Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU TETA! A | NDỤ GỊ Ọ̀ DỊ OTÚ Ị CHỌRỌ KA Ọ DỊRỊ?

Ihe Mere O Ji Ara Ahụ́: Ihe Mmadụ Ji n’Aka Dị Ọtụtụ

Ihe Mere O Ji Ara Ahụ́: Ihe Mmadụ Ji n’Aka Dị Ọtụtụ

KA E WERE ya na ihe ndị ị na-eme karịrị akarị. Ụmụ gị chọrọ ka i meere ha nke a, meere ha nke ọzọ, ọga gị nwere ọrụ ọ chọrọ ka ị rụọrọ ya, di gị ma ọ bụ nwunye gị nwekwara ihe ọ chọrọ ka i meere ya. N’elu ihe a niile, ị na-elekọtakwa papa gị ma ọ bụ mama gị ahụ́ na-adịghị. Otú a ndụ gị si aga abụghị otú ị tụrụ anya ya. Otú ihe si dịrị gị ugbu a na-erikwa gị nri n’ahụ́. I nwere ike ịna-agwa onwe gị na o nweghị ihe ị ma ị ga-eme gbasara ya n’ihi na ị dị ndị mmadụ mkpa. Nke bụ́ eziokwu bụ na ime ihe ọ bụla ndị mmadụ chọrọ gị n’aka nwere ike ọ gaghị abachara ma gị ma ndị ahụ ị na-emere ya uru. Gịnị ka i nwere ike ime ma ihe dịrị gị otú a?

IHE ANYỊ GA-AMỤTA N’AKA MOZIS

E nwere oge ọ bụ naanị Mozis bụ onyeikpe n’Izrel. N’oge ahụ, Mozis nwere ike ịna-eche na ya na-eme ihe ya kwesịrị ime. Ma, ọgọ ya nwoke gwara ya, sị: “Otú a ị na-eme adịghị mma. N’ezie, ike ga-agwụ gị.” Ọ tụụrụ Mozis aro ka ọ họta ụmụ nwoke ụfọdụ ruru eru ka ha na-enyere ya aka ekpe ikpe ụfọdụ. Ikpe ọ bụla siiri ha ike, ha eweta ya ka o kpee ya. Olee uru aro a ga-aba? Ọgọ Mozis gwara ya, sị: “Ị ga-enwe ike ịnagide ya, ndị a niile ga-alaru n’ụlọ ha n’udo.”—Ọpụpụ 18:17-23.

OTÚ DELINA SI ENYERE ONWE YA AKA

I chetaranụ na anyị kwuru na Delina na-arịa ọrịa na-akụjisi ya ahụ́, nọrọkwa n’elu ya na-elekọta ụmụnne ya atọ na-arịa ọrịa. Delina kwuru, sị: “Ihe na-enyere m aka ka m ghara ịna-adọlị oké ndọlị bụ ịna-eme ihe dịịrị m n’ụbọchị n’echegbughị onwe m gbasara echi, anaghịkwa m egbu oge ma m chọọ ime ha. Ana m akọrọ ndị ọzọ gbasara ihe mụ na ha na-alụ. O meela ka di m nakwa ndị ọzọ na-enyere m aka. Ihe ọzọ m na-eme nke na-enye m obi ụtọ bụ ilekọta okooko osisi n’ụtụtụ ọ bụla.”

“E nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla.”—Ekliziastis 3:1

IHE I NWERE IKE IME

Ọ bụrụ na ihe ndị ị na-eme karịrị akarị, i nwere ike ime ihe ndị a:

  • I nwere ike ịgwa ndị ọzọ ka ha nyere gị aka. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na gị na ụmụ gị ka bi, ha nwere ike ịna-enyere gị aka. Ọ bụrụkwa na e nwere ndị ikwu gị ma ọ bụ ndị enyi gị bi gị nso, i nwekwara ike ịkpọ ha ka ha nyere gị aka.

  • Na-agwa ndị ọzọ ihe ị chọrọ ka ha meere gị. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịgwa ọga gị ka o selatatụ aka n’ọrụ ọ na-enye gị ma ọ bụrụ na ọ na-agbaji gị aka. Ma, ọ pụtaghị na ị ga-agwa ya na ị ga-akwụsị ịrụrụ ya ọrụ ma ọ bụrụ na o kweghị. Gwa ya ihe mere ọrụ ahụ ji esiri gị ike. O nwere ike ime ihe ị rịọrọ ya.

  • Dee ihe ndị ị chọrọ ime n’izu ọ bụla n’akwụkwọ. Kpebiekwa ma ò nwere ndị nke ị ga-enye ndị ọzọ ka ha nyere gị aka rụọ.

  • Ọ bụghị ebe ọ bụla a kụrụ ékwé gị agbara gawa. Ọ bụrụ na mmadụ akpọọ gị ka ị bịa ememme, ya abụrụkwa na ahụ́ agaghị ekwecha gị ma ọ bụkwanụ na i nweghị ohere, gwa ya na ị gaghị abịali.

Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị ihe niile ị chọrọ ime ka ị ga-emeli.