Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ịga nke Ọma na Ọdịda Ndị E Nwere n’Ịlụso Ọrịa Ọgụ

Ihe Ịga nke Ọma na Ọdịda Ndị E Nwere n’Ịlụso Ọrịa Ọgụ

Ihe Ịga nke Ọma na Ọdịda Ndị E Nwere n’Ịlụso Ọrịa Ọgụ

N’AUGUST 5, 1942, Dr. Alexander Fleming chọpụtara na otu n’ime ndị ọ na-agwọ, enyi ya, nọ n’ọnụ ọnwụ. Nwoke ahụ nke dị afọ 52 ebutewo ọrịa menigitis ọkpụkpụ azụ, n’agbanyeghịkwa mgbalị nile Fleming mere, enyi ya nwoke nọzi n’ọnọdụ nke amakwaghị onwe ya.

Afọ 15 bu ụzọ, Fleming chọpụtara na mberede otu ihe dị ịrịba ama nke si n’ebe ebu na-achatụ akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ mara na-apụta. Ọ kpọrọ ya penicillin. Ọ chọpụtara na o nwere ikike nke igbu nje bacteria; ma ọ pụghị iwepụta nke bụ́ penicillin kpọmkwem, o jikwa ya mee ihe nanị dị ka ihe na-egbochi ụmụ nje. Otú ọ dị, n’afọ 1938, Howard Florey na ìgwè ndị nnyocha ya nọ na Mahadum Oxford malitere ihe ịma aka nke imepụta ọgwụ ahụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ezu iji nwalee ya n’ahụ́ ụmụ mmadụ. Fleming kpọrọ Florey na fon, bụ́ onye kwuru na ya ga-ezite penicillin nile o nwere. Ọ bụ ohere ikpeazụ Fleming nwere ịzọpụta enyi ya.

Penicillin ndị ọ gbara ya n’uru ahụ́ arụghị ọrụ nke ọma, n’ihi ya Fleming gbara enyi ya nwoke ọgwụ ahụ n’ọkpụkpụ azụ kpọmkwem. Penicillin ahụ gburu nje ndị ahụ; n’ime nanị ihe karịrị otu izu, onye ahụ Fleming na-agwọ si n’ụlọ ọgwụ laa n’ahụ́ ike zuru ezu. Oge nke iji ọgwụ nje eme ihe amalitewo, e nwewokwa ọganihu ọhụrụ bụ́ ịgba n’ọgụ ụmụ mmadụ na-alụso ọrịa.

Oge nke Iji Ọgwụ Nje Eme Ihe

Mgbe mbụ ha pụtara, ọgwụ nje yiri ka hà bụ ọgwụ a ṅụsịa okwu ebie. Ọrịa ndị nje bacteria, nje fungus, ma ọ bụ nje ndị anya nkịtị na-adịghị ahụ na-akpata, bụ́ ndị na-adịbughị ekwe ngwọta, pụziri ịbụ ndị a gwọrọ n’ụzọ gara nke ọma. N’ihi ọgwụ ọhụrụ ndị ahụ, ndị ọrịa meningitis, oyi ịba n’ahụ́, na ọrịa na-efe efe nke na-akpata oké ahụ́ ọkụ na-egbu belatara nnọọ. Ọrịa ndị a na-ebute n’ụlọ ọgwụ bụ́ ndị naara egbu ndị mmadụ, bụzi ndị a gwọrọ n’ime ụbọchị ole na ole.

Kemgbe oge Fleming, ndị nchọpụta emepụtawo ọtụtụ ọgwụ nje ndị ọzọ, a ka nọgidekwara na-eme nnyocha iji mepụta ndị ọhụrụ. N’ime afọ 60 gara aga, ọgwụ nje aghọwo ngwá agha dị oké mkpa n’ọgụ a na-alụso ọrịa. A sị na George Washington nọ ndụ taa, obi abụọ adịghị ya na ndị dọkịta gaara ejiwo ọgwụ nje gwọọ ọnyá akpịrị ya, ma eleghịkwa anya, ọ gaara agbake n’ime otu izu ma ọ bụ ihe yiri ya. Ọgwụ nje enyeworo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ anyị nile aka ịgwọpụ otu ọrịa ma ọ bụ ọzọ. Otú ọ dị, o dowo anya na ọgwụ nje nwere ihe ndọghachi azụ ụfọdụ.

Ọgwụ nje adịghị agwọ ọrịa ndị nje virus na-akpata, dị ka AIDS ma ọ bụ oké ahụ́ ọkụ bụ́ influenza. Ọzọkwa, ahụ́ ụfọdụ ndị adịghị anabata ọgwụ nje ụfọdụ. Ọgwụ nje ndị na-egbu ọtụtụ ihe pụkwara igbuchapụ ụmụ nje ndị anya na-adịghị ahụ bụ́ ndị bara uru n’ahụ́ anyị. Ma ikekwe, nsogbu kasịnụ e nwere banyere ọgwụ nje bụ iji ha eme ihe gabiga ókè ma ọ bụ ejighị ha mee ihe ruo n’ókè kwesịrịnụ.

A na-enwe ọnọdụ nke ejighị ha eme ihe ruo n’ókè kwesịrịnụ mgbe ndị ọrịa na-aṅụzughị ọgwụ e depụtaara ha, ma ọ́ bụghị n’ihi na ha agbaketụla, ọ̀ bụrụ n’ihi na usoro ọgwụgwọ ahụ na-ewe oge. N’ihi ya, ọgwụ nje ahụ nwere ike ọ gaghị egbuchapụ nje bacteria ndị dị onye ahụ n’ahụ́, na-eme ka ndị na-eguzogide ọgwụ dịgide ndụ ma mụbaa. Nke a emewo mgbe mgbe n’ọgwụgwọ nke ụkwara nta.

Ma ndị dọkịta ma ndị ọrụ ugbo etinyechawo aka n’iji ọgwụ ọhụrụ ndị a eme ihe n’ụzọ gabigara ókè. “Mgbe mgbe, e depụtaworo ndị mmadụ ọgwụ nje karịrị akarị na United States, a na-ejikwa ha eme ihe aghara aghara ọbụna karị n’ọtụtụ mba ndị ọzọ,” ka akwụkwọ bụ́ Man and Microbes na-akọwa. “E nyewo ha anụ ụlọ n’ókè dị ukwuu, ọ bụghị iji gwọọ ọrịa kama iji mee ka ha too ngwa ngwa; nke a bụ isi ihe kpatara nje ndị na-eguzogide ọgwụ ji arị elu.” Ihe ọ ga-arụpụta, ka akwụkwọ ahụ na-adọ aka ná ntị, bụ na “ọgwụ nje ndị ọhụrụ pụrụ ịmalite ịgwụnahụ anyị.”

Ma e wezụga nchegbu ndị a a na-enwe banyere ụmụ nje iguzogide ọgwụ, ọkara nke abụọ nke narị afọ nke 20 bụụrụ oge mmeri na nkà mmụta ọgwụ na ahụ́ ike. Ndị nchọpụta banyere ọgwụ na ahụ́ ike bịara yie ka hà nwere ike ịchọta ọgwụ ndị a ga-eji lụsoo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụdị ọrịa ọ bụla ọgụ. Ụfọdụ ọgwụ mgbochi ọrịa mekwara ọbụna ka e nwewa atụmanya na a gaghịzi ebute ọrịa.

Mmeri Sayensị Ọgwụ na Ahụ́ Ike Nwere

“Ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa wetara ihe ịga nke ọma kasịnụ n’akụkọ ihe mere eme nke ahụ́ ike ọha na eze,” ka akwụkwọ bụ́ The World Health Report 1999 kwuru. A zọpụtawo ọtụtụ nde ndụ ndị mmadụ ka ọ dị ugbu a, n’ihi usoro nke ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa a na-enwe n’ụwa nile. Usoro ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa nke a ekpochapụwo kịtịkpa—ajọ ọrịa nke ọnụ ọgụgụ ndị o gburu karịrị nke ndị agha nile a lụrụ na narị afọ nke 20 gburu—usoro yiri nke ahụ fọkwara nke nta ka o kpochapụ ọrịa polio. (Lee igbe bụ́ “Mmeri Ndị E Nwere n’Ebe Kịtịkpa na Ọrịa Polio Dị.”) A na-agbazi ọtụtụ ụmụaka ọgwụ mgbochi ọrịa iji chebe ha pụọ n’ọrịa ndị na-etinyekarị ndụ n’ihe ize ndụ.

E jiwo usoro ndị na-adịchaghị ịrịba ama otú ahụ belata ọrịa ndị ọzọ. Ọrịa ndị a na-ebute na mmiri dị ka ọgbụgbọ na ọnyụnyụ adịkebeghị akpata nsogbu n’ebe ndị a na-edebe ihe ọcha ma nwee mmiri dị ọcha. N’ọtụtụ ala, ohere ka ukwuu e nwere ịhụ dọkịta na inweta nlebara anya n’ụlọ ọgwụ pụtara na a pụrụ ịchọpụta ma gwọọ ihe ka n’ọtụtụ ọrịa tupu ha aghọọ ihe na-egbu egbu. Iri nri ndị ka mma na ọnọdụ ibi ndụ ndị ka mma, tinyere ịhụ na e debere iwu ndị metụtara ịkpa nri aka na ichekwa nri n’ụzọ kwesịrị ekwesị, emewokwa ka ahụ́ ike ọha na eze ka mma.

Ozugbo ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtasịrị ihe kpatara ọrịa na-efe efe, ụlọ ọrụ gọọmenti na-ahụ maka ahụ́ ike pụrụ ime ihe ndị dị mkpa iji mee ka ọrịa tiwapụrụnụ ghara ịgbasa. Tụlee nanị otu ihe atụ. Ntiwapụ nke ọrịa bubo na San Francisco n’afọ 1907 gburu mmadụ ole na ole n’ihi na obodo ahụ malitere usoro nke igbuchapụ òké nile bụ́ ndị akpịrị flea dị ha n’ahụ́ na-ebufe ọrịa ahụ. N’aka nke ọzọ, malite n’afọ 1896, ọrịa ahụ gburu nde mmadụ iri n’India n’ime afọ 12 n’ihi na a chọpụtaghị ihe na-akpata ya.

Ọdịda Ndị E Nwere n’Ịlụso Ọrịa Ọgụ

N’ụzọ doro anya, e nwewo mmeri n’ọgụ ndị dị ịrịba ama. Ma ụfọdụ mmeri ndị e nwere n’ihe banyere ahụ́ ike ọha na eze abụwo nanị ná mba ndị ka baa ọgaranya n’ụwa. Ọrịa ndị a pụrụ ịgwọta agwọta ka na-egbu ọtụtụ nde mmadụ, nanị n’ihi enwechaghị ego. Ná mba ndị ka na-emepe emepe, ọtụtụ ndị ka na-ebi n’ebe ndị na-adịghị ọcha, ha adịghị enweta nlekọta ahụ́ ike kwesịrịnụ, ha enweghịkwa mmiri dị mma ọṅụṅụ. Igbo mkpa ndị a bụ́ isi aghọwo ihe siri ike karị n’ihi nkwaga ìgwè ndị mmadụ na-esi n’ime ime obodo akwaga n’obodo ukwu dị iche iche nke mba ndị ka na-emepe emepe n’ụwa. N’ihi ihe ndị dị otú ahụ, ndị dara ogbenye n’ụwa na-ata ahụhụ nke Òtù Ahụ́ Ike Ụwa na-akpọ “ibu ibu nke ọrịa n’ụzọ na-ahaghị nhata.”

Elepụghị anya n’ihu n’ihi ịchọ ọdịmma onwe onye nanị bụ isi ihe na-akpata ahaghị nhata a n’ọnọdụ ahụ́ ike. “Ụfọdụ n’ime ọrịa na-efe efe ndị kasị egbu egbu n’ụwa yiri ka hà nọ n’ebe dị anya,” ka akwụkwọ ahụ bụ́ Man and Microbes na-ekwu. “A na-ahụ ụfọdụ n’ime ha nanị ma ọ bụkwanụ n’ụzọ bụ́ isi n’ógbè ndị dara ogbenye nke ebe okpomọkụ nakwa nke ebe ndị dịdebere ebe okpomọkụ.” Ebe ọ bụ na mba ndị mepere emepe ma baa ọgaranya nakwa ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ọgwụ nwere ike ha agaghị erite uru kpọmkwem, ha na-ala azụ n’iwepụta ego maka ọgwụgwọ nke ọrịa ndị a.

Àgwà ọjọọ nke ụmụ mmadụ sokwa n’isi ihe na-akpata mgbasa nke ọrịa. Ihe atụ nke ajọ ọnọdụ a bụ nje virus nke na-akpata AIDS, bụ́ nke na-agbasa site n’otu onye gaa n’ọzọ site ná mmiri ahụ́. N’ime afọ ole na ole, ọrịa a tiwapụrụ zuo ụwa nile. (Lee igbe bụ́ “Ọrịa AIDS—Ihe Otiti nke Oge Anyị.”) “Ụmụ mmadụ ji aka ha kpatara onwe ha ọdachi a,” ka onye ọkà n’ihe banyere mgbasa na nchịkwa ọrịa bụ́ Joe McCormick na-ekwu. “Nke ahụ abụghịkwa ịkatọ omume ha, ọ bụ nnọọ ihe mere eme.”

Olee otú ụmụ mmadụ si na-ehinyere nje virus ahụ ájá n’úkwù n’amaghị ama? Akwụkwọ bụ́ The Coming Plague depụtara ihe ndị na-esonụ: Mgbanwe n’akparamàgwà nke ọha na eze—karịsịa omume nke iso ọtụtụ ndị na-enwe mmekọahụ—kpatara ọtụtụ ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ, na-eme ka ọ dịkwuoro nje virus ahụ mfe ịmụba nakwa isi n’ahụ́ otu onye bu ya banye n’ahụ́ ọtụtụ ndị ọzọ. Ojiji a na-eji ndụdụ ndị na-adịghị ọcha, bụ́ ndị e jirila gbaa mmadụ ọgwụ eme ihe n’ịgba ndị ọrịa ọgwụ ná mba ndị ka na-emepe emepe ma ọ bụkwanụ n’ịgba ọgwụ ọjọọ, nwekwara mmetụta yiri nke ahụ. Ahịa ọbara a na-azụ n’ụwa nile bụ́ nke na-enye ọtụtụ ijeri dollar, mekwara ka nje virus na-akpata ọrịa AIDS nwee ike isi n’ahụ́ otu onye nyere ọbara ya gafere n’ahụ́ ọtụtụ ndị a mịnyere ọbara ahụ.

Dị ka e kwuru na mbụ, iji ọgwụ nje eme ihe n’ụzọ gabigara ókè ma ọ bụ ejighị ya mee ihe ruo n’ókè kwesịrịnụ esowo mee ka e nwee ụmụ nje ndị na-eguzogide ọgwụ. Nsogbu a dị njọ, ọ na-akawanyekwa njọ. Ọ na-adịburu ọgwụ ndị e si na penicillin rụpụta mfe igbu nje bacteria bụ́ staphylococcus, bụ́ nke na-akpatakarị ọnyá. Ma ugbu a, ọgwụ nje ndị a e jiworo na-eme ihe eri oge na-abụkarị ndị na-adịghị arụ ọrụ. N’ihi ya, ndị dọkịta aghaghị ichigharịkwuru ọgwụ nje ndị dara oké ọnụ bụ́ ndị aka ụlọ ọgwụ ndị dị ná mba ndị ka na-emepe emepe na-agachaghị eru. Ọbụna ọgwụ nje ndị kasị ọhụrụ pụrụ ịbụ ndị na-enweghị ike igbu nje ụfọdụ, na-eme ka ọrịa ndị a na-ebute n’ụlọ ọgwụ dịkwuo ọtụtụ ma na-egbu egbu karị. Dr. Richard Krause, onye bụ́bu onye ntụzi ọrụ nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ahụ́ Na-adịghị Anabata na Ọrịa Ndị Na-efe Efe na United States, kọwara ọnọdụ e nwere ugbu a hoo haa dị ka “njupụta nke ụmụ nje ndị na-eguzogide ọgwụ.”

“Ihe Ọ̀ Kaara Anyị Mma Taa?”

Ugbu a, ná mmalite nke narị afọ nke 21, o doro anya na iyi egwu nke ọrịa akwụsịbeghị. Mgbasa na-ekweghị akwụsị akwụsị nke ọrịa AIDS, mpụta nke nje ndị na-eguzogide ọgwụ, na mbịaghachi nke ọrịa ndị gbuwere ndị mmadụ kemgbe dị ka ụkwara nta na ọrịa ịba, na-egosi na e meribeghị n’agha ahụ a na-alụso ọrịa.

“Ihe ọ̀ kaara anyị mma taa karịa ka ọ dị anyị na narị afọ gara aga?” ka otu onye nwetara Ihe Nrite Nobel bụ́ Joshua Lederberg jụrụ. “N’ọnọdụ ka ukwuu, ihe kaara anyị njọ,” ka o kwuru. “Anyị anọwo na-eleghara ụmụ nje anya, anyị na-aghọtakwa mkpụrụ nke nleghara anya ahụ.” À pụrụ imeri ndọghachi azụ ndị e nwere ugbu a ma ọ bụrụ na sayensị ọgwụ na ahụ́ ike nakwa mba nile etinye mgbalị siri ike? À ga-emesị kpochapụ ọrịa na-efe efe ndị bụ́ isi, dị ka e kpochapụrụ kịtịkpa? Isiokwu ikpeazụ anyị ga-aza ajụjụ ndị a.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 18]

Mmeri Ndị E Nwere n’Ebe Kịtịkpa na Ọrịa Polio Dị

Ná ngwụsị nke October 1977, Òtù Ahụ́ Ike Ụwa chọpụtara onye ikpeazụ kịtịkpa gbara n’ụzọ a maara o si agba. Ali Maow Maalin, bụ́ onye bi na Somalia nke na-esiri otu ụlọ ọgwụ nri, butere ọrịa ahụ ma na o jisighị ya ike, ọ gbakekwara n’ime izu ole na ole. A gbara ndị nile ya na ha mekọrọ ihe ọgwụ na-egbochi ọrịa kịtịkpa.

Ruo afọ abụọ, ndị dọkịta nọ nnọọ na-eche. E kwuru na a ga-enye onye ọ bụla nke ga-ekwu onye ọzọ o doro anya na ọ na-arịa “ọrịa kịtịkpa nke na-akawanye njọ” 1,000 dollar dị ka onyinye. Ọ dịghị onye nwetara onyinye ahụ, na May 8, 1980 kwa, Òtù Ahụ́ Ike Ụwa mara ọkwa na “Ụwa na ndị nile bi na ya enwerewo onwe ha pụọ na kịtịkpa.” N’iri afọ bu ya nnọọ ụzọ, kịtịkpa nọ na-egbu ihe dị ka nde mmadụ abụọ n’afọ. Na nke mbụ ya n’akụkọ ihe mere eme, e kpochapụrụ otu ọrịa bụ́ isi na-efe efe. *

Ọrịa polio, bụ́ ọrịa na-akwarụ mmadụ site na nwata, bịara yie ka à ga-enwe ihe ịga nke ọma yiri nke ahụ na ya. N’afọ 1955, Jonas Salk mepụtara otu ọgwụ dị irè e ji egbochi ọrịa polio, a malitekwara usoro nke ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa polio na United States nakwa ná mba ndị ọzọ. Ka oge na-aga, e mepụtara ọgwụ mgbochi ọrịa nke a na-atanye n’ọnụ. N’afọ 1988, Òtù Ahụ́ Ike Ụwa malitere otu ihe omume zuru ụwa ọnụ iji kpochapụ ọrịa polio.

“Mgbe anyị malitere ime mgbalị iji kpochapụ ọrịa polio n’afọ 1988, ọ nọ na-akwarụ ihe karịrị 1000 ụmụaka kwa ụbọchị,” ka Dr. Gro Harlem Brundtland, onye bụ́bu onye ntụzi ọrụ nke Òtù Ahụ́ Ike Ụwa, na-akọ. “N’afọ 2001, e nwere ihe na-erutụghịdị 1000 mmadụ rịara ya n’afọ ahụ dum.” Mba ndị e nwere ọrịa polio na ha ugbu a erughịzi iri, ọ bụ ezie na a ga-achọkwu ego iji nyere mba ndị a aka imecha kpochapụ ọrịa ahụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 28 Kịtịkpa bụ ihe atụ kasị mma nke ọrịa ndị a pụrụ ịchụ site n’ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa n’ụzọ zuru ụwa ọnụ n’ihi na n’adịghị ka ọrịa ndị ihe ndị dị ka òké na ụmụ ahụhụ na-ebusa, nje na-akpata kịtịkpa na-adabere n’ahụ́ ụmụ mmadụ iji nọgide na-adị ndụ.

[Foto]

Ka otu nwa okoro Etiopia na-anara ọgwụ mgbochi ọrịa “polio” a tanyere ya n’ọnụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

© WHO/P. Virot

[Igbe/Foto dị na peeji nke 20]

Ọrịa AIDS—Ihe Otiti nke Oge Anyị

Ọrịa AIDS apụtawo dị ka ihe ọhụrụ na-eyi ụwa egwu. Ka ọ dị ugbu a, n’ihe dị ka afọ 20 kemgbe a chọpụtasịrị ya, ihe karịrị nde mmadụ 60 ebutewo ya. Ndị ọrụ ahụ́ ike na-adọkwa aka ná ntị na ntiwapụ nke ọrịa AIDS ka “na-amalite amalite.” Ọnụ ọgụgụ ndị na-ebute ọrịa a “na-arịwanye elu karịa otú e kwenyeburu na ọ ga-ekwe omume,” mmetụta ọ na-enwekwa n’ógbè ndị ọ kasị kpaa aka ọjọọ n’ụwa dịkwa egwu.

“Ọnụ ọgụgụ ka nnọọ ukwuu nke ndị bu ọrịa HIV/AIDS n’ụwa nile bụ ndị nọ n’uju nke ndụ ha ma a bịa n’ihe banyere ọrụ,” ka akụkọ sitere n’aka òtù Mba Ndị Dị n’Otu na-akọwa. N’ihi ya, e kweere na ọtụtụ mba ndị dị na ndịda Africa ga-abụ ndị ndị ọrụ ha dị agbata pasent 10 na pasent 20 ga-anwụnahụ ka ọ na-erule afọ 2005. Akụkọ ahụ na-ekwukwa, sị: “Nkezi afọ nke ndị bi ná mba Africa ndị dị na ndịda Sahara na-adịru ndụ ugbu a bụ afọ 47. A sị na ọrịa AIDS adịghị, ọ gaara abụ afọ 62.”

Mgbalị ndị e meworo iji chọta ọgwụ a ga-eji na-egbochi ya amịpụtabeghị mkpụrụ ọ bụla, ọ bụkwa nanị pasent 4 nke nde mmadụ isii na-arịa ọrịa AIDS ná mba ndị ka na-emepe emepe na-aṅụ ọgwụ. Ka ọ dị ugbu a, e nweghị ọgwụgwọ ọ bụla dịnụ maka ọrịa AIDS, ndị dọkịta kwekwaara na ihe ka ọtụtụ ná ndị bu nje ya ga-emesị nweta ọrịa ahụ.

[Foto]

Mkpụrụ ndụ “lymphocyte” nke T bụ́ nke butere nje “virus” HIV

[Ebe E Si Nweta Foto]

Godo-Foto

[Foto dị na peeji nke 17]

Ka onye na-eme nnyocha na-enyocha otu ụdị nje “virus” nke na-esi ọnwụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

CDC/Anthony Sanchez