Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chebe Aha Gị

Chebe Aha Gị

Chebe Aha Gị

NWOKE na-ese ụkpụrụ ụlọ ndị mara mma na-emere onwe ya aha dị ka ọkà n’ịtụpụta ụkpụrụ ụlọ. Nwa agbọghọ kasị eme nke ọma n’agụmakwụkwọ na-aghọ onye a maara dị ka nwa akwụkwọ ụbụrụ na-aghọ nkọ. Ọbụna onye na-adịghị eme ihe ọ bụla pụrụ imere onwe ya aha dị ka onye umengwụ. N’imesi ike uru dị ná mmadụ imere onwe ya aha ọma, Bible kwuru sị: “Ezi aha bụ ihe a na-achọsi ike karịa nnukwu akụ̀ na ụba, aha ọma karịakwa ọlaọcha na ọlaedo.”—Ilu 22:1, An American Translation.

A na-enweta aha ọma site n’ịrụ ọtụtụ ụmụ obere ọrụ ruo oge ụfọdụ. Ma, nanị ihe ọ na-ewe iji mebie ya bụ otu omume nzuzu. Dị ka ihe atụ, otu omume mmekọahụ rụrụ arụ pụrụ imebi aha ọma. N’isi nke 6 nke akwụkwọ Bible bụ́ Ilu, Eze Solomọn nke Israel oge ochie na-enye ịdọ aka ná ntị megide àgwà na omume ndị pụrụ imebi aha ọma anyị, mebiekwa mmekọrịta anyị na Jehova Chineke. Ụfọdụ n’ihe ndị a bụ nkwa a na-echeghị eche kwee, umengwụ, aghụghọ, na mmekọahụ rụrụ arụ—n’ụzọ bụ́ isi, ihe ndị Jehova kpọrọ asị. Ịṅa ntị na ndụmọdụ a ga-enyere anyị aka ichebe aha ọma anyị.

Napụta Onwe Gị ná Nkwa Nzuzu

Isi nke 6 nke Ilu ji okwu ndị a meghee: “Nwa m, ọ bụrụ na ị nọworo mmadụ ibe gị ná mbé, ọ bụrụ na ị narawo onye ala ọzọ n’aka ịbụ onye mbé, e jiwo okwu nile nke ọnụ gị maa gị n’ọnyà, e jiwo okwu nile nke ọnụ gị nwụde gị. Mee nke a ugbu a, nwa m, wee napụta onwe gị, n’ihi na ị bawo n’ọbụ aka nke mmadụ ibe gị; jee, kwee ka a zọtọọ gị n’ụkwụ, rịọchie mmadụ ibe gị ntị.”Ilu 6:1-3.

Ilu a na-adụ ọdụ megide mmadụ itinye aka n’achụmnta ego nke ndị ọzọ, karịsịa nke ndị a na-amabughị. Ee, ndị Israel ‘ga-enyere nwanne ha aka, bụ́ onye dara ogbenye, aka ya ewee ghara ịdị ike [n’ụzọ ego].’ (Levitikọs 25:35-38) Ma ụfọdụ ndị Israel, bụ́ ndị dị uchu tinyere onwe ha n’atụmatụ achụmnta ego a na-enyo enyo, nwetakwa nkwado ego site n’ime ka ndị ọzọ ‘kweta ịnọrọ ha ná mbé,’ si otú a na-ekonye ha ụgwọ ahụ n’isi. Ọnọdụ ndị yiri nke ahụ pụrụ ibilite taa. Dị ka ihe atụ, ụlọ ọrụ ndị na-agbazinye ego pụrụ ịchọ onye ga-eso bịanye aka n’akwụkwọ tupu ha akwado inye ego mgbazinye ha chere na ọ pụrụ ifu. Lee ihe nzuzu ọ bụ iji ọkụ ọkụ kwe nkwa dị otú ahụ n’ihi ndị ọzọ! Leenụ, ọ pụrụ ịmata anyị n’ọnyà n’ụzọ ego, ọbụna nye anyị aha ọjọọ n’ebe ndị ụlọ akụ nakwa ndị ọzọ e ji ụgwọ nọ!

Gịnị ma anyị chọta onwe anyị ná nsogbu nke ime ihe yiri na mbụ ihe amamihe dị na ya, ma mgbe e lerukwuru ya anya, o yizie ihe nzuzu? Ndụmọdụ e nyere bụ iwezụga nganga n’ụsọ ma “rịọchie mmadụ ibe gị ntị”—nọgide na-arịọ ya arịrịọ. Anyị aghaghị ime ihe nile anyị nwere ike ime iji dozie okwu. Otu akwụkwọ e ji eme nnyocha kọwapụtara, sị: “Gbalịa n’ụzọ ọ bụla o kwere mee ruo mgbe gị na onye iro gị kwekọrịtara, doziekwa okwu ahụ, ka gị ma ọ bụ ezinụlọ gị ghara ikote ụgwọ.” E kwesịkwara ime nke a n’egbughị oge, n’ihi na eze ahụ gbakwụnyere, sị: “Enyela anya gị abụọ ụra, enyekwala mbubere anya gị iru ụra. Napụta onwe gị dị ka mgbada n’aka onye ntá, na dị ka nnụnụ n’aka osi ọnyà.” (Ilu 6:4, 5) Ọ ka mma ịkagbu nkwa amamihe na-adịghị na ya mgbe o kwere omume karịa ịbụ onye ọ matara n’ọnyà.

Dị Uchu Dị Ka Ndanda

“Jekwuru ndanda, onye umengwụ; lee ụzọ ya nile, wee mara ihe,” ka Solomọn dụrụ n’ọdụ. Olee amamihe anyị pụrụ inweta site n’ụzọ nke ntakịrị ndanda? Eze ahụ na-aza, sị: “Nke na-enweghị onyeisi, ma ọ bụ onye na-ele anya n’ọrụ, ma ọ bụ onye na-achị achị, ma ọ na-edozi nri ya na mgbe okpomọkụ, na-ekpokọtakwa ihe oriri ya na mgbe owuwe ihe ubi.”Ilu 6:6-8.

Ndanda haziri onwe ha n’ụzọ dị ịtụnanya, ha na-emekọrịtakwa ihe n’ụzọ dị ịrịba ama. Ha ji amamihe ebumpụta ụwa ekpokọta nri maka ọdịnihu. Ha enweghị “onyeisi, ma ọ bụ onye na-ele anya n’ọrụ, ma ọ bụ onye na-achị achị.” N’eziokwu, e nwere eze nwanyị ndanda, ma, ọ bụ eze nwanyị nanị n’echiche bụ́ na ọ na-eyi àkwá, bụrụkwa nne nke ìgwè ahụ. Ọ naghị enye iwu ọ bụla. N’enweghị ọbụna onyeisi ọrụ na-amanye ha, ma ọ bụ onye nlekọta ọrụ na-enyocha ha, ndanda na-anọgide n’ọrụ ha n’adaghị mba.

Dị ka ndanda, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịdị uchu? Ịrụsi ọrụ ike na ịgbalịsi ike imeziwanye ọrụ anyị baara anyị uru ma à na-ele anyị anya ma ọ bụ na a dịghị ele anyị anya. Ee, n’ụlọ akwụkwọ, n’ebe ọrụ anyị, nakwa mgbe anyị na-ekere òkè n’ihe omume ime mmụọ, anyị kwesịrị ime ike anyị nile. Dị ka ndanda si erite uru n’ịdị uchu ya, otú ahụ ka Chineke si achọ ka anyị ‘hụ ezi ihe ná ndọgbu nile anyị na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ.’ (Eklisiastis 3:13, 22; 5:18) Akọ na uche dị ọcha na inwe afọ ojuju onwe onye bụgasị ụgwọ ọrụ nke ịrụsi ọrụ ike.—Eklisiastis 5:12.

N’iji ajụjụ abụọ na-achọghị azịza mee ihe, Solomọn nwara ịkpọte onye umengwụ n’arụghị ọrụ ya: “Ruo ole mgbe ka ị ga na-edina ala, gị onye umengwụ? Ole mgbe ka ị ga-esi n’ụra gị bilie?” N’ijije ihe ọ na-ekwu, eze ahụ gbakwụnyere, sị: “Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta, nwa ịkpakọba aka nta idina ala, ogbenye gị ewee bịa dị ka onye na-ejegharị ịpụnara mmadụ ihe, ihe ụkọ gị kwa dị ka nwoke ji ọta.” (Ilu 6:9-11) Ka onye umengwụ dina ala, ịda ogbenye na-ejiri ọsọ bịakwute ya dị ka onye na-apụnara mmadụ ihe, ịnọ n’ụkọ na-awakpokwa ya dị ka onye ji ọta. Ogwu na ahịhịa na-epuchi ubi onye umengwụ ngwa ngwa. (Ilu 24:30, 31) Ọ na-enwekwa ọghọm ahịa n’achụmnta ego ya n’oge na-adịghị anya. Ruo ole mgbe ka onye na-ewe mmadụ n’ọrụ ga-anagide onye na-anọ nkịtị? Nwa akwụkwọ nke dịkwa oké umengwụ ịmụ ihe ọ̀ pụrụ ịtụ anya ime nke ọma n’ụlọ akwụkwọ?

Na-eme Ihe n’Eziokwu

N’idepụta omume ọzọ na-emebi aha ọma mmadụ n’obodo nakwa ná mmekọrịta ya na Chineke, Solomọn gara n’ihu na-asị: “Mmadụ nke jọgburu onwe ya, onye na-eme ajọ ihe; o ji ọnụ nke na-ekwu ihe gbagọrọ agbagọ ejegharị; ọ na-egbu iku anya ya, o ji ụkwụ ya abụọ ekwu okwu, o ji mkpịsị aka ya nile na-ezi ihe. Ịgbakụta Chineke azụ dị n’obi ya, ọ na-echepụta ihe ọjọọ na mgbe nile; ọ na-ezisa iseokwu.”Ilu 6:12-14.

Nke a bụ nkọwa banyere onye nduhie. Onye ụgha na-agbalịkarị izochi ekwughị eziokwu ya. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụghị nanị ‘n’ikwu ihe gbagọrọ agbagọ’ kamakwa site n’iji mmegharị ahụ ekwu okwu. Otu ọkà mmụta kwupụtara, sị: “Mmegharị ahụ, ụda olu, na ọbụna ọdịdị ihu bụcha ụzọ e leziri anya chepụta nke isi aghọ aghụghọ; echiche gbagọrọ agbagọ na mmụọ nke iseokwu na-ezo n’azụ ngosipụta nke inwe obi eziokwu.” Ụdị mmadụ ahụ jọgburu onwe ya na-echepụta ihe ọjọọ, na-akpatakwa iseokwu oge nile. Gịnị ka ọ ga-emesịa rụpụtara ya?

“N’ihi nke a nhụjuanya ya ga-abịa na mberede,” ka eze Israel na-aza. “N’otu ntabi anya ka a ga-etipịa ya, ọ dịghịkwa ngwọta dị.” (Ilu 6:15) Mgbe ọ pụtara ìhè, a na-emebi aha ọma nke onye ụgha ahụ ozugbo. Ònye ga-atụkwasịkwa ya obi ọzọ? Ọgwụgwụ ya bụ nke jọgburu onwe ya n’ezie, n’ihi na a gụnyere “ndị ụgha nile” ná ndị ga-ata ahụhụ ọnwụ ebighị ebi. (Mkpughe 21:8) Ka anyị, n’alaghị azụ ọ bụla, “na-eme ihe n’eziokwu n’ihe nile.”—Ndị Hibru 13:18, NW.

Kpọọ Asị Ihe Jehova kpọrọ Asị

Ịkpọ ihe ọjọọ asị—lee ihe mgbochi ọ bụ pụọ n’omume ndị na-emebi aha ọma anyị! Mgbe ahụ, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịzụlite ịkpọasị maka ihe ọjọọ? Ma gịnị kpọmkwem ka anyị kwesịrị ịkpọ asị? Solomọn kwuru, sị: “Ihe isii dị nke Jehova kpọrọ asị; ee, ihe asaa dị nke bụ ihe arụ nke mkpụrụ obi Ya: anya dị elu, na ire okwu ụgha, na aka na-awụsị ọbara na-emeghị ihe ọjọọ; na obi nke na-echepụta ajọ ihe, na ụkwụ na-eme ngwa ịgbaga n’ihe ọjọọ; na onye àmà okwu ụgha nke na-ekupụ okwu ụgha dị iche iche dị ka ume, na onye na-ezisa iseokwu n’etiti ụmụnne.”Ilu 6:16-19.

Nkebi asaa ahụ ilu ahụ kpọtụrụ aha bụ ndị bụ́ isi ma na-agụnye ihe fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ ụdị ihe ọjọọ nile. “Anya dị elu” na “obi nke na-echepụta ajọ ihe” bụ mmehie a na-eme n’echiche. “Ire okwu ụgha” na “onye àmà okwu ụgha nke na-ekupụ okwu ụgha dị iche iche dị ka ume” bụgasị okwu mmehie. “Aka na-awụsị ọbara na-emeghị ihe ọjọọ” na “ụkwụ na-eme ngwa ịgbaga n’ihe ọjọọ” bụcha omume ọjọọ. Ihe Jehova kpọkwara asị karịsịa bụ ụdị mmadụ ahụ ọ na-atọgbu atọgbu ịkpasu esemokwu n’etiti ndị gaara na-ebikọta ọnụ n’udo. Mmụba a mụbara ọnụ ọgụgụ ahụ site n’isii ruo asaa na-atụ aro na e bughị n’uche ka ndepụta ahụ gụnyezuo ihe nile, ebe ọ bụ na ụmụ mmadụ na-anọgide mgbe nile na-amụba omume ọjọọ ha.

N’ezie, ọ dị anyị mkpa ịzụlite ịkpọasị maka ihe Chineke kpọrọ asị. Dị ka ihe atụ, anyị aghaghị izere “anya dị elu” ma ọ bụ ngosịpụta ọ bụla ọzọ nke mpako. A ga-ezerekwa asịrị na-emerụ ahụ n’ezie, n’ihi na ọ pụrụ n’ụzọ dị mfe ịkpali “iseokwu n’etiti ụmụnne.” Site n’ịgbasa asịrị obi ọjọọ, nkatọ na-ezighị ezi, ma ọ bụ ụgha, ọ pụrụ ịbụ na anyị agaghị “na-awụsị ọbara na-emeghị ihe ọjọọ,” ma n’ezie anyị pụrụ imebi aha ọma onye ọzọ.

“Achọsila Ịma Mma Ya Ike”

Solomọn malitere nkebi na-esonụ na ndụmọdụ ya site n’ikwu, sị: “Nwa m, chebe ihe nna gị nyere n’iwu, ahapụkwala iwu nne gị. Hie ha n’obi gị mgbe nile, kee ha n’olu gị.” N’ihi gịnị? “Mgbe ị na-ejegharị, ọ ga na-edu gị; mgbe ị na-edina ala, ọ ga na-eche gị; mgbe i tetakwara, nke ahụ ga-eso gị kparịa ụka.”Ilu 6:20-22.

Ọzụzụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ ọ̀ pụrụ ichebe anyị n’ezie pụọ n’ọnyà nke mmekọahụ rụrụ arụ? Ee, ọ pụrụ. A na-emesi anyị obi ike, sị: “Oriọna ka ihe ahụ e nyere n’iwu bụ; iwu ahụ bụkwa ìhè; ọ bụkwa ụzọ ndụ ka ịba mba nile nke ịdọ aka ná ntị bụ, idebe gị ka ị pụọ n’aka nwanyị ọjọọ, n’aka ire ụtọ nke nwanyị na-abụghị nwunye gị.” (Ilu 6:23, 24) Icheta ndụmọdụ nke Okwu Chineke na iji ya eme ihe dị ka ‘oriọna dịịrị ụkwụ anyị abụọ na ìhè nke dịịrị okporo ụzọ anyị’ ga-enyere anyị aka iguzogide òkù ire ụtọ nke nwanyị ọjọọ, ma ọ bụ nwoke ọjọọ n’akụkụ a.—Abụ Ọma 119:105.

“Achọsila ịma mma ya ike n’obi gị,” ka eze ahụ maara ihe na-adụ n’ọdụ, “ekwekwala ka o were gị ná mbubere anya ya.” N’ihi gịnị? “N’ihi na ọ bụ n’ihi nwanyị na-akwa iko ka e ji eme ka nwoke bịaruo nanị otu ógbè achịcha; nwunye nwoke ọzọ na-achụkwa nta ndụ dị oké ọnụ ahịa.”Ilu 6:25, 26.

Solomọn ọ̀ na-ezo aka n’ebe nwunye na-akwa iko nọ dị ka nwanyị akwụna? Ikekwe. Ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ na ọ na-egosi ọdịiche dị n’etiti ihe ndị na-esi n’iso nwanyị akwụna mee omume rụrụ arụ apụta na ndị na-esi n’iso nwunye nwoke ọzọ kwaa iko apụta. A pụrụ ime ka onye ya na nwanyị akwụna na-akwa iko nwee “nanị otu ógbè achịcha”—ghọọ ogbenye ọnụ ntụ. Ọ pụrụ ọbụna ibute ọrịa ndị na-egbu mgbu, ndị na-akpatakwa nkwarụ, bụ́ ndị a na-ebute site ná mmekọahụ, gụnyere ọrịa AIDS nke na-egbu mmadụ. N’aka nke ọzọ, onye na-achọ ka ya na di ma ọ bụ nwunye onye ọzọ nwee mmekọahụ ga-anọ ozugbo n’ihe ize ndụ ka ukwuu n’okpuru Iwu ahụ. Nwunye na-akwa iko na-etinye “ndụ dị oké ọnụ ahịa” nke onye òtù ya iwu na-akwadoghị n’ihe ize ndụ. “E bu n’uche . . . ihe karịrị ime ka ndụ dị mkpụmkpụ site n’imefusị ihe,” ka otu akwụkwọ e ji eme nnyocha na-ekwu. “A pụrụ inye onye mmehie ahụ ntaramahụhụ ọnwụ.” (Levitikọs 20:10; Deuterọnọmi 22:22) Ka o sina dị, n’agbanyeghị mma elu ahụ ya, nwanyị dị otú ahụ abụghị onye a ga-achọsi ike.

‘Agụrụla Ọkụ Tinye n’Uwe Obi Gị’

Iji mesikwuo ihe ize ndụ dị n’ịkwa iko ike, Solomọn jụrụ, sị: “Mmadụ, ọ̀ ga-agụrụ ọkụ tinye n’uwe obi ya, ma uwe ya agaghị ere ọkụ? Ma ọ bụ mmadu, ọ̀ ga-eje ije n’elu icheku ọkụ, ma ọkụ agaghị ahụ ya n’ụkwụ ya abụọ?” N’ịkọwa ihe ihe atụ ahụ pụtara, ọ sịrị: “Otú a ka onye na-abakwuru nwunye mmadụ ibe ya dị; a gaghị agụ onye ọ bụla nke na-emetụ nwanyị ahụ aka n’onye na-emeghị ihe ọjọọ.” (Ilu 6:27-29) A ga-enyerịrị onye mmehie dị otú ahụ ntaramahụhụ.

“Mmadụ adịghị eleda onye ohi anya, mgbe ọ na-ezu ohi imeju mkpụrụ obi ya mgbe agụụ na-agụ ya,” ka a na-echetara anyị. N’agbanyeghị nke ahụ, “ma a sị na a chọta ya, ọ ga-akwụghachi okpukpu asaa; akụ̀ nile nke ụlọ ya ka ọ ga-enye.” (Ilu 6:30, 31) N’Israel oge ochie, a na-achọ ka onye ohi nye nkwụghachi ụgwọ, ọ bụrụgodị na ọ ga-eji ihe nile o nwere kwụọ ya. * Lee ka di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko si kwesị ịnata ntaramahụhụ karị, bụ́ onye na-enweghị ihe ngọpụ maka ihe o meworo!

“Onye na-akwa nwanyị iko, obi amamihe kọrọ ya,” ka Solomọn kwuru. Nwoke obi amamihe kọrọ adịghị enwe ezi uche, ebe ọ “na-emebi mkpụrụ obi nke aka ya.” (Ilu 6:32) Ná mpụta, ọ pụrụ iyi onye nwere aha ọma, ma mmadụ ime ya enweghị ntozu òkè kwesịrị ekwesị ma ọlị.

Mkpụrụ nke onye na-akwa iko na-aghọta agwụbeghị. “Ọnyá ntipụta na nlelị ka ọ ga-ahụ; ịta ụta ya kwa, a gaghị ehichapụ ya. N’ihi na ekworo bụ ọnụma nke nwoke; ọ gaghị enwe ọmịiko n’ụbọchị ọ́bọ̀. Ọ gaghị ahụ ihe ikpuchi mmehie ọ bụla ihu ọma; ọ gaghị ekwekwa, mgbe ị ga-eme ka ihe iri ngo baa ụba.”Ilu 6:33-35.

Onye ohi pụrụ ịkwụ ụgwọ ihe o zuuru, ma onye na-akwa iko nke nwere di ma ọ bụ nwunye apụghị inye nkwụghachi ụgwọ ọ bụla. Olee nkwụghachi ụgwọ ọ pụrụ inye di iwe ji? Ọ dịghị arịrịọ yiri ka ọ ga-eme ka e meere onye mmehie ahụ ebere. Ọ dịghị ụzọ ọ bụla onye ahụ na-akwa iko pụrụ isi mezie mmehie ya. Nkọcha na nlelị o wetaara aha nke ya ga-adịgide. Ọzọkwa, ọ dịghị otú ọ bụla ọ ga-esi gbapụta onwe ya ma ọ bụ zụta nnwere onwe pụọ na ntaramahụhụ kwesịịrị ya.

Lee ka o si bụrụ ihe amamihe dị na ya izere ịkwa iko, nakwa àgwà na omume ndị ọzọ na-emebi aha ọma anyị, ndị pụkwara iwetara Chineke nkọcha! Mgbe ahụ, ka anyị lezie anya ịghara ikwe nkwa nzuzu. Ka ịdị uchu na ikwu eziokwu chọọ aha ọma anyị mma. Ka anyị na-agbalịkwa ịkpọ asị ihe Jehova kpọrọ asị, ka anyị meere onwe anyị aha ọma n’ebe ọ nọ na n’ebe mmadụ ibe anyị nọ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 28 Dị ka Iwu Mosis si kwuo, a na-achọ ka onye ohi kwụghachị okpukpu abụọ, okpukpu anọ ma ọ bụ ise. (Ọpụpụ 22:1-4) Okwu bụ́ “okpukpu asaa” yiri ka ọ na-ezo aka na ntaramahụhụ zuru ezu, nke pụrụ ịkarị ihe o zuru ọtụtụ ugboro.

[Foto dị na peeji nke 25]

Kpachara anya banyere iso bịanye aka n’ego mgbazinye

[Foto dị na peeji nke 26]

Dị uchu dị ka ndanda

[Foto dị na peeji nke 27]

Nọrọ na nche megide asịrị na-emerụ ahụ