Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịmụta Ụmụ Ọ̀ Na-eme Ka Mmadụ Bụrụ Nwoke?

Ịmụta Ụmụ Ọ̀ Na-eme Ka Mmadụ Bụrụ Nwoke?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Ịmụta Ụmụ Ọ̀ Na-eme Ka Mmadụ Bụrụ Nwoke?

“Amaara m [ụmụ okorobịa] ole na ole na-asị, ‘Enwere m nwa nwanyị bi n’ebe a, nweekwa nwa nwoke bi n’ebe nke ọzọ,’ otú ha si ekwu ya yiri ka a ga-asị na ọ gbasaghị ha.”—Harold.

KWA afọ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu nde ụmụ agbọghọ nọ n’afọ iri na ụma na United States na-atụrụ ime. Ọnụ ọgụgụ ka nnọọ ukwuu n’ime ụmụaka ndị nne dị otú ahụ na-amụ bụ ndị a na-amụ n’alụghị di. N’ime ndị nne a nọ n’afọ iri na ụma, 1 n’ime 4 na-emesị mụọ nwa ọzọ n’ime afọ abụọ na-esonụ. Magazin bụ́ Atlantic Monthly na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na ọnọdụ dị ugbu a anọgide na-aga n’ihu, ihe na-erughị ọkara nke ụmụaka a na-amụ taa na nne na nna ha ga-ebigide n’oge nwata ha nile. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ụmụaka America ga-ebi n’ezinụlọ na-enweghị nne ma ọ bụ nna ruo ọtụtụ afọ.”

Ọ bụ ezie na United States nwere ọnụ ọgụgụ ka elu nke ndị nọ n’afọ iri na ụma na-atụrụ ime karịa mba ndị ọzọ mepere emepe, nsogbu nke ịmụ nwa n’alụghị di bụ ihe zuru ụwa ọnụ. N’ala ụfọdụ nke Europe dị ka England na France, a pụrụ iji ọ̀tụ̀tụ̀ ịmụ nwa dị otú ahụ tụnyere ndị nke mba United States. N’ụfọdụ mba Africa na Ndịda America, ọ̀tụ̀tụ̀ ịmụ nwa n’etiti ụmụ agbọghọ ndị nọ n’afọ iri na ụma fọrọ nke nta ka o jiri okpukpu abụọ karịa nke mba United States. Gịnị na-akpata mmụba a nke ntụrụ ime?

Ihe Na-akpata Mmụba Ahụ

N’akụkụ dị ukwuu, ihe na-akpata ọnọdụ a bụ nretọ nke omume nke “oge dị oké egwu” anyị bi n’ime ya. (2 Timoti 3:1-5) N’iri afọ ndị na-adịbeghị anya, ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba alụkwaghịm arịwo elu nke ukwuu. Idina ụdị onwe na ụzọ ndụ ndị ọzọ na-ekwekọghị n’ụkpụrụ omume ọma aghọwo akụkụ nke ndụ a na-adị kwa ụbọchị. Ndị na-eto eto aghọwo ndị ọtụtụ mkpọsa nke ụlọ ọrụ mgbasa ozi lekwasịrị anya—egwú na ihe nkiri ndị na-akpali mmekọahụ, isiokwu magazin na mkpọsa ngwá ahịa ndị na-awụ ibobo n’ahụ, ihe ngosi TV na ihe nkiri sịnịma ndị na-akwalite inwe mmekọahụ aghara aghara. Ụlọ ọrụ nsikwopụ afọ ime na nchịkwa ọmụmụ ndị dị mfe nnweta atụnyewokwa ụtụ ná nkwenye ndị na-eto eto na-ekwenye n’ebe nile na ọ dịghị ihe na-esi n’inwe mmekọahụ apụta. Otu nna na-alụghị nwunye na-ekwu, sị: “Achọrọ m inwe mmekọahụ n’enweghị ibu ọrụ.” “Mmekọahụ bụ ihe ntụrụndụ na ihe egwuregwu,” ka onye ọzọ na-ekwu.

Àgwà ndị dị otú ahụ pụrụ ịdịkarị n’etiti ndị ntorobịa dara ogbenye. Onye nchọpụta bụ́ Elijah Anderson gbara ndị na-eto eto bi n’ime obodo ọtụtụ ajụjụ ma kwuo, sị: “Nye ọtụtụ ụmụ okorobịa, mmekọahụ bụ ihe dị mkpa e ji amata ọnọdụ mmadụ n’ógbè; ịbụ ọkà n’ịrata mmadụ inwe mmekọahụ na-aghọ ihe e ji eme ọnụ.” N’ezie, otu nna na-alụghị nwunye gwara Teta! na a na-ele ịbụ ọkà n’ịrata mmadụ inwe mmekọahụ anya dị ka “ihe nturu ugo.” Gịnị na-akpata omume obi ịta mmiri dị otú ahụ? Anderson na-akọwa na ọtụtụ mgbe ndị kasị dịrị mkpa ná ndụ onye ntorobịa bi n’ime obodo “bụ ndị òtù ọgbọ ya. Ha na-egosi ya ihe nlereanya nke omume ọ ga na-eme, ọ dịkwa ya mkpa ibi ndụ kwekọrọ n’ihe nlereanya ndị dị otú ahụ.”

Anderson si otú a chọpụta na nye ọtụtụ ndị ikom na-eto eto, ịbụ ọkà n’ịrata mmadụ inwe mmekọahụ abụghị ihe ọzọ karịa ụzọ mmadụ isi nweta ihe ọ chọrọ, “nzube ya bụ iji mee ka onye nke ọzọ yie onye iberibe, karịsịa nwata nwanỵị.” Ọ na-agbakwụnye na “egwuregwu ahụ na-agụnye nwa okoro ahụ igosi onwe ya n’ụzọ zuru ezu, tinyere uwe, ejiji, ọdịdị, nkà ịgba egwú, na mkparịta ụka ya.” Ọtụtụ ụmụ okoro bụ nnọọ ọkà n’imeri “n’egwuregwu” a. Ma Anderson na-ekwu, sị: “Mgbe nwa agbọghọ ahụ tụụrụ ime, nwa okoro ahụ na-agbahapụ ya.”—Young Unwed Fathers—Changing Roles and Emerging Policies, nke Robert Lerman na Theodora Ooms, chịkọtara.

Echiche Chineke

Ma, ịmụ nwa ọ̀ na-eme ka mmadụ bụrụ nwoke n’ezie? Mmekọahụ ọ̀ bụ nanị ihe egwuregwu? Ọ dịghị otú ahụ nye Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke. N’Okwu ya, bụ́ Bible, Chineke mere ka o doo anya na mmekọahụ nwere nzube pụrụ iche. Mgbe o kwusịrị banyere okike nke nwoke na nwanyị mbụ ahụ, Bible na-ekwu, sị: “Chineke wee gọzie ha: Chineke wee sị ha, Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa.” (Jenesis 1:27, 28) Ọ dịghị mgbe ọ bụ uche Chineke ka ndị bụ́ nna gbahapụ ụmụ ha. O jikọtara nwoke na nwanyị mbụ ahụ n’ihe nkekọ na-adịgide adịgide nke alụmdi na nwunye. (Jenesis 2:24) N’ihi ya, ọ bụ ọchịchọ ya ka nwata ọ bụla nwee ma nne ma nna.

Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, ndị ikom malitere ịlụ ọtụtụ nwunye. (Jenesis 4:19) Jenesis 6:2 na-akọrọ anyị na ọbụna ụfọdụ ndị mmụọ ozi e kere eke “hụrụ ụmụ ndị inyom nke mmadụ na ha mara mma.” Mgbe ha nwoghasịrị ghọọ mmadụ, ndị mmụọ ozi ndị a ‘lụtaara onwe ha ndị inyom,’ jiri anyaukwu na-akpọrọ “ndị nile ha họpụtara.” (Ọ bụ anyị dere okwu ndị ahụ n’ụdị dị iche.) Iju mmiri nke oge Noa manyere ndị mmụọ ọjọọ a ịlaghachi n’ógbè ndị bụ mmụọ. Otú ọ dị, Bible na-egosi na a chụdara ha ugbu a n’ụwa. (Mkpughe 12:9–12) N’ihi ya, Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-akpa ike dị ukwuu n’ahụ ụmụ mmadụ taa. (Ndị Efesọs 2:2) N’amaghị ama, ụmụ okorobịa na-ekwenyere ajọ mmetụta dị otú ahụ mgbe ha na-amụ ụmụ ndị a na-achọghị na ndị a na-ahụghị n’anya.

Mgbe ahụ, e nwere ezi ihe mere Akwụkwọ Nsọ ji na-ekwu, sị: “Nke a bụ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ka e doo unu nsọ, ka unu ghara ịkwa iko; ka onye ọ bụla n’ime unu mata otú ọ ga-enwe nwunye nke aka ya n’odido nsọ na nsọpụrụ, ọ bụghị n’ọchịchọ ọjọọ nke agụụ ihe ọjọọ, ọbụna dị ka ndị mba ọzọ ndị na-amataghị Chineke; ka onye ọ bụla ghara ịghọgbu na irigbu nwanna ya n’ihe a: n’ihi na Onyenwe anyị bụ onye na-abọ ọ́bọ̀ banyere ihe ndị a nile, dị ka anyị bukwara ụzọ gwa unu gwasiekwa unu ike.”—1 Ndị Tesalọnaịka 4:3–6.

À sịrị ka a “ghara ịkwa iko”? Ọtụtụ ụmụ okorobịa pụrụ ịchị ọchị ma e kwuo nke a. E kwuwerị, ha ka na-eto eto, ọchịchọ ha sikwara ike! Ma rịba ama na ịkwa iko na-agụnye “ịghọgbu na irigbu” ndị ọzọ. (Ọ bụ anyị dere okwu ndị ahụ n’ụdị dị iche.) Ọ́ dịghị ewute nwa agbọghọ ịhapụrụ ya nwa ọhụrụ, n’enweghịkwa nkwado nke onye bụ́ di? Gịnịkwa banyere ihe ize ndụ nke ibunye ya ọrịa a na-ebute site ná mmekọahụ, dị ka ọrịa herpes na-eme n’akụkụ ahụ e ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị, ọrịa ọta kpụrụkpụrụ, gonorrhea, ma ọ bụ ọrịa AIDS? N’eziokwu, ọ ga-ekwe omume mgbe ụfọdụ izere ihe ndị dị otú ahụ pụrụ isi na ya pụta. Ya bụrụgodị otú ahụ, mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye na-emebi ikike nwa agbọghọ nwere ichekwa aha ọma ya ma banye n’alụmdi na nwunye dị ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke. Mgbe ahụ, ezi uche dị n’ịghara ịkwa iko, ọ na-egosikwa ntozu okè. N’eziokwu, mmadụ ‘inwe nwunye nke aka ya’ na ịghara inwe mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye chọrọ njide onwe onye na mkpebi siri ike. Ma dị ka Aịsaịa 48:17, 18 na-agwa anyị, site n’iwu ya, Chineke ‘na-ezi anyị ime ihe na-aba uru.’

“Bụrụnụ Ndị Ikom”

Otú ọ dị, olee otú nwa okorobịa pụrụ isi gosi na ya bụ nwoke n’ezie? N’ezie ọ bụghị site n’ịmụta nwa mkpuke. Bible na-agba ume, sị: “Na-echenụ nche, na-eguzosinụ ike n’okwukwe unu, bụrụnụ ndị ikom, na-adịnụ ike. Ka e mee ihe unu nile n’ịhụnanya.”—1 Ndị Kọrint 16:13, 14.

Rịba àmà na ‘ịbụ ndị ikom’ na-agụnye ịnọ na nche, iguzosi ike n’okwukwe, inwe obi ike, na inwe ịhụnanya. N’ezie, ụkpụrụ a metụtara ndị ikom na ndị inyom n’ụzọ hà nhata. Ma ọ bụrụ na ị zụlite àgwà ime mmụọ ndị dị ka ndị a, ndị mmadụ ga-enwe ezi ihe mere ha ga-eji kwanyere gị ùgwù ma nwee mmasị n’ebe ị nọ dị ka nwoke n’ezie! Mụta ihe site n’aka nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ—Jisọs Kraịst. Cheedị banyere àgwà nwoke, nke onye nwere obi ike o gosipụtara mgbe a na-ata ya ahụhụ na ọbụna mgbe ọ na-eche ọnwụ ihu. Ma, olee otú Jisọs si mesoo ndị na-abụghị nwoke ibe ya ihe?

N’ezie, Jisọs nwere ohere nke ịnụ ụtọ mkpakọrịta ndị inyom. O nwere ọtụtụ ndị inyom na-eso ụzọ ya, ụfọdụ n’ime ha “na-ewepụta ihe ha nwere emezi [ya na ndị ozi ya].” (Luk 8:3) Ya na ụmụnne nwanyị abụọ nke Lazarọs kpachiri anya karịsịa. N’ezie, Bible na-ekwu na “Jisọs hụrụ Mata, na nwanne ya nwanyị, . . . n’anya.” (Jọn 11:5) Jisọs ò ji amamihe, ịma mma, ma ọ bụ ọdịdị ya na-adọrọ adọrọ, bụ́ nke ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na o nwere ha dị ka nwoke zuru okè, mee ihe iji rata ndị inyom a ime omume rụrụ arụ? N’ụzọ megidere nke ahụ, Bible na-ekwu banyere Jisọs na “ọ dịghị mmehie ọ bụla O mere.” (1 Pita 2:22) O meghị omume na-ekwesịghị ekwesị ọbụna mgbe nwanyị a maara nke ọma dị ka onye mmehie, eleghị anya onye akwụna, “na-akwa ákwá, wee malite iwere anya mmiri ya desa ụkwụ Ya abụọ, o werekwa agịrị isi ya hichaa ha.” (Luk 7:37, 38) Jisọs echetụdịghị echiche iji ohere ahụ mee ihe n’ebe nwanyị a na-adịghị ike nọ! O gosipụtara ikike nke ịchịkwa mmetụta ya—ihe e ji ama onye bụ nwoke n’ezie. O mesoghị ndị inyom ihe dị ka ndị e ji emeju agụụ mmekọahụ, kama dị ka ndị kwesịrị ka a hụ ha n’anya ma kwanyere ha ùgwù.

Ọ bụrụ na ị bụ nwa okorobịa bụ́ onye Kraịst, ịgbaso ihe nlereanya Kraịst—ọ bụghị nke ụfọdụ ndị ọgbọ gị—ga-egbochi gị “ịghọgbu na irigbu” onye ọzọ. Ọ ga-echebekwa gị pụọ n’ọdachi dị mwute nke ịmụta nwa mkpuke. N’eziokwu, ndị ọzọ pụrụ ịkwa gị emo n’ihi ịghara ịkwa iko. Ma n’ikpeazụ, inweta ihu ọma Chineke ga-abara gị uru karịa inweta ihu ọma na-adịru nwa oge nke ndị ọgbọ gị.—Ilu 27:11.

Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na onye ntorobịa ahapụlarị ndụ rụrụ arụ o biri n’oge gara aga ma chegharịa n’ezie? Ọ bụrụ otú ahụ, dị ka Eze Devid chegharịrịnụ, bụ́ onye nwekwara mmekọahụ rụrụ arụ, ọ pụrụ inwe obi ike na Chineke ga-agbaghara ya. (2 Samuel 11:2–5; 12:13; Abụ Ọma 51:1, 2) Ma ọ bụrụ na a tụrụwo ime n’alụghị dị na nwunye, nwa okorobịa pụrụ inwe mkpebi ndị siri ike ọ ga-eme. Ò kwesịrị ịlụ nwa agbọghọ ahụ? Ò nwere ibu ọrụ n’ebe nwa ahụ nọ? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-abịa n’ihu.

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Ọtụtụ ndị ntorobịa na-ekwenye n’ụzọ na-ezighị ezi na o nweghị ihe ndị na-esi ná mmekọahụ apụta