Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ị Ga-anwụ!”

“Ị Ga-anwụ!”

“Ị Ga-anwụ!”

DỊ KA LEANNE KARLINSKY SI KỌỌ

Ọchịchọ m chọrọ ọgwụgwọ kasị mma e nwere n’ejighị ọbara na Spain

Ọ BỤRỤ na a sị ka i mee njem gaa n’ebe ọ bụla n’ụwa, olee ebe ị ga-ahọrọ ịga? Nye m, azịza ya dị mfe. Ana m akụzi Spanish n’ụlọ akwụkwọ, mụ na di m, bụ́ Jay, na nwa m nwoke bụ́ Joel nọ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova na-asụ Spanish, bụ́ nke dị na Galax, Virginia, U.S.A. Mgbe ahụ, ebe m chọrọ ịga bụ Spain. Ya mere ị pụrụ ịghọta ụdị ọṅụ m nwere mgbe ndị mụrụ m kwuru na ha ga-akpọje m ebe ahụ! Ọ bụ ezie na di m na nwa m nwoke apụghị iso gaa, nrọ m na-achọ imezu ka mụ na ndị mụrụ m banyere n’ụgbọelu ga-eburu anyị gaa Madrid n’akwụsịghị akwụsị. Mgbe anyị rutere n’April 21, anyị kpebiri iji ụgbọala gaa Estella, bụ́ obere obodo dị na Navarre, n’ebe ugwu Spain. Anọsara m ahụ n’oche azụ ma hiwe ụra ozugbo.

Ihe ọzọ m chetara bụ na m dina n’èzí, anwụ ana-achakwa m n’anya. ‘Olee ebe m nọ? Olee otú m si bịaruo ebe a? Ànọ m ná nrọ?’ Ka ajụjụ ndị a na-erugharị n’isi m, enwetara m onwe m. Ọ dị ihe merenụ, nke a abụghịkwa nrọ. Aka efe m nke aka ekpe dọrisiri adọrisi, apụghịkwa m iwegharị aka m ma ọ bụ ụkwụ m. Ka e mesịrị, a kọọrọ m na ụgbọala anyị sukaara ígwè mgbochi na-adị n’akụkụ ụzọ nakwa na ụgbọala ahụ tụpụrụ m mgbe ọ tụgharịrị ma kpọdaa ihe ruru mita 20. Enwere m ekele na ma mụ ma ndị mụrụ m echetaghị ihe mberede ahụ merenụ.

Etiri m mkpu enyemaka, otu onye na-anya gwongworo ji ọsọ gbata n’ebe m nọ. Mgbe ahụ, ọ gbadakwuru ná mkpọda ahụ n’ebe ụgbọala ahụ dị, ebe ndị mụrụ m tọrọ atọ. “Gwa ụgbọala na-ebu ndị ọrịa ka o mee ngwa ngwa!” ka ọ gwara onye ya na ya so n’olu dị ike. “Ndị nọ n’ụgbọala ahụ merụrụ ahụ nke ukwuu!” Mgbe ahụ ọ laghachiri n’ebe m dina n’enweghị ike imegharị ahụ, n’inwekwa ezi nzube obi, ọ nwara ịgbatị ụkwụ m. Etiri m mkpu n’oké ihe mgbu, nke ahụ bụ mgbe mbụ m chọpụtara na m merụrụ ahụ nke ukwuu.

N’oge na-adịghị anya anọ m n’ọnụ ụlọ ọnọdụ mberede nke ụlọ ọgwụ dị na Logroño. N’ụzọ obiọma, ndị uwe ojii gwara Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè ahụ ebe m nọ na ihe merenụ. N’oge na-adịghị anya, ọtụtụ ndị si n’ọgbakọ ndị dị n’Estella na Logroño nọ n’akụkụ ákwà m, tinyere Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ nke ógbè ahụ. N’ezie, n’oge nile m nọ ná nsogbu n’ụlọ ọgwụ a, ndị Kraịst ibe m m hụrụ n’anya bụ́ ndị m na-ahụtụbeghị mbụ dị njikere ilekọta m ụbọchị dum. Ha jikwa ịhụnanya lekọta ndị mụrụ m, bụ́ ndị gbakeruru ịhapụ ha ka ha si n’ụlọ ọgwụ laa n’ihe dị ka otu izu mgbe anyị nwesịrị ihe mberede ahụ.

N’ihe dị ka elekere 1:00 nke ụtụtụ Wednesday, ndị dọkịta bịara ịwa m ahụ n’úkwù m gbajiri agbaji. Agwara m dọkịta ahụ na achọghị m ịnara ọbara. * O kwetara ime ya dị ka ọchịchọ m si dị, ma o sighị ya n’obi, ọ bụ ezie na ọ gwara m na m nwere ike ịnwụ. Apụtara m ndụ n’ịwa ahụ ahụ, ma o juru m anya na e hichaghị ọnyá m, a gbanweghịdị bandeeji e kere na ya mgbe e mesịrị.

Ka ọ na-erule Friday ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara m dalataruru 4.7, ike na-agwụkwa m. Dọkịta ahụ kwetara ịgwọ m n’ejighị ọbara—gbaa m ọgwụ erythropoietin (EPO), bụ́ nke, tinyere ihe ndị dị na ya na-enye iron ma na-ewulite ọbara, na-akpali mmepụta nke mkpụrụ ndụ ọbara uhie. * Ka ọ dị ugbu a, Jay na Joel abịawo. Lee ka o si dị mma ịhụ di m na nwa m nwoke!

N’ihe dị ka elekere 1:30 nke ụtụtụ, otu dọkịta gwara Jay na ụlọ ọgwụ ahụ enwetaworị ikike site n’ụlọikpe inye m ọbara ma ọ bụrụ na ọnọdụ m aka njọ. Jay gwara ya na achọghị m ịnara ọbara n’ọnọdụ ọ bụla. “Ọ ga-anwụnụ!” ka dọkịta ahụ zara.

Jay gwara Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ banyere ibuga m n’ụlọ ọgwụ ọzọ—nke ga-eme ihe m chọrọ. Ọ bụghị na mmadụ nile nọ n’ụlọ ọgwụ a na-emegide m. Dị ka ihe atụ, otu dọkịta mesiri m obi ike na ọ ga-eme ihe nile o nwere ike ime iji hụ na e ji nkwanye ùgwù nile dịịrị m gwọọ m. Ma n’oge na-adịghị anya dọkịta ndị ọzọ nọ na-arụgide m. “Ị̀ chọrọ ịnwụ ma hapụ ezinụlọ gị?” ka ha jụrụ. Emere m ka o doo ha anya na achọrọ m ọgwụgwọ kasị mma e nwere n’ejighị ọbara. O metụtaghịdị dọkịta ndị ahụ n’ahụ inyere m aka. “Ị ga-anwụ!” ka otu kwuru n’ezoghị ọnụ.

Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ chọtara otu ụlọ ọgwụ dị na Barcelona nke kwetara ịgwọ m n’ejighị ọbara. Lee ọdịiche dị n’ụlọ ọgwụ abụọ ahụ! Na Barcelona, nọọsụ abụọ ji nwayọọ hichaa m ahụ ma mee ka m tụsara ahụ. Mgbe ha na-agbanwe bandeeji e kere m, otu n’ime nọọsụ ndị ahụ hụrụ na ọ na-asọ oyi ma bụrụ nke ọbara kpụkọrọ n’ihu ya. Ọ sịrị na ọ na-eme ya ihere na ndị mba ya si otú a mesoo m.

N’oge na-adịghị anya, anọ m na-anara ọgwụgwọ nke e kwesịrị ịmalitewo nyewe m n’ụlọ ọgwụ ahụ dị na Logroño. Ihe ndị si na ya pụta dị ịrịba ama. N’ụbọchị ole na ole akụkụ ahụ m ndị kasị mkpa anọkwaghị n’ihe ize ndụ, ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara hemoglobin mụ arịwo elu ruo 7.3. N’oge m na-ahapụ ụlọ ọgwụ ahụ, ọ rịruwo 10.7. Mgbe ọ dị mkpa ka a waa m ahụ ọzọ n’ụlọ ọgwụ dị na United States, o ruwo 11.9.

Enwere m ekele maka mbọ ndị dọkịta na nọọsụ gbara, bụ́ ndị dị njikere ịnabata ọchịchọ nke ndị ha na-agwọ, ma ha kweere na ya ma ọ bụ na ha ekweghị. Mgbe ndị na-arụ n’ụlọ ọgwụ kwanyeere nkwenkwe nke onye ọrịa ùgwù, ha na-agwọ onye ahụ dum—n’ụzọ dịkwa otú a ha na-enye ọgwụgwọ kasị mma e nwere.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 N’ihi ihe ndị Bible kwuru, Ndịàmà Jehova adịghị anara mmịnye ọbara.—Lee Jenesis 9:4; Levitikọs 7:26, 27; 17:10–14; Deuterọnọmi 12:23-25; 15:23; Ọrụ 15:20, 28, 29; 21:25.

^ par. 9 Ma onye Kraịst ọ̀ ga-anara EPO ma ọ bụ na ọ gaghị anara bụ mkpebi onwe onye.—Lee Ụlọ Nche nke October 1, 1994, peji nke 31.

[Foto dị na peeji nke 16]

Mụ na di m na nwa m nwoke

[Foto dị na peeji nke 17]

Mmadụ abụọ so na Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ