Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Echiche Ziri Ezi Banyere Omenala Ndị Na-ewu Ewu

Echiche Ziri Ezi Banyere Omenala Ndị Na-ewu Ewu

Echiche nke Bible

Echiche Ziri Ezi Banyere Omenala Ndị Na-ewu Ewu

“Ọ DỊGHỊ ỤDỊ OMUME Ọ BỤLA NKE Ọ NA-ENWETỤBEGHỊ OGE NA EBE ỤFỌDỤ A KATỌRỌ YA, MA BỤRỤ NKE A NAKWEERE DỊ KA IBU ỌRỤ N’OTU OGE NAKWA N’EBE ỤFỌDỤ.”

WILLIAM LECKY, bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ onye Ireland si otú a chịkọta omume ịgbanwe agbanwe nke mmadụ. A pụkwara iji okwu ya kọwaa omenala na ọdịnala ndị dịwara kemgbe ọtụtụ afọ. N’ezie, ọtụtụ omume ndị e leburu anya dị ka akụkụ dị mkpa nke ndụ a na-adị kwa ụbọchị abụrụwo ndị a katọrọ ka oge na-aga. Nke a abụghị ihe ijuanya, n’ihi na dị ka onye Kraịst bụ́ Pọl onye ozi gosiri, “ụwa nke a dị ka e si ahụ ya anya [na-agbanwe agbanwe, NW].”–1 Ndị Kọrint 7:31.

Ee, ọha mmadụ na-agbanwe agbanwe oge nile. Nke a na-apụtakarị ìhè n’oké mgbanwe ndị a na-enwe n’omume na mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Ndị Kraịst agaghị ‘esite n’ụwa’—ya bụ ha na-anọpụ iche n’ọha mmadụ ndị e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ. N’agbanyeghị nke ahụ, Bible kwetara na ndị Kraịst nọ “n’ime ụwa,” o nyeghịkwa ha iwu ka ha bụrụ ndị na-ekewapụ onwe ha iche. Ya mere, inwe echiche ziri ezi banyere omenala dị mkpa.—Jọn 17:11, 14-16; 2 Ndị Kọrint 6:14-17; Ndị Efesọs 4:17-19; 2 Pita 2:20.

Gịnị Bụ Omenala?

Omenala bụ omume ndị e jikọtara ha na mmekọrịta mmadụ na ibe ya ma bụrụ ndị e ji mara otu ebe ma ọ bụ otu ndị. Ụfọdụ omenala, dị ka ịkpa ezi àgwà n’oge a na-eri nri na ụkpụrụ omume ọma, pụrụ ịmaliteworị n’ihi mkpa nke ịchịkwa àgwà ndị mmadụ n’ihe omume ìgwè, na-eme ka o kwe ha omume imekọrịta ihe n’ụzọ obiọma na nkwanyerịta ùgwù. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, a pụrụ iji àgwà ọma nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya tụnyere mmanụ, n’ihi na ọ na-eme ka mmekọrịta mmadụ na ibe ya na-aga were were.

Okpukpe enwewo mmetụta dị ukwuu n’omenala. N’ezie, ọtụtụ malitere site na nkwenkwe oge ochie na n’echiche okpukpe ndị na-esiteghị na Bible. Dị ka ihe atụ, inye ndị mmadụ nwụnahụrụ okooko osisi pụrụ ịmaliteworị na nkwenkwe ụgha nke okpukpe. * Tụkwasị na nke a, e chere na àgwà anụnụ anụnụ—nke a na-ejikọkarị ya na ụmụ ọhụrụ bụ́ ụmụ nwoke—na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ. E jiri ùri anya mee ihe iji chebe onwe onye pụọ n’ebe anya ọjọọ dị, ebe a na-eji uhie ọnụ egbochi ndị mmụọ ọjọọ ịbanye n’ọnụ nwanyị ma biri n’ime ya. Ọbụnadị omenala na-enweghị ihe ọjọọ dị na ya dị ka ikpuchi aka n’ọnụ mgbe a na-eghe ughere pụrụ ịmaliteworị site n’echiche bụ na mkpụrụ obi mmadụ pụrụ isi n’ọnụ ghere nnọọ oghe pụọ. Otú ọ dị, n’afọ ndị gafeworonụ, ihe ndị ahụ e jikọtara ha na okpukpe apụwo n’anya, taa kwa, omume na omenala ndị a enwekwaghị ihe jikọrọ ha na okpukpe.

Ihe Na-echegbu Ndị Kraịst

Mgbe onye Kraịst na-aghaghị ikpebi ma ọ̀ ga-agbaso omenala ma ọ bụ na ọ gaghị agbaso ya, nchegbu ya bụ́ isi kwesịrị ịbụ, Gịnị bụ echiche Chineke dị ka e kwupụtara ya n’ime Bible? N’oge gara aga, Chineke katọrọ omume ụfọdụ ndị ọ pụrụ ịbụ na obodo ụfọdụ nakweere. Ndị a gụnyere iji ụmụaka achụ àjà, iji ọbara eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, na omume mmekọahụ dị iche iche. (Levitikọs 17:13, 14; 18:1-30; Deuterọnọmi 18:10) N’otu aka ahụ, omenala ụfọdụ ndị zuru ebe nile taa bụ n’ezie ndị na-ekwekọghị n’ụkpụrụ Bible. Ndị a gụnyere ọdịnala ndị Bible na-akwadoghị bụ́ ndị e jikọtara ha na ememe okpukpe dị ka Krismas na Ista ma ọ bụ nkwenkwe ụgha ndị e jikọtara ha na mgbaasị.

Ma gịnị banyere omenala ndị ọ pụrụ ịbụ na o nwere ihe jikọrọ ha na omume ndị a na-enyo enyo ma bụrụ ndị e weere taa n’ụzọ bụ́ isi dị ka ụkpụrụ omume ọma ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya? Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ihe omume agbamakwụkwọ a ma ama —gụnyere ịnyerịta ọla na ịta keeki—pụrụ ịmaliteworịị site n’aka ndị ọgọ mmụọ. Nke a ọ̀ pụtara na a machibidoro ndị Kraịst ime omenala ndị dị otu ahụ? À chọrọ ka ndị Kraịst jiri nlezianya nyochaa omenala ọ bụla nke obodo iji hụ ma è nwere ebe ụfọdụ ma ọ bụ oge ụfọdụ o nwere njikọ nke Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị?

Pọl kọwapụtara na “ebe Mmụọ nke Onyenwe anyị nọ, ebe ahụ ka mmadụ nweere onwe ha.” (2 Ndị Kọrint 3:17; Jemes 1:25) Chineke chọrọ ka anyị jiri nnwere onwe a mee ihe, ọ bụghị iji kpalie ọchịchọ ọdịmma onwe onye nanị kama iji zụọ ike nghọta anyị ịtụle ọdịiche dị n’etiti ihe ọma na ihe ọjọọ. (Ndị Galetia 5:13; Ndị Hibru 5:14; 1 Pita 2:16) N’ihi ya, n’okwu a na-enweghị ụkpụrụ Bible o doro anya na e mebiri, Ndịàmà Jehova adịghị eti iwu a na-aghaghị ịgbaso. Kama nke ahụ, onye Kraịst nke ọ bụla aghaghị ịtụle ọnọdụ dị mgbe ahụ ma mee mkpebi onwe onye.

Chọọ Abamuru nke Ndị Ọzọ

Nke a ọ̀ pụtara na o ziri ezi mgbe nile ikere òkè n’omenala ụfọdụ ma ọ bụrụhaala na o megideghị ozizi Bible kpọmkwem? Ee e. (Ndị Galetia 5:13) Pọl gosiri na onye Kraịst kwesịrị ịchọ ọ bụghị nanị uru nke aka ya “kama uru nke mmadụ nile.” O kwesịrị ‘ime ihe nile ka e wee nye Chineke otuto’ gharakwa ịghọ ihe ịsụ ngọngọ nye ndị ọzọ. (1 Ndị Kọrint 10:31-33) N’ihi ya, onye na-achọ nnwapụta Chineke kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Olee otú ndị ọzọ si ele omenala a anya? Ọ̀ dị ihe na-ekwesịghị ekwesị ndị obodo na-ewere ya na ọ bụ? Mụ ikere òkè na ya ọ́ gaghị egosi na m kwenyere n’omume na echiche na-adịghị amasị Chineke?’—1 Ndị Kọrint 9:19, 23; 10:23, 24.

Ọ bụ ezie na ha bụ ihe na-enwechaghị ihe ọjọọ dị na ha, omenala ụfọdụ pụrụ ịbụ ndị a na-eme n’obodo n’ụzọ megidere ụkpụrụ Bible. Dị ka ihe atụ, inye okooko osisi n’oge ụfọdụ kpọmkwem pụrụ inwe ihe pụrụ iche ọ pụtara bụ́ nke megidere ozizi Bible. N’ihi ya, gịnị kwesịrị ịbụ nchegbu bụ́ isi nke onye Kraịst? Ọ bụ ezie na a pụrụ inwe ihe mere a ga-eji nyochaa mmalite nke otu omenala, mgbe ụfọdụ ọ ka mkpa ịtụle ihe omenala ahụ pụtara nye ndị mmadụ n’oge ahụ nakwa n’ebe mmadụ bi ugbu a. Ọ bụrụ na omenala nwere ihe Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị ma ọ bụkwanụ ihe na-adịghị mma ọ pụtara n’otu oge n’afọ ma ọ bụ n’ọnọdụ ụfọdụ, ndị Kraịst pụrụ iji amamihe kpebie izere ya n’oge ahụ.

Pọl kpere ekpere ka ndị Kraịst nọgide na-ekwe ka ịhụnanya ha na-ababiga ókè n’ime mmazu na nghọta nile. Site n’ịnọgide na-enwe echiche ziri ezi banyere omenala ndị a ma ama, ndị Kraịst ‘na-anwa ihe ha na ibe ha dị iche; ka ha wee dị ọcha n’obi gharakwa ịsụ ngọngọ.’ (Ndị Filipaị 1:9, 10) N’otu oge ahụ, ha ga-eme ka ‘mmadụ nile mara obiọma ha.’—Ndị Filipaị 4:5.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Dị ka ụfọdụ ndị ọkà mmụta banyere mmadụ si kwuo, e ji ùkwù okooko osisi mee ihe mgbe ụfọdụ dị ka onyinye a na-enye ndị nwụrụ anwụ iji gbochie ha inye ndị dị ndụ nsogbu.

[Foto ndị dị na peeji nke 28]

Ụfọdụ omenala ndị e mere n’oge ochie, dị ka ikpuchi aka n’ọnụ mgbe a na-eghe ughere na inye ndị mmadụ nwụnahụrụ okooko osisi, apụtakwaghị ihe ha pụtara na mbụ