukwuu. N’ịbụ onye akpata oyi wụrụ n’ahụ́, o gere ntị ka Netan na-ekwupụta ikpe ọmụma a na-apụghị ịgbanahụ agbanahụ nke Jehova. Ọ dịghị okwu nkasi obi dịịrị ya. Devid elelịwo okwu Jehova site n’ime ihe ọjọọ. Ọ̀ bụ na o jighị mma agha onye iro gbuo Yuraịa? Mma agha agaghị apụ n’ụlọ  Devid. Ọ̀ bụ na ọ kpọrọghị nwunye Yuraịa na nzuzo? Otu ihe ọjọọ ahụ ga-adakwasị ya, ọ bụghị na nzuzo, kama n’ihu ọha.—2 Samuel 12:7-12.

13. Olee otú Devid si meghachi omume n’ịdọ aka ná ntị Jehova?

13 Ebe o si dịrị Devid mma bụ na ọ gọghị agọ. O wesaghị Netan onye amụma iwe. Ọ taghị ndị ọzọ ụta ma ọ bụ nyewe ihe ngọpụ maka ihe o mere. Mgbe a tụrụ ya mmehie ya n’anya, Devid nakweere mmejọ ya, na-ekwu, sị: “Emehiewo m megide Jehova.” (2 Samuel 12:13) Abụ Ọma nke 51 gosiri oké ihe mgbu o nwere n’ihi obi amamikpe ya na otú o nweruru nchegharị. Ọ rịọrọ Jehova, sị: “Atụpụla m n’ihu Gị; anarakwala m Mmụọ Nsọ Gị.” O kweere na Jehova, n’ihi ebere ya, agaghị eleda “obi tiwara etiwa na nke e gwepịara egwepịa” n’ihi mmehie anya. (Abụ Ọma 51:11, 17) Devid nọgidere na-adabere na mmụọ Chineke. Ọ bụ ezie na Jehova echebeghị Devid pụọ n’ajọ ihe ndị si na mmehie ya pụta, ọ gbaghaara ya.

14. Olee otú anyị kwesịrị isi na-emeghachi omume n’ịdọ aka ná ntị Jehova?

14 Anyị nile bụ ndị na-ezughị okè, anyị nile na-emekwa mmehie. (Ndị Rom 3:23) Mgbe ụfọdụ, anyị na-adaba ná mmehie dị oké njọ dị ka Devid mere. Dị nnọọ ka nna na-ahụ n’anya si adọ ụmụ ya aka ná ntị, otú ahụ ka Jehova si agbazi ndị na-achọ ijere ya ozi. Otú ọ dị, ọ bụ ezie na ịdọ aka ná ntị na-aba uru, ọ naghị adị mfe nnakwere. N’ezie, mgbe ụfọdụ ọ na-abụ “ihe mwute.” (Ndị Hibru 12:6, 11) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụrụ na anyị ‘anụrụ ịdọ aka ná ntị,’ anyị na Jehova pụrụ ịdịghachi ná mma. (Ilu 8:33) Iji nọgide na-enweta ngọzi nke mmụọ Jehova, anyị aghaghị ịnakwere mgbazi ma rụọ ọrụ iji bụrụ ndị Chineke nwapụtara.

Ghara Inwe Olileanya n’Akụ̀ na Ụba Ndị A Na-ejighị n’Aka

15. (a) Olee otú ụfọdụ ndị si eji akụ̀ na ụba ha eme ihe? (b) Olee otú Devid chọrọ isi jiri akụ̀ na ụba ya mee ihe?

15 Ọ dịghị ihe ọ bụla gosiri na Devid si n’ezinụlọ a ma ama ma ọ bụ nke bara ọgaranya. Otú ọ dị, mgbe ọ bụ eze, Devid bara ọgaranya nke ukwuu. Dị ka ị maara, ọtụtụ ndị na-ezochi akụ̀ ha, jiri anyaukwu na-achọ ịmụba ya, ma ọ bụ na-emefu ya n’ụzọ ga-abara nanị ha uru. Ndị ọzọ na-eji ego ha enye onwe ha otuto. (Matiu 6:2) Devid ji akụ̀ na ụba ya mee ihe n’ụzọ dị iche. Ọ chọsiri ike ịsọpụrụ Jehova. Devid gwara Netan ọchịchọ ya iwuru Jehova ụlọ nsọ ebe a ga-adọba igbe ọgbụgba ndụ ahụ, bụ́ nke dị mgbe ahụ na Jeruselem, “na-ebi n’etiti ákwà nkwụba.” Ihe Devid bu n’uche masịrị Jehova ma ọ gwara ya site n’ọnụ Netan na ọ bụ nwa Devid, bụ́ Solomọn, ga-ewu ụlọ nsọ ahụ.—2 Samuel 7:1, 2, 12, 13.

16. Nkwadebe dị aṅaa ka Devid mere maka owuwu nke ụlọ nsọ ahụ?

16 Devid wekọtara ihe ndị a ga-eji wuo nnukwu ihe owuwu a. Devid gwara Solomọn, sị: “Edoziworo m ụlọ Jehova ọlaedo [otu narị puku talent], na ọlaọcha [otu nde talent]; ma ọla na ígwè enweghị ọ̀tụ̀tụ̀; n’ihi na o hiri nne: edoziwokwa m osisi na nkume; ị ga-atụkwasịkwa  ha ihe.” O si n’ego akpa ya nye talent ọlaedo 3,000 na talent ọlaọcha 7,000. * (1 Ihe E Mere 22:14; 29:3, 4) Onyinye mmesapụ aka Devid abụghị ngosipụta nke ihe mmadụ nwere kama ọ bụ ngosipụta nke okwukwe ya nakwa nrara ọ raara onwe ya nye Jehova Chineke. N’ịmata Isi Iyi nke akụ̀ na ụba ya, ọ gwara Jehova, sị: “N’ebe Ị nọ ka ihe nile si bịa, ọ bụkwa ihe si n’aka Gị bịa ka anyị nyere Gị.” (1 Ihe E Mere 29:14) Obi mmesapụ aka Devid kpaliri ya ime ihe nile o nwere ike ime iji kwalite ofufe dị ọcha.

17. Olee otú ndụmọdụ dị na 1 Timoti 6:17-19 si emetụta ma ndị ọgaranya ma ndị ogbenye?

17 N’ụzọ yiri nke ahụ, ka anyị jiri ihe onwunwe anyị na-eme ihe dị mma. Kama ibi ndụ nke ịhụ ego n’anya, ọ ka mma ịchọ nnwapụta Chineke—nke ahụ bụ ụzọ nke ezi amamihe na obi ụtọ. Pọl dere, sị: “Na-enye ndị bara ọgaranya n’usoro ihe dị ugbu a iwu ka ha ghara inwe anya dị elu, ka ha tụkwasịkwa olileanya ha, ọ bụghị n’akụ̀ na ụba ndị a na-ejighị n’aka, kama na Chineke, onye na-enye anyị ihe nile n’ụba ka anyị wee nwee ọṅụ; ka ha na-arụ ọrụ ọma, ka ha baa ọgaranya n’ezi ọrụ, ka ha na-emesapụ aka, na-adị njikere ikerịta ihe, na-atọrọ onwe ha ezi ntọala maka ọdịnihu n’ụzọ nwere nchebe, ka ha wee jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.” (1 Timoti 6:17-19) N’agbanyeghị ihe bụ́ ọnọdụ akụ̀ na ụba anyị, ka anyị dabere na mmụọ Chineke ma na-ebi ụdị ndụ nke ga-eme ka anyị bụrụ “ọgaranya n’ebe Chineke nọ.” (Luk 12:21) Ọ dịghị ihe dị oké ọnụ ahịa karịa inwe ezi aha n’ebe Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya nọ.

Chee Onwe Gị n’Ihu Chineke Dị Ka Onye A Nwapụtara Anwapụta

18. N’ụzọ dị aṅaa ka Devid si setịpụ ezi ihe nlereanya nye Ndị Kraịst?

18 Ná ndụ ya nile, Devid gbalịrị ịbụ onye Jehova nwapụtara. N’abụ, o tiri mkpu, sị: “Meere m amara, Chineke, meere m amara; n’ihi na n’ime Gị ka mkpụrụ obi m gbabaworo.” (Abụ Ọma 57:1) Ntụkwasị obi o nwere n’ebe Jehova nọ aghọghị ya ahịa. Devid mere agadi, “ụbọchị ndụ ya jukwara ya afọ.” (1 Ihe E Mere 23:1) Ọ bụ ezie na Devid mere mmehie ndị dị oké njọ, a na-echeta ya dị ka otu n’ime ọtụtụ ndị àmà Chineke bụ́ ndị gosipụtara okwukwe dị ịrịba ama.—Ndị Hibru 11:32.

19. Olee otú anyị pụrụ isi chee onwe anyị n’ihu Chineke dị ka ndị a nwapụtara anwapụta?

19 Ka ọnọdụ gị ná ndụ na-agbanwe, cheta na dị nnọọ ka Jehova kwagidere Devid, wusie ya ike ma gbazie ya, Ọ pụrụ imere gị otu ihe ahụ. Dị ka Devid, Pọl onyeozi nwere ọtụtụ mgbanwe ná ndụ ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ya onwe ya kwa nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi site n’ịdabere na mmụọ Chineke. O dere, sị: “Maka ihe nile enwere m ume site n’onye ahụ nke na-enye m ike.” (Ndị Filipaị 4:12, 13) Ọ bụrụ na anyị adabere na Jehova, ọ ga-enyere anyị aka inwe ihe ịga nke ọma. Ọ chọrọ ka anyị nwee ihe ịga nke ọma. Ọ bụrụ na anyị egee ya ntị ma bịaruo ya nso, ọ ga-enye anyị ike ime uche ya. Ọ bụrụkwa na anyị anọgide na-adabere na mmụọ Chineke, anyị ga-enwe ike “iche onwe [anyị] n’ihu Chineke dị ka [ndị] a nwapụtara anwapụta” ugbu a na ruo mgbe nile ebighị ebi.—2 Timoti 2:15.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 16 Ọnụ ego nke ihe Devid nyere, dị ka ọ dị n’oge a, karịrị $1,200,000,000, U.S.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee otú anyị pụrụ isi nọrọ na nche megide ịdị mpako?

• N’ihi gịnị ka anyị na-ejighị kwesị ịbọrọ onwe anyị ọbọ?

• Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ịdọ aka ná ntị anya?

• N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji tụkwasị Chineke obi, ọ bụghị akụ̀ na ụba?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 16, 17]

Devid dabeere na mmụọ Chineke, chọọkwa ịbụ onye Chineke nwapụtara. Ị̀ na-eme otú ahụ?

[Foto dị na peeji nke 18]

“N’ebe Ị nọ ka ihe nile si bịa, ọ bụkwa ihe si n’aka Gị bịa ka anyị nyere Gị”