Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Oge Awa Ya Aka-abịaghị”

“Oge Awa Ya Aka-abịaghị”

 “Oge Awa Ya Aka-abịaghị”

“Ọ dịghịkwa onye ọ bụla tụkwasịrị Ya aka, n’ihi na oge awa Ya aka-abịaghị.”—JỌN 7:30.

1. Isi ihe abụọ dị aṅaa chịkwara ihe ndị Jisọs mere?

“NWA nke mmadụ abịaghị ka e jeere Ya ozi, kama ka O jee ozi, ka O werekwa ndụ Ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ,” ka Jisọs Kraịst gwara ndị ozi ya. (Matiu 20:28) Ọ gwara onye ọchịchị Rom bụ́ Pọntiọs Paịlet, sị: “A mụwo Mụ onwe m ime ihe a, abịawokwa m n’ime ụwa ime ihe a, ka M wee gbaara eziokwu àmà.” (Jọn 18:37) Jisọs maara kpọmkwem ihe mere ọ ga-eji nwụọ na ọrụ ọ dị mkpa ka ọ rụọ tupu ọnwụ ya. Ọ makwaara aha oge o nwere iji rụzuo ọrụ ya. Ozi ya n’elu ala dị ka Mesaịa ahụ ga-adịru nanị afọ atọ na ọkara. Ọ malitere mgbe e mere ya baptism n’Osimiri Jọdan (na 29 O.A.) ná mmalite nke izu 70 ihe atụ ahụ e buru n’amụma ma jedebe mgbe ọ nwụrụ n’elu osisi ịta ahụhụ n’etiti izu ahụ (na 33 O.A.). (Daniel 9:24-27; Matiu 3:16, 17; 20:17-19) N’ihi ya, ihe nile Jisọs mere n’ụwa bụ nke isi ihe abụọ chịkwara n’ụzọ bụ́ isi: nzube o ji maka ya bịa na ịgụkọ oge nke ọma.

2. Olee otú e si akọwa Jisọs Kraịst n’Oziọma ndị ahụ, oleekwa otú o si gosipụta na ọ maara ihe ọ bịara ịrụ?

2 Ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ na-akọwa Jisọs Kraịst dị ka nwoke na-arụsi ọrụ ike bụ́ onye mere njem na Palestine nile, na-akpọsa ozi ọma nke Alaeze Chineke, na-arụkwa ọtụtụ ọrụ dị ike. N’akụkụ mbụ nke ozi dị ike nke Jisọs, e kwuru banyere ya, sị: “Oge awa Ya aka-abịaghị.” Jisọs n’onwe ya kwuru, sị: “Oge nke m aka-ezughị.” Ná ngwụsị nke ozi ya, o ji okwu bụ́ “oge awa abịawo” mee ihe. (Jọn 7:8, 30; 12:23) Ọmụma Jisọs maara oge awa, ma ọ bụ oge ọ ga-eji rụọ ọrụ e nyere ya, gụnyere ọnwụ ịchụàjà ya, aghaghị imetụtawo ihe ndị o kwuru ma  mee. Ịghọta nke a pụrụ inye anyị nghọta banyere ụdị mmadụ ọ bụ na ụzọ o si eche echiche, na-enyere anyị aka ‘isochikwu ijeụkwụ Ya nile anya.’—1 Pita 2:21.

O Kpebisiri Ike Ime Uche Chineke

3, 4. (a) Gịnị na-eme n’otu oriri agbamakwụkwọ na Kena? (b) N’ihi gịnị ka Ọkpara Chineke ji jụ aro Meri tụrụ ka o mee ihe banyere ụkọ mmanya, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site na nke a?

3 Ọ bụ n’afọ 29 O.A. Nanị ụbọchị ole na ole gaferela kemgbe Jisọs n’onwe ya họpụtara ndị na-eso ụzọ ya ndị mbụ. Ha nile abịawo ugbu a n’obodo nta bụ́ Kena n’ógbè Galili iji gaa otu ememe agbamakwụkwọ. Nne Jisọs, bụ́ Meri, nọkwa n’ebe ahụ. Mmanya agwụnahụ ha. N’ịtụ aro ka o mee ihe, Meri agwa nwa ya, sị: “Ha enweghị mmanya.” Ma Jisọs azaa ya, sị: “Nwanyị, gịnị ka Mụ na gị nwekọrọ? Oge awa nke m aka-abịarughị.”—Jọn 1:35-51; 2:1-4.

4 Azịza Jisọs bụ́, “Nwanyị, gịnị ka Mụ na gị nwekọrọ?” bụ ụdị ajụjụ ochie nke na-egosipụta ọjụjụ a jụrụ aro a tụrụ. N’ihi gịnị ka Jisọs ji jụ ihe Meri kwuru? Ọ dị afọ 30 ugbu a. Nanị n’izu ole na ole tupu mgbe ahụ, e mere ya baptism, jiri mmụọ nsọ tee ya mmanụ, Jọn Onye Na-eme Baptism akọwaakwa ya dị ka “Nwa atụrụ Chineke, Nke na-ebupụ mmehie nke ụwa!” (Jọn 1:29-34; Luk 3:21-23) Ugbu a ọ ghaghị inweta ntụziaka site n’aka Onye Kasị Elu zitere ya. (1 Ndị Kọrint 11:3) A gaghị ekwe ka onye ọ bụla, ọbụnadị onye òtù ezinụlọ ya, weta ihe mgbochi n’ọrụ Jisọs bịara ịrụ n’ụwa. Lee ka azịza Jisọs nyere Meri si egosipụta mkpebi ya siri ike ime uche Nna ya! Ka anyị kpebisiekwa ike otú ahụ ịrụzu ‘ọrụ nile dịịrị anyị’ n’ebe Chineke nọ.—Eklisiastis 12:13.

5. Ọrụ ebube dị aṅaa ka Jisọs Kraịst rụrụ na Kena, mmetụta dịkwa aṅaa ka o nwere n’ebe ndị ọzọ nọ?

5 Ebe ọ bụ na Meri ghọtara ihe nwa ya nwoke kwuru, ọ pụrụ ozugbo ma gwa ndị na-eje ozi n’ebe ahụ, sị: “Ihe ọ bụla Ọ sịrị unu mee, meenụ ya.” Jisọs gbokwara mkpa ahụ. O mere ka ndị ahụ na-eje ozi gbajuo mmiri n’ite ndị dị n’ebe ahụ, o meekwa ka mmiri ahụ ghọọ mmanya kasị mma. Nke a mere dị ka mmalite nke ike ịrụ ọrụ ebube nke Jisọs, na-enye ihe àmà na o nwere mmụọ Chineke. Mgbe ndị na-eso ụzọ ọhụrụ ahụ hụrụ ọrụ ebube a, okwukwe ha sikwuru ike.—Jọn 2:5-11.

Ịnụrụ Ụlọ Jehova Ọkụ n’Obi

6. N’ihi gịnị ka iwe ji wee Jisọs n’ihi ihe ọ hụrụ n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem, gịnịkwa ka o mere?

6 N’oge na-adịghị anya, oge opupu ihe ubi nke 30 O.A. eruo, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ na-aga Jerusalem iji mee Ememe Ngabiga. Mgbe ha nọ n’ebe ahụ, ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ka Onye Ndú ha na-akpa àgwà otú ma eleghị anya ha na-ahụtụbeghị ya mbụ. Ndị ọchụnta ego ndị Juu bụ́ ndị anyaukwu na-ere ụmụ anụmanụ na ụmụ nnụnụ maka ịchụàjà kpọmkwem n’ime ụlọ nsọ ahụ. Ha na-anakwa ndị Juu na-efe ofufe n’ikwesị ntụkwasị obi nnukwu ego. N’ịbụ onye iwe juru n’obi, Jisọs emee ihe. Ya ejiri ụdọ mere ụtarị ma chụpụsịa ndị ahụ na-ere ihe. Ọ kwafuo mkpụrụ ego nke ndị ahụ na-agbanwe ego ma kpuo tebụl ha ihu. “Chịpụnụ ihe ndị a n’ebe a,” ka o na-enye ndị ahụ na-ere nduru n’iwu. Mgbe ndị na-eso ụzọ Jisọs na-ahụ ya ka o ji ịnụ ọkụ n’obi dị otú ahụ na-eme ihe, ha echeta amụma e buru banyere Ọkpara Chineke, sị: “Ekworo ụlọ Gị ga-eripịa m.” (Jọn 2:13-17; Abụ Ọma 69:9) Anyị onwe anyị kwa aghaghị iji ịnụ ọkụ n’obi na-eche nche megide ikwe ka omume ụwa merụọ ofufe anyị.

7. (a) Gịnị kpaliri Nikodimọs ileta Mesaịa ahụ? (b) Gịnị ka anyị na-amụta site n’àmà Jisọs gbaara otu nwanyị Sameria?

7 Mgbe Jisọs nọ na Jerusalem, ọ rụrụ ọrụ ndị dị ịrịba ama, ọtụtụ ndị bịakwara nwee okwukwe n’ebe ọ nọ. Ọbụna Nikodimọs, bụ́ onye so na Sanhedrin, ma ọ bụ ụlọikpe dị elu nke ndị Juu, nwere mmasị n’ebe Jisọs nọ ma bịakwute ya n’abalị iji mụtakwuo ihe. E mesịa, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya nọrọ “n’ala Judia” ruo ihe dị ka ọnwa asatọ, na-eme nkwusa, na-emekwa ndị na-eso ụzọ. Otú ọ dị, mgbe a tụsịrị Jọn Onye Na-eme Baptism mkpọrọ, ha hapụrụ Judia gawa Galili. Ka ha na-agafe ógbè Sameria, Jisọs ji ohere dapụtaranụ mee ihe iji gbaara otu  nwanyị Sameria ezigbo àmà. Nke a megheere ọtụtụ ndị Sameria ụzọ ịghọ ndị kwere ekwe. Ka anyị onwe anyị kwa dịrị njikere iji ohere ọ bụla dapụtaranụ mee ihe iji kwuo okwu banyere Alaeze ahụ.—Jọn 2:23; 3:1-22; 4:1-42; Mak 1:14.

Izi Ihe n’Ụzọ Sara Mbara na Galili

8. Ọrụ dị aṅaa ka Jisọs malitere na Galili?

8 Tupu “oge awa” nke ọnwụ Jisọs eruo, o nwere ọrụ dị ukwuu ọ ga-arụ n’ozi Nna ya nke eluigwe. Na Galili, Jisọs malitere ọbụna ozi karịrị nke o jere na Judia na Jerusalem. Ọ na-ejegharị “na Galili dum, na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ nile ha, na-ekwusakwa ozi ọma nke alaeze ahụ, na-agwọkwa ọrịa nile dị iche iche na nrịanrịa nile dị iche iche n’eitti ndị ahụ.” (Matiu 4:23) A nụrụ okwu ya na-ama aka nke ọma n’ógbè ahụ dum, nke bụ́: “Chegharịanụ; n’ihi na alaeze eluigwe dị nso.” (Matiu 4:17) N’ime ọnwa ole na ole, mgbe mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ Jọn Onye Na-eme Baptism bịara isi n’aka Jisọs nweta akụkọ banyere onwe ya, ọ gwara ha, sị: “Gaanụ, kọọrọ Jọn ihe nile unu hụrụ na nke unu nụrụ; ndị ìsì na-ahụ ụzọ, ndị ngwụrọ na-eje ije, a na-eme ndị ekpenta ka ha dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụ ihe, a na-eme ndị nwụrụ anwụ ka ha si n’ọnwụ bilie, a na-ezi ndị ogbenye ozi ọma. Ngọzi na-adịkwara onye ahụ, bụ́ onye ọ bụla nke na-agaghị ama n’onyà n’ahụ m.”—Luk 7:22, 23.

9. Gịnị mere ìgwè mmadụ ji bịakwute Kraịst Jisọs, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site na nke a?

9 ‘Okwu ọma banyere Jisọs gbasaruru mba ndị gbara Galili gburugburu,’ oké ìgwè mmadụ bịakwutekwara ya—site na Galili, Dekapọlis, Jerusalem, Judia, na akụkụ nke ọzọ nke Osimiri Jọdan. (Luk 4:14, 15; Matiu 4:24, 25) Ha bịakwutere ya ọ bụghị nanị n’ihi ọrịa ndị ọ na-agwọ n’ụzọ ọrụ ebube kamakwa n’ihi ozizi ndị dị ebube ọ na-ezi. Ozi ya na-adọrọ adọrọ ma na-agba ume. (Matiu 5:1–7:27) Okwu Jisọs dị ụtọ ma na-akpali mmasị. (Luk 4:22) “Ibobo  ozizi Ya nwụrụ ìgwè mmadụ nile n’ahụ,” n’ihi na ọ na-esite n’Akwụkwọ Nsọ jiri nkwuwa okwu na-ekwu. (Matiu 7:28, 29; Luk 4:32) Olee onye a na-agaghị adọta n’ebe ụdị nwoke a nọ? Ka anyị onwe anyị kwa zụlite nkà izi ihe ka e wee dọta ndị nwere obi eziokwu n’ebe eziokwu ahụ dị.

10. N’ihi gịnị ka ndị obodo Nazaret ji nwaa igbu Jisọs, gịnịkwa mere ha enweghị ihe ịga nke ọma?

10 Otú ọ dị, ọ bụghị ndị nile nụrụ ihe Jisọs kụziri nabatara ya. Ọbụna ná mmalite nke ozi ya, mgbe ọ na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ dị n’obodo a mụrụ ya na Nazaret, a nwara igbu ya. N’agbanyeghị na “okwu nile nke amara” ya juru ndị obodo ahụ anya, ha chọrọ ịhụ ọrụ ebube. Otú ọ dị, kama ịrụ ọtụtụ ọrụ ebube n’ebe ahụ, Jisọs kpughere ọchịchọ onwe nanị na enweghị okwukwe ha. N’ịbụ ndị iwe jupụtara n’obi, ndị ahụ nọ n’ụlọ nzukọ ebilie, dọkpụrụ Jisọs, ma gaa n’akụkụ ugwu iji chedo ya isi n’ala ma tụda ya n’ebe kpọdara akpọda. Ma ya esi n’aka ha gbapụ n’emerụghị ahụ. “Oge awa” nke ọnwụ ya erubeghị.—Luk 4:16-30.

11. (a) N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị ndú okpukpe ji abịa ige Jisọs ntị? (b) N’ihi gịnị ka e ji boo Jisọs ebubo imebi iwu Ụbọchị Izu Ike?

11 Ndị ndú okpukpe—ndị odeakwụkwọ, ndị Farisii, ndị Sadusii na ndị ọzọ—na-anọkarịkwa n’ebe Jisọs na-eme nkwusa. Ọtụtụ n’ime ha na-anọ n’ebe ahụ, ọ bụghị iji gee ntị ma mụta ihe, kama ọ bụ iji chọpụta ebe Jisọs na-emezighị emezi na iji mata ya n’ọnyà. (Matiu 12:38; 16:1; Luk 5:17; 6:1, 2) Dị ka ihe atụ, mgbe ọ na-aga Jerusalem maka Ememe Ngabiga nke 31 O.A., Jisọs gwọrọ otu nwoke nke rịaworo ọrịa ruo afọ 38. Ndị ndú okpukpe ndị Juu boro Jisọs ebubo imebi iwu Ụbọchị Izu Ike. Ọ zaghachiri, sị: “Nna m na-arụ ọrụ ruo ugbu a, Mụ onwe m na-arụkwa ọrụ.” Ugbu a ndị Juu boro ya ebubo nkwulu maka ịzọrọ na ọ bụ Ọkpara Chineke site n’ịkpọ ya Nna ya. Ha achọọ ụzọ igbu Jisọs, ma ya na ndị na-eso ụzọ ya hapụrụ Jerusalem gawa Galili. N’otu aka ahụ, anyị ga-abụ ndị maara ihe izere iso ndị mmegide na-ese okwu n’ụzọ na-enweghị isi ka anyị na-etinye ume ọrụ anyị n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ na nke ime ndị na-eso ụzọ.—Jọn 5:1-18; 6:1.

12. Ruo ókè hà aṅaa ka ọrụ Jisọs rụrụ n’ókèala dị na Galili saruru na mbara?

12 Ruo otu afọ na ọkara sochirinụ ma ọ bụ ihe yiri ya, Jisọs ziri ihe kasị ukwuu n’ozi ya na Galili, na-eje Jerusalem nanị iji gaa ememe atọ ndị Juu na-eme kwa afọ. N’ozuzu ya, o mere njem ime nkwusa atọ na Galili: nke mbụ bụ ya na ndị na-eso ụzọ 4 ọhụrụ ya, nke abụọ bụ ya na ndị ozi 12 ahụ, nke sakwara mbara bụ nke ya na ndị ozi ahụ e nyere ọzụzụ bụ́kwa ndị o zipụrụ, so mee. Lee àmà sara mbara a gbaara eziokwu ahụ na Galili!—Matiu 4:18-25; Luk 8:1-3; 9:1-6.

Iji Obi Ike Gbaa Àmà na Judia na Perea

13, 14. (a) N’oge dị aṅaa ka ndị Juu nọ na-achọ ijide Jisọs? (b) Gịnị mere ndị ahụ na-eje ozi ejideghị Jisọs?

13 Ọ bụ oge mgbụsị akwụkwọ nke 32 O.A., “oge awa” Jisọs ka dịkwa n’ihu. Ememe Ụlọikwuu dị nso. Ndị otu nne ji ha na Jisọs agbazie ya ume, sị: “Si n’ebe a pụọ, jee na Judia.” Ha chọrọ ka Jisọs gosi ndị nile gbakọtara n’ememe ahụ na Jerusalem ike ọrụ ebube ya. Otú ọ dị, Jisọs maara ihe ize ndụ dị na ya. Ya mere ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mụ onwe m agaghị arịgoro ememe a ugbu a; n’ihi na oge nke m aka-ezughị.”—Jọn 7:1-8.

14 Mgbe Jisọs gbutụrụ oge na Galili ruo oge ụfọdụ, ọ rịgoro Jerusalem “ọ bụghị n’ihu ọha mmadụ, kama dị ka ọ̀ bụ na nzuzo.” N’ezie ndị Juu nọ na-achọ ya n’ememe ahụ, na-asị: “Olee ebe Onye ahụ nọ?” Mgbe ememe ahụ gara ọkara, Jisọs banyere n’ụlọ nsọ ahụ ma jiri obi ike malite izi ihe. Ha nwara ijide ya, ikekwe iji tụba ya n’ụlọ mkpọrọ ma ọ bụ iji gbuo ya. Ma, ha enweghị ihe ịga nke ọma n’ihi na ‘oge awa ya aka-abịaghị.’ Ọtụtụ ndị bịaziri nwee okwukwe n’ebe Jisọs nọ. Ọbụna ndị na-eje ozi bụ́ ndị ndị Farisii zigara ka ha jide ya, gba aka laghachi, na-asị: “Ọ dịghị mgbe ọ bụla mmadụ kwuru okwu dị otú a.”—Jọn 7:9-14, 30-46.

15. N’ihi gịnị ka ndị Juu ji tụtụrụ nkume ịtụ Jisọs, ọrụ nkwusa dịkwa aṅaa ka ọ malitere mgbe nke a gasịrị?

15 Esemokwu dị n’etiti Jisọs na ndị Juu na-emegide ya gara n’ihu ka ọ na-akụzi banyere  Nna ya n’ụlọ nsọ ahụ n’oge ememe ahụ. N’ụbọchị ikpeazụ nke ememe ahụ, ndị Juu, n’ịbụ ndị okwu Jisọs kwuru banyere ịdị adị ya tupu ọ ghọọ mmadụ kpasuru iwe, tụtụụrụ nkume iji tụọ ya. Ma o zobere onwe ya ma gbanahụ ha n’emerụghị ahụ. (Jọn 8:12-59) Mgbe Jisọs hapụrụ Jerusalem, ọ gbara àmà n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ na Judia. Ọ họpụtara ndị na-eso ụzọ 70, mgbe o nyesịkwara ha ndụmọdụ, o zipụ ha abụọ abụọ ka ha rụọ ọrụ n’ókèala ahụ. Ha eburu ụzọ gaa n’ebe nile na n’obodo nile Jisọs na ndị ozi ya na-eme atụmatụ ịga.—Luk 10:1-24.

16. Ihe ize ndụ dị aṅaa ka Jisọs gbanahụrụ n’oge Ememe Nraranye, ọrụ dịkwa aṅaa ka o ji n’aka ọzọ?

16 N’oge oyi nke 32 O.A., “oge awa” Jisọs nọ na-abịarukwu nso. Ya agaa Jerusalem maka Ememe Nraranye. Ndị Juu ka na-achọ igbu ya. Ka Jisọs na-agagharị n’ị̀bà nke ụlọ nsọ ahụ, ha agbaa ya gburugburu. N’ibo ya ebubo nkwulu ọzọ, ha tụtụụrụ nkume ịtụgbu ya. Ma dị ka Jisọs mere n’oge ndị bu ụzọ, ọ gbanahụrụ ha. N’oge na-adịghị anya, ya anọrọ n’okporo ámá na-akụzi ihe, n’oge a ọ na-aga site n’obodo ukwu gaa n’obodo ukwu, sitekwa n’obodo nta gaa n’obodo nta n’ógbè Perea, nke dị n’ofe Jọdan site na Judia. Ọtụtụ ndị bịakwara nwee okwukwe n’ebe ọ nọ. Ma ozi ọkụ ọkụ e ziteere ya n’ihe metụtara ezigbo enyi ya ọ hụrụ n’anya bụ́ Lazarọs mere ka ọ laghachi Judia.—Luk 13:33; Jọn 10:20-42.

17. (a) Ozi dị aṅaa nke chọrọ ime ihe ngwa ngwa ka Jisọs natara mgbe ọ na-eme nkwusa na Perea? (b) Gịnị na-egosi na Jisọs maara nzube nke ihe ọ na-aghaghị ime nakwa oge maka ihe dị iche iche?

17 Ozi ahụ nke chọrọ ime ihe ngwa ngwa sitere n’aka Mata na Meri, bụ́ ụmụnne Lazarọs ndị nwanyị, bụ́ ndị bi na Betani nke Judia. “Onyenwe anyị, lee, ahụ nke onye ahụ Ị hụrụ n’anya adịghị ike,” ka onye ozi ahụ kọrọ. “Nrịanrịa nke a abụghị nke ọnwụ,” ka Jisọs zaghachiri, “kama ọ bụ n’ihi otuto Chineke, ka e wee nye Ọkpara Chineke otuto site na ya.” Iji mezuo nzube a, Jisọs amara ụma nọrọ n’ebe ọ nọ ruo ụbọchị abụọ. E mesịa, ya agwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ka anyị jee Judia ọzọ.” Ha ji obi abụọ zaghachi, sị: “Rabaị, ugbu a ka ndị Juu na-achọ ụzọ ịtụ Gị nkume; Ị̀ na-ejekwa ebe ahụ ọzọ?” Ma Jisọs maara na oge fọdụrụ ‘n’awa dị n’ehihie,’ ma ọ bụ oge Chineke nyere maka ozi elu ala ya, dị mkpụmkpụ. Ọ maara kpọmkwem ihe ọ na-aghaghị ime na ihe mere ọ na-aghaghị iji mee ya.—Jọn 11:1-10.

Ọrụ Ebube nke Ọ Na-adịghị Onye Pụrụ Ileghara Anya

18. Mgbe Jisọs bịaruru Betani, olee ọnọdụ e nwere n’ebe ahụ, gịnịkwa mere mgbe ọ bịarutesịrị?

18 Na Betani, ọ bụ Mata bụ onye mbụ zutere Jisọs, na-asị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na Ị nọrịị n’ebe a, nwanne m nwoke agaghị anwụworị.” Meri na ndị bịara n’ụlọ ha sochiri. Ha nile na-akwa ákwá. “Olee ebe unu tọgbọworo ya?” ka Jisọs jụrụ. Ha zara, sị: “Onyenwe anyị, Bịa, leekwa.” Mgbe ha ruru n’ili ncheta ahụ—ọgba nke e ji otu nkume dochie ọnụ ya—Jisọs kwupụtara, sị: “Wepụnụ nkume ahụ.” Ebe ọ bụ na Mata aghọtaghị ihe Jisọs chọrọ ime, o kwuru ka a ghara ime otú ahụ, sị: “Onyenwe anyị, ọ na-esi ísì ugbu a: n’ihi na nke a mere ya ụbọchị anọ ọ nwụrụ.” Ma Jisọs jụrụ ya, sị: “Àsịghị m gị na, ọ bụrụ na i kwere, ị ga-ahụ ebube Chineke?”—Jọn 11:17-40.

19. N’ihi gịnị ka Jisọs ji kpee ekpere n’ihu ọha tupu ọ kpọlite Lazarọs?

19 Mgbe e wepụrụ nkume ahụ e ji dochie ọnụ ili Lazarọs, Jisọs kpere ekpere n’olu dara ụda ka ndị mmadụ mara na ihe ọ na-aga ime sitere n’ike Chineke. Mgbe ahụ, o weere oké olu tie mkpu, sị: “Lazarọs, pụta n’èzí.” Lazarọs pụtara, ákwà e ji kee ya ka dịcha ya n’aka na n’ụkwụ,  ịchafụ ka kpuchikwara ya ihu. “Tọpụnụ ya, gharakwa ya ka ọ laa,” ka Jisọs kwuru.—Jọn 11:41-44.

20. Olee otú ndị hụrụ mgbe Jisọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ si meghachi omume?

20 Mgbe ọtụtụ ndị Juu bụ́ ndị bịara ịkasi Mata na Meri obi hụrụ ọrụ ebube a, ha nwere okwukwe n’ebe Jisọs nọ. Ndị ọzọ gara ịkọrọ ndị Farisii ihe meworonụ. Gịnị bụ mmeghachi omume ha? Ngwa ngwa, ha na ndị isi nchụàjà akpọọ nzukọ mberede nke Sanhedrin. N’ụjọ, ha kwara arịrị, sị: “Gịnị ka anyị [ga-eme]? n’ihi na Nwoke a na-eme ọtụtụ ihe ịrịba ama. Ọ bụrụ na anyị ahapụ Ya otú a, mmadụ nile ga-ekwere na Ya: ndị Rom ga-abịakwa napụ ebe nke anyị na mba nke anyị.” Ma Onyeisi Nchụàjà bụ́ Kaịafas gwara ha, sị: “Unu atụleghịkwa uche na ọ baara unu uru ka otu onye nwụọ n’ọnọdụ ndị Juu, ka mba anyị dum ghara ịlakwa n’iyi.” Ya mere, site n’ụbọchị ahụ gaa n’ihu, ha gbara izu igbu Jisọs.—Jọn 11:45-53.

21. Ọrụ ebube nke ịkpọlite Lazarọs n’ọnwụ bụ mmalite gịnị?

21 Otú ahụ ka o si bụrụ na site n’igbu oge n’irute Betani, Jisọs bịara nwee ike ịrụ ọrụ ebube ọ na-adịghị onye pụrụ ileghara anya. N’ịbụ onye Chineke nyere ike, Jisọs kpọlitere nwoke nwụworo anwụ ruo ụbọchị anọ. Ọbụna a manyere òtù nnọkọ Sanhedrin ahụ a na-akwanyere ùgwù ịmata nke a, ha wee maa Onye Ọrụ Ebube ahụ ikpe ọnwụ! Ọrụ ebube ahụ si otú a bụrụ mmalite nke oge oké mgbanwe n’ozi Jisọs—mgbanwe site na mgbe “oge awa Ya aka-abịaghị” gaa na mgbe ‘oge awa ahụ bịara.’

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee otú Jisọs si gosi na ọ maara ọrụ Chineke nyere ya?

• N’ihi gịnị ka Jisọs ji jụ aro nne ya tụụrụ ya banyere mmanya?

• Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ụzọ Jisọs si mesoo ndị mmegide ihe mgbe mgbe?

• N’ihi gịnị ka Jisọs ji gbuo oge n’ime ihe banyere nrịanrịa Lazarọs?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 12]

Jisọs tinyere ume ọrụ ya n’ọrụ Chineke nyere ya