Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụzọ Isi Nagide Obi Nkoropụ

Ụzọ Isi Nagide Obi Nkoropụ

 Echiche nke Bible

Ụzọ Isi Nagide Obi Nkoropụ

OBI nkoropụ na-emetụta mmadụ nile, ma ọ dịghị ihe ọzọ ruo n’ókè ụfọdụ. Otú ọ dị, nye ụfọdụ ndị, mmetụta nke enweghị olileanya na-esi oké ike nke na ọ na-eyi ha ka ọnwụ ọ ka mma karịa ndụ.

Bible na-egosi na ọbụna ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi na-enwekwa nsogbu na nrụgide ndị na-akpata obi nkoropụ. Dị ka ihe atụ, tụlee Elaịja na Job—ndị socha Chineke nwee ezi mmekọrịta. Mgbe o sisịrị n’ihu Eze Nwanyị Jezebel gbapụ maka ndụ ya, Elaịja ‘rịọrọ Jehova ka ya nwụọ.’ (1 Ndị Eze 19:1-4) Onye ezi omume bụ́ Job nwetara ọtụtụ ọdachi, gụnyere ọrịa na-asọ oyi na ọnwụ nke ụmụ ya iri. (Job 1:13-19; 2:7, 8) Obi nkoropụ ya mere ka o kwuo, sị: “M ga-ahọrọ ọnwụ karịa ahụhụ m nile.” (Job 7:15, The New English Bible) N’ụzọ doro anya, ndị ikom a kwesịrị ntụkwasị obi nye Chineke nwere nnọọ oké nchegbu.

Nye ụfọdụ ndị taa, obi nkoropụ pụrụ ịmalite site ná mmetụta na-egbu mgbu nke ịka nká, ọnwụ onye òtù ọlụlụ, ma ọ bụ ajọ ihe isi ike ego. Ndị ọzọ na-achọpụta na nrụgide na-adịghị akwụsị akwụsị, mmetụta na-adịte aka nke mkpaghasị uche, ma ọ bụ nsogbu ezinụlọ na-eme ka ọ dị ha ka hà na-erugharị n’etiti oké osimiri, ebe ebili mmiri nile na-eme ka o siere ha ike iru n’ikperé mmiri. Otu nwoke kwuru, sị: “Ị ga na-eche na ị baghị uru—dị ka a ga-asị na ọ dịghị onye ọ ga-emetụta ozugbo ị pụrụ n’anya. Owu na-ama onye ahụ mgbe ụfọdụ na-adị egwu.”

N’ọnọdụ ụfọdụ, ihe na-agbanwe wee ka mma, na-ebelata oké nrụgide a. Ma gịnị  ma ọ bụrụ na ọnọdụ anyị agaghị agbanwe? Olee otú Bible pụrụ isi nyere anyị aka ịnagide obi nkoropụ?

Bible Pụrụ Inye Aka

Jehova nwere ikike ịkwagide Elaịja na Job gabiga ihe isi ike ha. (1 Ndị Eze 19:10-12; Job 42:1-6) Lee ka ịmata nke ahụ si akasi anyị obi taa! Bible na-ekwu, sị: “Chineke bụụrụ anyị ebe mgbaba na ike, O mewo ka a chọta Ya n’inyeaka nke ukwuu ná mkpagbu nile.” (Abụ Ọma 46:1; 55:22) Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịdị ka obi nkoropụ ọ̀ na-erikpu anyị, Jehova na-ekwe nkwa iji aka nri ya nke ezi omume jidesie anyị ike. (Aịsaịa 41:10) Olee otú anyị pụrụ isi jiri enyemaka a mee ihe?

Bible na-akọwa na site n’ekpere, “udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi [anyị] na echiche uche [anyị] nche n’ime Kraịst Jisọs.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) N’ihi obi erughị ala anyị, o nwere ike anyị agaghị agwọta nsogbu anyị. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị ‘anọgidesie ike n’ekpere,’ Jehova pụrụ ichebe obi na uche anyị, na-enye anyị ume dị anyị mkpa iji nagide ya.—Ndị Rom 12:12; Aịsaịa 40:28-31; 2 Ndị Kọrint 1:3, 4; Ndị Filipaị 4:13.

Anyị ga-erite uru site n’ịkpọ okwu aha n’ekpere anyị. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ isi ike ikwupụta ihe anyị na-eche, anyị kwesịrị inwere onwe anyị ịgwa Jehova mmetụta anyị na-enwe na ihe anyị ghọtara kpatara nsogbu ahụ. Ọ dị anyị mkpa ịrịọ ya maka ume iji kwagide anyị gabiga ụbọchị nke ọ bụla. Anyị nwere mmesi obi ike bụ́: “Ihe dị ndị na-atụ egwu Ya ụtọ ka [Jehova] ga-eme; ọ bụkwa ntiku ha ka Ọ ga-anụ, wee zọpụta ha.”—Abụ Ọma 145:19.

Tụkwasị n’ikpe ekpere, anyị aghaghị izere ikewapụ onwe anyị iche. (Ilu 18:1) Ụfọdụ ndị enwetawo ume site n’iwepụta onwe ha inyere ndị ọzọ aka. (Ilu 19:17; Luk 6:38) Tụlee otu nwanyị aha ya bụ Maria, * onye ọ na-abụghị nanị na ọ lụsoro ọrịa cancer ọgụ kamakwa mmadụ asatọ bụ́ ndị òtù ezinụlọ ya nwụrụ n’ime nanị otu afọ. Maria aghaghị ịmanye onwe ya ibili n’àkwà ma maliteghachi ọrụ ya. Ọ na-apụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kwa ụbọchị iji zie ndị ọzọ ihe banyere Bible, ọ na-agachikwa nzukọ ndị Kraịst anya. Nchegbu Maria na-alọghachi n’ụzọ dị egwu mgbe ọ lọghachiri n’ụlọ. Otú ọ dị, site n’itinye uche n’ịmata ụzọ ọ pụrụ isi nyere ndị ọzọ aka, Maria enwewo ike ịnagide ya.

Ma gịnị ma ọ bụrụ na ọ na-esiri anyị ike ikpe ekpere ma ọ bụ na o yiri ka anyị apụghị izere ikewapụ onwe anyị iche? Ọ bụrụ otú ahụ anyị aghaghị ịchọ enyemaka. Bible na-agba anyị ume ichigharịkwuru “ndị okenye nke nzukọ Kraịst.” (Jemes 5:13-16) Otu nwoke nke ka na-alụso oké ịda mbà n’obi ọgụ kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ ịgwa onye ị tụkwasịrị obi okwu ga-enye aka ime ka obi ruo gị ala ma mee ka mmụọ gị jụrụ, ka i wee nọgide na-enwe echiche ziri ezi.” (Ilu 17:17) Otú ọ dị mgbe obi nkoropụ nke nọteworo aka ma sie ike na-agba àmà nsogbu ahụ ike, enyemaka kwesịrị ekwesị nke onye ọrụ ahụ ike pụkwara ịdị mkpa. *Matiu 9:12.

Ọ bụ ezie na e nweghị ngwọta dị mfe dịnụ, anyị ekwesịghị ilelị ikike Chineke nwere inyere anyị aka ịnagide nsogbu anyị. (2 Ndị Kọrint 4:8) Ịnọgide n’ekpere, ịzere ikewapụ onwe anyị iche, na inweta enyemaka kwesịrị ekwesị ga-enyere anyị aka inweta onwe anyị. Bible na-ekwe nkwa na Chineke ga-ewepụcha ihe ndị na-akpatara anyị oké obi nkoropụ. Ndị Kraịst ekpebisiwo ike ịdabere na Ya ka ha na-atụ anya oge ‘a na-agaghị echetakwa ihe mbụ ndị a nile.’—Aịsaịa 65:17; Mkpughe 21:4.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Ọ bụghị ezigbo aha ya.

^ par. 12 Teta! adịghị akwado otu usoro ọgwụgwọ kpọmkwem. Ndị Kraịst kwesịrị ijide n’aka na usoro ọgwụgwọ ọ bụla ha na-eji eme ihe emegideghị ụkpụrụ Bible. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee Ụlọ Nche nke October 15, 1988, peji nke 25-29.