Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Bụ Eziokwu Banyere Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ?

Gịnị Bụ Eziokwu Banyere Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ?

 Gịnị Bụ Eziokwu Banyere Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ?

Ihe karịrị afọ 50 gara aga, nkume otu onye Bedouin na-azụ atụrụ tụbara n’ime otu ọgba dugara n’ihe ụfọdụ ndị kpọworo nchọpụta kasịnụ ndị ọkà mmụta ihe mgbe ochie meworo na narị afọ nke 20. Onye Bedouin ahụ nụrụ ka nkume ahụ tiwara otu ite ájá. Mgbe o mere nchọpụta, ọ hụrụ nke mbụ n’ime ihe a bịara mara dị ka Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ.

AKWỤKWỌ mpịakọta ndị a abụwo ihe na-adọrọ uche na ihe na-akpali arụmarụ ma n’etiti ndị ọkà mmụta ma n’usoro mgbasa ozi. Ọha mmadụ nwere nnọọ ọtụtụ ihe mgbagwoju anya na ihe ọmụma na-abụghị eziokwu banyere ha. A nụwo kepu kepu banyere oké nzochi a na-ezochi akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ, bụ́ nke egwu a na-atụ na ha kpughere eziokwu ndị pụrụ imebi okwukwe ndị Kraịst nakwa nke ndị Juu, kpaliri. Ma uru dị aṅaa ka akwụkwọ mpịakọta ndị a bara n’ezie? Ka ihe karịrị afọ 50 gasịworo, à pụrụ ịmata ihe ndị bụ́ eziokwu banyere ha?

Gịnị Bụ Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ?

Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ bụ ihe odide ochie nke ndị Juu, e dere ihe ka ọtụtụ n’ime ha n’asụsụ Hibru, dee ụfọdụ n’Aramaic, deekwa ole na ole n’asụsụ Grik. Ọtụtụ n’ime akwụkwọ mpịakọta ndị a na iberibe ha adịruola ihe karịrị afọ 2,000, na-amalite tupu oge ọmụmụ Jisọs. Ihe odide asaa toro ogologo bụ́ ndị mebirila ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ dịgasị iche, so n’akwụkwọ mpịakọta ndị mbụ e nwetara n’aka ndị Bedouin. Ka e nyochakwuru ọgba dị iche iche, a chọtara akwụkwọ mpịakọta ndị ọzo na ọtụtụ puku iberibe akwụkwọ mpịakọta. N’afọ ndị dị site na 1947 ruo 1956, a chọpụtara ngụkọta nke ọgba 11 ndị akwụkwọ mpịakọta dị na ha na nso Qumran, n’akụkụ Osimiri Nwụrụ Anwụ.

Mgbe a haziri akwụkwọ mpịakọta nile ahụ na iberibe ha, ha dị ihe dị ka ihe odide 800. Ihe dị ka  otu ụzọ n’ụzọ anọ, ma ọ bụ nanị ihe karịrị ihe odide 200, bụ akụkụ ụfọdụ nke ihe odide Bible Hibru. Ihe odide ndị ọzọ na-anọchite anya ihe odide oge ochie nke ndị Juu bụ́ ndị na-esoghị na Bible, ma Apọkrịfa ma Pseudepigrapha. *

Ụfọdụ n’ime akwụkwọ mpịakọta ndị kasị kpalie mmasị ndị ọkà mmụta bụ ihe odide ndị a na-amabughị. Ha gụnyere nkọwa ndị e nyere n’okwu ndị metụtara iwu ndị Juu, ụkpụrụ nduzi ndị a kapịrị ọnụ maka ndị so n’ịrọ òtù ahụ biri na Qumran, uri na ekpere ndị e ji eme ememe okpukpe, nakwa akwụkwọ nkà mmụta okpukpe ndị na-ekpughe echiche dị iche iche banyere mmezu amụma Bible na mgbe ikpeazụ. E nwekwara nkọwa Bible ndị pụrụ iche, bụ́ nkọwa ndị kasị ochie buteere nkọwa amaokwu n’amaokwu nke ihe odide Bible nke oge a ụzọ.

Ole Ndị Dere Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ?

Usoro dịgasị iche nke idetu oge e dere akwụkwọ mgbe ochie na-egosi na e depụtaghachiri ma ọ bụ dee akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ n’agbata narị afọ nke atọ T.O.A. na narị afọ mbụ O.A. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta ekwuwo na ọ bụ ndị Juu si Jerusalem tupu e bibie ụlọ nsọ ahụ na 70 O.A., zoro akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ n’ọgba ndị ahụ. Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkà mmụta na-enyocha akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ chọpụtara na echiche a ekwekọghị n’ihe ndị e dere n’akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ. Ọtụtụ akwụkwọ mpịakọta na-egosipụta echiche na omenala ndị megidere nke ndị ndú okpukpe nọ na Jerusalem. Akwụkwọ mpịakọta ndị a na-egosi ìgwè nke kweere na Chineke ajụla ndị nchụàjà na ozi a na-eje n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem nakwa na o lere ofufe òtù okpukpe ha na-efe n’ọzara anya dị ka ihe na-anọchite anya ozi a na-eje n’ụlọ nsọ. O yiri ihe na-agaghị eme eme na ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ nsọ Jerusalem ga-ezo nchịkọta nke akwụkwọ ndị gụnyere akwụkwọ mpịakọta ndị dị otú ahụ.

Ọ bụ ezie na o yiri ka e nwere ìgwè ndị ndepụtaghachi nọ na Qumran, ikekwe ndị okpukpe ahụ si ebe ọzọ were ọtụtụ n’ime akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ bịa ebe ahụ. N’otu echiche, Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ bụ nnukwu ọ́bá akwụkwọ. Dị ka ọ dị n’ọ́bá akwụkwọ ọ bụla, a pụrụ inwe akwụkwọ ndị bu ọtụtụ echiche dịgasị iche, ọ bụghị ha nile ga na-egosipụtacha echiche okpukpe nke ndị na-agụ ha. Otú ọ dị, ihe odide ndị ọnụ ọgụgụ ha buru ibu yikarịrị ka ha na-egosipụta mmasị na nkwenkwe pụrụ iche nke ìgwè ahụ.

Ndị ahụ Bi na Qumran Hà Bụ Ndị Essene?

Ọ bụrụ na akwụkwọ mpịakọta ndị a si n’ọ́bá akwụkwọ Qumran, ole ndị bi na ya? Prọfesọ Eleazar Sukenik, bụ́ onye nwetara akwụkwọ mpịakọta atọ maka Mahadum Hibru dị na Jerusalem na 1947, bụ onye mbụ kwupụtara na ọ bụ otu ógbè nke ndị Essene nwe akwụkwọ mpịakọta ndị a.

Ndị Essene bụ otu ịrọ òtù ndị Juu bụ́ nke ndị edemede narị afọ mbụ bụ́ Josephus, Philo nke Alexandria, na Pliny nke Okenye kwuru banyere ya. A na-akọ nkọ banyere ebe ndị Essene si kpọmkwem, ma o yiri ka ha malitere ịdị n’oge oké ọgba aghara ahụ sochiri nnupụisi ndị Maccabee na narị afọ nke abụọ T.O.A. * Josephus kọrọ banyere ịdị adị ha n’oge ahụ ka o nyere nkọwa zuru ezu banyere otú echiche okpukpe ha si dị iche na nke ndị Farisii na ndị Sadusii. Pliny kwuru banyere ebe otu ìgwè ndị Essene biri n’akụkụ Osimiri Nwụrụ Anwụ n’agbata Jeriko na En-gedi.

Prọfesọ James VanderKam, bụ́ ọkà mmụta na-amụ Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ, kwuru na “ndị Essene bụ́ ndị biri na Qumran bụ nanị akụkụ dị nta nke ìgwè ka ukwuu nke ndị Essene,” bụ́ ndị Josephus kwuru na ọnụ ọgụgụ ha dị ihe dị ka puku anọ. Ọ bụ ezie na ha ekwekọchaghị ná nkọwa nile a na-enye ha, ìgwè nke ihe odide ndị ahụ e si Qumran nweta na-ese onyinyo ya yiri ka ò kwekọrọ n’ebe ndị Essene nọ karịa n’ìgwè ọ bụla ọzọ nke ndị Juu a maara n’oge ahụ.

Ụfọdụ azọrọwo na Iso Ụzọ Kraịst malitere na Qumran. Otú o sina dị, a pụrụ ịchọpụta ọtụtụ ọdịiche pụtara ìhè n’etiti echiche okpukpe nke ịrọ òtù Qumran ahụ na nke ndị Kraịst oge gboo. Ihe odide  ndị ahụ e si Qumran nweta na-ekpughe iwu nchịkwa ndị siri oké ike banyere Ụbọchị Izu Ike na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ itinyebiga uche ókè n’ịdị ọcha n’ụzọ omenala. (Matiu 15:1-20; Luk 6:1-11) A pụkwara ikwu otu ihe ahụ banyere nnọpụ ndị Essene na-anọpụ iche n’etiti ọha mmadụ, nkwere ha kweere n’akara aka nakwa n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, na mmesi ha na-emesi ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye ike nakwa echiche ndị dị omimi banyere isonyere ndị mmụọ ozi n’ofufe ha. Nke a na-egosi na ha ekwenyeghị n’ozizi Jisọs na nke ndị Kraịst oge mbụ.—Matiu 5:14-16; Jọn 11:23, 24; Ndị Kọlọsi 2:18; 1 Timoti 4:1-3.

Ọ Dịghị Ihe E Zochiri, E Nweghị Akwụkwọ Mpịakọta Ndị E Zoro Ezo

N’afọ ndị sochiri nchọpụta nke Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ ndị ahụ, e bipụtara akwụkwọ dị iche iche bụ́ ndị mere ka ndị ọkà mmụta nọ gburugburu ụwa nwee ike ịmara nchọpụta ndị mbụ e mere. Ma, ọtụtụ puku iberibe akwụkwọ ndị si n’otu n’ime ọgba ndị ahụ, bụ́ nke a maara dị ka Ọgba nke 4, nyere nnọọ nsogbu karị. Ha dị n’aka obere ìgwè ndị ọkà mmụta si mba dị iche iche bụ́ nke e guzobere n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Jerusalem (nke dị na Jọdan n’oge ahụ) n’Ebe Ngosi Ihe Mgbe Ochie nke Palestine. Ọ dịghị ọkà mmụta bụ́ onye Juu ma ọ bụ Israel so n’ìgwè a.

Ìgwè ahụ guzobere ụkpụrụ nke ekweghị ka aka ndị ọzọ ruo n’akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ ruo mgbe ha bipụtara ihe ndị ha chọpụtara. A kpaara ọnụ ọgụgụ ndị ọkà mmụta so n’ìgwè ahụ ókè. Mgbe otu onye so n’ìgwè ahụ nwụrụ, ọ bụ nanị otu ọkà mmụta ọhụrụ ka a na-ewebata iji nọchie ya. Ọrụ dị na ya chọrọ ìgwè ka nnọọ ukwuu, chọọkwa, n’ọnọdụ ụfọdụ, nkà ka ukwuu n’asụsụ Hibru na Aramaic oge ochie. James VanderKam si otú a kwuo ya: “Ọtụtụ iri puku iberibe akwụkwọ karịrị ihe ndị ọkachamara asatọ pụrụ ịhụ maka ha, n’agbanyeghị otú ha nweruru nkà.”

Mgbe a lụsịrị Agha Ụbọchị Isii na 1967, Ebe Ọwụwa Anyanwụ Jerusalem na akwụkwọ mpịakọta ndị dị na ya bịara dịrị n’aka ndị ọchịchị Israel, ma a gbanweghị ụkpụrụ nke ìgwè ahụ na-enyocha akwụkwọ mpịakọta. Ka mbipụta nke akwụkwọ mpịakọta ndị si n’Ọgba nke 4 were oge site n’ọtụtụ afọ gaa n’ọtụtụ iri afọ, ụfọdụ ndị ọkà mmụta mere mkpesa. Na 1977, Prọfesọ Geza Vermes nke Mahadum Oxford kpọrọ ya akụkọ ọjọọ kasịnụ na nkà mmụta nke narị afọ 20. A malitere ịnụ kepu kepu n’ebe nile na Chọọchị Katọlik ma ụma na-ezochi ihe ọmụma ndị si n’akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ bụ́ ndị ga-emebiri Iso Ụzọ Kraịst ihe.

N’afọ ndị 1980, a mụbara ndị so n’ìgwè ahụ n’ikpeazụ ịbụ ndị ọkà mmụta 20. E mesịa, na 1990, ná ntụzi nke editọ ukwu ya a ka họpụtara ọhụrụ, bụ́ Emanuel Tov, nke Mahadum Hibru dị na Jerusalem, a mụbakwuru ndị so n’ìgwè ahụ ruo ihe karịrị ndị ọkà mmụta 50. E wepụtara usoro ihe omume a kapịrị ọnụ maka ibipụta ọrụ nile ndị ọkà mmụta rụrụ n’akwụkwọ mpịakọta ndị fọdụrụnụ.

E nwere nke bụ́ ọganihu na mberede na 1991. Nke mbụ, e bipụtara akwụkwọ bụ́ A Preliminary Edition of the Unpublished Dead Sea Scrolls (Mbipụta Mbuụzọ nke Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ Ndị A Na-ebipụtabeghị). E ji kọmputa dekọọ nke a na-adabere ná ndepụta okwu nke ìgwè ahụ ji eme ihe. Mgbe nke ahụ gasịrị, Ọ́bá Akwụkwọ Huntington dị na San Marino, California, mara ọkwa na ha ga-eme ka ọkà mmụta ọ bụla nwee ike inweta foto zuru ezu nke akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ. N’oge na-adịghị anya, mgbe e bipụtara akwụkwọ bụ́ A Facsimile Edition of the Dead Sea Scrolls (Mbipụta nke Nwere Foto nke Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ), foto nke akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ a na-ebipụtabughị ebipụta bịara dị mfe nnweta.

Ya mere, n’ime afọ iri gara aga, e wepụtawo Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ nile maka nnyocha. Nnyocha ahụ na-ekpughe na ọ dịghị ihe e zochiri; ọ dịghị akwụkwọ mpịakọta ndị e zoro ezo. Ka a na-ebipụta akụkụ ndị ikpeazụ nke akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ, ọ bụ ugbu a nanị ka a pụrụ ịmalite inyocha ha n’ụzọ zuru ezu. E nweela ndị ọkà mmụta ọhụrụ na-amụ banyere akwụkwọ mpịakọta. Ma olee uru nnyocha a baara ndị mmụta Bible?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Ma Apọkrịfa (n’ụzọ nkịtị, “ihe e zoro ezo”) ma Pseudepigrapha (n’ụzọ nkịtị, “ihe odide ndị a na-ekwughị eziokwu banyere ndị dere ha”) bụcha ihe odide ndị Juu ndị e dere site na narị afọ nke atọ T.O.A. ruo narị afọ mbụ O.A. Chọọchị Roman Katọlik nakweere Apọkrịfa dị ka akụkụ nke akwụkwọ Bible e dere n’ike mmụọ nsọ, ma ndị Juu na ndị Protestant jụrụ akwụkwọ ndị a. Pseudepigrapha na-adịkarị n’ụdị nke akụkọ ndị a gbakwụnyere n’akụkọ Bible, bụ́ ndị e ji aha nke ụfọdụ ndị a ma ama a kọrọ akụkọ ha na Bible dee.

^ par. 13 Lee isiokwu bụ́ “Olee Ndị Bụ́ Ndị Maccabee?” n’Ụlọ Nche nke November 15, 1998, peeji nke 21-24.

[Foto dị na peeji nke 3]

Ndị a so n’ọgba ndị dị n’akụkụ Osimiri Nwụrụ Anwụ bụ́ ebe ndị a chọtara akwụkwọ mpịakọta mgbe ochie

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

Iberibe akwụkwọ mpịakọta: Peeji nke 3, 4, na 6: Site n’aka Israel Antiquities Authority

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 5]

Site n’aka Shrine of the Book, Ebe Ndebe Ihe Ochie Israel, Jerusalem