Ilu 26:1-28
26 Otú ahụ snoo na-ekwesịghị ịda n’oge okpomọkụ, nakwa otú ahụ mmiri na-ekwesịghị izo n’oge a na-ewe ihe ubi,Ka a na-ekwesịghị ịkwanyere onye nzuzu ùgwù.+
2 A naghị abụ mmadụ ọnụ ma ọ bụrụ na e nweghị ezigbo ihe kpatara ya,*Otú ahụ nnụnụ na elekentịọba na-anaghị efeli ma ọ bụrụ na e nweghị ihe kpatara ya.
3 E mere apịpịa maka ịnyịnya, mee ihe e ji achịkwa anụ maka jakị,+Ma e mere ụtarị maka azụ ndị nzuzu.+
4 Azala onye nzuzu okwu otú o si gwa gị okwu,Ka ị ghara ịbụ onye nzuzu otú ọ bụ.*
5 Zaa onye nzuzu okwu otú o si gwa gị okwu,Ka ọ ghara iche na ya ma ihe.+
6 Onye na-enyefe onye nzuzu ihe n’akaDị ka onye na-egbupụ onwe ya ụkwụ ma na-emerụ onwe ya ahụ́.
7 Otú ahụ onye na-ete ụkwụ na-enweghị ike ịga ije nke ọmaKa onye nzuzu na-enweghị ike ịtụ ezigbo ilu.+
8 Ito onye nzuzuDị ka mmadụ ikenye okwute n’èbè.*+
9 Ilu onye nzuzu na-atụDị ka ahịhịa ogwu onye aṅụrụma ji n’aka.
10 Onye na-ego onye nzuzu ma ọ bụkwanụ ndị na-agafe agafe ọrụDị ka onye na-agba ụta nke ji ụta ya na-agba ihe ọ bụla ọ hụrụ.*
11 Onye nzuzu nke na-emeghachi iberiibe o meburuDị ka nkịta nke na-alaghachi n’agbọ ọ gbọrọ.+
12 Ụfọdụ ndị chere na ha ma ihe.+
Ma ọ dị mfe inyere onye nzuzu aka karịa inyere ụdị ndị ahụ aka.
13 Onye umengwụ na-asị: “Ọdụm nọ n’ụzọ!
Ọdụm nọ n’ámá obodo!”+
14 Otú ọnụ ụzọ si emeghe ma na-emechiKa onye umengwụ si atụgharị n’àkwà* ya.+
15 Onye umengwụ na-amanye aka n’efere nri,Ma ike iwere nri tinye n’ọnụ ya anaghị adị ya.+
16 Onye umengwụ na-eche na ya ma iheKarịa mmadụ asaa ndị na-aza ihe bara uru.
17 Ọ bụrụ na mmadụ na-agafe agafe wee malite iwe oké iwe maka esemokwu na-agbasaghị ya,O yiri onye jidesiri nkịta aka ná ntị ike.+
18 Onye ara na-agbapụ akụ́ ụta na-ere ọkụ nakwa akụ́ nke na-atụgbu mmadụ.
19 Ọ bụ otú ahụ ka onye ghọrọ onye agbata obi ya aghụghọ, ma sị ya na ọ bụ egwuregwu, dị.+
20 Ọ bụrụ na nkụ adịghị, ọkụ na-anyụ.
Ọ bụrụkwa na e nweghị onye na-ekwutọ mmadụ, esemokwu na-akwụsị.+
21 Otú ahụ icheku ọkụ na-eme ka ọkụ na-eke, nkụ ana-emekwa ka ọkụ na-enwu,Ka onye okwu na ụka na-eme ka esemokwu malite.+
22 Okwu onye na-ekwutọ mmadụ dị ka nri na-atọ ụtọ.
A na-elo ya ngwa ngwa, ya abanye n’afọ.+
23 Okwu ọma onye obi ọjọọ na-ekwuDị ka ọlaọcha a gbazere agbaze nke e ji machie mpekere ite ụrọ.+
24 Onye kpọrọ ndị ọzọ asị na-ekwu okwu ọma iji mee ka a ghara ịmata ihe dị ya n’obi,Ma ihe juru ya obi bụ aghụghọ ọ ga-aghọ.
25 N’agbanyeghị na ọ na-ekwu okwu ọma, atụkwasịla ya obi,N’ihi na ihe asaa jọgburu onwe ha dị ya n’obi.*
26 N’agbanyeghị na o ji aghụghọ na-eme ka a ghara ịma na ọ kpọrọ ndị ọzọ asị,A ga-eme ka ndị mmadụ mata ihe ọjọọ ọ na-eme.
27 Onye na-egwu olulu ga-adaba na ya.
Onye na-akwapụ nkume, nkume ahụ ga-alaghachi dakwasị ya.+
28 Onye ụgha na-akpọ onye ụgha ọ ghara kpataara nsogbu asị,Onye na-eto mmadụ otuto elu ọnụ na-alakwa mmadụ n’iyi.+

