Chineke Ọ̀ Na-anụ Ekpere Gị?

Chineke Ọ̀ Na-anụ Ekpere Gị?

I kpee ekpere, ì chere na Chineke na-anụ ya n’eziokwu?

GỊNỊ KA BAỊBỤL KWURU?

  • Chineke na-ege ntị. Baịbụl gwara anyị na “Jehova nọ ndị niile na-akpọku ya nso, bụ́ ndị niile ji obi ha niile na-akpọku ya. . . . Ọ na-anụ ákwá ha na-ebe ka o nyere ha aka.”​—Abụ Ọma 145:18, 19.

  • Chineke chọrọ ka ị na-ekpegara ya ekpere. Baịbụl gwara anyị, sị: “N’ihe niile, na-ekpenụ ekpere, na-arịọsikwanụ Chineke arịrịọ ike ma na-ekele ya. Ọ bụ otú unu ga-esi mee ka ọ mara ihe unu na-arịọ.”​—Ndị Filipaị 4:6.

  • Ihe banyere gị na-emetụ Chineke n’obi. Chineke ma ihe niile anyị na ha na-alụ, ọ chọkwara inyere anyị aka. Baịbụl kwuru, sị: “Na-akọrọnụ ya ihe niile na-echegbu unu, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.”​—1 Pita 5:7.