Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Jehova E Weghachiri Eweghachi Na-eto Ya n’Ụwa Nile

Ndị Jehova E Weghachiri Eweghachi Na-eto Ya n’Ụwa Nile

Ndị Jehova E Weghachiri Eweghachi Na-eto Ya n’Ụwa Nile

“M [ga-enye ndị dị iche iche mgbanwe gaa n’asụsụ dị ọcha], ka ha nile wee kpọkuo aha Jehova.”—ZEFANAỊA 3:9.

1. N’ihi gịnị ka e ji mezuo ozi mbibi n’ahụ Juda na mba ndị ọzọ?

LEE ozi ikpe ndị dị ike Jehova kpaliri Zefanaịa izi! E mezuru ozi mbibi ndị ahụ n’ahụ Juda na isi obodo ya, bụ́ Jerusalem, n’ihi na ndị ndú ya na ndị ahụ n’ozuzu ha anọghị na-eme uche Jehova. Iwe Chineke ga-abịakwasịkwa mba ndị dị nso dị ka Filistia, Moab, na Amọn. N’ihi gịnị? N’ihi mmegide obi ọjọọ ha nọworo na-emegide ndị Jehova eri ọtụtụ narị afọ. N’ihi otu ihe ahụkwa, a ga-ebibi ike ọchịchị ụwa bụ́ Asiria, a gaghị ewughachikwa ya ma ọlị.

2. Ole ndị ka o doro anya na a na-agwa okwu na Zefanaịa 3:8?

2 Otú ọ dị, e nwere ndị ụfọdụ nwere obi eziokwu na Juda oge ochie. Ha tụrụ anya mmezu nke ikpe Chineke megide ndị ajọ omume, o dokwara anya na ọ bụ ha ka a gwara okwu ndị a: “Cherenụ m, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), cherenụ ụbọchị mgbe M ga-ebili ọtọ ịkwata ihe: n’ihi na ikpe m bụ ime ka mba nile zukọta, ka M wee chịkọta alaeze nile ịwụsa ha oké iwe m, bụ́ ọnụma nile nke iwe m; n’ihi na a ga-eji ọkụ nke ekworo m ripịa ụwa nke a nile.”—Zefanaịa 3:8.

“Asụsụ Dị Ọcha” Maka Ole Ndị?

3. Ozi dị aṅaa na-enye olileanya ka e nyere Zefanaịa ike mmụọ nsọ izi?

3 Ee, Zefanaịa ziri ozi mbibi nke Jehova. Ma e nyekwara onye amụma ahụ ike mmụọ nsọ ịgụnye ozi mara mma nke na-enye olileanya—nke ga-abụrụ nnọọ ndị nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova, ihe nkasi obi. Dị ka e dekọrọ na Zefanaịa 3:9, Jehova Chineke kwuru, sị: “Mgbe ahụ ka M [ga-enye ndị dị iche iche mgbanwe gaa n’asụsụ dị ọcha], ka ha nile wee kpọkuo aha Jehova, ife Ya n’otu ubu.”

4, 5. (a) Gịnị ga-eme ndị ajọ omume? (b) Ole ndị ga-erite uru site na nke a, n’ihi gịnịkwa?

4 E nwere ndị a na-agaghị enye asụsụ ahụ dị ọcha. Amụma ahụ na-arịba ha ama, na-ekwu, sị: “M ga-ewezụga n’etiti gị ndị gị na-aṅụrị ọṅụ agha n’ime mpako.” (Zefanaịa 3:11) Ya mere a ga-ewezụga ndị mpako, bụ́ ndị na-elelị iwu Chineke ma na-eme ajọ omume. Ole ndị ga-eritekwa uru na nke a? Zefanaịa 3:12, 13 na-ekwu, sị: “M [Jehova] ga-emekwa ka otu ndị e wedara n’ala nke na-enweghịkwa ike fọdụ n’etiti gị, ha ga-agbabakwa n’aha Jehova. Ndị Israel fọdụrụ agaghị eme ajọ omume, ha agaghị ekwukwa okwu ụgha; a gaghị ahụkwa ire aghụghọ n’ọnụ ha: n’ihi na ndị ahụ ga-azụ onwe ha makpuokwa amakpu dị ka atụrụ, ọ dịghịkwa onye ga na-eme ka ha maa jijiji.”

5 Ndị kwesịrị ntụkwasị obi fọdụrụ na Juda oge ochie gaje irite uru. N’ihi gịnị? N’ihi na ha emewo ihe kwekọrọ n’okwu ndị a: “Chọọnụ Jehova, unu nile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa, ndị rụworo ihe O kpere n’ikpe; chọọnụ ezi omume, chọọnụ umeala n’obi: eleghị anya a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova.”—Zefanaịa 2:3.

6. Gịnị mere ná mmezu mbụ nke amụma Zefanaịa?

6 Ná mmezu mbụ nke amụma Zefanaịa, Chineke tara Juda na-ekwesịghị ntụkwasị obi ahụhụ site n’ikwe ka ike ọchịchị ụwa bụ́ Babilọn merie ya ma dọrọ ya n’agha na 607 T.O.A. E chebere ụfọdụ ndị, gụnyere Jeremaịa onye amụma, ndị ọzọ nọgidekwara na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova n’ebe e ji ha eji. Na 539 T.O.A., ndị Midia na Peasia, n’okpuru ịchịisi Eze Saịrọs, meriri Babilọn. Afọ abụọ ka e mesịrị, Saịrọs tiri iwu nke nyere ihe fọdụrụ ná ndị Juu ohere ịlaghachi n’ala nna ha. Ka oge na-aga, e wughachiri ụlọ nsọ Jerusalem, e weghachikwara usoro ndị nchụàjà izi ndị ahụ ihe n’Iwu ahụ. (Malakaị 2:7) Ya mere, Jehova mere ka ndị ahụ fọdụrụ e weghachiri eweghachi nwee ọganihu—ruo oge nile ha nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi.

7, 8. Ole ndị ka okwu amụma nke Zefanaịa 3:14-17 metụtara, n’ihi gịnịkwa ka i ji zaa otú ahụ?

7 Banyere ndị ga-anụ ụtọ mweghachi ahụ, Zefanaịa buru n’amụma, sị: “Tie mkpu ọṅụ, gị ada Zaịọn; tie mkpu, gị Israel; ṅụrịa, were obi nile ṅụrịa ọṅụ agha, gị ada Jerusalem. Jehova ewezụgawo ikpe gị nile, Ọ chụghachiwo onye iro gị: Eze Israel, bụ́ Jehova, nọ n’etiti gị: ị gaghị atụ egwu ihe ọjọọ ọzọ. N’ụbọchị ahụ ka a ga-asị Jerusalem, Atụla egwu: gị Zaịọn, ekwela ka aka gị abụọ kụdaa. Jehova, bụ́ Chineke gị, nọ n’etiti gị, Ọ bụ dike nke na-azọpụta: Ọ ga-eji ọṅụ nwee obi ụtọ n’ahụ gị, Ọ ga-edere duu n’ịhụnanya Ya, Ọ ga-eji iti mkpu ọṅụ tegharịa egwú ọṅụ n’ahụ gị.”—Zefanaịa 3:14-17.

8 Okwu amụma ndị ahụ na-ezo aka n’ihe ahụ fọdụrụnụ e ji eji na Babilọn bụ́ ndị a kpọghachitere n’ala nna ha. E mere ka nke a doo anya na Zefanaịa 3:18-20, bụ́ ebe anyị na-agụ, sị: “Ndị ọ na-ewute n’ihi mgbe a kara aka ka M [Jehova] ga-eme ka ha zukọta, bụ́ ndị sitere na gị: bụ́ obodo nke ibu e boro ya bụ ịta ụta. Lee, M ga na-emeso ndị ahụ nile, bụ́ ndị na-eweda gị n’ala, na mgbe ahụ: M ga-azọpụtakwa nwanyị ahụ nke na-eje nsụkwarachị, ọ bụkwa nwanyị nke a chụpụrụ achụpụ ka M ga-achịkọta; M ga-emekwa ka ha ghọọ otuto, ghọọkwa aha, bụ́ ndị ihere ha dị n’ụwa nke a nile. Na mgbe ahụ ka M ga-eme ka unu bata, ọ bụkwa na mgbe ahụ ka M ga-achịkọta unu: n’ihi na M ga-eme ka unu ghọọ aha, ghọọkwa otuto n’etiti ndị nile dị iche iche nke ụwa, mgbe M ga-eme ka ndị unu a dọtara n’agha lata n’anya unu, ka Jehova sịrị.”

9. Olee otú Jehova si meere onwe ya aha n’ihe banyere Juda?

9 Cheedị ihe ijuanya ọ ga-abụrụ ndị nọ ná mba ndị gbara ha gburugburu, ndị bụ́ ndị iro nke ndị Chineke! Babilọn dị ike akpụrụwo ndị bi na Juda, ha enweghịkwa olileanya ọ bụla doro anya nke ịbụ ndị a tọhapụrụ. Ọzọkwa, ala ha tọgbọrọ n’efu. Otú ọ dị, site n’ike Chineke, e weghachiri ha n’ala nna ha mgbe afọ 70 gasịrị, ebe mba bụ́ ndị iro ha na-aga ịbụ ndị e bibiri ebibi. Lee aha Jehova meere onwe ya site n’ịkpọghachite ndị ahụ fọdụrụnụ kwesịrị ntụkwasị obi! O mere ka ha “ghọọ aha, ghọọkwa otuto n’etiti ndị nile dị iche iche.” Lee ka mweghachi ahụ si wetara Jehova na ndị na-aza aha ya otuto!

E Bulie Ofufe Jehova Elu

10, 11. Ole mgbe ka mmezu bụ́ isi nke amụma mweghachi Zefanaịa ga-ewere ọnọdụ, oleekwa otú anyị si mara nke a?

10 Mweghachi ọzọ weere ọnọdụ na narị afọ mbụ nke Oge Anyị, mgbe Jisọs Kraịst chịkọtara ihe fọdụrụ n’Israel n’ezi ofufe. Nke ahụ bụ ntakịrị ihe atụ nke ihe gaje ịbịa, n’ihi na mmezu bụ́ isi nke mweghachi ahụ ka dị n’ihu. Amụma Maịka kwuru, sị: “Ọ ga-erukwa, n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a, na ugwu nke ụlọ Jehova ga na-eguzosi ike n’elu ugwu nile, a ga-ebulikwa ugwu ahụ elu karịa ugwu nta nile; ndị dị iche iche ga-eruba n’ime ya dị ka osimiri.”—Maịka 4:1.

11 Olee mgbe nke a ga-eme? Dị ka amụma ahụ kwuru, ọ bụ “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a”—ee, na “mgbe ikpeazụ” a. (2 Timoti 3:1) Nke a ga-ewere ọnọdụ tupu ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a, mgbe mba dị iche iche ka ga na-efe chi ụgha dị iche iche. Maịka 4:5 na-ekwu, sị: “Ndị nile dị iche iche na-ejegharị, onye ọ bụla n’aha nke chi ya.” Gịnịkwanụ banyere ndị na-efe ezi ofufe? Amụma Maịka na-aza, sị: “Anyị onwe anyị ga na-ejegharịkwa n’aha Jehova, bụ́ Chineke anyị, ruo mgbe nile ebighị ebi.”

12. Olee otú e siworo bulie ezi ofufe elu na mgbe ikpeazụ a?

12 N’ihi ya, na mgbe ikpeazụ a, “ugwu nke ụlọ Jehova [eguzosiwo] ike n’elu ugwu nile.” E weghachiwo ezi ofufe dị elu nke Jehova, mee ka o guzosie ike, ma bulie ya elu karịa ụdị okpukpe nile ọzọ. Dịkwa ka amụma Maịka kwuru, “ndị dị iche iche ga-eruba n’ime ya dị ka osimiri.” Ndị na-ekpe ezi okpukpe “ga na-ejegharịkwa n’aha Jehova, bụ́ Chineke [ha], ruo mgbe nile ebighị ebi.”

13, 14. Olee mgbe ụwa a banyere “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a,” gịnị nọwokwara na-eme kemgbe ahụ n’ihe banyere ezi ofufe?

13 Ihe omume ndị mezuru amụma Bible na-egosi na ụwa a banyere “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a”—mgbe ikpeazụ ya—n’afọ 1914. (Mak 13:4-10) Akụkọ ihe mere eme na-egosi na Jehova malitere ịchịkọta ihe fọdụrụ kwesịrị ntụkwasị obi n’ime ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị nwere olileanya eluigwe, gaa n’ezi ofufe. Ihe sochiri nke a abụrụwo nchịkọta nke “oké ìgwè mmadụ, . . . ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta”—ndị nwere olileanya ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’elu ala.—Mkpughe 7:9.

14 Site n’oge Agha Ụwa Mbụ ruo taa, ofufe nke ndị na-aza aha Jehova na-efe ya agawo n’ihu n’ụzọ dị ukwuu n’okpuru nduzi ya. Malite na puku mmadụ ole na ole mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị, ndị na-efe Jehova ofufe dị ihe dị ka nde isii ugbu a, bụ́ ndị a chịkọtara ọnụ n’ihe dị ka ọgbakọ 91,000 n’ala 235. Kwa afọ, ndị mkpọsa Alaeze a na-etinye ihe karịrị nnọọ otu ijeri awa n’ito Chineke n’ihu ọha. O doro anya na Ndịàmà a nke Jehova bụ ndị na-emezu okwu amụma Jisọs, bụ́: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.”—Matiu 24:14.

15. Olee otú e si emezu Zefanaịa 2:3 ugbu a?

15 Zefanaịa 3:17 na-ekwu, sị: “Jehova, bụ́ Chineke gị, nọ n’etiti gị, Ọ bụ dike nke na-azọpụta.” Ọganihu ime mmụọ nke ndị ohu Jehova na-enwe na mgbe ikpeazụ a bụ kpọmkwem n’ihi na ‘ọ nọ n’etiti ha’ dị ka Chineke ha kachasị ike. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị taa dịkwa ka ọ dị mgbe e weghachiri Juda oge ochie na 537 T.O.A. N’ihi ya, anyị pụrụ ịhụ otú Zefanaịa 2:3 si enwe mmezu bụ́ isi n’oge anyị mgbe o kwuru, sị: “Chọọnụ Jehova, unu nile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Na 537 T.O.A., ndị “nile” gụnyere ndị Juu nile fọdụrụnụ, bụ́ ndị si n’ịbụ ndị e ji eji na Babilọn lọta. Ma ugbu a, ọ na-anọchite anya ndị nile dị umeala n’obi nọ ná mba nile dị n’elu ụwa nile, ndị na-emeghachi omume n’ụzọ dị mma n’ebe ọrụ nkwusa Alaeze ahụ zuru ụwa ọnụ dị ma na-eruba ‘n’ugwu nke ụlọ Jehova.’

Ezi Ofufe Na-enwe Ọganihu

16. Gịnị yiri ka ọ̀ bụ mmeghachi omume nke ndị iro anyị n’ebe ọganihu nke ndị ohu Jehova n’oge a dị?

16 Mgbe 537 T.O.A. gasịrị, mweghachi nke ndị ohu Chineke n’ezi ofufe n’ala nna ha tụrụ ọtụtụ ndị nọ ná mba ndị gbara ha gburugburu n’anya. Ma, mweghachi ahụ weere ọnọdụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dịtụ nta. Ị̀ pụrụ ichetụ n’echiche ihe ụfọdụ ndị—ọbụna ndị iro nke ndị Chineke—na-ekwu ugbu a ha hụrụ uto na-eju anya, na ọganihu nke ndị ohu Jehova n’oge a? O yikarịrị ka ọ dị ụfọdụ n’ime ndị iro a otú ọ dị ndị Farisii mgbe ha hụrụ otú ndị mmadụ si na-enuga n’ebe Jisọs nọ. Ha tiri mkpu, sị: “Lee, ụwa ejesowo Ya n’azụ.”—Jọn 12:19.

17. Gịnị ka otu onye edemede kwuru banyere Ndịàmà Jehova, uto dịkwa aṅaa ka ha nweworo?

17 N’akwụkwọ ya bụ́ These Also Believe, Prọfesọ Charles S. Braden kwuru, sị: ‘N’ụzọ nkịtị, Ndịàmà Jehova ejiriwo ịgba àmà ha gazuo ụwa. A pụrụ ikwu n’eziokwu na ọ dịghị otu òtù okpukpe nọ n’ụwa nke gosipụtara ịnụ ọkụ n’obi na nnọgidesi ike ná mgbalị ya ịgbasa ozi ọma Alaeze ahụ karịa Ndịàmà Jehova. Òtù a yiri ka ọ ga na-esiwanye ike.’ Lee ka ihe o kwuru si bụrụ eziokwu! Mgbe o dere okwu ndị ahụ ihe dị ka afọ 50 gara aga, ọ bụ nanị ihe dị ka Ndịàmà 300,000 na-eme nkwusa n’ụwa nile! Gịnị ka ọ ga-ekwu taa, bụ́ mgbe ihe ji okpukpu 20 karịa ọnụ ọgụgụ ahụ—ihe dị ka nde isii—na-ekwusa ozi ọma ahụ?

18. Gịnị bụ asụsụ ahụ dị ọcha, ole ndị ka Chineke nyewokwara ya?

18 Chineke kwere nkwa site n’ọnụ onye amụma ya, sị: “M [ga-enye ndị dị iche iche mgbanwe gaa n’asụsụ dị ọcha, NW], ka ha nile wee kpọkuo aha Jehova, ife Ya n’otu ubu.” (Zefanaịa 3:9) Na mgbe ikpeazụ a, ọ bụ Ndịàmà Jehova na-akpọku aha Jehova, na-eji ịdị n’otu ejere ya ozi n’ihe nkekọ ịhụnanya nke a na-apụghị igbubi egbubi—ee, “n’otu ubu.” Ọ bụ ha bụ ndị Jehova nyeworo asụsụ dị ọcha. Asụsụ a dị ọcha na-agụnye nghọta kwesịrị ekwesị nke eziokwu banyere Chineke na nzube ya. Ọ bụ nanị Jehova na-enye nghọta nke a site ná mmụọ nsọ ya. (1 Ndị Kọrint 2:10) Ole ndị ka o nyeworo mmụọ nsọ ya? Ọ bụ nanị “ndị na-ekwenyere Ya.” (Ọrụ 5:32) Ọ bụ nanị Ndịàmà Jehova dị njikere ikwenyere Chineke dị ka Onye Na-achị Achị n’ihe nile. Ọ bụ ya mere o ji bụrụ ha na-enweta mmụọ Chineke ma na-asụ asụsụ ahụ dị ọcha, bụ́ eziokwu banyere Jehova na nzube ya ndị dị ebube. Ha na-eji asụsụ ahụ dị ọcha eto Jehova n’ụwa nile n’ọ̀tụ̀tụ̀ buru ibu, nke na-amụbakwa amụba.

19. Ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha ọ̀ na-agụnye gịnị?

19 Ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha gụnyere ọ bụghị nanị ikwere eziokwu ahụ na ịkụziri ya ndị ọzọ kamakwa mmadụ ime ka àgwà ya na iwu na ụkpụrụ Chineke kwekọọ. Ndị Kraịst e tere mmanụ ebutewo ụzọ n’ịchọ Jehova na n’ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha. Chee echiche ihe a rụzuworo! Ọ bụ ezie na ndị e tere mmanụ ebelatawo n’ọnụ ọgụgụ ruo ihe na-erughị 8,700, ihe dị ka nde mmadụ isii ndị ọzọ na-eṅomi okwukwe ha site n’ịchọ Jehova na n’ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha. Ndị a bụ ọnụ ọgụgụ na-amụba amụba nke oké ìgwè mmadụ ahụ ndị si ná mba nile pụta, bụ́ ndị na-egosipụta okwukwe n’àjà mgbapụta Jisọs, na-eje ozi dị nsọ n’ogige elu ala nke ụlọ nsọ ime mmụọ nke Chineke, bụrụkwa ndị ga-alanarị ‘oké mkpagbu ahụ’ gaje ịbịakwasị ụwa ajọ omume a n’isi nso.—Mkpughe 7:9, 14, 15.

20. Gịnị na-echere ndị kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ nakwa ndị mejupụtara oké ìgwè mmadụ ahụ?

20 A ga-eduru oké ìgwè mmadụ ahụ banye n’ime ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke. (2 Pita 3:13) Jisọs Kraịst na 144,000 ndị e tere mmanụ bụ́ ndị e si n’ọnwụ kpọlite ịdị ndụ n’eluigwe iji jee ozi dị ka ndị eze na ndị nchụàjà, ga-emejupụta ndị ọchịchị ọhụrụ nke ụwa. (Ndị Rom 8:16, 17; Mkpughe 7:4; 20:6) Ndị lanarịrị oké mkpagbu ahụ ga-arụ ọrụ iji mee ka ụwa bụrụ paradaịs, ha ga-anọgidekwa na-asụ asụsụ ahụ dị ọcha nke Chineke nyere. Ụkpụrụ dị n’okwu ndị a metụtara ha, nke bụ́: “Ụmụ gị nile ga-abụ ndị mmụta Jehova; udo nke ụmụ gị ga-abakwa ụba. N’ezi omume ka a ga-eme ka i guzosie ike.”—Aịsaịa 54:13, 14.

Ọrụ Nkụzi Kasị Ukwuu n’Akụkọ Ihe Mere Eme

21, 22. (a) Dị ka e gosiri n’Ọrụ 24:15, ole ndị ka ọ ga-adị mkpa ka a kụziere asụsụ ahụ dị ọcha? (b) Ọrụ nkụzi dị aṅaa na-enweghị atụ ka a ga-arụ n’elu ala n’okpuru ịchịisi Alaeze ahụ?

21 Otu ìgwè buru nnọọ ibu bụ́ ndị a ga-enye ohere ịmụta asụsụ ahụ dị ọcha n’ime ụwa ọhụrụ bụ ndị ahụ e kwuru banyere ha n’Ọrụ 24:15, nke na-asị: “Mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.” N’oge gara aga, ọtụtụ ijeri mmadụ ebiwo ndụ nwụọkwa n’enweghị ezi ihe ọmụma banyere Jehova. N’ụzọ dị n’usoro, ọ ga-eme ka ha dịghachi ndụ. Ọ ga-adịkwa mkpa ịkụziri ndị dị otú ahụ e si n’ọnwụ kpọlite asụsụ ahụ dị ọcha.

22 Lee ihe ùgwù ọ ga-abụ ikere òkè n’oké ọrụ izi ihe ahụ! Ọ ga-abụ ọrụ izi ihe kasịnụ a rụworo n’akụkọ ihe mere eme nke ihe a kpọrọ mmadụ. A ga-arụzu ha nile n’okpuru ịchịisi ọma nke Kraịst Jisọs n’ike Alaeze. N’ihi ya, ihe a kpọrọ mmadụ ga-emesị hụ mmezu nke Aịsaịa 11:9, nke na-asị: “Ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”

23. N’ihi gịnị ka ị ga-eji kwuo na anyị nwere ihe ùgwù dị ukwuu dị ka ndị Jehova?

23 Lee ihe ùgwù anyị nwere na mgbe ikpeazụ a ịdị na-akwadebe maka oge ahụ dị ebube mgbe ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta n’ụwa n’ezie! Leekwa ihe ùgwù anyị nwere ugbu a ịbụ ndị nke Chineke, bụ́ ndị na-ahụ mmezu nke okwu amụma ndị ahụ e dekọrọ na Zefanaịa 3:20! Anyị na-ahụ n’ebe ahụ okwu mmesi obi ike nke Jehova, bụ́: “M ga-eme ka unu ghọọ aha, ghọọkwa otuto n’etiti ndị nile dị iche iche nke ụwa.”

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Mmezu dị aṅaa ka amụma mweghachi nke Zefanaịa nweworo?

• Olee otú ezi ofufe siworo na-enwe ọganihu na mgbe ikpeazụ a?

• Olee ọrụ nkụzi dị ukwuu ga-ewere ọnọdụ n’ụwa ọhụrụ ahụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 25]

Ndị Jehova laghachiri n’ala nna ha iji guzobeghachi ofufe dị ọcha. Ị̀ maara ihe nke a pụtara taa?

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Site n’ịsụ “asụsụ dị ọcha,” Ndịàmà Jehova na-ezi ndị mmadụ ozi nkasi obi nke Bible