Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nhọrọ Ị Na-eme Banyere Ọgwụgwọ—Ọ̀ Dị Ihe O Mere?

Nhọrọ Ị Na-eme Banyere Ọgwụgwọ—Ọ̀ Dị Ihe O Mere?

Nhọrọ Ị Na-eme Banyere Ọgwụgwọ—Ọ̀ Dị Ihe O Mere?

ỌRỊA dị iche iche na mmerụ ahụ bụcha ihe ndị ihe a kpọrọ mmadụ maara nnọọ nke ọma. Mgbe ndị iro a nke ahụ ike chere ọtụtụ ndị ihu, ha na-achọ ahụ efe site n’inweta ọgwụgwọ. Jisọs Kraịst ghọtara uru mgbalị ndị dị otú ahụ pụrụ ịba, na-ekweta na “mkpa dibịa akpaghị ndị ahụ dị mma; kama ọ na-akpa ndị ahụ na-adịghị mma.”—Luk 5:31.

Onye so dee Bible nke dere okwu ndị ahụ, bụ́ Luk, bụ dibịa n’onwe ya. (Ndị Kọlọsi 4:14) Ikekwe n’oge ha mekọrọ njem, Pọl onyeozi ritere uru na nkà ịgwọ ọrịa Luk. Ma, Akwụkwọ Nsọ ọ̀ na-enye ụkpụrụ nduzi n’ihe banyere ụdị nlekọta ahụ ike ndị Kraịst na-anabata? Usoro ọgwụgwọ ị na-ahọrọ ọ̀ dị ihe o mere?

Ụkpụrụ Nduzi Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ

Bible pụrụ iduzi mmadụ n’ime mkpebi ndị amamihe dị na ha n’ihe banyere ọgwụgwọ. Dị ka ihe atụ, Deuterọnọmi 18:10-12 na-eme ka o doo anya na ihe ndị dị ka ịjụ ndị mmụọ ase na majik bụ “ihe arụ” n’anya Jehova. “Ịgwọ nsí,” bụ́ nke Pọl dọrọ aka ná ntị banyere ya, ga-agụnye omume ndị a a machibidoro iwu. (Ndị Galetia 5:19-21) N’ihi ya, ezi ndị Kraịst na-ezere usoro ọ bụla nke ịchọpụta ma ọ bụ ịgwọ ọrịa nke o doro anya na ọ gụnyere mgbaasị.

Bible na-ekpughekwa otú Onye Okike si were ịdị nsọ nke ndụ na ọbara n’ihe dị nnọọ oké ọnụ ahịa. (Jenesis 9:3, 4) N’ịbụ ndị kpebisiri ike ịṅa ntị n’iwu bụ́ ‘ịhapụ ọbara,’ Ndịàmà Jehova na-ajụ usoro ọgwụgwọ ndị na-emebi iwu Bible bụ́ ịhapụ ọbara. (Ọrụ 15:28, 29) Nke a apụtaghị na ha na-ajụ ụdị ọgwụgwọ nile. Kama nke ahụ, ha na-achọ ọgwụgwọ kasị mma a pụrụ inweta maka ha onwe ha na ụmụ ha. Ma, ha na-arịọ ndị ọkachamara n’ilekọta ahụ ike inye ha ọgwụgwọ kwekọrọ na nkwenkwe okpukpe ha.

Tụlee Ijeụkwụ Gị

Eze Solomọn dọrọ aka ná ntị na “onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla: ma onye nwere ezi uche [na-atụle] ijeụkwụ ya.” (Ilu 14:15) Ọbụna mgbe mkpebi metụtara ahụ ike na-emegideghị ụkpụrụ Bible kpọmkwem, mmadụ kwesịrị ‘ịtụle ijeụkwụ ya.’ Ọ bụghị ụdị ọgwụgwọ nile na-enye aka. Mgbe Jisọs kwuru na ‘mkpa dibịa na-akpa ndị ahụ na-adịghị mma,’ ọ dịghị akwado usoro ọgwụgwọ nile e nwere n’oge ya. Ọ maara na ụdị ọgwụgwọ ụfọdụ dị irè, marakwa na ụfọdụ bụ nke aghụghọ. *

N’otu aka ahụ taa, ụfọdụ ọgwụgwọ pụrụ ịbụ ihe na-abaghị uru, ọbụna nke wayo. Emeghị ezi mkpebi pụrụ itinye mmadụ n’ihe ize ndụ na-enweghị isi. E kwesịkwara ịghọta na ọgwụgwọ nke nyeere otu onye aka pụrụ ịbụ ihe na-adịghị irè—ọbụna ihe na-emerụ ahụ—nye onye ọzọ. Mgbe onye dị akọ na-eche mkpebi metụtara ọgwụgwọ ihu, ọ ga-eji nlezianya tụlee nhọrọ ndị o nwere kama ‘ikwere okwu nile,’ ọbụna mgbe ọ na-anata ndụmọdụ n’aka ndị enyi ya na-echere ya echiche ọma. Ọ ga-egosipụta “uche zuru okè” site n’ịchọ ihe ọmụma a pụrụ ịdabere na ya ka o wee nọrọ n’ọnọdụ nke ime nhọrọ dabeere n’ezi ihe ọmụma.—Taịtọs 2:12.

Nwee Ezi Uche

O kwesịrị ekwesị mmadụ inwe nchegbu banyere ọnọdụ ahụ ike ya. Mmadụ ilebara ọdịmma anụ ahụ ya anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị na-egosi na o nwere ekele n’ebe onyinye nke ndụ dị nakwa n’ebe Isi Iyi ya bụ́ Chineke nọ. (Abụ Ọma 36:9) Ọ bụ ezie na ndị Kraịst na-achọ inweta ọgwụgwọ kwesịrị ekwesị, ha kwesịrị inwe ezi nguzo n’okwu metụtara ahụ ike. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye ahụ siri nnọọ ike etinyebiga uche ókè n’ahụ ike na mgbasi ike ya, nke a pụrụ ime ka o leghara “ihe ndị ka mkpa” anya.—Ndị Filipaị 1:10; 2:3, 4, NW.

Otu nwanyị ọrịa kpara aka ọjọọ n’oge Jisọs ‘mefusịrị ihe nile o nwere’ na-achọ enyemaka nke ndị dibịa maka ọgwụgwọ nke ọrịa ya na-adịghị ala ala. Gịnị si na ya pụta? Kama ịbụ onye a gwọrọ, ọnọdụ ya kara njọ, bụ́ nke na-aghaghị ịkpataworo ya oké obi nkoropụ. (Mak 5:25, 26) O mere ihe nile o nwere ike ime iji nweta ahụ efe, ma ọ dịghị nke nwere isi. Ahụmahụ ya na-eme ka ókè sayensị ọgwụ na ahụ ike nke oge ya maruuru ọgwụ pụta ìhè. Ọbụna taa, n’agbanyeghị ọganihu ndị e nwere ná nchọpụta ọgwụ nakwa na nkà mmụta ọgwụ, ọtụtụ mmadụ na-ahụ onwe ha n’ọnọdụ yiri nke ahụ. Ya mere ọ dị mkpa inwe echiche ziri ezi banyere ihe sayensị ọgwụ na ahụ ike pụrụ ime. Ahụ ike zuru okè bụ ihe aka na-apụghị iru ugbu a. Ndị Kraịst na-aghọta na oge Chineke maka “ime ka ahụ dị mba nile ike” ka dị n’ihu. (Mkpughe 22:1, 2) Ya mere, anyị aghaghị ịzụlite echiche kwesịrị ekwesị banyere ọgwụgwọ.—Ndị Filipaị 4:5.

N’ụzọ doro anya, nhọrọ ndị anyị na-eme dị ihe ha mere. N’ihi nke ahụ, mgbe mkpebi ndị metụtara ọgwụgwọ chere anyị ihu, nhọrọ anyị kwesịrị igosipụta ma ọchịchọ anyị inweta ezi ahụ ike ma nke ịnọgide na-eso Chineke na-enwe ezi mmekọrịta. Ka anyị na-eme otú ahụ, anyị pụrụ ịnọgide na-eji obi ike atụ anya mmezu nke nkwa Jehova bụ́ na n’ụwa ọhụrụ ahụ dị ebube na-abịanụ, “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.”—Aịsaịa 33:24.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ nkà ihe ọmụma ọgwụ Dioscorides dere na narị afọ mbụ, otu usoro ọgwụgwọ a sịrị na ọ bụ maka ọrịa jaundice bụ ịṅụ ọgwụ e ji mmanya na nsị́ ewu mee! N’ezie, anyị maara ugbu a na o yikarịrị nnọọ ka ọgwụ dị otú ahụ ọ ga-etinyeworị ihe ná nsogbu nke onye ọrịa ahụ.