Diuterọnọmi 15:1-23

  • Ná ngwụcha afọ asaa ọ bụla, ndị Izrel ga-akagbu ụgwọ e ji ha (1-6)

  • Inyere ndị ogbenye aka (7-11)

  • N’afọ asaa ọ bụla, a ga-ahapụ ndị ohu ka ha nwere onwe ha (12-18)

    • A ga-eji ihe kpọpuo ohu ntị (16, 17)

  • A ga-edo anụ ọ bụla e bụ ụzọ mụọ nsọ (19-23)

15  “Ná ngwụcha afọ asaa ọ bụla, unu ga-akagbu ụgwọ e ji unu.+  Otú a ka unu ga-esi kagbuo ụgwọ e ji unu: Onye ọ bụla e ji ụgwọ ga-akagbu ụgwọ onye agbata obi ya ji ya. Ọ gaghị agba onye agbata obi ya ma ọ bụ nwanne ya ụgwọ, n’ihi na a ga-ama ọkwa ka onye ọ bụla kagbuo ụgwọ e ji ya n’ihi Jehova.+  Unu nwere ike ịgba onye mba ọzọ ụgwọ,+ ma unu ga-akagbu ụgwọ ọ bụla nwanne unu ji unu.  Ma, e nweghị onye kwesịrị ịda ogbenye n’ime unu n’ihi na o doro anya na Jehova ga-agọzi unu+ n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka ọ bụrụ nke unu,  naanị ma ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu ma lezie anya na-edebe iwu a niile m na-enye unu taa.+  N’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu ga-agọzi unu otú o kwere unu ná nkwa. Unu ga na-agbazinye ọtụtụ mba ihe, ma unu agaghị agbaziri ihe ọ bụla.+ Unu ga-achị ọtụtụ mba, ma ha agaghị achị unu.+  “Ọ bụrụ na otu n’ime ụmụnne unu adaa ogbenye n’otu n’ime obodo unu, n’ala Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu, unu akpọchila obi unu ma ọ bụ jụ inyere nwanne unu dara ogbenye aka.+  Unu ga-emesapụrụ ya aka+ ma gbazinye ya ihe ọ bụla na-akpa ya.  Lezienụ anya ka unu ghara ichewe echiche ọjọọ n’obi unu, sị: ‘Afọ nke asaa, bụ́ afọ mmadụ ji akagbu ụgwọ e ji ya, eruwela,’+ unu ewee ghara imere nwanne unu dara ogbenye ebere, gharakwa inye ya ihe ọ bụla. Ọ bụrụ na o besara Jehova ákwá n’ihi unu, ọ ga-abụrụ unu mmehie.+ 10  Unu kwesịrị imesapụrụ ya aka,+ ya ewutekwala unu* na unu na-enye ya ihe, n’ihi na ọ bụ ya mere Jehova bụ́ Chineke unu ga-eji gọzie ihe ọ bụla unu na-eme na ihe ọ bụla unu na-arụ.+ 11  N’ihi na e nweghị mgbe a na-agaghị enwe onye dara ogbenye n’ala unu.+ Ọ bụ ya mere m ji na-enye unu iwu, sị, ‘Mesapụrụnụ nwanne unu nọ n’ahụhụ nke dakwara ogbenye n’ala unu aka.’+ 12  “Ọ bụrụ na e resịrị gị nwanne gị, ya bụ, nwoke Hibru ma ọ bụ nwaanyị Hibru, ya abụrụ na o jeerela gị ozi afọ isii, ị ga-ahapụ ya ka o nwere onwe ya n’afọ nke asaa.+ 13  Ọ bụrụ na o nwere onwe ya, agbawala ya aka mgbe ị na-ahapụ ya ka ọ lawa. 14  Ị ga-esi n’ìgwè ewu na atụrụ gị, ebe ị na-azọcha ọka* gị, ebe ị na-azọchapụta mmanya, nakwa n’ebe ị na-azọchapụta mmanụ were ọtụtụ ihe nye ya. Ị ga-enye ya ihe ndị a otú Jehova bụ́ Chineke gị si gọzie gị. 15  Cheta na ị nọ na-agba ohu n’Ijipt, Jehova bụ́ Chineke gị wee gbapụta gị. Ọ bụ ya mere m ji na-enye gị iwu taa ka i mee ihe a. 16  “Ma ọ bụrụ na ọ sị gị, ‘Agaghị m ahapụ gị,’ maka na ọ hụrụ gị na ezinụlọ gị n’anya, n’ihi na obi dị ya ụtọ kemgbe gị na ya nọ,+ 17  ị ga-edokwasị ntị ya n’ibo ụzọ, were ihe e ji akpọpu ntị kpọpuo ya ntị. Ọ ga-abụzi ohu gị ná ndụ ya niile. Otu ihe a ka ị ga-eme ohu gị nwaanyị. 18  Mgbe ị na-ahapụ ya ka ọ lawa nwere onwe ya, echela na e megburu gị emegbu, n’ihi na ozi o jeere gị afọ isii ji okpukpu abụọ karịa ihe onye ọrụ e goro ego gaara arụrụ gị, Jehova bụ́ Chineke gị gọzikwara gị n’ihe niile. 19  “Ị ga-edo oké ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’ìgwè ehi gị nakwa n’ìgwè ewu na atụrụ gị nsọ ka ọ bụrụ nke Jehova bụ́ Chineke gị.+ Ejila ehi* e bu ụzọ mụọ n’ìgwè ehi gị rụọ ọrụ. Akpachakwala ajị ewu ma ọ bụ ajị atụrụ gị e bu ụzọ mụọ. 20  Gị na ezinụlọ gị ga na-eri ya n’ihu Jehova bụ́ Chineke gị kwa afọ n’ebe Jehova bụ́ Chineke gị ga-ahọrọ.+ 21  Ma ọ bụrụ na anụ ahụ nwere nkwarụ, ya bụ, na ọ dara ngwọrọ ma ọ bụ kpuo ìsì ma ọ bụ nwee nkwarụ ọ bụla ọzọ dị njọ, achụrụla ya Jehova bụ́ Chineke gị n’àjà.+ 22  Ị ga-anọ n’obodo gị rie ya. Onye dị ọcha na onye na-adịghị ọcha ga-eri ya otú e si eri ele ma ọ bụ mgbada.+ 23  Ma, erila ọbara ya.+ Ị ga-awụpụ ya n’ala ka mmiri.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “obi unu.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Na Hibru, “oké ehi.”