Levitikọs 25:1-55

  • Afọ Izu Ike (1-7)

  • Afọ Nnwere Onwe (8-22)

  • Mmadụ iwereghachi ụlọ ya ma ọ bụ ala ya (23-34)

  • Otú a ga-esi na-emeso ndị ogbenye (35-38)

  • Iwu ndị e nyere gbasara ịgba ohu (39-55)

25  Jehova wee gwa Mosis okwu ọzọ n’Ugwu Saịnaị, sị:  “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Mgbe unu ga-emecha bata n’ala m ga-enye unu,+ unu ga-edebere Jehova ụbọchị izu ike ma hapụ ala ahụ ka o zuo ike.+  Afọ isii ka unu ga-agha mkpụrụ n’ubi unu. Afọ isii ka unu ga-akwachakwa ubi vaịn unu. Unu ga-aghọrọkwa mkpụrụ ala unu mepụtara.+  Ma n’afọ nke asaa, unu ga-ahapụ ya ka o zuo ezigbo ike. Ọ bụ afọ izu ike a ga-edebere Jehova. Unu agaghị agha mkpụrụ n’ubi unu ma ọ bụ kwachaa ubi vaịn unu.  Unu werechaa ihe ubi unu mepụtara, unu aghọrọla ọka* nke mkpụrụ a hapụrụ n’ubi mịrị. Unu aghọrọkwala mkpụrụ si n’osisi vaịn ndị unu na-akwachaghị akwacha. Unu ga-ahapụ ala ahụ ka o zuo ezigbo ike otu afọ.  Ma unu nwere ike iri nri ala ahụ mepụtara n’oge ahụ unu hapụrụ ya ka o zuo ike. Gị na ohu gị nwoke na ohu gị nwaanyị na onye ọrụ i goro ego na ndị ọbịa gị na ha bi nwere ike iri ya.  Anụ ụlọ gị na anụ ọhịa ndị bi n’ala gị nwekwara ike iri ya. E nwere ike iri ihe niile ala ahụ mepụtara eri.  “‘Unu ga-agụ afọ izu ike asaa, ya bụ, afọ asaa ụzọ asaa. Afọ izu ike asaa ga-abụ afọ iri anọ na itoolu.  N’abalị iri n’ọnwa nke asaa, unu ga-afụ opi ka ọ dasie ụda ike. Unu ga-afụ opi ahụ ka a nụ ya n’ala unu niile n’Ụbọchị Ikpuchi Mmehie.+ 10  Unu ga-edo afọ nke iri ise nsọ ma maa ọkwa ka ndị niile bi n’ala unu nwere onwe ha.+ Ọ ga-abụrụ unu afọ Nnwere Onwe.* Onye ọ bụla n’ime unu ga-alaghachi n’ala o ketara. Onye ọ bụla n’ime unu ga-alaghachikwuru ezinụlọ ya.+ 11  Afọ nke iri ise ga-abụrụ unu afọ Nnwere Onwe. Unu agaghị agha mkpụrụ ma ọ bụ ghọrọ ọka wit mkpụrụ a hapụrụ n’ubi mịrị. Unu agaghịkwa aghọrọ mkpụrụ si n’osisi vaịn ndị unu na-akwachaghị akwacha.+ 12  N’ihi na ọ bụ afọ Nnwere Onwe. Ọ ga-abụrụ unu afọ dị nsọ. Ọ bụ naanị ihe ala ahụ mepụtara n’onwe ya ka unu nwere ike iri.+ 13  “‘N’afọ Nnwere Onwe, onye ọ bụla n’ime unu ga-alaghachi n’ala o ketara.+ 14  Unu resịwa mmadụ ibe unu ihe ọ bụla ma ọ bụ zụwa ya ihe, unu erigbula ibe unu.+ 15  Unu zụwa ala n’aka mmadụ ibe unu, unu ga-agbakọ afọ ole gaferela kemgbe afọ Nnwere Onwe gachara. Onye ahụ ga-agbakọkwa afọ ole fọrọ ị ga-eji wee ihe n’ubi ahụ ka ọ mata ego ole ọ ga-ana gị.+ 16  Ọ bụrụ na ọtụtụ afọ ka fọrọ, o nwere ike iweli ọnụ ahịa ya. Ma, ọ bụrụ afọ ole na ole fọrọ, ọ ga-ewetu ọnụ ahịa ya n’ihi na ihe ọ na-eresị gị bụ ihe ndị ubi ahụ ga-emepụtara gị. 17  Onye ọ bụla n’ime unu erigbula ibe ya.+ Tụọnụ egwu Chineke unu+ n’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.+ 18  Ọ bụrụ na unu na-edebe iwu m ma na-eme ihe m kpebiri, unu ga-ebi n’ala ahụ, obi eruo unu ala.+ 19  Ala ahụ ga na-amị mkpụrụ.+ Unu ga-eriju afọ ma biri na ya, obi eruokwa unu ala.+ 20  “‘Ma ọ bụrụ na unu asị: “Gịnị ka anyị ga-eri n’afọ nke asaa ma ọ bụrụ na anyị agaghị agha mkpụrụ ma ọ bụ wee ihe ubi?”+ 21  M ga-awụsa unu ngọzi m n’afọ nke isii. Ala unu ga-amịkwa mkpụrụ ga-ezuru unu afọ atọ.+ 22  Unu ga-aghazi mkpụrụ n’afọ nke asatọ, ma unu ga na-eri ihe ochie unu wetara n’ubi ruo n’afọ nke itoolu. Unu ga na-eri nke ochie ruo mgbe mkpụrụ unu kụrụ mịrị. 23  “‘A gaghị ere ala ka ọ bụrụzie nke onye unu resịrị ya ebighị ebi,+ n’ihi na ọ bụ m nwe ala.+ N’ihi na n’anya m, unu bụ ndị mbịarambịa na ndị ọbịa.+ 24  N’ala niile unu ketara, onye rere ala nwere ikike ịzụrụghachi ala ya. 25  “‘Ọ bụrụ na nwanne gị adaa ogbenye wee ree ụfọdụ n’ime ala ya, ezigbo onye ikwu ya ga-abịa zụrụghachi ala ahụ nwanne ya rere.+ 26  Ọ bụrụ na mmadụ enweghị onye ga-agbara ihe o rere, ma ya abaa ọgaranya wee nweta ego ọ ga-eji gbara ya, 27  ọ ga-agbakọ ego afọ ole garala kemgbe o rere ala ahụ, wepụ ya n’ego ole o rere ala ahụ, nyeghachizie onye o resịrị ala ahụ ego ole fọrọnụ. Ọ ga-ewereghachi ala ya.+ 28  “‘Ma ọ bụrụ na o nwetaghị ego ọ ga-eji zụrụghachi ya n’aka onye o resịrị ya, ihe ahụ o rere ga-adị n’aka onye zụrụ ya ruo n’afọ Nnwere Onwe.+ Ala ahụ ga-abụghachi nke ya n’afọ Nnwere Onwe, ya ewerezie ya.+ 29  “‘Ọ bụrụ na mmadụ eree ụlọ dị n’obodo nwere mgbidi, ọ ga-enwe ikike ịgbara ya malite mgbe o rere ya ruo mgbe otu afọ gwụrụ. Ọ ga-enwe ikike a+ ruo otu afọ zuru ezu. 30  Ma ọ bụrụ na a zụrụghachighị ụlọ ahụ dị n’obodo nwere mgbidi mgbe otu afọ zuru, ọ ga-abụzi nke onye zụrụ ya n’ọgbọ ya niile. N’afọ Nnwere Onwe, a gaghị enyeghachi ya onye nwebu ya. 31  Ma, a ga-ewere ụlọ ọ bụla dị n’obodo nta na-enweghị mgbidi otú e si were ala ubi dị n’ime ime obodo. A ka ga-enwe ikike ịgbara ya. N’afọ Nnwere Onwe, a ga-enyeghachi ya onye nwebu ya. 32  “‘Ma ndị Livaị nwere ikike ịgbara ụlọ ndị dị n’obodo ha+ mgbe ọ bụla. 33  Ọ bụrụ na a zụrụghachighị ụlọ ndị Livaị e rere ere, bụ́ nke dị n’obodo ndị Livaị, a ga-enyeghachi onye nwebu ụlọ ahụ ụlọ ya n’afọ Nnwere Onwe,+ n’ihi na ọ bụ ndị Livaị ketara ụlọ ndị dị n’obodo ha n’Izrel.+ 34  A gaghịkwa ere ala ndị gbara obodo ha gburugburu, bụ́ ala ebe anụmanụ na-ata ahịhịa,+ n’ihi na ọ bụ nke ha mgbe niile. 35  “‘Ọ bụrụ na nwanne gị nke bi gị nso adaa ogbenye, ya abụrụ na o nweghị ike igboro onwe ya mkpa,+ ị ga na-enye ya ihe na-akpa ya otú ị ga-emere onye mbịarambịa na onye ọbịa,+ ka nwanne gị soro gị dịrị ndụ. 36  Anala ya ọmụrụ nwa ma ọ bụ jiri ya kpaa ego.+ Tụọ egwu Chineke gị.+ Nwanne gị ga-esokwa gị dịrị ndụ. 37  Anala ya ọmụrụ nwa ma i binye ya ego.+ Enyekwala ya nri ka i nweta uru. 38  Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu, onye kpọpụtara unu n’Ijipt+ ka m nye unu ala Kenan, ka m wee gosi na m bụ Chineke unu.+ 39  “‘Ọ bụrụ na nwanne gị nke bi gị nso adaa ogbenye wee resị gị onwe ya,+ amanyela ya ka ọ rụwara gị ọrụ ka ohu nkịtị.+ 40  Ị ga-ewere ya ka onye ọrụ e goro ego+ ma ọ bụ ọbịa. Ọ ga na-ejere gị ozi ruo n’afọ Nnwere Onwe. 41  Ọ ga-ahapụzi gị laghachikwuru ezinụlọ ya, ya na ụmụ ya. Ọ ga-alaghachi n’ala nna nna ya hà ketara.+ 42  N’ihi na ha bụ ndị ohu m, ndị m kpọpụtara n’Ijipt.+ Ha agaghị ere onwe ha ka ha bụrụ ndị ohu nkịtị. 43  Emegbula ya.+ Tụọ egwu Chineke gị.+ 44  I nwere ike isi ná mba ndị gbara unu gburugburu nweta ohu nwoke na ohu nwaanyị. Ọ bụ ná mba ndị ahụ ka i nwere ike isi zụrụ ohu nwoke ma ọ bụ ohu nwaanyị. 45  Unu nwekwara ike isi n’ụmụ ndị mbịarambịa binyeere unu+ nakwa ná ndị ezinụlọ ha, bụ́ ndị a mụụrụ ha n’ala unu, zụrụ ndị ohu. Ha ga-abụkwa nke unu. 46  Unu nwere ike inyefe ha ụmụ unu ndị ga-anọchi unu ka ha bụrụ ndị ohu ụmụ unu. Unu nwere ike iji ha mere ndị ọrụ, ma unu emegbula ndị Izrel bụ́ ụmụnne unu.+ 47  “‘Ma ọ bụrụ na onye mbịarambịa ma ọ bụ onye ọbịa binyeere unu abaa ọgaranya, ma nwanne gị bi ya nso adaa ogbenye, o wee resị onye mbịarambịa ma ọ bụ onye ọbịa binyeere unu onwe ya ma ọ bụ resị otu onye n’ezinụlọ onye mbịarambịa onwe ya, 48  ọ ka nwere ikike ịgbara onwe ya mgbe o rechara onwe ya. Otu n’ime ụmụnne ya ndị nwoke nwere ike ịgbara ya.+ 49  Nwanne nna ya ma ọ bụ nwa nwanne nna ya nwere ike ịgbara ya. Onye ikwu ya ọ bụla* si n’ezinụlọ ya nwere ike ịgbara ya. “‘Ma ọ bụ, ọ bụrụ na onye ahụ rere onwe ya abaa ọgaranya, o nwekwara ike ịgbara onwe ya.+ 50  Ya na onye zụrụ ya ga-agbakọ oge ọ nọrọla malite n’afọ o resịrị ya onwe ya ruo n’afọ Nnwere Onwe.+ Ego ole o rere onwe ya na ego afọ ole ọ rụrụ ọrụ ga-aha.+ A ga-agbakọ ego ụbọchị ndị ọ rụrụ ọrụ otú e si agbakọ nke onye ọrụ e goro ego.+ 51  Ọ bụrụ na afọ ole fọrọ tupu afọ Nnwere Onwe ka dị ọtụtụ, ọ ga-akwụ ya ụgwọ afọ ole fọrọnụ ka o wee gbara onwe ya. 52  Ma ọ bụrụ naanị afọ ole na ole fọrọ tupu afọ Nnwere Onwe, ọ ga-agbakọ ya ma kwụọ ụgwọ afọ ole fọrọnụ ka o wee gbara onwe ya. 53  N’oge niile ọ na-ejere nna ya ukwu ozi, ọ ga na-arụ ọrụ ka onye ọrụ e goro ego. Unu ga-ahụ na e megbughị ya.+ 54  Ma, ọ bụrụ na ọ gaghị agbarali onwe ya otú e kwuru, ọ ga-enwere onwe ya n’afọ Nnwere Onwe,+ ya na ụmụ ya. 55  “‘N’ihi na ndị Izrel bụ ndị ohu m. Ha bụ ndị ohu m, ndị m kpọpụtara n’Ijipt.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ma ọ bụ “afọ Jubili.”
Ma ọ bụ “onye ikwu ya ọ bụla ya na ya bụ otu ọbara.”