Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú E Si Erite Uru n’Akwụkwọ Akụkọ

Otú E Si Erite Uru n’Akwụkwọ Akụkọ

Otú E Si Erite Uru n’Akwụkwọ Akụkọ

“Onye na-agụtụbeghị akwụkwọ akụkọ dara iberibe; onye na-ekwere n’ihe ọ gụrụ nanị n’ihi na ọ gụtara ya n’akwụkwọ akụkọ kadị daa iberibe.” —August von Schlözer, onye Germany na-akọ akụkọ ihe mere eme, bụrụkwa onye nta akụkọ ná ngwụsị narị afọ nke 18.

N’OTU nnyocha e mere, a jụrụ ọtụtụ puku mmadụ nọ na Britain nakwa na France ka ha kwuo otú ha tụkwasịruru nke ọ bụla n’ime ụlọ ọrụ 13 ndị bụ́ isi e nwere ná mba ndị ahụ obi. Ụlọ ọrụ mgbasa ozi ka ha gụrụ dị ka nke ikpeazụ ha na-atụkwasịtụghị obi. Ha gụrụ ọbụna ọchịchị na achụmnta ego dị ka ihe ndị ha tụkwasịrị obi karịa ya. Na United States, ihe ka ọtụtụ ná ndị na-agụ akwụkwọ akụkọ ka na-ekwu na ha na-ekwere n’ihe ha na-agụta. Ma, nnyocha ụlọ ọrụ Pew Research Center mere gosiri na ọnụ ọgụgụ ndị na-ekwere n’ihe a na-ede n’akwụkwọ akụkọ ebelatala.

A na-enwekarị ihe na-eme ka e nyowe ihe e dere n’akwụkwọ akụkọ enyo, nke ka nke ma ọ bụrụ na ihe ahụ e dere metụtara ọdịmma nke mba a nọ na ya ebipụta akwụkwọ akụkọ ahụ. Gịnị na-eme ma ọ dị otú a? A na-ekpukarị eziokwu ihu n’ala. Arthur Ponsonby, bụ́ onye England ọnụ ruru n’okwu na narị afọ nke 20, kwuru n’otu oge, sị: “Agha daa, Eziokwu bụ ihe mbụ a na-egbu.”

Ọbụna mgbe agha na-adabeghị, ọ bụ ihe amamihe dị na ya inyocha akụkọ a na-ede nke ọma. Otu ilu Bible na-ekwu, sị: “Onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla: ma onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya.” (Ilu 14:15) Ọ bụrụ na ị kpachara anya nke ọma, akwụkwọ akụkọ pụrụ nnọọ imejụ ọchịchọ ị na-enwe ịnụrụ akụkọ ndị dị gị mkpa.

Mkpa Akụkọ Ụwa Dị

Usoro mgbasa ozi dị mkpa taa n’ihi na ọ na-enyere anyị aka ịma ihe na-aga n’ụwa. Ọ dịkwa mkpa ịma ihe na-aga n’ụwa. N’ihi gịnị? N’ihi na onye amụma kasị ukwuu nke dịworo ndụ, bụ́ Jizọs Kraịst, buru ihe ka ọtụtụ n’ihe ndị na-eme taa n’amụma. Mgbe a jụrụ ya banyere ọgwụgwụ nke usoro ihe a, o kwuru na a ga-eji agha, ịba ụba nke mmebi iwu, ụkọ nri, ọrịa na-efe efe, ala ọma jijiji, na ihe ndị ọzọ yiri ha, mara mgbe ọgwụgwụ.—Matiu 24:3-14; Luk 21:7-11.

Bible kwukwara, sị: “N’ụbọchị ikpeazụ, oge pụrụ iche nke siri ike obibi gaje ịdị.” Amụma ahụ kwukwara na n’ime ‘ụbọchị ikpeazụ’ a, ndị mmadụ ga-abụ “ndị hụrụ onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya,” na “ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi.” Ha ga-abụ ndị “na-enweghị obi mmadụ” na “ndị na-enweghị njide onwe onye, ndị na-eme ihe ike ike, ndị na-enweghị ịhụnanya maka ezi ihe, ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu, ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya.”—2 Timoti 3:1-5.

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị na-ahụ ka amụma Bible a na-emezu n’ebe i bi. Ihe ndị na-eme n’ụwa nile—dị ka a na-akọ ha n’akwụkwọ akụkọ—na-agbakwa nnọọ akaebe na amụma Bible na-emezu. Nke a ọ̀ pụtara na anyị pụrụ ikwere ihe nile anyị na-agụta n’akwụkwọ akụkọ? Mbanụ. Ọbụna ndị tinyere onwe ha n’ọrụ ide akwụkwọ akụkọ na-ekwu na ọ dị mkpa ịkpachara anya.

Ghọta Ihe Ịma Aka Ndị A Na-enwe na Ya

Onye ọ bụla na-emehie ihe, ọbụna ndị ọkachamara kasị eme ihe n’eziokwu ma mara nke a na-akọ. Otu nwanyị aha ya bụ Ariel Hart dere n’akwụkwọ bụ́ Columbia Journalism Review, sị: “N’ime afọ atọ m rụrụ ọrụ dị ka ọga onwe ya nke ọrụ ya bụ ịchọpụta ma akụkọ e dere ò mere eme, enyochatụbeghị m akụkọ, ya abụrụ na ọ dịghị ihe e dehiere na ya, ọ sọkwa ya ya bụrụ akụkọ dị peeji ise ma ọ bụ paragraf abụọ.” O nyere ihe atụ ndị dị ka “ide afọ na-abụghị afọ ihe mere; ide ọnụ ọgụgụ na-abụghị ya; asụpetaghị ihe; ide ihe a kọsarala bụ́ nke e si ebe ọzọ nweta, ma ya abụrụ ihe na-emeghị eme.”

Ndị nta akụkọ aghaghị ịnọ na nche megide akụkọ ndị a na-atụkwasịghị ebe ha si obi. Mgbe ụfọdụ, a na-enye ndị nta akụkọ akụkọ na-abụghị eziokwu, ka ha bipụta. N’afọ 1999, otu onye aghụghọ wepụtara otu akụkọ ụgha banyere “otu ogige ntụrụndụ nke ga-adị ka ebe a na-eli ozu.” O mere ka e kwere na ọ bụ eziokwu site n’idebe ya n’ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet, nke o ji aha ụlọ ọrụ na-adịghị adị mepee. O nyekwara nọmba fon nke ndị a pụrụ ịjụ maka ya, bụ́ nke onye aghụghọ ahụ na-aza dị ka à ga-asị na ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere ụlọ ọrụ ahụ. Ngalaba ụlọ ọrụ Associated Press nke na-eji ígwè satellite ezigara ụlọ ọrụ mgbasa ozi akụkọ achọpụtalighị aghụghọ ahụ. Nke a mekwara ka akụkọ ahụ gbaa n’ọtụtụ akwụkwọ akụkọ ndị a na-ebipụta kwa ụbọchị na United States. A na-ekwu na isi ihe mere ụdị ndị aghụghọ a ji enweta ndị nta akụkọ bụ na akụkọ ha na-ewetara ha na-abụ “akụkọ dị ụtọ, nke nwere ọtụtụ ọmarịcha ihe osise ndị ga-eme ka o yie ihe na-agaghị ekwe omume ma, n’otu mgbe ahụ, bụrụ ihe a pụrụ ikwere na ya.”

Ọbụna ndị nta akụkọ chọrọ ịkọ kpọmkwem otú ihe si mee abụghị mgbe nile ka ha na-aghọtacha akụkọ ndị ha na-ede. Otu onye edemede nọ na Poland kwuru, sị: “Ndị nta akụkọ na-arụkarị ọrụ ha ọkụ okụ. Ụlọ ọrụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ na-amarịta aka. Nke ọ bụla n’ime ha na-achọ ịbụ onye mbụ ga-ebipụta akụkọ. N’ihi ya, n’agbanyeghị na ọtụtụ n’ime anyị na-achọ ide akụkọ e nyochara nke ọma, anyị adịghị enwe ike ime ya.”

Nrụgide A Na-enwe Ime Ihe Ndị Ọzọ Na-eme

Akwụkwọ bụ́ Freedom of the Press 2003—A Global Survey of Media Independence depụtara mba 115 n’ime mba 193 dị ka ebe ndị nta akụkọ nwetụụrụ onwe ha ma ọ bụ na-enweghịrị onwe ha ide ihe ha chọrọ ide. Otú ọ dị, ọbụna ná mba ndị nta akụkọ nweere onwe ha ide ihe ọ bụla, a pụrụ iji aghụghọ mee ka ha ghara ide ihe otú ha si chọọ ya.

Mgbe ụfọdụ, a dịghị nnọọ ekwe ka ụfọdụ ndị nta akụkọ nweta ihe ọmụma dị mkpa, ebe a na-ekwe ka ndị nke ọzọ, bụ́ ndị na-ekwe eme otú e kwuru, gbaa ndị a ma ama ajụjụ ọnụ, a na-akpọkwa ha ka ha soro ndị ọchịchị gaa njem. Ego a na-enweta n’aka ndị a na-akpọsara ngwá ahịa pụkwara imetụta ihe a na-ede. Otu onye nta akụkọ nọ na Poland kwuru, sị: “Ndị a na-akpọsara ngwá ahịa pụrụ iyi egwu ịnapụ ụlọ ọrụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ ọrụ ịkpọsara ha ngwá ahịa ma ọ bụrụ na ha edee akụkọ ọjọọ ọ bụla banyere ha. Ngwá ahịa a ụlọ ọrụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ na-akpọsa pụrụ ịbụ ihe na-enye ha ezigbo ego.” Otu onye na-achịkọta akwụkwọ akụkọ na Japan dọkwara aka ná ntị, sị, “Buru n’obi na o sigburu onwe ya n’ike ide akụkọ kpọmkwem otú o si mee.”

Ị pụrụ ịjụ, sị: ‘Ọ bụrụ na ndị nta akụkọ bụ́ ọkachamara na-enwe ụdị nsogbu a n’ide akụkọ a pụrụ ịtụkwasị obi, olee otú onye na-agụ ya ga-esi ama nke ọ ga-ekwere?’

Ọ Dị Mkpa Inwe Echiche Ziri Ezi

O doro anya na ọ dị mkpa iji nghọta mee ihe. “Ntị, ọ́ dịghị anwa okwu? Okpo ọnụ kwa, ọ́ dịghị edetụrụ onwe ya ihe oriri ya?” ka nna ochie ahụ bụ́ Job jụrụ. (Job 12:11) Ọ dị onye na-agụ akwụkwọ akụkọ mkpa inyocha ihe e dere nke ọma iji chọpụta ma ọ̀ na-ada ka eziokwu. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ọ na-eji amamihe detụ ya ire ma họrọ nke bụ́ eziokwu. Otu onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst na narị afọ mbụ dere ihe dị mma banyere ndị gere Pọl onyeozi ntị ma mesịa nyochaa ebe ihe Pọl kwuru si iji mara ma ihe ọ kụziiri ha ọ̀ bụkwa eziokwu.—Ọrụ 17:11; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:21.

N’ụzọ yiri nke ahụ, onye na-agụ akwụkwọ akụkọ pụrụ ịjụ onwe ya ajụjụ ndị dị ka: Olee otú amamihe onye dere akụkọ a haruru? Olee ndị ma ọ bụ ihe ndị ọ na-ele anya ọjọọ? Akụkọ ahụ ọ̀ kọrọ ihe ndị bụ́ eziokwu nke ndị ọzọ pụrụ ịga chọpụta n’onwe ha? Olee ndị ọ pụrụ ịmasị ka e tinye nnu na ose n’akụkọ ahụ? Ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe dị na ya ka onye na-agụ ya nyochaa ihe ndị ọzọ iji chọpụta ma ihe a kọrọ n’akụkọ ahụ ọ̀ bụ eziokwu. Ọ pụkwara iso ndị ọzọ kwurịta ihe ọ gụtara. “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe,” ka otu ilu Bible kwuru.—Ilu 13:20.

N’otu mgbe ahụ, atụla anya na ihe nile ga-ezu okè. Dị ka anyị hụrụla, e nwere ọtụtụ ihe na-eme ka akwụkwọ akụkọ ghara ide ihe nile otú ha si mee. Ma, ha pụrụ inyere gị aka ịma ihe na-aga n’ụwa. Ọ dị mkpa ịma ihe na-aga, n’ihi na mgbe Jizọs na-ekwu banyere oge a anyị bi na ya, ọ gbara ume, sị: “Nọgidenụ na-amụ anya.” (Mak 13:33) Akwụkwọ akụkọ ị na-agụ pụrụ inyere gị aka ime otú ahụ. N’otu mgbe ahụ, i kwesịkwara iburu n’uche na ihe nile e dere na ya ezughị okè.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 18]

MGBE ỤLỌ ỌRỤ MGBASA OZI KỌRỌ IHE NA-ABỤGHỊ EZIOKWU

Ihe mere akwụkwọ akụkọ ji ebu akụkọ na-abụghị eziokwu na-abụkarị n’ihi odide e dere ya ọkụ ọkụ ma ọ bụ n’ihi aghọtachaghị otú ihe si mee. N’agbanyeghị nke ahụ, akụkọ ndị ahụ e ji obi ọcha dee pụrụ ime ka ụgha chara acha ruo onye ọ bụla ntị ngwa ngwa. N’aka nke ọzọ, a na-akpachapụ anya mgbe ụfọdụ ede ihe na-abụghị eziokwu n’akwụkwọ akụkọ, dị ka e mere na Nazi Germany, bụ́ mgbe a ghara ụgha megide ndị si n’agbụrụ nakwa n’okpukpe ụfọdụ.

Tụlee banyere mmetụta otu nkata aghụghọ a kpara n’oge na-adịbeghị anya n’oge a na-ekpe otu ikpe metụtara ihe ndị ruuru mmadụ n’ụlọikpe dị na Moscow, Russia, nwere. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Globe and Mail nke a na-ebipụta na Toronto, Canada, kwuru, sị: “Mgbe ụmụ agbọghọ atọ gburu onwe ha na Moscow, ihe ụlọ ọrụ mgbasa ozi ndị dị na Russia kwuru ozugbo ahụ nyere echiche na ndị ahụ gburu onwe ha bụ Ndịàmà Jehova bú okpukpe ha n’isi.”

A kọrọ akụkọ a na February 9, 1999, bụ́ ụbọchị ụlọikpe obodo maliteghachiri ikpe a na-ekpe iji machibido Ndịàmà Jehova iwu n’obodo Moscow. Geoffrey York, bụ́ onye nọ na Moscow achụrụ ụlọ ọrụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ ahụ nta akụkọ, kọrọ, sị: “Ndị uwe ojii mesịrị kweta na ọ dịghị ihe jikọrọ ụmụ agbọghọ ahụ na òtù okpukpe ahụ. Ma tupu mgbe ahụ, otu ụlọ ọrụ telivishọn dị na Moscow amalitelarị ịkatọ òtù okpukpe ahụ, na-agwa ndị mmadụ na Ndịàmà Jehova na Adolf Hitler rụkọrọ ọrụ na Nazi Germany—n’agbanyeghị ihe àmà ndị gosiri na ndị Nazi gburu ọtụtụ puku Ndịàmà n’ogige ọnwụ dị iche iche.”

N’ihi ya, n’anya ọtụtụ n’ime ọha mmadụ ahụ nụrụ akụkọ ụgha a nakwa ndị ọ pụrụ ịbụ na ụjọ na-atụ, Ndịàmà Jehova bụ òtù nzuzo na-egbu onwe ha ma ọ bụkwanụ bụrụ ndị ha na ndị Nazi rụkọrọ ọrụ!

[Foto dị na peeji nke 15]

Jizọs Kraịst buru amụma banyere ihe ka ukwuu n’ihe ndị anyị na-ahụ a na-ede n’akwụkwọ akụkọ taa

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Ihe ndị a na-ede n’akwụkwọ akụkọ na-agba akaebe na ihe ndị e buru n’amụma na Bible na-emezu

[Ebe E Si Nweta Foto]

FAO photo/B. Imevbore

[Foto dị na peeji nke 16, 17]

A jara ndị nyochara ebe Pọl onyeozi si nweta ozizi ya mma, nke a bụkwa ihe amamihe dị na ya ime mgbe ị na-agụ akụkọ ndị a na-adịghị anụkebe