Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Guzogide Mmụọ Nke Ụwa Na-agbanwe Agbanwe

Guzogide Mmụọ Nke Ụwa Na-agbanwe Agbanwe

 Guzogide Mmụọ Nke Ụwa Na-agbanwe Agbanwe

“Anyị natara, ọ bụghị mmụọ nke ụwa, kama mmụọ nke sitere na Chineke.”—1 Ndị Kọrint 2:12.

1. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka e si ghọgbuo Iv?

“AGWỌ ahụ rafuru m.” (Jenesis 3:13) Site n’ikwu nke a, nwanyị mbụ, bụ́ Iv, gbalịrị ịkọwa ihe mere o ji nupụrụ Jehova Chineke isi. Ihe o kwuru bụ eziokwu, ọ bụ ezie na ọ bụghị ihe ngọpụ maka ajọ omume ya. E nyere Pọl onyeozi ike mmụọ nsọ ide ka e mesịrị, sị: “A ghọgburu [Iv] kpam kpam.” (1 Timoti 2:14) A ghọgburu ya ikwere na nnupụisi—iri mkpụrụ ahụ a machibidoro iwu—ga-abara ya uru, na-eme ka ọ dị ka Chineke. A ghọgbukwara ya n’ụdị na ọ maghị onye duhiere ya. Ọ maghị na agwọ ahụ bụ nanị ọnụ na-ekwuru Setan bụ́ Ekwensu.—Jenesis 3:1-6.

2. (a) Olee otú Setan si eduhie ndị mmadụ taa? (b) Gịnị bụ “mmụọ nke ụwa,” oleekwa ajụjụ ndị anyị ga-atụle ugbu a?

2 Kemgbe oge Adam na Iv, Setan anọgidewo na-aghọgbu ndị mmadụ. N’ezie, ọ “na-eduhie ụwa dum mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9) Ụzọ ndị o si eme ihe agbanwebeghị. Ọ bụ ezie na ọ dịghịzi eji agwọ nkịtị eme ihe, ọ nọgidere na-ekpuchi onye ọ bụ. Site n’ụlọ ọrụ ụfọdụ na-emepụta ihe ntụrụndụ, usoro mgbasa ozi, na ụzọ ndị ọzọ, Setan na-eduhie ndị mmadụ ikwere na nduzi ịhụnanya nke Chineke adịghị ha mkpa, na ọ dịghịkwa abara ha uru. Mgbalị Ekwensu na-eme iduhie ndị mmadụ emewo ka ndị mmadụ n’ebe nile nwee mmụọ nnupụisi megide iwu na ụkpụrụ Bible. Bible na-akpọ nke a “mmụọ nke ụwa.” (1 Ndị Kọrint 2:12) Mmụọ a na-enwe nnọọ mmetụta dị ike na nkwenkwe, àgwà, na akparamàgwà nke ndị na-amaghị Chineke. Olee otú e si egosipụta mmụọ ahụ, oleekwa otú anyị pụrụ isi guzogide mmetụta ya na-emerụ emerụ? Ka anyị hụ.

Ụkpụrụ Omume Na-adalata Adalata

3. N’ihi gịnị ka “mmụọ nke ụwa” ji na-apụtawanye nnọọ ìhè n’oge a?

3 N’oge a, “mmụọ nke ụwa” apụtawanyewo nnọọ ìhè. (2 Timoti 3:1-5) Eleghị anya, ị chọpụtawo na ụkpụrụ omume na-adalata adalata.  Akwụkwọ Nsọ na-akọwa ihe nke a ji dị otú a. Mgbe e guzobesịrị Alaeze Chineke n’afọ 1914, agha dara n’eluigwe. E meriri Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ma chụda ha n’ụwa. N’oké iwe, Setan anọwo na-agbalịsi ike iduhie ụwa nile. (Mkpughe 12:1-9, 12, 17) N’ụzọ ọ bụla o nwere ike, ọ na-agbalịsi ike ‘iduhie ọbụna ndị a họọrọ, ma ọ bụrụ na o kwe mee.’ (Matiu 24:24) Dị ka ndị Chineke, anyị bụ ndị bụ́ isi o lekwasịrị anya. Ọ na-agbalịsi ike imebi ọnọdụ ime mmụọ anyị ka anyị wee kwụsị inwe ihu ọma Jehova na atụmanya nke ndụ ebighị ebi.

4. Olee otú ndị ohu Jehova si ele Bible anya, oleekwa otú ụwa si ele ya anya?

4 Setan na-achọ ime ka a ghara ịtụkwasị Bible obi, bụ́ akwụkwọ dị oké ọnụ ahịa nke na-akụziri anyị banyere Onye Okike anyị na-ahụ n’anya. Ndị ohu Jehova hụrụ Bible n’anya ma jiri ya kpọrọ ihe. Anyị maara na ọ bụ Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ, ọ bụghị okwu ụmụ mmadụ. (1 Ndị Tesalonaịka 2:13; 2 Timoti 3:16) Otú ọ dị, ụwa Setan ga-achọ ka anyị ghara ikwere nke ahụ. Dị ka ihe atụ, okwu mbido nke otu akwụkwọ na-akatọ Bible na-ekwu, sị: “Ọ dịghị ihe ‘dị nsọ’ banyere Bible, ọ bụghịkwa ‘okwu Chineke.’ Ọ bụghị ndị nsọ Chineke nyere ike mmụọ nsọ dere ya, kama ọ bụ ndị ụkọchukwu na-achọ ike.” Ndị e duhiere ikwere nzọrọ dị otú ahụ pụrụ n’ụzọ dị mfe inwe echiche hiere ụzọ nke bụ́ na ha nweere onwe ha ife Chineke n’ụzọ ọ bụla masịrị ha—ma ọ bụ gharadị ife ya ma ọlị.—Ilu 14:12.

5. (a) Gịnị ka otu onye edemede zọọrọ banyere okpukpe ndị ji Bible eme ihe? (b) Olee otú ụfọdụ echiche ụwa ọtụtụ ndị nwere dị ma e jiri ha tụnyere ihe Bible na-ekwu? (Gụnye igbe dị na peeji na-esonụ.)

5 Ịkatọ Bible n’ụzọ pụtara ìhè na n’ụzọ na-apụtachaghị ìhè, tinyere ihu abụọ okpukpe nke ndị na-azọrọ na ha na-akwado ya, emewo ka ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị mmadụ gharazie inwe mmasị n’okpukpe, gụnyere okpukpe na-eji Bible eme ihe. A na-akatọ okpukpe n’akụkọ ụwa, ndị ọkachamara na-akatọkwa ya. Otu onye edemede na-ekwu, sị: “Ndị si n’ọdịbendị ndị a ma ama na-ele okpukpe ndị Juu na Iso Ụzọ Kraịst anya ọjọọ. Mgbe e lere ha anya n’ụzọ kasị mma, a na-ewere ha dị ka ihe mgbe ochie na-adọrọ mmasị; e leekwanụ ha anya n’ụzọ kasị njọ, a na-ahụ ha dị ka echiche ndị meworo ochie bụ́ ndị na-egbochi ntozu okè n’ọgụgụ isi na ọganihu nkà mmụta sayensị. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, nlelị aghọwo ịkwa emo na mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ.” Mmegide dị otú a na-esitekarị n’aka ndị na-ekweghị na Chineke dị na ndị “na-enweghị nghọta n’iche echiche ha.”—Ndị Rom 1:20-22.

6. Echiche dị aṅaa ka ụwa nwere banyere ụdị mmekọahụ ndị Chineke katọrọ?

6 N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya na ndị mmadụ ka nọgidere na-akpafuwanye site n’ụkpụrụ omume nke Chineke. Dị ka ihe atụ, Bible na-akọwa idina ụdị onwe onye dị ka “ihe rụrụ arụ.” (Ndị Rom 1:26, 27) Ọ na-ekwukwa na ndị na-akwa iko bụ́ ndị na-alụbeghị di na nwunye na ndị nke lụrụ di na nwunye agaghị eketa Alaeze Chineke. (1 Ndị Kọrint 6:9) N’agbanyeghị nke ahụ, n’ọtụtụ ala, ọ bụghị nanị na a na-anabata mmekọahụ  ndị dị otú ahụ kama a na-akọwa ha n’akwụkwọ, magazin, egwú, ihe nkiri sinima, na n’ihe omume TV dị ka ihe ndị na-adọrọ mmasị. A na-ele ndị na-ekwu okwu megide omume ndị dị otú ahụ anya dị ka ndị na-enweghị uche ghere oghe, ndị nkatọ, na ndị na-amaghị nke a na-akọ. Kama ile ụkpụrụ Chineke anya dị ka ngosipụta nke nchegbu ịhụnanya, ụwa na-ele ha anya dị ka ihe na-egbochi mmadụ inwere onwe ya na inwe afọ ojuju.—Ilu 17:15; Jud 4.

7. Ajụjụ ndị dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

7 N’ime ụwa nke nọgidere na-emegidesikwu Chineke ike, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya anyị ileru àgwà na ụkpụrụ nke anyị onwe anyị anya. Site n’oge ruo n’oge, anyị kwesịrị iji ekpere na ezi obi na-enyocha onwe anyị iji hụ na anyị ejighị nwayọọ nwayọọ na-ahapụ echiche na ụkpụrụ Jehova. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ na-enwe mmasị n’ihe ndị m gaara ajụwo afọ ụfọdụ gara aga? M̀ na-anabatatụzi omume ndị Chineke kagburu? M̀ na-enwe ọchịchọ nke ịghara iji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe karịa ka m nwere n’oge gara aga? Ụzọ m si ebi ndụ, ọ̀ na-egosi na m na-ebute ihe ndị metụtara Alaeze ahụ ụzọ ná ndụ m?’ (Matiu 6:33) Ntụgharị uche ndị dị otú a ga-enyere anyị aka iguzogide mmụọ nke ụwa.

“Ghara Ịkpafu Mgbe Ọ Bụla”

8. Olee otú mmadụ pụrụ isi si n’ebe Jehova nọ kpafuo?

8 Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ, sị: ‘Ọ dị mkpa ka anyị na-etinye uche n’ihe ndị anyị na-anụ karịa otú anyị na-adị etinye, ka anyị wee ghara ịkpafu mgbe ọ bụla.’ (Ndị Hibru 2:1) Ụgbọ ebili mmiri na-ebupụ adịghị eru ebe ọ na-eje. Ọ bụrụ na onyeisi ụgbọ mmiri anọghị na nche ịmata ebe ifufe na ebili mmiri chere ihu, ụgbọ ya pụrụ ịgbafe ọdụ ụgbọ mmiri dị nchebe ma kpụọ n’ala n’ụsọ mmiri bụ́ okwute okwute. N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ bụrụ na anyị anọghị na nche iji ghọta eziokwu ndị dị oké ọnụ ahịa nke Okwu Chineke, anyị pụrụ ịkpafu n’ụzọ dị mfe site n’ebe Jehova nọ, ụgbọ anyị ga-ebibikwa n’ụzọ ime mmụọ. Ọ dịghị mkpa na anyị ga-ajụ eziokwu ahụ kpam kpam tupu nke a emee anyị. N’ezie, ọ bụghị ọtụtụ mmadụ na-ajụ Jehova n’otu ntabi anya ma ọ bụ kpachara anya mee otú ahụ. Ọtụtụ mgbe, ha na-eji nwayọọ nwayọọ na-etinye aka n’ihe na-adọpụ uche ha n’ịṅa ntị n’Okwu Chineke. N’ụzọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’amaghị ama, ha na-eji nwayọọ nwayọọ daba ná mmehie. Dị ka onyeisi ụgbọ nke na-ehi ụra, ndị dị otú ahụ adịghị eteta n’ụra ruo mgbe oge gafeworo.

9. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jehova si gọzie Solomọn?

9 Tụlee ụzọ ndụ Solomọn. Jehova mere ya eze Izrel. Chineke kwere ka Solomọn wuo ụlọ nsọ ahụ ma duzie ya ide akụkụ ụfọdụ nke Bible. Jehova gwara ya okwu ugboro abụọ ma nye ya akụ̀ na ụba, mee ka ọ bụrụ onye a ma ama, meekwa ka udo dị n’oge ọchịchị ya. Karịsịa, Jehova ji amamihe dị ukwuu gọzie Solomọn. Bible na-ekwu, sị: “Chineke nyekwara Solomọn amamihe na nghọta hiri nne nke ukwuu, na obi sara mbara, dị ka ájá nke dị n’ụsọ oké osimiri. Amamihe Solomọn wee baa ụba karịa amamihe ụmụ Ihu anyanwụ nile, karịakwa amamihe Ijipt nile.” (1 Ndị Eze 4:21,  29, 30; 11:9) N’ezie, mmadụ pụrụ iche, sị, ọ bụrụ na ọ dị onye pụrụ ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke, ọ bụ Solomọn. N’agbanyeghị nke ahụ, Solomọn si n’ezi ofufe dapụ. Olee otú nke ahụ si mee?

10. Olee ntụziaka nke Solomọn na-erubeghị isi na ya, gịnịkwa si na ya pụta?

10 Solomọn maara ma ghọta Iwu Chineke nke ọma. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ ga-enwewo mmasị pụrụ iche ná ntụziaka ndị e nyere ndị ga-aghọ eze n’Izrel. Otu n’ime ntụziaka ahụ bụ nke kwuru, sị: “[Eze agaghị] emekwa ka ndị inyom baara ya ụba, ka obi ya wee ghara iwezụga onwe ya.” (Deuterọnọmi 17:14, 17) N’agbanyeghị ntụziaka a doro anya, Solomọn nwere narị nwunye asaa na narị ndị iko nwanyị atọ. Ọtụtụ n’ime ndị inyom a na-efe chi ala ọzọ. Anyị amaghị ihe mere Solomọn ji lụọ ọtụtụ nwunye, anyị amaghịkwa otú o si gọpụrụ ihe ahụ o mere. Ihe anyị maara bụ na o rubeghị isi ná ntụziaka doro anya nke Chineke. Ihe si na ya pụta bụ kpọmkwem ihe Jehova dọrọ aka ná ntị ga-esi na ya apụta. Anyị na-agụ, sị: “Ndị inyom [Solomọn] wezụgara obi ya ka o soo chi ọzọ.” (1 Ndị Eze 11:3, 4) Nwayọọ nwayọọ—ma n’ụzọ a na-apụghị igbochi egbochi—amamihe Chineke nyere ya furu. Ọ kpafuru. Ka oge na-aga, ọchịchọ Solomọn ime ihe na-atọ ndị nwunye ya na-ekpere arụsị ụtọ nọchiri anya ọchịchọ ya irubere Chineke isi na ime ihe na-atọ ya ụtọ. Lee ihe mwute nke ahụ bụ, n’ihi na ọ bụ Solomọn bụ onye dere okwu ndị a tupu mgbe ahụ, sị: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu”!—Ilu 27:11.

Mmụọ nke Ụwa Dị Ike

11. Olee otú ihe anyị na-etinye n’uche anyị si emetụta echiche anyị?

11 Ihe atụ Solomọn na-akụziri anyị na ọ dị ize ndụ iche na n’ihi na anyị maara eziokwu ahụ, mmụọ nke ụwa agaghị emetụta echiche anyị. Dị nnọọ ka nri nkịtị si emetụta ahụ́ anyị, nri uche na-emetụtakwa uche anyị. Ihe anyị na-etinye n’uche anyị na-akpụzi echiche na àgwà anyị. N’ịghọta nke a, ụlọ ọrụ dị iche iche na-emefu ọtụtụ ijeri dollar kwa afọ n’ịkpọsa ngwá ahịa ha. Mkpọsa ngwá ahịa ndị na-enwe ihe ịga nke ọma na-eji okwu na onyinyo ndị na-adọrọ adọrọ eme ihe iji kpalie agụụ na ọchịchọ nke onye na-azụ ihe. Ndị na-akpọsa ngwá ahịa makwaara na ịhụ mkpọsa ngwá ahịa otu ugboro ma ọ bụ ugboro abụọ agachaghị akpali ndị mmadụ ịgbara gaa zụọ ngwá ahịa ahụ. Otú ọ dị, igosi ya ugboro ugboro ruo oge ụfọdụ na-emekarị ka ndị na-azụ ihe nwee mmasị ná ngwá ahịa ahụ. Mkpọsa ngwá ahịa na-arụpụta ihe—ma ọ́ bụghị ya, ọ dịghị onye ga-etinye ego na ya. Ọ na-enwe mmetụta dị ike n’echiche na àgwà nke ọha mmadụ.

12. (a) Olee otú Setan si emetụta echiche ndị mmadụ? (b) Gịnị na-egosi na a pụrụ inweta Ndị Kraịst?

12 Dị ka onye na-akpọsa ngwá ahịa, Setan na-akwalite echiche ya site n’ime ka o yie ihe na-adọrọ mmasị, na-amara na ka oge na-aga, ya pụrụ ime ka ndị mmadụ nakwere ụzọ iche echiche ya. Site n’ihe omume ntụrụndụ na ụzọ ndị ọzọ, Setan na-eduhie ndị mmadụ ikwere na ezi ihe dị njọ nakwa na ihe ọjọọ dị mma. (Aịsaịa  5:20) Ọbụna ezi Ndị Kraịst abụwo ndị mgbalị Setan na-eme ịgbasa ihe ọmụma ụgha duhiere. Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Okwu sitere ná mkpali nke mmụọ nsọ na-ekwu kpọmkwem na n’oge ikpeazụ, ụfọdụ ga-esi n’okwukwe dapụ, na-aṅa ntị n’okwu nduhie ndị sitere ná mkpali nke mmụọ na ozizi ndị mmụọ ọjọọ, site n’ihu abụọ nke ndị na-ekwu okwu ụgha, ndị e gbunyere akara n’akọ na uche ha dị ka e ji ígwè ọkụ”—1 Timoti 4:1, 2; Jeremaịa 6:15.

13. Gịnị bụ mkpakọrịta ọjọọ, oleekwa otú mkpakọrịta anyị na-enwe si emetụta anyị?

13 Ọ dịghị onye n’ime anyị mmụọ nke ụwa na-apụghị imetụta. Ifufe na ebili mmiri nke usoro ihe Setan dị ike. Bible na-adụ anyị ọdụ n’ụzọ amamihe dị na ya, sị: “Ka a ghara iduhie unu. Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà bara uru.” (1 Ndị Kọrint 15:33) Mkpakọrịta ọjọọ pụrụ ịgụnye ihe ọ bụla ma ọ bụ onye ọ bụla—ọbụna n’ime ọgbakọ—nke na-egosipụta mmụọ nke ụwa. Ọ bụrụ na anyị echee na mkpakọrịta ọjọọ apụghị imerụ anyị ahụ́, nke ahụ ọ́ gaghị apụta na anyị ga-ekwubi na ezi mkpakọrịta apụghị inyere anyị aka? Lee ka nke ahụ ga-esi bụrụ ihie ụzọ! Bible mere nnọọ ka okwu ahụ doo anya mgbe o kwuru, sị: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.”—Ilu 13:20.

14. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ isi guzogide mmụọ nke ụwa?

14 Iji guzogide mmụọ nke ụwa, anyị aghaghị iso ndị maara ihe—ndị na-ejere Jehova ozi—na-akpakọrịta. Anyị aghaghị iji ihe ndị na-ewulite okwukwe na-emejupụta uche anyị. Pọl onyeozi dere, sị: “Ihe ọ bụla nke bụ́ eziokwu, ihe ọ bụla nke kwesịrị nchebara echiche, ihe ọ bụla nke bụ́ ezi omume, ihe ọ bụla nke dị ọcha, ihe ọ bụla nke na-akpali ịhụnanya, ihe ọ bụla nke a na-ekwu okwu ọma banyere ya, omume ọma ọ bụla dịnụ na ihe ọ bụla dịnụ nke kwesịrị otuto, nọgidenụ na-atụle ihe ndị a.” (Ndị Filipaị 4:8) Dị ka ndị nweere onwe ha ime nhọrọ, anyị pụrụ ịhọrọ ihe ndị anyị ga-atụle. Ka anyị na-ahọrọ mgbe nile ịtụle ihe ndị ga-adọta anyị nso karị n’ebe Jehova nọ.

Mmụọ Chineke Ka Ya Ike

15. Olee otú Ndị Kraịst na Kọrint oge ochie si dị iche ná ndị ọzọ bi n’obodo ahụ?

15 N’adịghị ka ndị mmụọ nke ụwa na-eduhie, ezi Ndị Kraịst bụ ndị mmụọ nsọ Chineke na-eduzi. Ọ bụ ọgbakọ dị na Kọrint ka Pọl degaara akwụkwọ, sị: “Anyị natara, ọ bụghị mmụọ nke ụwa, kama mmụọ nke sitere na Chineke, ka anyị wee mara ihe ndị Chineke jiworo obiọma nye anyị.” (1 Ndị Kọrint 2:12) Kọrint oge ochie bụ obodo nke mmụọ nke ụwa rikpuru. Ihe ka ọtụtụ ná ndị bi na ya rụrụ nnọọ arụ nke na okwu bụ́ “ime ka onye Kọrint” bịara pụta “ime omume rụrụ arụ.” Setan emewo ka anya nke uche nke ndị mmadụ kpuo ìsì. N’ihi ya, ha bụ ndị na-adịghị aghọtacha ma ọ bụ ndị na-adịghị aghọta ihe ọ bụla banyere ezi Chineke ahụ. (2 Ndị Kọrint 4:4) N’agbanyeghị nke ahụ, site na mmụọ nsọ ya, Jehova meghere anya ụfọdụ ndị Kọrint, na-enyere ha aka inweta ihe ọmụma nke eziokwu. Mmụọ ya kpaliri ma duzie ha ime mgbanwe ndị bụ́ isi ná ndụ ha ka ha wee nwee ike inweta ihu ọma na ngọzi ya. (1 Ndị Kọrint 6:9-11) Ọ bụ ezie na mmụọ nke ụwa dị ike, mmụọ Jehova ka ya ike.

16. Olee otú anyị pụrụ isi nata ma nọgide na-enwe mmụọ Chineke?

16 Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Mmụọ nsọ Jehova bụ ike kasịnụ n’eluigwe na ala, ọ na-enyekwa ya ndị nile ji okwukwe na-arịọ maka ya n’efu na n’ụba. (Luk 11:13) Otú ọ dị, iji nweta mmụọ Chineke, anyị aghaghị ime ihe karịrị  iguzogide mmụọ nke ụwa. Anyị aghaghịkwa ịmụchi Okwu Chineke anya ma na-etinye ya n’ọrụ ná ndụ anyị iji mee ka mmụọ anyị—ọnọdụ uche anyị—kwekọọ n’echiche ya. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, Jehova ga-ewusi anyị ike iguzogide atụmatụ ọ bụla nke Setan pụrụ iji mee ihe iji mebie ọnọdụ ime mmụọ anyị.

17. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ahụmahụ Lọt pụrụ isi kasie anyị obi?

17 Ọ bụ ezie na Ndị Kraịst abụghị akụkụ nke ụwa, ha nọ n’ime ụwa. (Jọn 17:11, 16) Ọ dịghị onye n’ime anyị pụrụ izere mmụọ nke ụwa kpam kpam, n’ihi na anyị na ndị na-ahụghị Chineke ma ọ bụ ụzọ ya n’anya pụrụ ịdị na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ ọbụna na-ebikọ. Ọ̀ na-adị anyị dị ka ọ dị Lọt, bụ́ onye “nwere oké mwute,” ọbụna bụrụ onye mmebi iwu nke ndị Sọdọm, bụ́ ndị o bi n’etiti ha, mekpara ahụ́? (2 Pita 2:7, 8) Ya bụrụ otú ahụ, anyị pụrụ ịkara obi. Jehova chebere ma napụta Lọt, ọ pụkwara imere anyị otu ihe ahụ. Nna anyị nke na-ahụ n’anya na-ahụ ma mara ọnọdụ anyị, ọ pụkwara inyere anyị aka ma nye anyị ike dị anyị mkpa iji nọgide jiri ihe ime mmụọ na-akpọrọ ihe. (Abụ Ọma 33:18, 19) Ọ bụrụ na anyị adabere n’ebe ọ nọ, tụkwasị ya obi ma na-akpọku ya, ọ ga-enyere anyị aka iguzogide mmụọ nke ụwa, n’agbanyeghị otú ọnọdụ anyị pụrụ isiru ike.—Aịsaịa 41:10.

18. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị iji mmekọrịta anyị na Jehova kpọrọ ihe?

18 N’ime ụwa nke e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ na nke Setan na-eduhie, dị ka ndị Jehova, e ji ihe ọmụma nke eziokwu ahụ gọzie anyị. N’ihi ya, anyị na-enwe ọṅụ na udo nke ụwa na-enweghị. (Aịsaịa 57:20, 21; Ndị Galeshia 5:22) Anyị ji olileanya magburu onwe ya nke ndụ ebighị ebi na Paradaịs kpọrọ ihe, bụ́ ebe mmụọ nke ụwa a na-anwụ anwụ na-agaghị adị ọzọ. N’ihi ya, ka anyị jiri mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa nke anyị na Chineke kpọrọ ihe ma nọrọ na nche iji wepụ ọchịchọ ọ bụla nke ịkpafu n’ụzọ ime mmụọ. Ka anyị nọgide na-abịarukwu Jehova nso, ọ ga-enyekwara anyị aka iguzogide mmụọ nke ụwa.—Jems 4:7, 8.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Olee ụzọ ndị Setan siworo ghọgbuo ma duhie ndị mmadụ?

• Olee otú anyị pụrụ isi zere isi n’ebe Jehova nọ kpafuo?

• Gịnị na-egosi na mmụọ nke ụwa dị ike?

• Olee otú anyị pụrụ isi nata ma nọgide na-enwe mmụọ nke sitere n’ebe Chineke nọ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe dị na peeji nke 11]

AMAMIHE ỤWA NA AMAMIHE CHINEKE

E nweghị ihe bụcha eziokwu—ndị mmadụ na-emepụta eziokwu nke ha.

“Okwu [Chineke] bụ eziokwu.”—Jọn 17:17.

Iji kpebie ihe dị iche n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ, dabere ná mmetụta gị.

“Obi dị aghụghọ karịa ihe nile, ihe na-adịghị nghọta ka ọ bụkwa.”—Jeremaịa 17:9.

Na-eme ihe masịrị gị.

“Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.”—Jeremaịa 10:23.

Akụ̀ na ụba bụ isi ihe na-eweta obi ụtọ.

“Ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ nile.”—1 Timoti 6:10.

[Foto dị na peeji nke 10]

Solomọn si n’ezi ofufe kpafuo ma chigharịkwuru chi ụgha

[Foto dị na peeji nke 12]

Dị ka onye na-akpọsa ngwá ahịa, Setan na-akwalite mmụọ nke ụwa. Ị̀ na-eguzogide ya?