Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụwa nke Ọrịa Na-agaghị Adị na Ya

Ụwa nke Ọrịa Na-agaghị Adị na Ya

Ụwa nke Ọrịa Na-agaghị Adị na Ya

“Mba nile kwesịrị ịgbakọta aka ná mmụọ nke imekọ ihe na ịrụkọ ọrụ ọnụ iji hụ na mmadụ nile na-enweta nlekọta ahụ́ ike bụ́ isi, ebe ọ bụ na ọ bụrụ na ndị bi n’otu mba enwee ezi ahụ́ ike, ọ na-emetụta ma na-abara ndị bi ná mba ọ bụla ọzọ uru kpọmkwem.”—NKWUPỤTA NKE ALMA-ATA, SEPTEMBER 12, 1978.

AFỌ 25 gara aga, nlekọta ahụ́ ike bụ́ isi maka onye ọ bụla nọ n’ụwa yiri ụfọdụ ndị ka ihe mgbaru ọsọ a pụrụ iru eru. Ndị gara Nnọkọ Nkwurịta Okwu Mba Nile Maka Nlekọta Ahụ́ Ike Bụ́ Isi, bụ́ nke e nwere n’Alma-Ata, nke dị n’ebe bụ́ Kazakhstan ugbu a, kpebiri ịhụ na a gbara ihe nile a kpọrọ mmadụ ọgwụ mgbochi maka ọrịa ndị bụ́ isi na-efe efe ka ọ na-erule afọ 2000. Ha nwekwara olileanya na n’otu afọ ahụ, onye ọ bụla nọ n’ụwa ga-enwe ike ịdị na-edebe ihe ọcha n’ụzọ bụ́ isi ma nwee mmiri dị mma ọṅụṅụ. Mba nile so n’Òtù Ahụ́ Ike Ụwa bịanyere aka ná nkwupụta ahụ.

Ihe mgbaru ọsọ ahụ bụ nnọọ nke e kwesịrị ịja mma, ma imezinụ ya eme abụrụwo ihe e siri n’ọkụ. Nlekọta ahụ́ ike bụ́ isi erubeghị mmadụ nile aka ma ọlị, ọrịa ndị na-efe efe ka na-ebibikwa ahụ́ ike nke ọtụtụ ijeri mmadụ n’ụwa. Ọrịa ndị a na-egbu egbu na-atakarịkwa isi ụmụaka nakwa nke ndị toworo eto bụ́ ndị nọ n’uju ndụ ha.

Ọbụna egwu ọrịa atọ ndị bụ́ AIDS, ụkwara nta, na ọrịa ịba na-eyi amanyebeghị mba dị iche iche “ịgbakọta aka ná mmụọ nke imekọ ihe.” Ndị so n’òtù e guzobere ọhụrụ bụ́ Akpa Ego Ụwa Nile Maka Ịlụso Ọrịa AIDS, Ụkwara Nta na Ọrịa Ịba Ọgụ rịọrọ gọọmenti dị iche iche maka ijeri dollar 13 iji nye aka n’igbochi ntiwapụ ọrịa ndị a. Otú ọ dị, ka ọ na-erule n’oge okpomọkụ nke afọ 2002, ọ bụ nanị ihe karịrị ijeri dollar 2 ka e nyeworo ha—n’otu afọ ahụ, e mere atụmatụ na e mefuru ego ruru ijeri dollar 700 n’ihe ndị metụtara agha! N’ụzọ dị mwute, n’ụwa nke oge a nke kewasịrị ekewasị, ọ bụ nanị ihe egwu ole na ole nwere ike ime ka mba nile jikọọ aka maka ọdịmma nke mmadụ nile.

Ọbụna mgbe ha nwere ebumnobi ndị kasị mma, ndị ọrụ ahụ́ ike na-ahụta onwe ha dị ka ndị aka jiri n’ọgụ ha na-alụso ọrịa ndị na-efe efe. Gọọmenti nwere ike ghara iweta ego dị mkpa. Ụmụ nje na-eguzogidezi ọtụtụ ọgwụ, ndị mmadụ nwekwara ike isi ọnwụ na-ebi ndụ ndị dị nnọọ ize ndụ. Ọzọkwa, nsogbu ndị a na-enwekarị n’ebe ụfọdụ dị ka ịda ogbenye, agha, na ụnwụ nri, na-eme ka ụmụ nje nwee ike ịbanye n’ahụ́ ọtụtụ nde mmadụ n’enweghị nsogbu.

Mmasị Chineke Nwere n’Ahụ́ Ike Anyị

E nwere ihe ngwọta dịnụ. Anyị nwere ihe àmà doro anya na Jehova Chineke na-enwe nnọọ mmasị n’ahụ́ ike nke ihe a kpọrọ mmadụ. Usoro ahụ́ anyị ji alụso ọrịa ọgụ na-enye ihe àmà pụtara ìhè banyere mmasị a. Ọtụtụ iwu Jehova nyere Izrel oge ochie gosiri ọchịchọ ya ichebe ha pụọ n’ọrịa ndị na-efe efe. *

Jizọs Kraịst, bụ́ onye na-egosipụta àgwà Nna ya nke eluigwe, na-enwekwa ọmịiko n’ebe ndị ọrịa nọ. Oziọma Mak na-akọ banyere nzute Jizọs zutere otu nwoke na-arịa ekpenta. “Ọ bụrụ na ị chọrọ,” ka onye ekpenta ahụ sịrị, “ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” Jizọs bịara nwee nnọọ ọmịiko mgbe ọ hụrụ ihe mgbu na ahụhụ nwoke ahụ nọ na ya. “[Achọrọ] m ka ị dị ọcha,” ka Jizọs zara. “Dịrịkwa ọcha!”—Mak 1:40, 41, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

Ọ bụghị nanị mmadụ ole na ole ka Jizọs gwọrọ ọrịa n’ụzọ ọrụ ebube. Onye so dee Oziọma ndị ahụ bụ́ Matiu dekọrọ na Jizọs “[gazuru] gburugburu Galili dum, na-ezi ihe . . . , na-ekwusakwa ozi ọma alaeze ahụ, na-agwọkwa ụdị ọrịa ọ bụla na ụdị nsogbu ahụ́ ike ọ bụla ndị mmadụ nwere.” (Matiu 4:23) Ọgwụgwọ ndị ahụ abụghị nanị na o nyeere ndị ọrịa nọ na Judia na Galili aka. Ha na-eme ka anyị hụperetụ otú ụdị ọrịa dị iche iche ga-esi pụọ n’anya n’ikpeazụ mgbe Alaeze Chineke, nke Jizọs kwusara banyere ya, ga na-achị ihe a kpọrọ mmadụ n’enweghị ihe ịma aka.

Ahụ́ Ike Zuru Ụwa Ọnụ Abụghị Atụmanya Na-agaghị Ekwe Omume

Bible na-emesi anyị obi ike na ahụ́ ike zuru ụwa ọnụ abụghị atụmanya na-agaghị ekwe omume. Jọn onyeozi lepụrụ anya n’ihu ma hụ oge ‘ụlọikwuu nke Chineke ga-adịnyere ihe a kpọrọ mmadụ.’ N’ihi ihe a Chineke ga-eme, “ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.” Nke ahụ ọ̀ na-atọ nnọọ ụtọ ná ntị nke na o yiri ihe na-agaghị eme eme? N’amaokwu na-esonụ, Chineke n’onwe ya na-ekwu, sị: “Okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi ma bụrụ eziokwu.”—Mkpughe 21:3-5.

N’eziokwu, ka ọrịa wee kwụsị, ọ ga-adịkwa mkpa na ịda ogbenye, ụnwụ nri, na agha kwụsịrị, ebe ọ bụ na ọdachi ndị a na ụmụ nje ndị na-ebunye ọrịa na-agakarị ụkwụ na ụkwụ. Ya mere, Jehova nyere Alaeze ya nnukwu ọrụ a ịrụ, bụ́ ọchịchị eluigwe nke dị n’aka Kraịst. N’ịza ekpere nke ọtụtụ nde mmadụ na-ekpesi ike, ọchịchị a ga-abịa, ọ ga-ahụkwa na uche Chineke mere n’ụwa.—Matiu 6:9, 10.

Olee mgbe anyị pụrụ ịtụ anya Alaeze Chineke ịbịa? N’ịza ajụjụ ahụ, Jizọs buru n’amụma na ụwa ga-ahụ ihe ndị dị ịrịba ama bụ́ ndị ga-enye ihe àmà na Alaeze ahụ ga-eme ihe n’oge na-adịghị anya. Otu n’ime ihe ndị a, ka o kwuru, ga-abụ ntiwapụ nke ‘ọrịa na-efe efe site n’otu ebe ruo ebe ọzọ.’ (Luk 21:10, 11; Matiu 24:3, 7) Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “ọrịa na-efe efe” na-ezo aka “[n’ọrịa] ọ bụla na-egbu egbu nke na-esi n’ahụ́ otu onye gafere n’ahụ́ onye ọzọ.” Na narị afọ nke 20, e nwere n’ezie ntiwapụ ndị dị egwu nke ọrịa ndị na-efe efe, n’agbanyeghị ọganihu nile sayensị ọgwụ na ahụ́ ike nwere.—Lee igbe bụ́ “Ndị Ọrịa Na-efe Efe Gbuworo Kemgbe 1914.”

Otu amụma dị n’akwụkwọ Mkpughe, bụ́ nke yiri ihe Jizọs kwuru n’Oziọma ndị ahụ, na-egosi ọtụtụ ndị ikom na-agba ịnyịnya bụ́ ndị na-esonyere Jizọs Kraịst mgbe o weere ike ọchịchị n’eluigwe. Onye nke anọ nọkwasịrị n’elu “ịnyịnya nke ahụ́ ya chanwụrụ achanwụ,” na-ewetakwa “ihe otiti na-akpata ọnwụ.” (Mkpughe 6:2, 4, 5, 8) Ọ bụrụ na e lee anya n’ọnụ ọgụgụ ndị ọrịa ndị bụ́ isi na-efe efe gbuworo kemgbe afọ 1914, ọ na-egosi na ọgba ịnyịnya ihe atụ a anọwo na-agba n’ezie. Nhụjuanya “ihe otiti na-akpata ọnwụ” na-eweta n’ụwa nile na-enyekwu ihe àmà ọzọ na Alaeze Chineke dị nso. *Mak 13:29.

Ọ bụ ezie na sayensị ọgwụ na ahụ́ ike enwewo ihe ịga nke ọma n’ibelata mmụba nke ọrịa na-efe efe ruo iri afọ ole na ole, ọ maliteghachikwala iyi anyị egwu. N’ụzọ doro anya, ọ dị anyị mkpa inweta ihe ngwọta site n’ebe karịrị ike mmadụ iji dozie nsogbu a kpam kpam. Onye Okike anyị na-ekwe nkwa ime nke ahụ kpọmkwem. Aịzaịa onye amụma na-emesi anyị obi ike na n’okpuru Alaeze Chineke, “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” Ọzọkwa, “[Chineke ga-eloda] ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi; Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu nile.” (Aịsaịa 25:8; 33:22, 24) Mgbe ụbọchị ahụ ga-eru, a ga-emeriwo ọrịa kpam kpam.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Iwu Mozis nwere ntụziaka ndị metụtara mkpofu ihe, idebe ihe ọcha, idebe onwe onye ọcha, na iwepụ ndị nwere ọrịa ụfọdụ iche pụọ n’ebe ndị mmadụ nọ. Dr. H. O. Philips kwuru na “eziokwu ndị metụtara ọmụmụ, nchọpụta ọrịa, ọgwụgwọ, na ọgwụ mgbochi ọrịa dị ka e si kọwaa ha n’ime Bible bụ nnọọ ịgba nakwa ihe ndị a pụrụ ịdabere na ha karịa nchepụta echiche nke Hippocrates.”

^ par. 15 Iji tụlee ihe ndị ọzọ na-egosi na ọbịbịa nke Alaeze Chineke dị nso, lee isi nke 11 nke akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Igbe dị na peeji nke 22]

Ndị Ọrịa Na-efe Efe Gbuworo Kemgbe 1914

Ọnụ ọgụgụ ndị a bụ atụmatụ e mere eme. Otú ọ dị, ha na-egosi ọ̀tụ̀tụ̀ ọrịa na-efe efe taruworo isi ihe a kpọrọ mmadụ kemgbe 1914.

Kịtịkpa (agbata nde 300 na nde 500) Ọ dịghị mgbe e mepụtara ọgwụ dị ike na-agwọ kịtịkpa. Usoro sara mbara nke ịgba ọgwụ mgbochi zuru ụwa ọnụ mesịrị nwee ihe ịga ọma n’ikpochapụ ọrịa ahụ ka ọ na-erule afọ 1980.

Ụkwara nta (agbata 100 nde na nde 150) Ụkwara nta na-egbuzi ihe dị ka nde mmadụ abụọ kwa afọ, ihe dịkwa ka 1 onye n’ime mmadụ 3 ọ bụla nọ n’ụwa bu nje na-akpata ụkwara nta.

Ọrịa ịba (agbata nde 80 na nde 120) N’ọkara nke mbụ nke narị afọ nke 20, ọnụ ọgụgụ ndị ọrịa ịba na-egbu bịara nọrọ n’ihe dị ka nde abụọ kwa afọ. Ebe ọ kasị egbu ndị mmadụ ugbu a bụ ná mba Africa ndị dị na ndịda Sahara, bụ́ ebe ọrịa ịba ka na-egbu ihe karịrị otu nde mmadụ kwa afọ.

Oké ahụ́ ọkụ Spen (agbata nde 20 na nde 30) Ụfọdụ ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme na-ekwu na ọnụ ọgụgụ ndị o gburu karịrị nnọọ nke ahụ. Ntiwapụ ọrịa a na-egbu egbu gbukpọrọ ụwa n’afọ 1918 na 1919, ozugbo Agha Ụwa Mbụ gasịrị. “Ọbụna ọrịa bubo egbughị ọtụtụ mmadụ n’ụzọ dị ngwa otú ahụ,” ka akwụkwọ bụ́ Man and Microbes na-ekwu.

Ịba ahụ́ ọkụ (ihe dị ka nde 20) Ntiwapụ nke ịba ahụ́ ọkụ na-esokarị agha abịa, agha ụwa mbụ kpatakwara ịba ahụ́ ọkụ nke kpara mba ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe aka ọjọọ.

Ọrịa AIDS (ihe karịrị nde 20) Ihe otiti ọgbara ọhụrụ a na-egbuzi nde mmadụ atọ kwa afọ. Atụmatụ ngalaba nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu nke na-ahụ maka ọrịa AIDS mere na-egosi na “ọ bụrụ na e meghị ihe dị ukwuu n’igbochi nakwa n’ịgwọ ọrịa ahụ, nde mmadụ 68 ga-anwụ . . . n’agbata afọ 2000 na 2020.”

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

N’okpuru Alaeze Chineke, ọrịa ndị dị ka ndị a agaghịzi na-eyi egwu

Ọrịa AIDS

Ọrịa ịba

Ụkwara nta

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Ọrịa AIDS: CDC; ọrịa ịba: CDC/Dr. Melvin; ụkwara nta: © 2003 Dennis Kunkel Microscopy, Inc.

[Foto dị na peeji nke 23]

Jizọs gwọrọ ụdị ọrịa na nsogbu ahụ́ ike ọ bụla