Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụwa Ọ̀ Ga-adị n’Otu?

Ụwa Ọ̀ Ga-adị n’Otu?

 Ụwa Ọ̀ Ga-adị n’Otu?

N’AFỌ ndị na-adịbeghị anya, ọtụtụ nde mmadụ nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe na n’ebe ndị ọzọ atawo ahụhụ n’ihi ihe ndị si n’agha pụta. Ma, ọbụna ka ụdị agha obi ọjọọ ndị ahụ na-aga n’ihu, ọtụtụ puku ndị nọ ná mba ndị a agha tisasịworo enwewo ike ịzụlite ma nọgide na-enwe ezi ịdị n’otu n’etiti onwe ha. Tụlee ihe atụ ole na ole.

Na 1991 otu ìgwè mmadụ si mba dị iche iche, nke fọrọ nke nta ka o ruo mmadụ 15,000 zukọrọ na Zagreb, Croatia. A kpaliri otu onye uwe ojii nọ n’ebe ahụ ikwu, sị: “Ọ ga-adị mma igosi ụlọ ọrụ mgbasa ozi ihe na-eme n’ámá egwuregwu a, n’ebe a, ebe anyị na-ahụ ndị Serbia, Croatia, Slovenia, Montenegro, na ndị ọzọ ka ha sooro ibe ha nọrọ n’udo.” Gịnị kpatara ịdị n’otu dị otú ahụ a na-adịghị ahụkebe?

Na 1993 e nwere ọbụna mgbakọ mba nile ka ukwuu, nke isiokwu ya bụ “Izi Ihe Chineke,” na Kiev, isi obodo Ukraine. Ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị bịaranụ fọrọ nke nta ka o ruo 65,000. Ihu peji nke Evening Kiev kọrọ, sị: “Ndịàmà Jehova . . . abụghị nanị baajị anụnụ anụnụ e dekwasịrị ‘Izi Ihe Chineke’ jikọtara ha kama ọ bụ ezi okwukwe.”

Izi Ihe Chineke—Ike Na-akpata Ịdị n’Otu

Ọ̀ na-eju gị anya ihe mere Ndịàmà Jehova ji adị n’otu ebe adịghị n’otu gbara ha gburugburu? Prọfesọ Wojciech  Modzelewski bụ́ onye Poland na-akọwa ihe kpatara ya site n’ikwu banyere Ndịàmà, sị: “Isi ihe na-akpata àgwà ịnọ n’udo ha bụ mkpebi ha nke ịnọ ugbu a na-agbaso ụkpụrụ ndị e kpughere na Bible.” N’ezie, Ndịàmà bụ ndị izi ihe nke Onye Okike ahụ, bụ́ Jehova Chineke, jikọworo n’ụwa nile. Gịnị bụ izi ihe ahụ?

Jisọs Kraịst rụtụrụ aka n’otu ụkpụrụ dị mkpa na-eme ka a dị n’otu mgbe o kwuru banyere ụmụazụ ya, sị: “Ha esiteghị n’ụwa, dị ka Mụ onwe m na-esiteghị n’ụwa.” Ee, nnọpụiche nke Ndịàmà Jehova n’ebe ọ bụla na-eme ka ha dị n’otu. Nke a kwekọrọ n’okwu Jisọs mgbe o kpere ekpere, sị: “M na-ekpe ekpere . . . ka ha nile wee bụrụ otu; dị ka Gị onwe gị dị n’ime m, dị ka Mụ onwe m dịkwa n’ime Gị, Nna, ka ha onwe ha wee dịkwa n’ime Anyị.”—Jọn 17:16-21.

Nnọpụiche a bụ ike na-akpata ịdị n’otu n’ihi na ọ na-akwali Ndịàmà n’akụkụ nile nke ụwa ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe Aịsaịa onye amụma kwuru banyere ndị nile Chineke “ga-ezi . . . ụzọ Ya ụfọdụ.” Aịsaịa kwuru na ndị dị otú ahụ “ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi.” Onye amụma ahụ gara n’ihu, sị: “Mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.”—Aịsaịa 2:2-4.

Ịdị n’otu na udo a hụrụ ná mgbakọ Ndịàmà Jehova n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe n’afọ iri gara aga na-egosi na a nọworị na-emezu amụma Aịsaịa n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta. Na Europe na n’ebe ndị ọzọ, Ndịàmà ahụ akpụgharịwo mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè na ube ha ka ha bụrụ mma ịkwa osisi, n’ụzọ ihe atụ. N’ihi ya, ha na-enwe udo na ịdị n’otu taa n’ụwa a na-adịghị n’otu. Ka a sịkwa ihe mere otu uche akwụkwọ akụkọ ji kwuo n’otu oge, sị: “Ọ bụrụ na ụwa nile ebie ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ [Bible] nke Ndịàmà [Jehova], nkwafu ọbara na ịkpọasị ga-akwụsị, ịhụnanya ga-achịkwa dị ka eze”! Ọ̀ dị mgbe nke ahụ ga-eme?

 Otú A Ga-esi Nwee Ịdị n’Otu Zuru Ụwa Ọnụ

Iji weta ịdị n’otu zuru ụwa dum, a chọrọ ihe karịrị otu ìgwè dị nnọọ nta nke ndị mmadụ nwere ezi nzube. Ọ dịkwa mkpa inwe otu ọchịchị nke nwere ike ịkwụsị mmetụta nke ndị na-emebi ịdị n’otu na udo. N’ezie, Jisọs kụziiri ụmụazụ ya ikpe nnọọ ekpere maka ọchịchị dị otú ahụ: “Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” (Matiu 6:10) Ee, Jisọs gosiri na ọ bụ nanị ọchịchị Chineke, “alaeze eluigwe,” pụrụ ịgwọta nsogbu ụwa—gụnyere nsogbu nke adịghị n’otu.—Matiu 4:17.

Jisọs Kraịst bụ Eze nke Alaeze eluigwe a. N’oge ọchịchị ya, ndị nọ n’ụwa ga-ahụ oge udo na ịdị n’otu a na-ahụtụbeghị mbụ. Ịdị n’otu a zuru ụwa ọnụ agaghị abịa site ná ndozigharị ọnọdụ akụ̀ na ụba ụmụ mmadụ mere. Nanị ọchịchị ụwa nke dị n’aka “Onyeisi Udo” pụrụ ime ihe dị otú ahụ.—Aịsaịa 9:6, 7.

Onyeisi Udo ahụ agaghị anabata ikpe na-ezighị ezi dị ugbu a, bụ́ nke ịda ogbenye na iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi na-akpata. Bible na-ekwe nkwa, sị: “Eze nile ga-akpọ isiala nye ya: mba nile ga-efe ya ofufe. N’ihi na ọ ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha; . . . Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.”—Abụ Ọma 72:11, 12, 14, 16.

Enweghị ọrụ ga-abụkwa ihe mgbe ochie n’oge ọchịchị Kraịst. Aịsaịa onye amụma kwuru, sị: “Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie; ha agaghị akụ, onye ọzọ erie: n’ihi na dị ka ụbọchị nile nke osisi si dị, otú a ka ụbọchị nile nke ndị m ga-adị, ndị M họpụtaworo ga-enwekwa ihe aka ha rụtara mgbe dị anya nke ukwuu.” (Aịsaịa 65:22) Cheedị echiche, mmadụ nile nọ n’ụwa ga-enwe ike ịrụ ọrụ bara uru na-enye afọ ojuju!

Ezi Ịdị n’Otu—Ole Mgbe?

Ma olee mgbe ịchịisi Kraịst n’elu ụwa ga-amalite? N’ịza ajụjụ ahụ, Jisọs Kraịst rụtụrụ aka n’oge agha, akụkọ agha, ọrịa, ala ọma jijiji, na ihe omume ndị ọzọ ga-aka akara. Ma, ọ rụtụkwara aka n’akụkụ dị mma—nkwusa zuru ụwa ọnụ nke ozi ọma Alaeze Chineke. (Matiu 24:3-14; Luk 21:11) Jisọs kwuru na ihe omume ndị a ga-ejedebe ‘n’oké mkpagbu’ nke ga-ewebata mgbanwe zuru ezu nke ọchịchị ụwa. (Matiu 24:21) Gụọ okwu ya e dekọrọ na Matiu isi nke 24 na Luk isi nke 21. Jiri ihe ị na-ahụ n’ụwa tụlee ọnọdụ ndị ahụ o buru n’amụma. Ị ga-ahụ nnọọ na anyị na-ebi ugbu a n’oge ga-ebute ụzọ tupu Chineke akwụsị ọchịchị ụmụ mmadụ. Alaeze Ya, nke Jisọs Kraịst bụ Eze ya, ga-eweghara ọchịchị. Ụwa nke dị n’otu na-abịa n’ihu!

Ajụjụ ahụ ka dị, Gịnị ka i kwesịrị ime iji hụ mmezu nke nkwa a? Ebe Bible na-emezu òkè dị mkpa n’atụmanya ụmụ mmadụ maka ọdịnihu, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ime mgbalị ịmara Bible nke ọma karị. Ya mere, Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ ịkpọtụrụ gị n’ebe obibi gị iji duziere gị ọmụmụ Bible n’efu. * Ọ bụrụ na ị nakwere atụmatụ a, n’oge na-adịghị anya ị ga-ahụ na ịdị n’otu ụwa dị mfe nnweta nakwa na gị onwe gị pụrụ ikere òkè na ya!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 Ọ bụrụ na ị ga-achọ inwetakwu ihe ọmụma banyere usoro ọmụmụ Bible a, kpọtụrụ ndị na-ebipụta magazin a ma ọ bụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị.

[Foto ndị dị na peeji nke 9]

N’ụwa nile, Ndịàmà Jehova na-enwe ịdị n’otu dị ịrịba ama

Kiev, Ukraine

Zagreb, Croatia

[Foto dị na peeji nke 10]

Nzube Chineke bụ ka ihe a kpọrọ mmadụ ghọọ otu ezinụlọ zuru ụwa ọnụ, nke dị n’otu