Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Di na Nwunye Ga-esi Kwụsị Ịna-esekarị Okwu

Otú Di na Nwunye Ga-esi Kwụsị Ịna-esekarị Okwu

GỊNỊ ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na udo adịghị n’ezinụlọ unu? O nwere ike ịbụ na unu na-esekarị okwu nke na unu anaghịzi atụpụrụ onwe unu ọnụ. O nwekwara ike ịbụ na ị chetaghịzi ihe seere unu okwu. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na unu hụrụ ibe unu n’anya, unu ebughịkwa n’obi ịna-akpasu onwe unu iwe.

Na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-enwe nghọtahie mgbe ụfọdụ apụtaghị na ihe aghasawala n’ezinụlọ unu. Ihe di na nwunye mere mgbe ha nwere nghọtahie ga-ekpebi ma udo ọ̀ ga-adị n’ụlọ ha ma ọ bụ na ọ gaghị adị. Ka anyị hụ ihe ụfọdụ ga-enye aka ka esemokwu belata n’ezinụlọ.

1. ASAKWALA YA OKWU.

Mmadụ abụọ na-asa ibe ha okwu, okwu ga na-arị ibe ya elu. Ma, ọ bụrụ na otu onye agba nkịtị mgbe onye nke ọzọ na-ekwu okwu, ọ bụrụgodị na iwe ji ya, o nwere ike ime ka okwu ahụ bie. N’ihi ya, asala di gị ma ọ bụ nwunye gị okwu mgbe iwe ji gị. Ùgwù gị ga-adịrị gị ma i jide onwe gị mgbe ọ na-ekwu okwu. Ihe ka mkpa bụ udo ịdị n’ezinụlọ unu, ọ bụghị ikwu onye ikpe mara na onye ọ na-amaghị.

“Ọ bụrụ na nkụ adịghị, ọkụ na-anyụ, ọ bụrụkwa na e nweghị onye nkwutọ, esemokwu na-akwụsị.”Ilu 26:20.

2. GEE NTỊ MGBE Ọ NA-EKWU OTÚ OBI DỊ YA.

Di gị ma ọ bụ nwunye gị kwuwe otú obi dị ya, gee ya ntị nke ọma, amanyekwala ya aka n’ọnụ. Ihe a ga-eme ka obi dajụọ ya, udo adịrịkwa n’ụlọ unu. Ekwula na o nwere ihe ọjọọ di gị ma ọ bụ nwunye gị bu n’obi o ji na-ekwu ihe ọ na-ekwu, kama gbaa mbọ ghọta ihe ọ na-ekwu. Echefula na ezughị okè na-akpa ike n’ahụ́ mmadụ. Okwu ọjọọ mmadụ gwara ibe ya nwere ike ịbụ na onye ahụ echeghị echiche kwuo ya ma ọ bụ n’ihi ihe ya na onye ahụ na-alụ, ọ bụghị na onye ahụ bu ihe ọjọọ n’obi.

“Yirinụ obi ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi, dị ka uwe.”Ndị Kọlọsi 3:12.

3. JIDE ONWE GỊ MGBE A KPASURU GỊ IWE.

Ọ bụrụ na iwe ji gị, i nwere ike ịgwa di gị ma ọ bụ nwunye gị na ị na-abịa, gị apụọ ka obi dajụọ gị. I nweziri ike ịbanye n’ime ụlọ ma ọ bụ gị aga jegharịa n’èzí. Ihe ị ga-eji pụọ abụghị ka ị gbaara nsogbu ọsọ ma ọ bụkwanụ ka ị ghara ịtụpụrụ ya ọnụ. Kama, oge ahụ bụ oge i nwere ike ịrịọ Chineke ka o nyere gị aka ka ị na-enwere di gị ma ọ bụ nwunye gị ndidi ma ghọta ya nke ọma.

“Tupu esemokwu amalite, si n’ebe ahụ pụọ.”Ilu 17:14.

4. CHEBARA IHE Ị CHỌRỌ IKWU ECHICHE.

Udo agaghị adị ma ị nọrọ na-echepụta okwu ị ga-asa di gị ma ọ bụ nwunye gị ka ọ fụọ ya ụfụ. Kama, na-agwa ya okwu ga-eme ka obi jụrụ ya. Kama ị gwawa ya otú obi kwesịrị ịdị ya, rịọ ya ka ọ kọọrọ gị otú obi dị ya. Ọ kọchaa, kelee ya maka otú o si mee ka ị matakwuo obi ya.

“Onye na-ekwu okwu n’echeghị echiche dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ, ma ire ndị maara ihe na-agwọ ọrịa.”Ilu 12:18.

5. EJILA OLU IKE AGWA YA OKWU.

Àgwà di ma ọ bụ nwunye kpara nwere ike ime ka iwe bịa di ya ma ọ bụ nwunye ya. Ọ bụrụgodị na ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị mere na-afụ gị ka ose, ekwela ka olu gị lawa elu ma ọ bụ gị akpọwa ya iyi. Agwakwala ya okwu ndị dị ka “Ị chọghị ịma ihe ọ bụla gbasara m” ma ọ bụ “Ị naghị ekwe ege m ntị.” Kama, wetuo obi gwa di gị ma ọ bụ nwunye gị otú àgwà ụfọdụ ọ na-akpa si ewute gị. Di na nwunye ekwesịghị ikwe ka esemokwu mee ka ha kwawa ibe ha aka, mawa ibe ha ụra ma ọ bụkwanụ lụwa ọgụ. Ha ekwesịghịkwa ịna-agwa ibe ha okwu ọjọọ.

“Wepụnụ obi ilu niile na iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị, tinyere ihe ọjọọ niile, n’etiti unu.”Ndị Efesọs 4:31.

6. RỊỌ MGBAGHARA, KWUOKWA IHE Ị GA-EME KA IHE DỊ MMA.

Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị see okwu, ekwela ka iwe mee ka gị na ya ghara ikpezi. Ọ bụrụ na gị na mmadụ alụọ ọgụ, ahụ́ agaghị afọ unu abụọ. Ma ọ bụrụ na unu abụọ ekpezie, obi ga-adị unu ụtọ. N’ihi ya, rịọ di gị ma ọ bụ nwunye gị mgbaghara maka ebe i mejọrọ. Ọ bụrụgodị na ị ma na ikpe amaghị gị, rịọ ya mgbaghara maka otú i si wesa ya iwe, saa ya okwu, ma ọ bụkwanụ maka ihe ọzọ i mere kpasuru ya iwe. Di na nwunye ime udo dị mkpa karịa onye nke ọ bụla n’ime ha ịdị mpako ma ọ bụ ịnọ na-azọ onye ikpe mara. Gbaghara di gị ma ọ bụ nwunye gị ozugbo ma ọ rịọ gị mgbaghara.

“Gaa daa n’ala, rịọsiekwa mmadụ ibe gị arịrịọ ike.”Ilu 6:3.

Unu dozichaa esemokwu unu, gịnị ka unu nwere ike ime ka udo nọgide na-adị n’ezinụlọ unu? Gụọ isiokwu na-esonụ ka ị mata ihe ndị ga-enyere unu aka ime ya.