Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Imejụ Ọchịchọ A Na-enwe Ịnụrụ Akụkọ

Imejụ Ọchịchọ A Na-enwe Ịnụrụ Akụkọ

Imejụ Ọchịchọ A Na-enwe Ịnụrụ Akụkọ

“NDỊ Atens na ndị mba ọzọ nile bịara ịnọtụ nwa oge n’ebe ahụ adịghị etinye oge nzurutụ ike ha n’ihe ọzọ ma e wezụga ịkọ ma ọ bụ ige ntị n’ihe dị ọhụrụ,” ka odeakụkọ bụ́ Luk dere n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga. (Ọrụ 17:21) Otu narị afọ tupu mgbe ahụ, ka gọọmenti Rom chọpụtara oké mmasị ndị mmadụ na-enwe ịnụrụ akụkọ, ọ malitere idebe Acta Diurna, bụ́ akwụkwọ akụkọ ndị a na-ede kwa ụbọchị, n’ebe ndị a ma ama ka ọhaneze wee nwee ike ịgụ ha.

Ka ọ na-erule narị afọ nke asaa, ndị China amalitelarị ibipụta akwụkwọ akụkọ a na-akpọ Dibao (Pao), bụ́ akwụkwọ akụkọ mbụ e biri ebi n’ụwa. Na Europe, bụ́ ebe ọtụtụ mmadụ ka bụ iti n’oge ahụ, ọ bụ ndị njem akụkọ na-adị mma n’ọnụ na-akọsa banyere agha, ọdachi, mpụ, na ihe ndị ọzọ. Ka e mesịrị, a malitere ire akwụkwọ akụkọ ndị e ji aka dee ma jiri osisi a tụrụ atụ see ihe a kọrọ na ha n’ọmà ahịa nakwa n’ebe ndị a na-egosi ngwá ahịa.

Ka oge na-aga, ụlọ ahịa dị iche iche bịara na-edenye akụkọ ndị dị mkpa n’akwụkwọ ozi ndị ha na-ede banyere ụlọ ahịa ha. N’ikpeazụ, a bịara dewe ihe ndị a ná mpempe akwụkwọ ọzọ, bụ́ nke a pụrụ ikesa ekesa.

Otú Akwụkwọ Akụkọ Si Malite

Ná mmalite narị afọ nke 17, a malitere ibipụta akwụkwọ akụkọ abụọ na Germany n’esepụghị aka. Oge a malitere ibipụta Relation (nke na-akọ akụkọ ụwa), bụ́ nke a na-ebipụta na Strasbourg, bụ n’afọ 1605; oge a malitere ibipụta Avisa Relation oder Zeitung (nke na-akọ akụkọ ndụmọdụ), bụ́ nke a na-ebipụta na Wolfenbüttel, bụ n’afọ 1609. Akwụkwọ akụkọ mbụ e bipụtawara kwa ụbọchị na Europe bụ Einkommende Zeitungen (Akụkọ Banyere Ihe Ndị Ka Ga-eme Eme), bụ́ nke pụtara n’obodo Leipzig, Germany, n’afọ 1650.

Akwụkwọ akụkọ mbụ ahụ e bipụtawara kwa ụbọchị na Leipzig dị peeji anọ, ọ na-abakwa n’akpa uwe. Akụkọ ndị dị na ha anaghị adị n’usoro. Ịzụ akwụkwọ ndị a otu otu adịghị efu oké ego, ma ịtụ ọda ya maka otu afọ ga-efu onye ọrụ a na-akwụ ezigbo ego ego nile a kwụrụ ya n’otu ọnwa. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị nwere mmasị ịgụ akwụkwọ akụkọ mụbara ngwa ngwa. Ka ọ na-erule afọ 1700, akwụkwọ akụkọ ndị a na-ebipụta mgbe nile na Germany nanị bịara ruo site 50 ruo 60, ọtụtụ narị puku mmadụ gụkwara ha.

Na mbụ, ebe e si enweta ihe a na-ede na-abụ n’akwụkwọ ozi, n’akwụkwọ akụkọ ndị ọzọ, n’aka ndị na-arụ na post ọfịs bụ́ ndị na-edegharị akụkọ ozi ndị e ziteere ha, ma ọ bụkwanụ site n’asịrị ndị nta akụkọ nụrụ n’ebe ọhaneze na-anọkarị. Otú ọ dị, ka akwụkwọ akụkọ ọ bụla nọgidere na-azọ nke ga-aka ibe ya, ndị nta akụkọ bịara gbawa mbọ ịhụ na akụkọ ha na-ede na-ehikwu nne nakwa na ha na-ede ha ka ha bụrụkwuo ịgba. Ha maliteziri iwe ndị nchịkọta akụkọ ma nke a na-akọ n’ọrụ. Ebe ọ bụkwa na ihe ka ọtụtụ n’ụlọ ọrụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ enweghị ego iwe ọtụtụ ndị ga na-achụrụ ha nta akụkọ n’ọrụ, oké mmasị ndị mmadụ nwere ịnụ akụkọ bịara mee ka e nwee ụlọ ọrụ ndị na-ahụ maka akụkọ, ndị ọrụ ha bụ inweta akụkọ ma resị ha ụlọ ọrụ mgbasa ozi.

Ihe Ndị E Mepụtara Bụ́ Ndị Nyere Aka na Ya

A garaghị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ ma a sị na e mepụtaghị ihe ụfọdụ ndị dị mkpa, karịsịa ụdị ígwè obibi akwụkwọ nke Johannes Gutenberg. Ihe ndị ọzọ e mepụtara mere ka ibipụta akwụkwọ akụkọ dịrị mfe ma bụrụ ihe aka pụrụ iru. Dị ka ihe atụ, n’afọ ndị 1860, ígwè obibi akwụkwọ rotary mere ka o kwe omume iji akwụkwọ a na-achabighị achabi ebipụta akwụkwọ kama iji ndị a chabiri achabi ebipụta ya. N’oge na-adịghị anya ka e mesịrị, a bịara jiri ígwè Linotype na-ahazi peeji akwụkwọ tupu e bipụtawa ya. E mesịa, n’ọkara ikpeazụ nke narị afọ nke 20, a bịara jirizie kọmputa na-ahazi peeji akwụkwọ kama iji aka eme ya, bụ́kwa nke ka eri ego.

Ka oge na-aga, e nwetawakwuru akụkọ ngwa ngwa mgbe ọtụtụ mmadụ malitere iji teligraf mewe ihe n’afọ ndị 1840, mgbe ígwè typewriter pụtara n’afọ ndị 1870, na mgbe telifon pụtara n’ihe dị ka otu oge ahụ. N’oge na-adịbeghị anya, bụ́ nke mere n’anya ọtụtụ nde ndị nọ ndụ ugbu a, kọmputa, e-mail, na ígwè fax aghọwo ihe a ma ama n’ọrụ ide akwụkwọ akụkọ. Ụgbọ okporo ígwè, ụgbọala, na ụgbọelu anọgidewo na-eme ka ndị nta akụkọ na-erutekwu n’ebe ihe nọ mee n’egbughị oge ma nweta akụkọ ha. Ụgbọ njem ndị na-efe oké ọsọ na-ekesakwa akwụkwọ akụkọ buru ibu ugbu a karị.

Gịnị Ka A Na-ede na Ya?

Inweta akụkọ a ga-ede abụghị nsogbu n’ọtụtụ ebe n’ụwa anyị a yiri obodo nta. Dị ka ndị na-achịkọta akwụkwọ akụkọ bụ́ Frankfurter Allgemeine Zeitung si kwuo, “ihe bụ́ nsogbu bụ ịma nke a ga-ahọrọ n’ime imirikiti akụkọ ndị a na-enweta.” Ụlọ ọrụ na-ahụ maka akụkọ ụwa na-ezitere ụlọ ọrụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ na Germany imirikiti akụkọ ruru ihe dị ka puku abụọ kwa ụbọchị. Ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ na-enwetakwu akụkọ site n’aka ndị nta akụkọ, site n’akụkọ ụwa a kọrọ na redio ma ọ bụ na TV, nakwa site n’ebe ndị ọzọ.

Ụzọ abụọ n’ụzọ atọ nke akụkọ ndị a na-akọ na-abụ ịma ọkwa—ozi dị mkpa a chọrọ ka ọhaneze mara na ọkwa banyere ihe e mere atụmatụ ime, dị ka ihe ntụrụndụ, egwuregwu, na nzukọ ezumezu. Ndị nchịkọta akụkọ aghaghị ịma ụdị akụkọ na-amasị ndị na-agụ akwụkwọ akụkọ ha, bụ́ ndị pụrụ ịgụnye otú owuwe ihe ubi si gaa, ememe mgbaafọ, na ememe ndị ọzọ.

Akụkọ banyere egwuregwu, akụkọ ndị na-akpa ọchị, ihe osise ndị na-akpa ọchị banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na akụkọ ndị hiri ụdụ socha n’ihe ndị a na-ahụkarị n’akwụkwọ akụkọ. Akụkọ ndị bụ́ isi, akụkọ ndị e si mba ọzọ nweta, na ajụjụ ọnụ a gbara ndị a ma ama na ndị ọkachamara banyere ihe ụfọdụ, pụrụ ịbụ ihe na-enye ihe ọmụma na ihe na-atọ ụtọ.

Akwụkwọ Akụkọ Nọ ná Nsogbu

“Nsogbu ego ụlọ ọrụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ na Germany nọ na ya ugbu a karịrị nnọọ nke ha nọtụrụla na ya,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Die Zeit kwuru n’afọ 2002. N’afọ 2004 kwa, Òtù Na-ahụ Maka Mgbasa Ozi na Switzerland kọrọ na, n’ime afọ iri, ọ bụ n’afọ a ka ha kasị nwee njọ ahịa. Gịnị meziri oké mmasị ndị mmadụ na-enwe ịgụ akwụkwọ akụkọ?

Otu ihe kpatara ya bụ na akụ̀ na ụba ụwa na-ada ada, na-eme ka a kwụsịlata ịkpọsa ngwá ahịa, bụ́ ebe ọtụtụ ụlọ ọrụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ si nweta ụzọ abụọ n’ụzọ atọ nke ego ha kpatarala. N’agbata afọ 2000 na 2004, ego ụlọ ọrụ na-ebipụta Wall Street Journal nke United States na-enweta n’ịkpọsara ndị mmadụ ngwá ahịa, ji pasent 43 belata. Ọ bụrụ na ọnọdụ akụ̀ na ụba adị mma, à ga-amaliteghachi ịkpọsa ngwá ahịa otú e sibu akpọsa ya? Ojiji e ji Intanet akpọsa ngwá ahịa emewo ka a gharazie iji akwụkwọ akụkọ akpọsa ọtụtụ n’ime ala na ụlọ a chọrọ ire ere, ọrụ ndị dịnụ, na ụgbọala ọhụrụ ndị e mepụtara. Taa, akwụkwọ akụkọ na ụzọ ndị ọzọ e si agbasa ozi—redio, telivishọn, na Intanet—na-amarịta aka.

N’aka nke ọzọ, imerime mmadụ ka na-enwe mmasị ịnụrụ akụkọ. Axel Zerdick, bụ́ prọfesọ nke na-ahụ maka otú ụlọ ọrụ mgbasa ozi ga-esi na-erite uru ego, gwara otu ụlọ ọrụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ na Frankfurt, Germany, sị: “Nsogbu a adịrughị njọ otú ihe ka ọtụtụ ná ndị nta akụkọ chere.” Onyeisi nchịkọta akụkọ nke otu akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta kwa ụbọchị na Germany kwukwara ihe yiri nke ahụ. Ọ sịrị: “[Akwụkwọ akụkọ] a na-ede maka ndị obodo ka na-aga nnọọ ahịa.”

A sịgodị na ọ bụ eziokwu na ọ dịghị ihe ka akwụkwọ akụkọ akọru akụkọ n’isi, na ọ dịghịkwa ihe ka ya ike n’ịkpali ọhaneze ikwu echiche ha, ajụjụ ka bụkwa: Ị̀ pụrụ ikwere n’ihe ndị ha na-akọ? Olee otú ị pụrụ isi rite ezigbo uru n’akwụkwọ akụkọ ndị ị na-agụ?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 14]

NTA AKỤKỌ—ỌRỤ NA-ACHỌ IHE DỊ UKWUU N’AKA MMADỤ

Ọ bụrụ na mmadụ atụlee ihe ụfọdụ ndị nta akụkọ na-ede, ọ pụrụ ịdị ya ka ọ bụrụzie onye nta akụkọ. “Aha onye nta akụkọ ịgba n’akwụkwọ akụkọ, dị ka onye ọ bụ ya dere akụkọ ahụ, pụrụ ibu ya isi,” ka otu onye France chụwara nta akụkọ eri ogologo oge kwuru. N’agbanyeghị nke ahụ, ọrụ a pụkwara ibutere mmadụ obi mgbawa—ihe ndị dị ka onye ọzọ ibu ụzọ bipụta akụkọ onye nta akụkọ ka na-ede ede, mmadụ ịjụ ka a ghara ịgba ya ajụjụ ọnụ, na iji ọtụtụ awa na-eche otu ihe omume, e mesịa, ya abụrụ na e meghịzi ya.

Otu onye na-ede akwụkwọ akụkọ na Poland kwuru nsogbu ọzọ a na-enwe na ya. Ọ sịrị: “Anyị adịghị ama oge anyị na-agaghị arụ ọrụ ma ọ bụ oge anyị ga-anọ n’ọrụ. Mgbe ụfọdụ, anyị adịghị enwe oge ime ihe ndị dịịrị anyị, otú ọrụ si karịa anyị akarị n’aka pụkwara ime ka anyị ghara inwe oge iso ezinụlọ anyị nọkọọ.” Otu onye bụ́bu onye nta akụkọ n’ebe bụ́bu Soviet Union kwuru ihe e nwere ike iwere dị ka ihe kasị agbawa obi n’ọrụ a. O kwuru, sị: “Agbasịrị m nnọọ mbọ dee akụkọ, e mesịa, e bipụtaghị ya.”

Otu onye na-ede banyere egwuregwu n’ụlọ ọrụ kachasịnụ n’ime ụlọ ọrụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ na Netherlands kwuru, sị: “A na-agwakarị m na m amaghị nke a na-akọ. Ụfọdụ ndị na-agụ akụkọ m dere na-ewesa m iwe. N’ihi obi ọkụ ndị mmadụ na-enwe mgbe ụfọdụ ma ha na-ekiri egwuregwu, ọbụna ha eyiwo m egwu na ha ga-egbu m.” Ya mere, gịnị na-akpali ndị nta akụkọ ịnọgide n’ọrụ ha?

N’ezie, ọ pụrụ ịbụ ego ha na-enweta na ya na-akpali ụfọdụ ndị—ma ọ bụghị ha nile. Otu onye nta akụkọ nke na-arụ n’otu ụlọ ọrụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ na France kwuru banyere oké mmasị o nwere ide ihe. Otu onye nta akụkọ nọ na Mexico kwuru, sị, “Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ị na-agba mbọ mee ka ndị mmadụ nụ ihe ha kwesịrị ịnụ.” Na Japan kwa, otu onye welitere isi n’ọrụ nchịkọta akụkọ n’ụlọ ọrụ nke abụọ kasịnụ n’ụlọ ọrụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ kwa ụbọchị n’ụwa, kwuru, sị, “Ana m enwe aṅụrị mgbe ọ dị m ka m nyerela ndị mmadụ aka na mgbe e kpere ikpe ziri ezi.”

N’ezie, ọrụ ibipụta akwụkwọ akụkọ abụghị ọrụ ndị nta akụkọ nanị. Dabere n’otú ụlọ ọrụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ haruru, tupu akwụkwọ akụkọ eruo gị aka, a pụrụ inwe ndị chịkọtara akụkọ ndị ahụ, ndị gụzigharịrị ha, ndị chọpụtara ma ihe ndị e dere hà mere eme, ndị chekwara akụkọ ndị ahụ, na ọtụtụ ndị ọzọ rụsiri ọrụ ike na ya, ma ị naghị ahụ aha ha.

[Foto ndị dị na peeji nke 12]

Akwụkwọ akụkọ e bipụtara na Germany n’oge gboo na shelf ọgbara ọhụrụ a na-akpọsa akwụkwọ akụkọ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Akwụkwọ akụkọ e bipụtara na Germany n’oge gboo: Bibliothek für Kunst - und Antiquitäten-Sammler, Mpịakọta nke 21, Flugblatt und Zeitung, 1922