Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

 Ikiri Ụwa

Okwuchukwu A Na-ere Ere

“Ekpere ndị ụkọchukwu na-arụgbu onwe ha n’ọrụ bụ́ ndị na-adọga ịkwadebe okwuchukwu abụrụwo nke a zara: otu onye ọnụ na-eru n’okwu na Chọọchị England nke na-abụghị ụkọchukwu, mepere ebe ọhụrụ a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet bụ́ ebe a na-edebe okwuchukwu ndị a pụrụ iji mee ihe n’ọnọdụ nile,” ka The Daily Telegraph nke London na-akọ. Onye mepere ebe ndebe ihe ọmụma ahụ, bụ́ Bob Austin, na-ekwu, sị: “Ndị na-ekwu okwuchukwu na-ejikarị ọrụ n’aka n’oge ndị a nke na ha adịchaghị elebara okwuchukwu anya.” Ọ na-azọrọ na ya na-ewepụta “okwuchukwu ndị rijuru afọ, bụ́ ndị a kwadebeworo akwadebe,” ndị “na-akpali iche echiche, na-adọrọ mmasị ma na-enye ihe ọmụma.” Ka ọ dị ugbu a, ebe ndebe ihe ọmụma ahụ nwere “ihe karịrị okwuchukwu 50 ‘a nwaleworo n’ikpo okwu,’ bụ́ ndị dabeere n’isiokwu nakwa n’akụkụ Bible dị iche iche,” ma isiokwu ndị metụtara ozizi ndị na-akpata arụmụka esoghị na ha, ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-akọwa. N’ịbụ nke a kọwara dị ka “okwu ga-ewe minit 10 ruo minit 12 nke ọgbakọ ga-aghọta nke ọma,” nke ọ bụla n’ime ha na-ada dollar 13.

Iji Ụgwọ nke Na-arịwanye Elu na Britain

“Ụgwọ a na-eji na Britain na-achọ iji nwayọọ nwayọọ mebie akụ̀ na ụba ha ma tinye otu onye n’ime mmadụ anọ ọ bụla ná nnukwu nsogbu ego ọ na-agaghị esi na ya pụta,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Daily Telegraph nke London na-akọ. Ọ na-agbakwụnye, sị: “Mba ahụ emewo ka a mara ya dị ka mba ‘e mesịa a kwụọ ụgwọ’ bụ́ nke ji ụgwọ ijeri pound 878 [puku ijeri dollar 1.49] n’ihe ndị ha zụrụ azụ.” A gụpụ ego ndị e nyere ihe ná mbe were gbazite, onye Britain nke na-akpata afọ ya ji ụgwọ ruru pound 3,383 [dollar 5,737] n’ihe ọ zụrụ n’aka, ego ndị ọ gbaziri agbazi, na ego ndị o bitere n’ụlọ akụ̀. N’ihi ya, “ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị ruworo ogo mmadụ na-adọga ịkwụ ụgwọ ha na-atụ ụjọ na ha agaghị akwụchali mgbe ọ bụla,” karịsịa ma ọ bụrụ na ọmụrụ nwa na ụkọ ọrụ arịa elu. Frances Walker nke na-arụ n’Ụlọ Ọrụ Na-enye Ndụmọdụ Maka Ịzụ Ihe n’Aka na-adụ ọdụ, sị: “Ọ bụrụ na ego ị na-akwụ n’ụgwọ i ji kwa ọnwa, ma a gụpụ ihe ndị i nyere ná mbe, eruo ihe karịrị pasent 20 nke ego ị na-akpata n’ọnwa, ị na-emefu ihe karịrị akpa gị.” N’agbanyeghị ịdọ aka ná ntị ndị a, e mere atụmatụ na ndị Britain na-aga ezumike ga-atụkwasị ijeri pound 3 [ijeri dollar 5] n’elu ụgwọ ha ji n’ime afọ 2003.

Ehi Hà Dị Oké Ọnụ Karịa Mmadụ?

Oghere dị n’etiti ndị ọgaranya na ndị ogbenye n’ụwa nọgidere na-asawanye mbara. N’ime afọ 20 gara aga, òkè mba ndị kasị ala n’imepe emepe (nke nde mmadụ 700 bi na ha) na-ekere n’azụmahịa mba ụwa ebelatala site na 1 pasent ruo pasent 0.6. “Ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị Africa isi ojii dara ogbenye taa karịa ka ọ dị n’ọgbọ gara aga,” ka onye France bụ́ ọkà ná nhazi akụ̀ na ụba bụ́ Philippe Jurgensen dere na magazin bụ́ Challenges. Dị ka ihe atụ, n’Etiopia, ihe nde mmadụ 67 na-akpata bụ otu ụzọ n’ụzọ atọ nke akụ̀ na ụba nke mmadụ 400,000 bi na Luxembourg. Jurgensen na-ekwu na ndị ọrụ ugbo nọ na Europe na-enweta ego enyemaka dị dollar 3 kwa ụbọchị n’isi otu ehi, ebe ihe dị ka ijeri mmadụ 2.5 na-akpata ihe na-erughị nke ahụ n’ụbọchị. N’ihi ya, n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa, “ehi dị oké ọnụ karịa onye ogbenye,” ka Jurgensen na-ekwu.

Iji Ọgwụ Ọjọọ Eme Ihe n’Etiti Ndị Ịtali Nọ n’Oge Uto

Dị ka otu nnyocha Ụlọ Akwụkwọ San Raffaele nke dị na Milan mere na-egosi, pasent 42 nke ụmụ akwụkwọ Ịtali e mere nnyocha n’ebe ha nọ, bụ́ ndị dị afọ 14 ruo 19, kwetara na ha na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe. Otú ọ dị, Mariolina Moioli, bụ́ ọga kpata kpata na Ministri Na-ahụ Maka Agụmakwụkwọ n’Ịtali, kweere na ọnụ ọgụgụ ha kpọmkwem karịrị nke ahụ. Ọgwụ ọjọọ kasị ewu ewu n’etiti ndị a jụtara uche ha bụ wii wii na hashish. N’ime ụmụ akwụkwọ ndị ahụ na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe, pasent 34 kwetara na ha na-eji ya eme ihe n’ụlọ akwụkwọ, pasent 27 na-eji ya eme ihe n’ụlọ egwú abalị, pasent 17 na-ejikwa ya eme ihe n’ebe obibi ha. Nnyocha ahụ kpughekwara na pasent 82 nke ụmụ akwụkwọ ahụ na-aṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya.