Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka O Ji Emegbu M?

N’ihi Gịnị Ka O Ji Emegbu M?

 Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

N’ihi Gịnị Ka O Ji Emegbu M?

“[Enyi m nwoke] na-ebokarị m ebubo ndị na-enweghị nnọọ isi. Ma obi m dị n’ebe ọ nọ.”—Kathrin. *

“Ọ dịghị [ọnyá ọ bụla] ị na-ahụ n’elu ahụ́, ma ọ na-egbu m nnọọ mgbu n’obi.”—Andrea, bụ́ onye enyi ya nwoke mara ụra.

Ọ BỤ ọnọdụ a na-ahụkarị nnọọ: Nwa agbọghọ amalite iso nwa okoro yiri nnọọ ka à ga-asị na ọ dịghị ezi mmadụ mara mma ka ya, na-eme mkpapụ. Ma nwayọọ nwayọọ, ya amalite ịgbanwe. Kama ịnọgide na-agwa nwa agbọghọ ahụ okwu ịhụnanya, ihe a na-anụzi n’ọnụ ya abụrụ okwu mkparị ndị na-agbakasị ahụ́ na okwu nkatọ ndị na-ewetu mmadụ ala. Na mbụ, nwa agbọghọ ahụ ewere ya dị ka njakịrị ịhụnanya a na-edebeghị ọnụ nke ọma maa. Otú ọ dị, ihe abịa ka njọ ruo n’ókè nke nwa okorobịa ahụ ịgwakasị ya okwu ahụ́, iwesa ya iwe, na ikwu okwu ndị na-egosi na ọ na-akwa oké ụta. N’ịbụ onye na-eche n’ụzọ ụfọdụ na ọ bụ ya kpatara àgwà ọjọọ ahụ enyi ya nwoke na-akpa, nwa agbọghọ ahụ ajụ ịkọsara mmadụ ihe na-eme ya, na-enwe olileanya na ihe ga-agbanwe. Ma ihe agbanweghị. Enyi ya nwoke amalitezie ịbakasị ya ahụ́. N’otu oge iwe were ya, ọbụna ya akwaa ya aka! Egwu atụwa ya na n’oge ọzọ ọ ga-eti ya ihe. *

Ụmụ okoro na agbọghọ bụ́ ndị nọ ná mmekọrịta ịhụnanya e ji iti ihe ma ọ bụ ịgwakasị okwu ahụ́ mara, pụrụ ịdị na-agwa ibe ha okwu nkatọ, okwu na-egbu mmụọ, na-ewesokwa ibe ha ókè iwe mgbe nile. Ị̀ nọ n’ọnọdụ dị otú ahụ? (Lee igbe bụ́ “Ụfọdụ Ihe Mgbaàmà Ịdọ Aka ná Ntị”) Ọ bụrụ otú ahụ, ị pụrụ ịnọ nnọọ ná mgbagwoju anya nakwa n’obi erughị ala nke na ị gaghị ama ihe ị ga-eme eme.

Ọnọdụ ndị dị otú a abụghị nke a na-adịghị ahụkarị dị ka ị pụrụ iche. Ndị nchọpụta na-eme atụmatụ na e mesowo 1 onye n’ime mmadụ 5 ọ bụla ihe ike n’oge a na-eme mkpapụ. Ọ bụrụ na a gụnye ịkpọ iyi dị ka otu ụdị nke ime ihe ike, atụmatụ a ga-arị elu ruo mmadụ 4 n’ime mmadụ 5 ọ bụla. N’ụzọ dị iche n’ihe ọtụtụ ndị na-eche, ọ bụghị nanị ụmụ nwanyị ka a na-emeso omume a. Dị ka otu nnyocha ndị Britain mere banyere imeso mmadụ ihe ike n’oge a na-eme mkpapụ na-egosi, “ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasent há nhata nke ndị nwoke na ndị nwanyị” na-eme mkpapụ kọrọ na ndị ha na ha na-eme mkpapụ na-emeso ha ihe ike. *

 N’ihi gịnị ka e ji enwe àgwà ọjọọ dị otú ahụ n’oge mbedo? Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ị hụ onwe gị n’ọnọdụ dị otú ahụ?

Ịmata Echiche Chineke

Nke mbụ, ị ghaghị ịghọta nnọọ otú ọnọdụ dị otú ahụ si dị oké njọ n’anya Chineke. Nke bụ́ eziokwu bụ na ụmụ mmadụ na-ezughị okè ga-emerịrị ma ọ bụ kwuo ihe ndị ga-ewute ndị ọzọ. (Jems 3:2) Ọ bụkwa eziokwu na mgbe ụfọdụ ọbụna ndị hụrụ onwe ha n’anya ma tụkwasị onwe ha obi ga-enwe nghọtahie. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi na Banabas bụ Ndị Kraịst tozuru okè. Ma, n’otu oge, ha nwere “oké ntiwapụ nke iwe.” (Ọrụ 15:39) N’ihi ya, ọ bụrụ na ọ dị onye gị na ya na-eme mkpapụ, ọ dị mfe na unu ga-esetụ okwu mgbe ụfọdụ.

Ọzọkwa, ọ ga-abụ ihe ezi uche na-adịghị na ya iche na ọ dịghị mgbe enyi gị nwoke ga-akatọ gị. E kwuwerị, unu na-eche echiche ịghọ di na nwunye. Ọ bụrụ na ọ dị àgwà ị na-akpa nke na-enye ya nsogbu n’obi, ọ́ gaghị abụ ngosipụta nke ịhụnanya ma ọ bụrụ na ọ gwa gị banyere ya? N’eziokwu, okwu nkatọ na-ewute ewute. (Ndị Hibru 12:11) Ma ọ bụrụ na e jiri ịhụnanya gwa gị ya, o soghị n’okwu mkparị.—Ilu 27:6.

Otú ọ dị, iti mkpu, ịma ụra, isu ọkpọ, ma ọ bụ ịgwakasị mmadụ okwu ọjọọ ahụ́ bụ ihe ọzọ dị nnọọ iche. Bible na-akatọ ‘ọnụma, iwe, ihe ọjọọ, okwu mkparị.’ (Ndị Kọlọsi 3:8) Ọ na-ewe Jehova iwe mgbe mmadụ na-eji “ike” eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi n’iweda ndị ọzọ ala, n’imenye ha ụjọ, ma ọ bụ n’imekpọ ha ọnụ. (Eklisiastis 4:1; 8:9) N’eziokwu, Okwu Chineke na-enye ndị bụ́ di iwu ka ha “na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha . . . , n’ihi na ọ dịghị nwoke kpọtụworo anụ ahụ́ nke ya asị; kama ọ na-azụ ma na-elezi ya anya.” (Ndị Efesọs 5:28, 29) Nwoke nke na-akparị nwanyị ya na ya nọ ná mbedo ma ọ bụ na-emeso ya omume ọjọọ na-egosi onwe ya dị ka onye na-erughị eru ịbụ di ya. N’otu mgbe ahụ, ọ na-eme ihe Jehova Chineke n’onwe ya ga-eji wesa ya iwe!

Ọ Bụghị Gị Kpatara Ya!

Otú o sina dị, ndị na-eme omume a na-atakarị ndị ha na-emeso ya ụta. Ikekwe, ị pụrụ iche mgbe ụfọdụ na ọ bụ gị kpatara oké iwe na-ewe enyi gị nwoke. Ma, o nwere ike ọ bụghị gị kpatara iwe na-ewe ya. Mgbe mgbe, ndị ikom na-eti mmadụ ihe na-abụ ndị a zụlitere n’ezinụlọ ebe e weere ime ihe ike na ikwu okwu mkparị dị ka ihe na-adịghị njọ. * N’ala ụfọdụ, ọdịnala zuru ebe nile nke a na-atụ ụmụ nwoke anya n’aka ịbụ ndị na-egosi na ọ bụ ha nọ n’isi, na-emetụta ụmụ okorobịa. Ndị ọgbọ pụkwara ịrụgide nwa okorobịa ịdị na-egosi na ọ bụ nwoke. N’ihi enweghị obi ike n’ime onwe ya, okwu ọ bụla i kwuru ma ọ bụ ihe ọ bụla i mere pụrụ ime ka ahụ́ ghara ịdị na-eru ya ala.

Ihe ọ sọrọ ọnọdụ ahụ ya bụrụ, ọ bụghị gị kpatara ihe mere onye ọzọ ji na-ewe oké iwe. Ọ dịghị mgbe ọ bụla mkparị na ime ihe ike ziri ezi.

Ịgbanwe Echiche Gị

Ọ bụrụgodị na ọ bụghị gị na-akpasu onye ọzọ iwe, ọ pụrụ ịdị mkpa ịgbanwe ọbụna ụzọ i si ele ihe anya. N’ụzọ dị aṅaa? Tụleedị ihe a, ọ bụrụ na a zụlitere nwa agbọghọ n’onwe ya n’ezinụlọ ebe ime ihe ike na okwu ọjọọ na-arị ibe ha elu, okwu ọjọọ pụrụ iyi ya ihe kwesịrị ekwesị. Kama ịbụ onye omume dị otú ahụ na-ekwesịghị Onye Kraịst na-asọ oyi, ọ pụrụ ịnabata ya—ikekwe, ọbụna were ya dị ka ihe na-adọrọ mmasị. Ee, ụfọdụ ndị e mesoro ihe n’ụzọ na-adịghị mma na-ekweta na ụmụ nwoke ndị na-eme nnọọ mma mma na-agbụ ha agbụ. Ụmụ agbọghọ ndị ọzọ na-ehie  ụzọ site n’ikwere na ha pụrụ ịgbanwe enyi ha nwoke.

Ọ bụrụ na i nwere nke ọ bụla n’ime echiche ndị a, ọ dị gị mkpa ‘ịbụ onye e nwoghara site n’ime ka uche gị dị ọhụrụ’ n’ihe banyere nke a. (Ndị Rom 12:2) Site n’ekpere, ọmụmụ ihe, nakwa ntụgharị uche, ọ dị gị mkpa ile àgwà ọjọọ ahụ anya n’ụzọ Jehova si ele ya anya ma hụ ya dị ka ihe rụrụ arụ. Ọ dị gị mkpa ịghọta na e kwesịghị imegbu gị. Ịmara ebe ike gị ruru pụrụ inyere gị aka ịghọta na i nweghị ikike nke ịgbanwe enyi gị nwoke na-ewekarị iwe. Ọ dị ya n’aka ịgbanwe!—Galeshia 6:5.

N’ọnọdụ ụfọdụ, ụmụ agbọghọ na-anagide mmeso ọjọọ n’ihi enwechaghị ùgwù onwe onye. Kathrin, onye a kpọtụrụ aha ná mmalite na-ekwu, sị, “Amaghị m otú ndụ m ga-adị ma m hapụ ya, agaghị m enwetali onye ka ya mma.” Nwa agbọghọ aha ya bụ Helga kwukwara ihe yiri nke ahụ banyere enyi ya nwoke, sị, “Ana m ekwere ka ọ na-akụ m ihe n’ihi na ọ ka mma karịa enweghị enwe.”

Echiche ndị dị otú ahụ, hà na-egosi ezi ntọala maka mmekọrịta ga-aga nke ọma? E kwuwerị, ì nwere ike ịhụ onye ọzọ n’anya ma ọ bụrụ na ị pụghị ọbụna ịhụ onwe gị n’anya? (Matiu 19:19) Zụlite ùgwù onwe onye kwesịrịnụ. * Ịnagide mmeso ọjọọ agaghị enyere gị aka ime otú ahụ. Dị ka otu nwa agbọghọ aha ya bụ Irena ghọtara site n’ahụmahụ o nwere, ịnagide mmeso ọjọọ pụrụ “ịnapụ gị ùgwù onwe onye gị nile.”

Iche Eziokwu Ihu

Ọ pụrụ isiri ụfọdụ ndị ike ikweta na ha nọ ná mmekọrịta na-ekwesịghị ekwesị—karịsịa ma ọ bụrụ na ndọrọ mmekọahụ ha nwere n’ahụ́ ibe ha esiwo ike. Ma emela anya ka ị maghị ihe na-aganụ. Otu ilu Bible na-asị: “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya: ma ndị na-enweghị uche agabigawo, e wee rie ha nha.” (Ilu 22:3) Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Hanna na-echeta, sị, “Mgbe ị hụrụ nwa okorobịa n’anya, ị gaghị na-ahụchakwa ụzọ, ihe ị ga na-ahụ bụ nanị àgwà ọma ya.” Otú ọ dị, ọ bụrụ na ọ na-emeso gị mmeso ọjọọ, ọ dị mkpa ịhụ ya otú ọ dị n’ezie. Ọ bụrụkwa na enyi gị nwoke na-emenye gị egwu, ma ọ bụ na-elelị gị anya, mara na agwọ nọ n’akịrịka. A nwakwala anwa leghara mmetụta ị na-enwe anya, na-agọpụrụ ya ma ọ bụ na-ata onwe gị ụta. Ahụmahụ e nwere egosiwo na ọ bụrụ na a kwụsịghị ọnọdụ ahụ, mmeso ọjọọ ahụ ga na-arịwanye nnọọ elu. Ndụ gị pụrụ ịdị n’oké ihe ize ndụ!

Otú ọ dị, ọ kasị mma ọbụna ịghara iso onye na-enweghị njide onwe onye banye ná mbedo. (Ilu 22:24) N’ihi ya, ọ bụrụ na onye ị na-amaghị nke ọma achọọ ka gị na ya malite ime mkpapụ, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ịchọpụta ụdị onye ọ bụ. Gịnịkwanụ ma ị tụọ aro ka unu buru ụzọ na-akpakọrịta n’ebe ìgwè mmadụ nọ? Nke a ga-enye gị ohere ịchọpụta ụdị onye ọ bụ n’azụliteghị ndọrọ mmekọahụ ngwa ngwa. Jụọ ajụjụ ndị bara uru, dị ka ndị a: Olee ndị bụ́ enyi ya? Olee ụdị egwú, ihe nkiri sinima, egwuregwu kọmputa, na egwuregwu nkịtị ndị na-amasịkarị ya? Mkparịta ụka ya ọ̀ na-egosi na ihe ime mmụọ na-amasị ya? Soro ndị maara ya kwurịta okwu, dị ka ndị okenye ọgbakọ ya. Ha ga-eme ka ị mara ma ọ̀ bụ onye ndị ọzọ ‘na-akọ akụkọ ọma banyere ya’ n’ihi ịbụ onye tozuru okè na onye nwere àgwà nsọpụrụ Chineke.—Ọrụ 16:2.

Ma gịnị ka ị pụrụ ime ma ọ bụrụ na ị nọrịị anọ ná mmekọrịta nke a na-emegbu gị na ya? Isiokwu na-abịa n’ihu ga-aza ajụjụ a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo aha ụfọdụ.

^ par. 5 Isiokwu a na-ekwu banyere ndị a na-agwakasị okwu ahụ́ na ndị a na-eti ihe. E nyere ndụmọdụ ndị pụrụ inyere ndị na-akpa àgwà ahụ aka n’isiokwu ndị bụ́ “Site n’Okwu Na-emerụ Ahụ Gaa n’Okwu Na-agwọ Agwọ” ná mbipụta anyị nke November 8, 1996, nakwa “Ịchọ Okwu—Olee Ihe Ọjọọ Dị Ya?” ná mbipụta anyị nke April 8, 1997.

^ par. 7 Otú ọ dị, iji mee ka ihe dị mfe, anyị ga na-ezo ndị e mesoro mmeso ọjọọ a aka dị ka ndị inyom. Ụkpụrụ ndị a tụlere n’ime isiokwu a na-emetụtakwa ma ndị nwoke ma ndị nwanyị.

^ par. 14 Lee isiokwu bụ́ “Ikpughe Mkpọrọgwụ nke Nkwulu,” n’ime mbipụta anyị nke November 8, 1996.

^ par. 20 Lee isiakwụkwọ nke 12 n’akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, bụ́ nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Igbe dị na peeji nke 29]

Ụfọdụ Ihe Mgbaàmà Ịdọ Aka ná Ntị

▪ Ọ na-ekwukarị okwu nlelị banyere gị, banyere ezinụlọ gị, ma ọ bụ banyere ndị enyi gị, mgbe nanị unu abụọ nọ ma ọ bụ mgbe unu na ndị ọzọ nọ

▪ Ọ na-elegharakarị ọchịchọ gị ma ọ bụ echiche gị anya

▪ Ọ na-agbalị ịchịkwa akụkụ nile nke ndụ gị, na-achọkarị ịmata ebe ị nọ n’oge ọ bụla ma na-emere gị mkpebi nile

▪ Ọ na-agwakasị gị okwu ahụ́, na-akwa gị aka, ma ọ bụ na-eyi gị egwu

▪ Ọ na-anwa ime ka i kweta ime ngosipụta ịhụnanya ndị na-ekwesịghị ekwesị

▪ Ọ na-esiri gị ike ime ihe ọ bụla n’echegbughị onwe gị ma ọ̀ dị ụzọ ọ bụla ọ ga-esi kpasuo ya iwe

[Foto dị na peeji nke 28]

Mmekọrịta ọ bụla a nọgidere na-enwe nkatọ ma ọ bụ mkparị na ya pụrụ igosi na mmekọrịta ahụ ekwesịghị ekwesị