Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịchọ Ndị Kwesịrị Ekwesị na Kenya

Ịchọ Ndị Kwesịrị Ekwesị na Kenya

 Ịchọ Ndị Kwesịrị Ekwesị na Kenya

KENYA bụ ala mara oké mma site n’okike. Oké ọhịa ndị tojuru etoju, mbara ala ndị dị larịị, ọzara ndị na-ekpo oké ọkụ, na ugwu ndị snow kpuchiri chọrọ ọmarịcha ala a mma. Ọ bụ ebe obibi nke ihe karịrị otu nde ele nakwa nke anụ rhino ahụ nọ n’ihe ize ndụ mkpochapụ. Mmadụ pụkwara ịhụ ka ìgwè anịgọ bara ụba na-agafe n’ala ahịhịa ndụ jupụtara.

Anụ ufe bakwara ụba, malite n’ugo dị ike nke na-efego oké elu ruo n’ọtụtụ nnụnụ olu ụtọ tụrụ àgwà bụ́ ndị abụ olu ụtọ ha na-ejupụta n’ikuku. Oleekwa onye na-agaghị ahụ enyi na ọdụm? A naghị echefu ihe ndị a na-ahụ na ụda ndị a na-anụ na Kenya echefu.

Ma, e nwere ụda ọzọ a na-anụ n’akụkụ nile nke ala a mara mma. Ọ bụ ụda nke ọtụtụ puku olu na-ezisa ozi olileanya. (Aịsaịa 52:7) Olu ndị a na-adaru na nke ndị sitere n’ihe karịrị agbụrụ na asụsụ 40. N’echiche a, Kenya bụkwa ala mara mma n’ụzọ ime mmụọ.

Ihe ka ọtụtụ ná ndị Kenya na-eji okpukpe akpọrọ ihe, na-adịkwa njikere ikwurịta ihe ime mmụọ. N’agbanyeghị nke a, ịchọta ndị a ga-agwa okwu abụrụwo ihe ịma aka, n’ihi na Kenya, dịkwa ka ọtụtụ mba ndị ọzọ, na-enwe mgbanwe.

Ọnọdụ akụ̀ na ụba siri ike amanyewo ọtụtụ ndị ịgbanwe ụzọ ndụ ha. Ndị inyom, bụ́ ndị a na-ahụkarị ka ha na-arụ ọrụ n’ebe obibi, na-arụzi ọrụ n’ọfịs dị iche iche ma ọ bụ nọrọ n’akụkụ ụzọ na-ere mkpụrụ osisi, akwụkwọ nri, azụ̀, na nkata. Ndị ikom na-arụ ọrụ ruo ọtụtụ awa nke na-eme ka ike gwụ ha ka ha na-agbalị igbo mkpa ezinụlọ ha. Ọbụna ụmụaka, n’ịbụ ndị na-ebuju obere aka ha ná ngwugwu ahụekere e ghere eghe na àkwá e siri esi, na-agagharị n’okporo ámá na-ere ngwá ahịa ha. Ihe ọ na-akpata bụ na ọ bụ mmadụ ole na ole na-anọ n’ụlọ n’oge ehihie. Ọnọdụ a emeela ka ọ dị ndị nkwusa nke ozi ọma Alaeze mkpa ime mgbanwe dị iche iche.

A tụụrụ ọgbakọ Ndịàmà Jehova aro ka ha lekwasịkwuo anya ná ndị na-anọghị n’ebe obibi ha, ndị na-agagharị na-arụ ọrụ dịịrị ha n’ụbọchị, tinyere ndị enyi, ndị ikwu, ndị na-achụ nta ego, na ndị ọrụ ibe ha. Ụmụnna nakwekwaara ya, na-agwa ndị mmadụ okwu n’ebe ọ bụla a pụrụ ịhụ ha. (Matiu 10:11) Ọ̀ dịla ihe mgbalị a a na-eme iji nwetakwuo ndị mmadụ rụpụtara? Ee, ọ dịla! Tụlee ụfọdụ ihe atụ.

Ndị Ikwu—Ndị Kasị Nọrọ Anyị Nso

Isi obodo Kenya, bụ́ Nairobi, nwere ihe dị ka  nde mmadụ atọ bi na ya. N’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ nke obodo ahụ ka otu soja bụ́ mejọ nke laworo ezumike nká bi, bụ́ onye kpọworo Ndịàmà Jehova asị ruo ogologo oge, n’agbanyeghị na, dị ka oké ihe mwute nye ya, nwa ya nwoke bụ Onyeàmà. N’otu ọnwa February, onye ọfịsa a laworo ezumike nká mere njem kilomita 160 ruo n’ebe nwa ya nwoke bi n’obodo Nakuru nke dị na Rift Valley. N’oge nleta ahụ, nwa ya nwoke nyere ya otu onyinye—akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. * Nna ya naara ya lawa.

Mgbe ọ laruru ụlọ, onye a bụbu ọfịsa nyere nwunye ya akwụkwọ ahụ, bụ́ onye malitere ịgụ ya, n’amaghị na ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. Nwayọọ nwayọọ, eziokwu Bible malitere ịbanye ya n’obi, ọ kọkwaara di ya ihe ọmụma o nwetara. N’ihi ọchịchọ ịmata ihe, di ya malitekwara ịgụ akwụkwọ ahụ. Mgbe ha chọpụtara ndị bipụtara ya, ha kwubiri na ihe a gwaburu ha banyere Ndịàmà Jehova abụghị eziokwu. Ha kpọtụụrụ Ndịàmà nọ n’ebe ahụ, a malitekwara ọmụmụ Bible. Site n’ịgụ akwụkwọ ahụ n’onwe ha, ha bịara ghọta na ire ụtaba ma ọ bụ iji ya na-eme ihe na-emegide ụkpụrụ ndị Kraịst. (Matiu 22:39; 2 Ndị Kọrint 7:1) N’egbughị oge, ha bibiri siga nile dị n’ụlọ ahịa ha. Mgbe ọtụtụ ọnwa gasịrị, ha ruru eru ịbụ ndị nkwusa a na-emebeghị baptism, n’oge na-adịghịkwa anya, e mere ha baptism n’otu mgbakọ distrikti.

Ebe Mkpofu Ihe Enye Akụ̀ Dị Oké Ọnụ Ahịa

N’akụkụ ụfọdụ nke ógbè isi obodo dị na ya, e nwere obodo nta ndị e wuru aghara aghara bụ́ ebe ọtụtụ narị puku ndị mmadụ bi. N’ebe a, a na-ahụ ọtụtụ ahịrị ụlọ obibi e ji ájá, osisi, iberibe ígwè, ma ọ bụ gbam gbam wuo. Mgbe ọrụ dị ụkọ n’ụlọ ọrụ na n’ụlọ mmepụta ihe, ndị mmadụ na-eji aka ha emepụta ihe. Ndị ọrụ jua kali (okwu Swahili nke pụtara “oké anwụ”) na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’ebe anwụ na-acha, ka ha na-eji taya ochie arụpụta sandal ma ọ bụ jiri kom kom a tụfuru atụfu na-arụ oriọna mmanụ ọkụ. Ndị ọzọ na-abọgharị ikpo ahịhịa na ebe mkpofu ihe na-achọ akwụkwọ, kom kom, na karama ndị a ga-arụgharị arụgharị.

Ebe mkpofu ihe ọ̀ pụrụ inye akụ́ dị oké ọnụ ahịa? Ee! Otu nwanna nwoke na-echeta, sị: “Otu nwoke gbasiri ike nke dị nkịrịka n’ile anya, onye na-ejikeghịkwa nke ọma, bu nnukwu akpa wọtapruf a fọjuru akwụkwọ akụkọ na magazin e kpofuru ekpofu bata n’ala Ụlọ Mgbakọ anyị. Mgbe ọ gwasịrị m na aha ya bụ William, ọ jụrụ, sị: ‘Ì nwere mbipụta Ụlọ Nche ndị ọhụrụ?’ Ụjọ tụtụrụ m, m na-echekwa ihe ọ na-achọ ime. Mgbe m gosiri ya mkpụrụ magazin ise, o lere ha anya otu otu wee kwuo, sị: ‘Aga m ewere ha nile.’ N’ijuanya, abanyeghachiri m n’ọnụ ụlọ m gaa were akwụkwọ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala lọghachi. * Egosiri m ya ihe osise Paradaịs ma kọwaa na anyị na-amụrụ ndị mmadụ Bible n’anaghị ego. Ya mere m tụụrụ ya aro, sị: ‘William, gịnị ma ị bịa echi, ka anyị malitekwa ịmụ ihe?’ O mere nnọọ otú ahụ!

“N’otu ụbọchị Sunday, ọ bịara nzukọ mbụ ya. Ọ bụ m nọ na-ekwu okwu ihu ọha n’ụbọchị ahụ. Mgbe William batara, anya ya gazuru n’ebe ndị na-ege ntị nọ ngwa ngwa, ọ hụ m n’ikpo okwu, ma si n’ụlọ nzukọ ahụ gbapụ. Ajụrụ m ya mgbe e mesịrị ihe mere o ji mee otú ahụ. O ji ihere zaa, sị: ‘Ndị nọ ebe ahụ dị ọcha nke ukwuu. Ahụ erughị m ala.’

“Ka William gara n’ihu n’ọmụmụ ihe ya, eziokwu Bible malitere ịgbanwe ndụ ya. Ọ na-asa  ahụ, na-akpụ isi ya, na-eyi uwe dị ọcha ndị dịkwa mma n’anya, n’oge na-adịghịkwa anya, ọ bịachiwara nzukọ anya. Mgbe e wepụtara akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, anyị malitere ịmụ ya. N’ime oge ahụ, o meela ihe omume abụọ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, bụrụkwa onye nkwusa a na-emebeghị baptism. Enwere m obi ụtọ ịnabata ya dị ka nwanna m nwoke n’ụzọ ime mmụọ mgbe e mere ya baptism n’ụbọchị mgbakọ pụrụ iche.”

Olee ebe mbụ William hụrụ uru magazin Ụlọ Nche bara? “Ahụrụ m mbipụta ụfọdụ n’akwụkwọ ndị e kpofuru n’ebe mkpofu ihe.” Ee, ọ chọtara akụ̀ dị oké ọnụ ahịa n’ụzọ ahụ a na-atụghị anya ya!

Ịgba Àmà n’Ebe Ọrụ

Ànyị na-amụ anya mgbe nile maka ohere ịgba àmà mberede n’ebe ọrụ anyị? E si n’ụzọ dị otú ahụ mee ka James, bụ́ onye okenye n’otu ọgbakọ dị na Nairobi, mata eziokwu Bible. Ya onwe ya kwa enweela nkà n’iji ụzọ a agakwuru ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, n’otu oge, James hụrụ onye ọrụ ibe ya ka o tu baajị e dere “Jisọs Na-azọpụta” bata n’ọfịs. N’iṅomi Filip onye na-ezisa ozi ọma, James jụrụ onye ọrụ ibe ya ahụ, sị: “Ị̀ ghọtara n’ezie ihe okwu ndị ahụ pụtara?” (Ọrụ 8:30) Ajụjụ ahụ mere ka e nwee nkwurịta okwu dị mma. A malitere ọmụmụ Bible, e mesịkwara mee nwoke ahụ baptism. James ò nweela ihe ịga nke ọma n’ebe ndị ọzọ nọ? Ka ọ kọwaa:

“Mụ na Tom rụkọrọ ọrụ n’otu ụlọ ọrụ. Mgbe mgbe anyị na-abakọ na bọs e ji ebu ndị ọrụ anyị. Otu ụtụtụ, ọ dabara na mụ na ya nọkọrọ. Anọ m na-agụ otu n’ime akwụkwọ anyị, ejidekwara m ya n’ụzọ ga-eme ka m jide n’aka na Tom na-ahụ ya nke ọma. Dị nnọọ ka m tụworo anya ya, ọ dọọrọ mmasị ya, ejikwa m obi ụtọ gbazinye ya akwụkwọ m. O nwere nnọọ mmasị n’ihe ọ gụrụ wee kweta ka a mụwara ya Bible. Ugbu a ya na nwunye ya bụ ndị ohu Jehova e mere baptism.”

James gara n’ihu, sị: “Ọtụtụ mgbe, n’oge nri ehihie n’ụlọ ọrụ anyị, a na-enwe mkparịta ụka ndị na-akpali mmasị. Nke ahụ bụ mgbe, n’oge dịgasị iche, m zutere Ephraim na Walter. Ha abụọ maara na abụ m Onyeàmà. Ephraim nwere mmasị ịmata ihe mere e ji emegide Ndịàmà Jehova n’ụzọ dị ukwuu. Walter nwere ajụjụ dị iche iche banyere ọdịiche dị n’etiti Ndịàmà na okpukpe ndị ọzọ. Ha abụọ nwere nnọọ afọ ojuju n’azịza dabeere n’Akwụkwọ Nsọ ndị m nyere ha, kwetakwa ịmụ ihe. Ephraim nwere ọganihu dị ngwa. Ka oge na-aga, ma ya ma nwunye ya raara ndụ ha nye Jehova. Ọ na-eje ozi ugbu a dị ka okenye, nwunye ya kwa bụ onye ọsụ ụzọ oge nile. Otú ọ dị, Walter zutere mmegide siri ike nke na ọ tụfuru akwụkwọ o ji amụ ihe. Ma, n’ihi nnọgidesi ike m, ọ maliteghachiri ọmụmụ ihe ya. Ya onwe ya kwa nwere ihe ùgwù nke ije ozi dị ka okenye.” Ná ngụkọta, mmadụ 11 aghọọla ezi ndị Kraịst n’ihi na James ji ohere ịgba àmà mberede n’ụlọ ọrụ ya mee ihe.

Ihe Kasị Dị Ịtụnanya nke Ọ Rụpụtara

N’otu obodo nta dị n’ikperé Ọdọ Mmiri Victoria, ndị enyi na ndị ikwu zukọtara maka otu ememe ili ozu. Otu Onyeàmà meworo agadi so ná ndị ahụ na-eru újú. Ọ gakwuuru otu onye nkụzi ụlọ akwụkwọ aha ya bụ Dolly ma kọwaara ya ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ nakwa nzube Jehova iwepụ ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe ọ hụrụ otú o si nabata okwu ya, o mesiri ya obi ike, sị: “Mgbe ị laghachiri n’obodo gị, otu n’ime ndị ozi ala ọzọ anyị ga-akpọtụrụ gị ma kụziere gị Bible.”

Obodo Dolly bụ obodo nke atọ kasị ukwuu na Kenya. Ọ bụ nanị Ndịàmà anọ bụ́ ndị ozi  ala ọzọ na-eje ozi n’ebe ahụ n’oge ahụ. Nwanna nwoke ahụ meworo agadi ezighị onye ọ bụla n’ime ndị ozi ala ọzọ ahụ ozi n’ezie ka ọ kpọtụrụ Dolly. Nanị na o nwere obi ike zuru ezu na ihe ga-emesịa gaa otú ahụ. Ọ gakwara otú ahụ! N’ime mkpirikpi oge, otu nwanna nwanyị bụ́ onye ozi ala ọzọ zutere Dolly wee malite ịmụrụ ya ihe. E mewo Dolly baptism ugbu a, obere nwa ya nwanyị edenyewo aha ya n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, e mewokwa ụmụ ya ndị ikom abụọ baptism. O nwewo ọbụna ọṅụ nke ije Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ.

Ịhụ Maka Mmụba Ahụ

Okwu ahụ e kwusiri ike banyere ịgba àmà mberede enyeworo ọtụtụ puku ndị ọzọ aka ịnụ ozi ọma ahụ na Kenya. Ihe karịrị ndị nkwusa 15,000 na-arụsi ọrụ ike ugbu a n’ọrụ a kasị mkpa, ihe karịkwara mmadụ 41,000 gara Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst n’afọ gara aga. Gburugburu Kenya, ọnụ ọgụgụ ndị na-aga nzukọ na-abụkarị okpukpu abụọ nke ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze. Nke a emeela ka e nwee mkpa maka Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọzọ.

A na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze ma n’obodo ukwu ma n’ime ime obodo. Otu n’ime ndị a bụ obodo Samburu nke dịpụrụ adịpụ, ihe dị ka kilomita 320 n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Nairobi. Na 1934, a kpọrọ obodo ahụ Maralal, nke pụtara “mgbukepụ” n’asụsụ Samburu, n’ihi na gbam gbam mbụ e ji wuo ụlọ n’ebe ahụ na-egbukepụ egbukepụ ma anwụ na-acha. Afọ 62 mgbe e mesịrị, e wuru ụlọ gbam gbam ọzọ na Maralal. Nke a kwa “na-enwu zaa” ma “na-amụke amụke” n’ihi na ọ bụ ebe a na-efe ezi ofufe n’ógbè ahụ.

Ndị nkwusa 15 mere mgbalị dị ịtụnanya iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze mbụ e nwere n’akụkụ ime ime obodo a nke Kenya. Ego dị ụkọ, n’ihi ya ụmụnna ndị ahụ dabeere n’ihe ndị ebe ahụ ji ewu ụlọ. Ha rụrụ ahụ ụlọ site n’iji ájá ụrọ e ji mmiri zọọ tụọ n’osisi ndị e gwunyere n’ala. E ji nsị́ ehi na unyi a gwakọtara agwakọta techie ahụ ụlọ ka ọ dị larịị, na-eme ka o nwee ọdịdị siri ike nke ga-adịru ọtụtụ afọ.

Iji nweta poolu maka ụlọ ahụ, ụmụnna ahụ natara ikike igbutu osisi. Ma oké ọhịa nke dịkarịsịrị nso dị ihe dị ka kilomita iri. Ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị ji ụkwụ garuo oké ọhịa ahụ, gbutuo osisi, kwachasịa ha, ma buru ogwe ha ruo ebe ihe owuwu ahụ dị. N’otu oge, ka ha ji ụkwụ si n’oké ọhịa ahụ na-alọghachi, ndị uwe ojii kwụsịrị ụmụnna ahụ, bụ́ ndị kwuru na ikike ha natara abụghị nke ezigbo ya. Ndị uwe ojii ahụ gwara onye ọsụ ụzọ pụrụ iche na ọ bụ onye e ji eji n’ihi igbutu osisi. Otu nwanna nwanyị obodo ahụ, bụ́ onye ndị obodo ahụ na ndị uwe ojii maara nke ọma, kwuru hoo haa, sị: “Ọ bụrụ na unu ejide nwanna anyị nwoke, unu ga-ejidekwa anyị nile, ebe ọ bụ anyị nile gbuturu osisi!” Onye uwe ojii ahụ wee hapụ ha nile.

E nwere ụmụ anụmanụ n’oké ọhịa ahụ, n’ihi ya ịgagharị n’ebe ahụ dị ize ndụ. Otu ụbọchị, otu nwanna nwanyị gbuturu osisi. Ka osisi ahụ dara, ọ hụrụ ka otu anụmanụ wụliri ma gbapụ ọsọ. N’ihi àgwà nchara nchara ọ hụpeere, o chere na ọ bụghị ihe ọzọ ma ọ bụghị ele, ma o mesịrị chọpụta site n’akara ụkwụ ya n’ala na ọ bụ ọdụm! N’agbanyeghị ụdị ihe ize ndụ ndị ahụ, ụmụnna ahụ wuzuru ụlọ nzukọ ahụ, ọ na-eguzokwa dị ka isi iyi nke otuto ‘na-egbukepụ egbukepụ’ nye Jehova.

February 1, 1963, bụ ụbọchị dị ịrịba ama n’akụkọ ọchịchị Chineke nke Kenya. N’ụbọchị ahụ, e meghere alaka ụlọ ọrụ mbụ, ebe bụ́ nanị otu ọnụ ụlọ nke dị square mita 7.4. October 25, 1997, bụ oge ọzọ dị ịrịba ama n’akụkọ ọchịchị Chineke nke Kenya—ụbọchị nraranye nke ebe obibi Betel ọhụrụ bụ́ nke dị square mita 7,800! Atụmatụ ọrụ ahụ a rụzuru bụ ngwụsị dị ebube nke ọrụ e ji ịnụ ọkụ n’obi rụsie ike afọ atọ. Ndị ọrụ afọ ofufo sitere mba 25 dị iche iche emewo ka ala apịtị na ahịhịa juru bụ́ nke dị hekta 3.2 ghọọ ebe yiri ubi mara mma maka alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ ahụ, bụ́ ebe ga-aba ndị òtù 80 nke ezinụlọ Betel.

Anyị nwere ihe nile mere anyị ga-eji ṅụrịa ọṅụ n’ihe Jehova mewooro ndị ya. Ka ekele dịrị ya n’ihi ịkpali obi ndị ya ịgbasawanye na ịchọsikwu ndị kwesịrị ekwesị ike na Kenya, na-eme ka ọ bụrụ ala mara mma n’ụzọ ime mmụọ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

^ par. 13 Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.