Uru Ekpere Nwere Ike Ịbara Gị
Otu nwaanyị aha ya bụ Pamela gara ụlọ ọgwụ n’ihi ọrịa kansa ọ na-arịa. Ọ rịọrọ Chineke ka o nye ya ike ọ ga-eji na-edi nsogbu a ya na ya na-alụ. È nwere uru ekpere a o kpere baara ya?
Pamela sịrị: “Ezigbo ụjọ tụrụ m mgbe a na-agwọ m ọrịa kansa a. Ma mgbe m kpegaara Jehova Chineke ekpere, ahụ́ bịara ruo m ala, mụ akwụsịkwa ụjọ m na-atụ. Ahụ́ ka na-egbu m ezigbo mgbu, ma ekpere na-enyere m aka ịna-edi nsogbu m. Ndị mmadụ jụọ m otú m mere, m na-agwa ha, sị: ‘Ahụ́ adịghị m, ma obi dị m ụtọ.’”
Ma, anyị ekwesịghị ichere ka ezigbo nsogbu bịara anyị tupu anyị ekpee ekpere. Nsogbu na-abịara anyị niile, ma nnukwu nsogbu ma obere nsogbu, anyị makwa na anyị chọrọ enyemaka iji merie ha. Ekpere ò nwere ike inyere anyị aka?
Baịbụl sịrị: “Bunye Jehova ibu na-anyịgbu gị. Ọ ga-enyere gị aka. E nweghị mgbe ọ ga-ahapụ onye ezi omume ka ọ daa.” (Abụ Ọma 55:22) Ihe a Baịbụl kwuru na-akasi anyị obi. Oleekwanụ otú ekpere ga-esi nyere gị aka? Ọ bụrụ na i kpegara Chineke ekpere otú kwesịrị ekwesị, ọ ga-enye gị ihe ndị dị gị mkpa iji die nsogbu gị.—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ihe Ekpere Ga-emere Gị.”