Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe I Kwesịrị Ịma Gbasara Ịba

Ihe I Kwesịrị Ịma Gbasara Ịba

Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru na n’afọ 2013, ihe karịrị otu narị nde mmadụ na nde iri itoolu na nde asatọ rịara ịba, ihe dịkwa ka narị puku mmadụ ise na puku iri asatọ na puku anọ n’ime ha anwụọkwa. Ndị ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị ahụ nwụrụnụ bụ ụmụaka na-erubeghị afọ ise. Ịba na-akpa ike dị egwu n’ihe dị ka otu narị obodo n’ụwa, nke na o nwere ike igbu ihe dị ka ijeri mmadụ atọ na narị nde mmadụ abụọ.

1 OLEE OTÚ E SI AMA ONYE ỊBA JI?

Ịba jide mmadụ, ahụ́ ọkụ ga na-ere ya, oyi ga na-ama ya, ọsụsọ ana-agbakwa ya. Isi ga na-awa ya, ahụ́ ana-egbukwa ya mgbu. O nwekwara ike ịna-agbọ agbọ. Mgbe ụfọdụ, ihe ndị a nwere ike ịna-eme ha metụ, ha akwụsị. Ihe dị ka ụbọchị abụọ ma ọ bụ atọ gafee, ha amalitekwa. Ọ bụ ụdị ịba ji onye ahụ ma ọ bụ ụbọchị ole ịba ahụ nọrọla ya n’ahụ́ nwere ike ime ka ọ na-eme ya otú ahụ.

2 GỊNỊ NA-AKPATA ỊBA?

  1. O nwere ụdị anwụnta na-atanye mmadụ nje na-akpata ịba n’ahụ́.

  2. Nje ndị ahụ ga-agazi n’imeju onye ahụ nọrọ mụbawa.

  3. Ha ga-esi ebe ahụ gawa n’ọbara onye ahụ, nọrọkwa ebe ahụ na-amụba.

  4. Ha ga-ejizi nwayọọ nwayọọ banye n’ọbara niile dị onye ahụ n’ahụ́.

  5. Ọ bụ otú a ka nje ndị ahụ ga-esi jezuo onye ahụ ahụ́. Mgbe ahụ nje ndị ahụ na-amụba ka ihe ndị na-egosi na ịba ji onye ahụ ga na-eme ya.

3 GỊNỊ GA-ENYERE GỊ AKA IGBOCHI ỊBA?

Ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na i bi n’ebe ndị mmadụ na-arịakarị ịba:

  • Zụta net anwụnta. O kwesịrị ịbụ

    • nke ndị rụrụ ya gbara ọgwụ anwụnta.

    • nke na-adọkaghị adọka.

    • nke ga-ekpuchi ebe mmadụ dina.

  • Na-agba ọgwụ anwụnta n’ụlọ gị.

  • I nwere ike ịrụnye net n’ọnụ ụzọ gị nakwa na windo gị. I nwekwara ike ịgbanye fan ma ọ bụ ntụoyi n’ihi na ha agaghị ekwe anwụnta besa ebe ọ bụla.

  • Na-eyi ákwà ga-ekpuchi ahụ́ gị nke ọma.

  • Ebila ọhịa nso, ekwekwala ka mmiri dọrọ otu ebe n’akụkụ ụlọ gị n’ihi na ha abụọ na-amụ anwụnta.

  • Ọ bụrụ na ịba abịa gị, gwọọ ya ozugbo.

Ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị chọrọ ịga ebe ndị mmadụ na-arịakarị ịba:

  • Jụọ ase tupu gị agawa. Ụdị nje na-akpata ịba n’otu ebe nwere ike ịdị iche na nke na-akpata ya n’ebe ọzọ. Ihe a nwere ike ime ka mmadụ nweta ọgwụ ga-aka arụ ọrụ n’ebe ahụ ọ na-aga. Ọ ga-adịkwa mma ka ị hụ dọkịta ka ọ gwa gị ihe ụfọdụ gbasara ahụ́ gị ị ga-akpachapụrụ anya tupu gị agawa.

  • I ruo ebe ahụ, mee ihe ndị e kwuru n’isiokwu a gbasara ihe ndị bi n’ebe ndị mmadụ na-arịakarị ịba kwesịrị ịna-eme.

  • Ọ bụrụ na ịba abịa gị, gaa ụlọ ọgwụ n’egbughị oge. Buru n’obi na mgbe ị ga-amalite hụwa ihe ndị na-egosi na ị na-arịa ịba nwere ike ịbụ n’agbata otu izu na otu ọnwa.