Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE BAỊBỤL KWURU

Ọrụ

Ọrụ

O teela e dere Baịbụl. Ma, oge ihe ndị e kwuru na ya anaghị agafe agafe. Ihe ndị o kwuru gbasara ọrụ ka bara uru taa otú ha bara n’oge e dere ha.

Gịnị ka anyị kwesịrị ịghọta gbasara ọrụ?

IHE ỤFỌDỤ NDỊ NA-EKWU

Ụfọdụ ndị na-ekwu na ebe ọ bụ na ọrụ dị ụkọ, ọrụ mmadụ kwesịrị ịdị ya mkpa karịa ihe ọ bụla ọzọ. N’ihi ya, ọtụtụ ndị na-ewere ndụ ha niile tinye n’ọrụ ha nke na ha anaghịzi elebara ma onwe ha ma ezinụlọ ha anya.

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl kwuru otú mmadụ kwesịrị isi na-arụ ọrụ. O kwuru na anyị kwesịrị ịna-arụsi ọrụ ike nakwa na anyị ekwesịghị ịdị umengwụ. (Ilu 6:6-11; 13:4) Ma, ihe a Baịbụl kwuru apụtaghị na mmadụ kwesịrị ịna-arụgbu onwe ya n’ọrụ. Kama, o kwuru na ihe mmadụ kwesịrị ime bụ ya rụtụ ọrụ, ya atụrụtụ ndụ. Ekliziastis 4:6 kwuru, sị: “Obere ezumike dị mma karịa ịrụsi ọrụ ike gabiga ókè na ịchụso ifufe.” N’ihi ya, ọrụ ekwesịghị ime ka anyị ghara ịna-elebara ezinụlọ anyị anya, ma ọ bụkwanụ ka anyị ghara ịna-elezi onwe anyị anya. O nweghị uru dị́ na mmadụ ịrụgbu onwe ya n’ọrụ.

“Ọ dịghị ihe dịịrị mmadụ mma karịa iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, meekwa ka mkpụrụ obi ya hụ ihe ọma n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya.”Ekliziastis 2:24.

Mmadụ ò kwesịrị ịrụ ụdị ọrụ ọ bụla?

IHE ỤFỌDỤ NDỊ NA-EKWU

Ụfọdụ ndị na-ekwu na ọrụ ọ bụla na-enye ezigbo ego dị mma. Ụdị echiche a nakwa agụụ inwe nnukwu ego emeela ka ndị mmadụ ghara ịna-akwụwa aka ọtọ. O meekwala ka ndị mmadụ na-arụ ọrụ megidere iwu obodo.

Ụfọdụ ndị anaghị ekwe arụ ọrụ ọ bụla ọzọ ma ọ́ bụghị nke dị ha n’obi. Ọ bụrụ na ọrụ ha ji n’aka abụghị ụdị ọrụ ha chọrọ ma ọ bụkwanụ na ọ masịchaghị ha, ike ya na-agwụ ha. Ihe a ga-emezi ka ọrụ ha na-ewe ha iwe, ha agaghịkwa na-arụsi ọrụ ike. Ọ bụrụkwa na ha enweta ọrụ ọzọ dị mma, ha nwere ike jụ ịrụ ya n’ihi na ha na-eche na ha akarịala ịrụ ụdị ọrụ ahụ.

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl kwuru na anyị ekwesịghị ịrụ ọrụ ọ bụla ga-eme ka anyị ghara ịna-akwụwa aka ọtọ ma ọ bụ nke nwere ike imerụ mmadụ ahụ́. (Levitikọs 19:11, 13; Ndị Rom 13:10) Ọrụ dị́ mma kwesịrị ịbara ndị ọzọ uru, meekwa ka onye na-arụ ya ‘nwee ezi akọ na uche.’—1 Pita 3:16.

Baịbụl kwukwara na ihe mere mmadụ ji arụ ọrụ abụghị ka o jiri ihe ọ kpatara na-eme ọnụ, kama ọ bụ ka o nwee ike ịna-egbo mkpa ya ma na-elekọta ezinụlọ ya. Ọ bụghị ihe ọjọọ ma ọrụ mmadụ na-atọ ya ụtọ, ma o kwesịghị ikwe ka ọ bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ ya.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Alannah kwuru, sị: “Anyị bụ Ndịàmà Jehova. N’ọmụmụ ihe anyị, papa m nwere ọtụtụ ọrụ ọ na-arụ. A bịa n’ọrụ o ji akpa afọ anyị, ọ na-agbakwa ezigbo mbọ. N’agbanyeghị na ọ na-eme ihe ndị o kwesịrị ime, ọ na-ewepụta oge ka anyị na ya na-anọrị. O nweghị mgbe ihe ọ ga-eme na-akọ ya n’aka, ma ọ na-eme nke ọ bụla mgbe o kwesịrị ime ya.”

Nke bụ́ eziokwu bụ na otú ihe dị iche iche si adazi ọnụ na-eme ka anyị na-echegbu onwe anyị gbasara otú anyị ga-esi azụtali ihe ndị dị anyị mkpa. Ma, Baịbụl kwuru na anyị ekwesịghị iji maka ya na-arụgbu onwe anyị n’ọrụ. O kwuru, sị: “Ebe anyị nwere ihe oriri na uwe, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a.” (1 Timoti 6:8) Ihe a Baịbụl kwuru apụtaghị na anyị ga na-ata ndụ anyị ahụhụ. Kama, ihe ọ pụtara bụ na anyị chọwa ime ihe ọ bụla, anyị kwesịrị ime ihe aka anyị ruru. Ọ bụghịkwa ihe ọ bụla anyị hụrụ anyị azụrụ.—Luk 12:15.

IHE I KWESỊRỊ IME

Na-arụsi ọrụ ike. Eledakwala ọrụ ọ bụla ị na-arụ anya. Ọ bụrụgodị na ọrụ ahụ bụ ọrụ ndị mmadụ na-ejighị kpọrọ ihe ma ọ bụkwanụ na ọ bụghị ụdị ọrụ obi gị dị na ya kemgbe ụwa, gbalịa ka aka sie gị ike na ya. Ọ bụrụ na ị na-arụsi ọrụ ike, obi ga na-adị gị mma. Ọ bụrụkwa na aka esie gị ike n’ọrụ ahụ, ọ ga na-atọ gị ụtọ.

Ma, i kwesịghị ịna-arụ ọrụ mgbe niile. Ị rụtụ ọrụ, gị ewepụta ohere zuo ike. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na mmadụ ezuru ike mgbe ọ rụrụla ọrụ ya nke ọma, ọ na-atọ ezigbo ụtọ. Ọ bụrụ na anyị ana-arụsi ọrụ ike ma na-egbo mkpa anyị, obi ga-esi anyị ike na o nwere uru anyị bara, ndị ezinụlọ anyị nakwa ndị ọzọ ga na-akwanyere anyị ùgwù.—2 Ndị Tesalonaịka 3:12.

“Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla, sị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-eyi?’ . . . N’ihi na Nna unu nke eluigwe maara na ihe a niile dị unu mkpa.”Matiu 6:31, 32.