Gịnị Mere Chineke Anaghị Aza Ekpere Niile?
Ọ na-agụsi Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova Chineke, agụụ ike ịnụ ekpere anyị si n’ala ala obi anyị kpee, ọ na-emekwa ya obi ụtọ. Ma, e nwere ihe ndị nwere ike ime ka ọ ghara ịnụ ekpere anyị. Gịnị ka ha bụ, gịnịkwa ka anyị kwesịrị iburu n’obi ma anyị kpewe ekpere? Lee ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka.
“Mgbe ị na-ekpe ekpere, ekwughachila otu ihe ugboro ugboro.”—Matiu 6:7.
Jehova achọghị ka anyị na-ekpe ekpere anyị bu n’isi ma ọ bụ si n’akwụkwọ na-agụpụta ya. Kama, ọ chọrọ ka anyị si n’obi anyị na-agwa ya okwu. Chegodị otú obi ga-adị gị ma enyi gị na-abịa agwa gị otu ihe mgbe niile. Ndị bụ́ ezigbo enyi na-esi n’ala ala obi ha agwa ibe ha okwu. Ọ bụrụ na anyị esi n’ala ala obi anyị na-ekpe ekpere, ọ pụtara na anyị weere Nna anyị nke eluigwe ka enyi anyị.
“Ọ bụrụkwa na unu arịọ, unu anaghị arịọta n’ihi na ihe unu na-arịọ maka ya bụ . . . ihe unu ga-eji mee ihe ọjọọ.”—Jems 4:3.
Anyị agaghị atụ anya ka Chineke nụ ekpere anyị ma anyị rịọ ya ihe anyị ma na ọ chọghị ka anyị mee ma ọ bụ ka anyị nweta. Dị ka ihe atụ, onye na-agba chaa chaa rịọ Jehova ka o mee ka o nwee ihu ọma, Jehova ọ̀ ga-aza ekpere ya ebe ọ bụ na ọ dọọla anyị aka ná ntị gbasara inwe anyaukwu na ikwere nkwenkwe ụgha, dị ka inwe ihu ọma? (Aịzaya 65:11; Luk 12:15) Anyị ekwesịghị iche na Jehova ga-aza ụdị ekpere ahụ. Anyị chọọ ka Chineke na-aza ekpere anyị, anyị ga-ejiderịrị n’aka na ihe anyị na-arịọ ya dabara n’ihe ọ na-agwa anyị na Baịbụl.
“Onye na-ekweghị eme ihe iwu kwuru, Chineke ga-eweredị ekpere ya ka ihe rụrụ arụ.”—
N’oge Baịbụl, Chineke azaghị ndị na-enupụrụ ya isi ekpere ha. (Aịzaya 1:15, 16) Chineke agbanwebeghị. (Malakaị 3:6) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke na-aza ekpere anyị, anyị ga-emerịrị ike anyị niile iji na-erubere iwu ya isi. Ma, ọ bụrụkwanụ na anyị mere ihe ndị na-adịghị mma n’oge gara aga? Ọ̀ pụtara na Jehova emekataghị nụ ekpere anyị? Mbanụ! Ọ bụrụ na anyị echegharịa ma gbalịa ike anyị niile na-eme ihe dị Chineke mma, ọ ga-agbaghara anyị maka na ọ hụrụ anyị n’anya.—Ọrụ Ndịozi 3:19.